Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ànyị ga-amatali nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke?

Gịnị mere Chineke ji chọọ ka anyị mara nke bụ́ eziokwu? Gụọ Jọn 17:3

O nweela oge dị iche iche Chineke gwara ụmụ mmadụ okwu. O ji mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nke na-arụ ọrụ mgbe niile, mee ka ndị dere Baịbụl mata uche ya. (2 Pita 1:20, 21) Anyị ga-amatali nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke ma anyị gụọ Baịbụl.—Gụọ Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16.

Chineke si na Baịbụl gwa anyị ọtụtụ ihe gbasara onwe ya. Ọ gwara anyị ihe mere o ji kee anyị, ihe ọ ga-emere anyị, na otú ọ chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ. (Ọrụ Ndịozi 17:24-27) Jehova Chineke chọrọ ka anyị mata nke bụ́ eziokwu gbasara ya.—Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.

Gịnị mere Chineke ji achọ ka ndị na-efe ya bụrụ ndị eziokwu na-atọ ụtọ?

Jehova, bụ́ Chineke anyị, na-ekwu eziokwu. O zitekwara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bịa kụziere anyị eziokwu. Ọ bụ ya mere ndị eziokwu na-atọ ụtọ ji na-ege Jizọs ntị. (Jọn 18:37) Ọ bụkwa ụdị ndị ahụ ka Chineke chọrọ ka ha na-efe ya.—Gụọ Jọn 4:23, 24.

Setan bụ́ Ekwensu na-eme ka ndị mmadụ na-akụzi ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara Chineke. Nke a emeekwala ka ọtụtụ ndị ghara ịma onye Chineke bụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:3, 4) Ihe ndị ahụ na-abụghị eziokwu na-amasị ndị kpọrọ ihe ọma asị. (Ndị Rom 1:25) Ma, ọtụtụ nde mmadụ taa ji obi ha niile na-amụ Baịbụl. Ha na-amatakwa nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:11.