Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?

Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?

E nwere otu nwatakịrị hụrụ ka nnukwu anwụrụ ọkụ si n’elu otu ụlọ ọrụ na-akwụgo n’elu. Otú anwụrụ ọkụ ahụ si ju n’elu mere ka nwatakịrị ahụ chee na ihe ụlọ ọrụ ahụ na-emepụta bụ anwụrụ ọkụ nke na-aghọ urukpuru na-ekpuchi eluigwe. Ihe a nwatakịrị a chere nwere ike ịtọ ọchị. Ma, ọ bụrụ na mmadụ aghọtahie ihe dị ezigbo mkpa o kwesịrị ịghọta, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ aghọtahie ihe e dere ná mkpọ̀ ọgwụ ọ na-aṅụ, o nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu.

Ọ bụrụ na mmadụ aghọtahie ihe Baịbụl kwuru, nsogbu o nwere ike ịkpata nwedịrị ike ịka njọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ghọtahiere ihe Jizọs kụziiri ha. (Jọn 6:48-68) Kama ịgba mbọ ka ha ghọta ihe ọ na-ekwu, ha ekwetaghịzi ihe niile ọ kụziri. Ihe a ha mere ghọrọ ha ahịa.

Ị̀ na-agụ Baịbụl ka ị mata otú ị ga-esi na-ebi ndụ? Ọ bụrụ ihe ị na-eme, ọ dị mma. Ma, ì nwere ike ịghọtahie ihe ị gụrụ? E nweela ọtụtụ ndị ghọtahiere ihe ha gụrụ na Baịbụl. Ka anyị leba anya n’ihe atọ Baịbụl kwuru ndị mmadụ na-aghọtahiekarị.

  • Baịbụl kwuru ka anyị “tụọ egwu ezi Chineke.” Ụfọdụ na-aghọtahie ihe a Baịbụl kwuru. Ha chere na ọ pụtara na anyị kwesịrị iji ụjọ na-efe Chineke. (Ekliziastis 12:13) Ma, Chineke achọghị ka ndị na-efe ya jiri ụjọ na-efe ya. Ọ sịrị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” (Aịzaya 41:10) Ihe ịtụ egwu Chineke pụtara bụ mmadụ iji obi ya niile na-akwanyere ya ùgwù.

  • À ga-eji ọkụ bibie ụwa?

    Baịbụl kwuru na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ.” Ụfọdụ na-aghọtahie ihe a Baịbụl kwuru. Ha na-ekwu na ihe ọ pụtara bụ na Chineke ekpebiela mgbe onye ọ bụla ga-anwụ. (Ekliziastis 3:1, 2) Ma, ihe amaokwu Baịbụl a na-ekwu bụ banyere ihe ndị na-eme ná ndụ, nakwa na ọnwụ na-adabara mmadụ niile. Okwu Chineke na-emekwa ka anyị mara na ihe anyị kpebiri ime nwere ike ime ka anyị dị ogologo ndụ ma ọ bụ nwụchuo ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Egwu Jehova ga-atụkwasịrị mmadụ ọtụtụ ụbọchị.” (Ilu 10:27; Abụ Ọma 90:10; Aịzaya 55:3) Olee otú nke a nwere ike isi mee? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Chineke, anyị ga-ezere ịṅụbiga mmanya oké na ịkwa iko n’ihi na ha na-akpatara mmadụ nsogbu.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

  • Baịbụl kwuru na eluigwe na ụwa dị ugbu a ka “e debeere ọkụ.” Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ọ pụtara bụ na Chineke ga-ebibi ụwa a anyị bi n’ime ya. (2 Pita 3:7) Ma Chineke kwuru na enweghị mgbe ọ ga-ebibi ụwa anyị a. Chineke “tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5; Aịzaya 45:18) Ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ nọ n’ụwa ka Chineke ga-ebibi kpamkpam ka à ga-asị na e ji ọkụ bibie ha. Ebe ụfọdụ e kwuru banyere eluigwe na Baịbụl, ihe ọ pụtara bụ ihu igwe, mbara igwe ebe kpakpando dị, ma ọ bụkwanụ ebe Chineke bi. Ma, o nweghị nke ọ bụla Chineke ga-ebibi.

GỊNỊ MERE NDỊ MMADỤ JI AGHỌTAHIE BAỊBỤL MGBE ỤFỌDỤ?

Ihe ndị anyị kwurula na-egosi na ọtụtụ ndị na-aghọtahiekarị ihe ha gụrụ na Baịbụl. Ma, gịnị mere Chineke ji kwe ka ụdị ihe a na-eme? Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke ma ihe niile, ọ gaara ede Baịbụl otú ọ ga-adịrị onye ọ bula gụrụ ya mfe ịghọta. Gịnị mere na Chineke emeghị ya otú ahụ?’ Ka anyị legodị ihe atọ mere ndị mmadụ ji aghọtahie Baịbụl.

