Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ṄOMIE OKWUKWE HA | DEBORA

“M Biliri Dị Ka Nne n’Izrel”

“M Biliri Dị Ka Nne n’Izrel”

N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị, Debora lere ndị agha Izrel gbakọtara n’elu Ugwu Tebọ anya, obi atọọ ya ụtọ. Ọ nọ na-eche gbasara otú ndị agha ahụ si nwee obi ike na otú onye ndú ha bụ́ Berak si nwee okwukwe. Ọ bụ eziokwu na ha dị puku ndị ikom iri, ihe ha ga-eme ma ha hụ ndị ha na-aga ịlụso agha taa ga-egosi ma hà nwere okwukwe na obi ike n’eziokwu. Ndị ha na-aga ịlụso agha kagburu ha akagbu ma n’ọnụ ọgụgụ ma n’inwe ngwá agha. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, okwu Debora gwara ha mere ka ha kata obi bịa ịlụso ndị iro ha agha.

Weregodị ya na ị na-ahụ Debora na Berak ka ha guzo n’ọnụ ọnụ Ugwu Tebọ na-elepụ anya, ikuku ana-ebugharị uwe Debora. Elu ugwu ahụ dị larịị. Ugwu ahụ dịkwa ihe dị ka narị mita anọ n’ịdị elu. Ị nọrọ n’elu ugwu ahụ, ị ga na-ahụ ndagwurugwu Esdraelon nke ọma. Ị ga na-ahụkwa Osimiri Kaịshọn nke na-esi n’ala ahịhịa juru sọrọ na-aga n’Osimiri Ukwu nke dị nso n’Ugwu Kamel. N’ụtụtụ ụbọchị a, ọ ga-abụ na mmiri dị n’Osimiri Kaịshọn ataala. Ma, Sisera na ndị agha ya ji ọkpọka ngwá agha ha na-egbuke egbuke na-abịa. Ha ji narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ndị nwere mma. E nweghị ụgbọ ịnyịnya agha dị ka ha. Ebe ọ bụ na ndị agha Izrel enweghị ọkpọka ngwá agha, Sisera bu n’obi ịsụ ha akwụ.

Debora ma na Berak na ndị agha ya na-eche ka ọ sị ha gawa. Ma, ọ̀ bụ ya bụ naanị nwaanyị nọ ebe ahụ? Olee otú o si were nnukwu ọrụ a Jehova nyere ya ịgwa ndị agha Izrel ihe ha ga-eme? Ọ̀ nọ na-eche ihe ọ nọ ebe ahụ eme? O doro anya na o cheghị ụdị ihe ahụ. Jehova, bụ́ Chineke ya, agwala ya ka ọ gaa agha ahụ. Ọ gwakwara ya na ọ bụ nwaanyị ka ọ ga-eji merie ndị ha na-aga ịlụso agha. (Ndị Ikpe 4:9) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Debora na ndị agha a gbasara inwe okwukwe?

“GAA GBASAA ONWE GỊ N’UGWU TEBỌ”

Mgbe mbụ Baịbụl kwuru gbasara Debora, a kpọrọ ya “onye amụma nwaanyị.” Aha a e turu ya gosiri na ọ na-arụ ọrụ pụrụ iche. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ nwaanyị Baịbụl kwuru rụrụ ụdị ọrụ a. * E nwere ọrụ ọzọ Debora rụrụ. Ọ na-ekpere ndị Izrel ikpe, na-agwa ha ihe Jehova chọrọ ka ha mee ma ha na ibe ha see okwu.—Ndị Ikpe 4:4, 5.

