Febụwarị 2-8

AỊZAYA 30-32

Febụwarị 2-8

Abụ nke 8 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Gbaba n’Okpuru Nku Jehova

(Nkeji 10)

Jehova na-echebe ndị ya otú nne nnụnụ na-echebe ụmụ ya ma anụ ọzọ bịa iburu ha (Aịza. 31:5; w01 11/15 16 ¶7)

Nọrọ ndị Jehova ji na-enyere gị aka nso (Aịza. 32:1, 2; w24.01 24 ¶13)

Ichebara olileanya Jehova mere ka i nwee echiche ga-eme ka ị dị ike (Aịza. 32:16-18; w23.10 17 ¶19)

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 30:20​—Gịnị ka okwu bụ́ “nri Jehova ga-enye unu bụ ịta unu ahụhụ, mmiri ọ ga-enyekwa unu bụ ime ka ihe siere unu ike” pụtara? (it “Achịcha; Nri” ¶6)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Onye ahụ kwuru ihe gosiri na ihe ndị na-eme n’ụwa na-echu ya ụra. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 5 nọmba nke 5)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 7 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 157

7. Vidio Si na Vidio Bụ́ “Ezi Omume A Ga Na-eme Ga-eme Ka Udo Dị”

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara na vidio a gbasara ihe bụ́ ezi omume?​—Aịza. 32:17.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 58-59

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 133 na Ekpere