  1.   E dere Baịbụl ka ndị dị umeala n’obi ma chọọ ịmụta ihe, gụọ ma ghọta ya. Jizọs gwara Nna ya, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma ma kpugheere ha ụmụ ọhụrụ.” (Luk 10:21) E dere Baịbụl otú ọ ga-abụ naanị ndị dị umeala n’obi ga-aghọta ya. Ọtụtụ “ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi” na-aghọtahie ya n’ihi na ha na-adịkarị mpako. Ma ndị na-aghọta ya bụ ndị dị umeala n’obi ka “ụmụ ọhụrụ” ma chọọ ịmụta ihe. Ihe a gosiri na Chineke ji amamihe dee Baịbụl.

  2. E dere Baịbụl ka ndị ji obi ha niile chọọ ka Chineke nyere ha aka ịghọta ya ghọta ihe ha gụrụ. Ihe Jizọs kwuru gosiri na e kwesịrị -inyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ọ kụziri tupu ha aghọta ya nke ọma. Olee otú a ga-esi enyere ha aka a? Jizọs kwuru, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile.” (Jọn 14:26) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke na-enye ndị mmadụ mmụọ nsọ ya ka ha nwee ike ịghọta ihe ha gụrụ na Baịbụl. Ma, Chineke anaghị enye ndị na-achọghị ka o nyere ha aka mmụọ nsọ ya. Ọ bụ ya mere ha anaghị aghọta ihe Baịbụl kwuru. Mmụọ nsọ Chineke na-emekwa ka Ndị Kraịst ma Baịbụl nke ọma gaa nyere ndị chọrọ ịghọtakwu Baịbụl aka.—Ọrụ Ndịozi 8:26-35.

  3. E dere ihe ụfọdụ dị na Baịbụl ka ndị mmadụ ghọta ha mgbe Chineke chọrọ ka a ghọta ha. Dị ka ihe atụ, a gwara Daniel onye amụma ka o dee ihe ga-eme n’ọdịnihu. Otu mmụọ ozi gwara ya, sị: “Ma gị onwe gị, Daniel, zochie okwu ndị a, mechiekwa akwụkwọ a, ruo n’oge ikpeazụ.” Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị agụọla ihe e dere n’akwụkwọ Daniel ma ha aghọtaghị ihe ha gụrụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Daniel aghọtadịghị ihe ụfọdụ o dere. O kwuru, sị: “Mụ onwe m nụrụ ma aghọtaghị m.” Ma, ndị mmadụ ga-emecha ghọta ihe ndị ahụ Daniel dere, ma ọ ga-abụ mgbe Chineke chọrọ ka a ghọta ha. Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel, sị: “Gawa, Daniel, n’ihi na e zochiwo okwu ndị a, mechiekwa ya ruo n’oge ikpeazụ.” Ole ndị ga-aghọta ihe ndị ahụ? Baịbụl zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ajọ omume ọ bụla ga-aghọta ihe ndị a; ma ndị nwere nghọta ga-aghọta ha.” (Daniel 12:4, 8-10) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke anaghị eme ka a ghọta ihe ụfọdụ e dere na Baịbụl ruo mgbe ọ chọrọ ka a ghọta ha.

È nwetụla mgbe Ndịàmà Jehova ghọtahiere ihe Baịbụl kwuru n’ihi na oge Chineke chọrọ ka a ghọta ha erubeghị? Ee, e nwetụla. Ma, mgbe oge Chineke chọrọ ka a ghọta ha ruru, Ndịàmà Jehova ghọtara ha ma gbanwee otú ha sibu ghọta ha. Ndịàmà Jehova na-eṅomi ndịozi Jizọs, bụ́ ndị dị umeala n’obi. Ndịozi Jizọs gbanwere otú ha sibu ghọta ihe ndị Jizọs kụziiri ha mgbe ọ bụla Jizọs mere ka ha ghọtakwuo ha.—Ọrụ Ndịozi 1:6, 7.

Ihe ahụ nwatakịrị ahụ anyị kwuru ná mmalite isiokwu a ghọtahiere nwere ike ịbụ obere ihe. Ma, mmadụ ịghọtahie ihe Baịbụl kwuru abụghị obere ihe. Ihe ndị e dere na Baịbụl abụghị ihe mmadụ ga-achọ iji echiche nke ya ghọta n’ihi na ha dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl. Ndị ị ga-agwa bụ ndị dị umeala n’obi na-amụ Baịbụl, ndị Chineke ji mmụọ nsọ ya na-enyere aka ịghọta Baịbụl, nakwa ndị kwetasiri ike na oge anyị a bụ oge Chineke chọrọ ka anyị ghọta Baịbụl karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Biko, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka, ma ọ bụkwanụ gị agaa ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org/ig gụọ ihe ndị ha mere ezigbo nchọnchọ dee. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-akpọku . . . , ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị  ga-achọta.”—Ilu 2:3-5.