Debora bi n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, nke dị n’agbata Betel na Rema. Ọ na-anọkarị n’okpuru nkwụ, na-arụrụ ụmụ Izrel ọrụ Jehova gwara ya ka ọ rụọ. N’eziokwu, ọrụ ya abụghị obere ọrụ. Ma, o kweghị ka ọrụ ahụ gwụ ya ike. Ọrụ a ọ na-arụ dị ezigbo mkpa. O mechadịrị soro ná ndị si n’ike mmụọ nsọ rọọ abụ. N’abụ ahụ, o kwuru banyere oge ụmụ Izrel nupụụrụ Chineke isi. Ọ sịrị: “Ha wee họrọ chi ọhụrụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka agha dara n’ọnụ ụzọ ámá.” (Ndị Ikpe 5:8) Ebe ọ bụ na ndị Izrel hapụrụ Jehova fewe chi ndị ọzọ, Jehova hapụrụ ha ka ndị iro ha na-emegbu ha. Eze Kenan aha ya bụ Jebin ji ọchịagha ya bụ́ Sisera na-echi ụmụ Izrel ọnụ n’ala.

Ọ na-abụ ụmụ Izrel nụ na Sisera na-abịa, obi awụnye ha n’afọ. Omenala ndị Kenan na otú ha si efe chi ha jọgburu onwe ya. Ha na-eji ụmụ ha achụ àjà, na-agbakwa akwụna n’ụlọ arụsị ha. Olee otú ihe dịịrị ndị Izrel ebe ọ bụ na ha nọ n’okpuru onyeisi ndị agha Kenan na ndị agha ya? Abụ Debora gosiri na ime njem adịghịziri ndị Izrel mfe nakwa na obodo dị iche iche n’Izrel tọgbọzi chakoo. (Ndị Ikpe 5:6, 7) Weregodị ya na ị na-ahụ ka ndị Izrel na-ezo n’ọhịa na n’ugwu. Ụjọ ịpụta kọọ ugbo na ụjọ ibi n’obodo na-enweghị mgbidi na-atụ ha. Ụjọ anaghịkwa ekwe ha si n’okporo ụzọ gaa ebe ha chọrọ ịga ka a ghara ịwakpo ha, kpọnara ha ụmụaka ha ma dinaa ụmụ nwaanyị ha n’ike. *

Ndị Kenan chiri ndị Izrel a na-enupụ isi ọnụ n’ala ruo afọ iri abụọ, ruo mgbe Jehova hụrụ na ha adịla njikere ịgbanwe. Ma ọ bụkwanụ, dị ka Debora na Berak bụrụ n’abụ, sị, “Ruo mgbe mụ onwe m, bụ́ Debora, biliri, ruo mgbe m biliri dị ka nne n’Izrel.” Anyị amaghị ma Debora nwunye Lapidọt ọ̀ mụrụ nwa. Ma, ihe mere e ji kpọọ ya nne bụ na Jehova nyere ya ọrụ ilekọta ụmụ Izrel otú nne si elekọta ụmụ ya. Ọ gwara ya ka o zie Berak Onyeikpe, bụ́ nwoke nwere okwukwe, ka ọ gaa lụso Sisera agha.—Ndị Ikpe 4:3, 6, 7; 5:7.

Debora gbara Berak ume ka ọ kata obi napụta ndị Chineke

Jehova gwara Debora ka ọ gwa Berak ka ọ ‘gaa gbasaa onwe ya n’Ugwu Tebọ’ nakwa ka o si n’ebo abụọ n’Izrel kpọrọ puku ụmụ nwoke iri ga-eso ya. Debora gwara ha na Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ha merie Sisera, bụ́ nwoke siri ezigbo ike, na narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ya na ìgwè ndị agha ya. O doro anya na nkwa a Chineke kwere riri Berak ọnụ. Ụmụ Izrel enweghị ndị agha a zụrụ azụ, ngwá agha ha ehighịkwa nne. Ma, Berak kwetara na ya ga-aga agha ahụ ma ọ bụrụ na Debora ga-eso ha gaa n’Ugwu Tebọ.—Ndị Ikpe 4:6-8; 5:6-8.

Ụfọdụ ndị ekwuola na ihe mere Berak ji gwa Debora ka o soro ha bụ n’ihi na o nweghị okwukwe. Ma ọ bụghị eziokwu. A sị ka e kwuwe, ọ rịọghị Chineke ka o nyekwuo ha ngwá agha. Kama, okwukwe o nwere nyeere ya aka ịghọta na ọ bụrụ na onye nnọchianya Jehova anọrọ n’etiti ya na ndị agha ya, ọ ga-eme ka obi sikwuo ha ike. (Ndị Hibru 11:32, 33) Jehova meere Berak ihe ahụ ọ rịọrọ. O kwere ka Debora soro ha gaa. Ma, Jehova sikwa n’ọnụ Debora kwuo na ọ bụghị nwoke ga-enweta otuto n’agha ahụ ha ga-aga. (Ndị Ikpe 4:9) Chineke ekpebiela na ọ bụ nwaanyị ga-egbu nwoke ọjọọ a bụ́ Sisera.

N’ụwa taa, a na-emegbu ụmụ nwaanyị, na-eti ha ihe, na-akparị ha, na-emetọkwa ha. Ọtụtụ ndị anaghị akwanyere ha ùgwù otú Chineke chọrọ. Ma, n’anya Chineke, nwoke na nwaanyị bachara uru, o nweghị onye nke bara uru karịa ibe ya, o nweghịkwa onye nke o ji kpọrọ ihe karịa ibe ya. (Ndị Rom 2:11; Ndị Galeshia 3:28) Ọrụ pụrụ iche Chineke nyere Debora gosiri na ọ tụkwasịrị ụmụ nwaanyị obi, na-akwanyere ha ùgwù, na-emekwara ha amara. Ọtụtụ ndị taa na-eleda ụmụ nwaanyị anya. Ma, anyị ekwesịtụghị ime ka ha.

“ALA MARA JIJIJI, MMIRI SIKWA N’ELUIGWE ZOO”

Berak gawara ịkpọkọta ndị agha ya. Ọ kpọkọtara puku ụmụ nwoke iri ndị obi siri ike ịga lụso ndị agha Sisera agha n’agbanyeghị na ndị agha a siri ezigbo ike. Ka Berak du ndị agha ya na-aga n’Ugwu Tebọ, obi dị ya ụtọ na e nwere ihe ga-eme ka obi sikwuo ha ike. Baịbụl gwara anyị, sị: “Debora sokwa ha gbagoo.” (Ndị Ikpe 4:10) Chegodị otú obi ga-adị ndị agha Berak ịhụ na nwaanyị ahụ obi kara so ha na-aga n’Ugwu Tebọ, dịkwa njikere ime ihe nwere ike ịta isi ya n’ihi okwukwe o nwere n’ebe Jehova Chineke nọ.

Sisera mere ihe ozugbo ọ nụrụ na ụmụ Izrel ejikerela ịlụso ya agha. Ọtụtụ ndị eze Kenan ndị ọzọ sonyeere Eze Jebin bịa ịlụ agha a. Ọ dị ka ọ̀ bụ ya kacha ha niile ike. Otú ndị agha Sisera na ụgbọ ịnyịnya agha ha si wụrụ na-abịa mere ka ebe niile na-ama jijiji. N’obi ndị Kenan, ha ga-ememila ndị agha Izrel a na-enweghị ngwá agha n’otu ntabi anya.—Ndị Ikpe 4:12, 13; 5:19.

Gịnị ka Berak na Debora ga-eme ugbu a ndị iro ha rutewere nso? Ọ bụrụ na ndị agha Izrel anọrọ na ndagwurugwu Ugwu Tebọ lụso ndị Kenan agha, ha nwere ike imeri ha, n’ihi na ọ bụ n’ala dị larịị ka ndị agha ji ụgbọ ịnyịnya agha na-aka akpa ike. Ma, Berak chọrọ ịlụ agha a otú Jehova chọrọ. Ọ bụ ya mere o ji chere ka ọ nụ ihe Debora ga-agwa ya. Debora mechakwara gwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ gwara ya, sị: “Bilie, n’ihi na taa ka Jehova ga-enyefe Sisera n’aka gị. Ọ́ bụghị Jehova buteere gị ụzọ?” Baịbụl kwukwara, sị: “Berak wee si n’Ugwu Tebọ gbadaa, ya na puku ndị ikom iri so ya.”—Ndị Ikpe 4:14. *

Ndị agha Izrel si n’ugwu ahụ gbadaa n’ala ahụ dị larịị, chụrụ ndị agha ahụ ji ọkpọka ngwá agha gawa. Jehova ò buteere ha ụzọ dị ka Debora kwuru? Jehova egbughị oge ọ bụla. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ala mara jijiji, mmiri sikwa n’eluigwe zoo.” Ndị agha Sisera dị́ mpako amaghị ihe ha ga-eme eme. Mmiri zosiwere ike nke na e nwere ike ịsị na mmiri bịara tojuo ebe niile n’otu ntabi anya. O teghị aka, ha enwelighịzi ike iji ụgbọ ịnyịnya agha ha na ngwá agha ha lụọ agha. Ha mikpuru n’apịtị.—Ndị Ikpe 4:14, 15; 5:4.

Ma, oké mmiri ozuzo ahụ enyeghị Berak na ndị agha ya nsogbu n’obi. Ha ma na Jehova ji ya na-alụrụ ha agha. Ha chụụrụ ndị agha Kenan gawa. O nweghị onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ ha hapụrụ ndụ dị ka Jehova gwara ha. Iyi Kaịshọn tojuru, sọpụta, sọrọ ozu ndị agha ahụ sọba n’Osimiri Ukwu.—Ndị Ikpe 4:16; 5:21.

Jehova lụchiteere ndị ya ọgụ, merie ndị agha Sisera, dị ka ọ gwara Debora na ya ga-eme

Jehova anaghịzi edunye ndị ohu ya agha nkịtị. Ma, ọ gwara ha ka ha na-alụso Setan ọgụ. (Matiu 26:52; 2 Ndị Kọrịnt 10:4) Otú anyị si alụso Setan ọgụ taa bụ ịna-erubere Chineke isi. Anyị kwesịrị ịna-akata obi n’ihi na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ na-abịara ndị na-erubere Chineke isi. Ma Jehova agbanwebeghị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ebe ọ nọ ma tụkwasị ya obi, ọ ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka dị ka ọ gbataara Debora, Berak, na ndị agha Izrel ahụ obi kara.

“ONYE A GỌZIRI AGỌZI KARỊSỊA, N’IME NDỊ INYOM”

Onye obi kacha fee azụ ná ndị agha ndị Kenan gbanahụrụ ndị agha Izrel. Ọ bụ Sisera, onye kacha emegbu ndị Chineke. O ji ụkwụ si n’ihu agha rie mbọ mbọ. Ọ chọghị ịma ma ndị agha ya tọrọ n’apịtị hà ga-adị ndụ ka hà ga-anwụ anwụ. O si n’etiti ndị agha ụmụ Izrel mịpụ, si n’ebe ahụ apịtị dị gbapụ, gbara gawa n’ebe kacha nso o chere na ya ga-anọ zere isi ya. Ọ gbara ezigbo ọsọ gbafere ebe ndị mmadụ nwere ike ịhụ ya, na-atụ ezigbo ụjọ na aka ndị agha Izrel nwere ike ịkpara ya. Ọ gbagara n’ụlọikwuu Hiba. Hiba bụ onye Kenaịt kewapụrụ onwe ya n’ebe ndị Kenaịt ibe ya nọ ma mee ka ya na Eze Jebin dịrị n’udo.—Ndị Ikpe 4:11, 17.

Mgbe Sisera na-erutela na nke Hiba, ezigbo ike agwụla ya. Ọ chọpụtara na Hiba anọghị n’ụlọ. Ma, Jeel nwunye Hiba nọ ya. Ọ ga-abụ na Sisera chere na o nweghị ihe Jeel ga-eme ya ebe di ya na Eze Jebin dị ná mma. O nwekwara ike ịbụ na o cheghị na nwaanyị ga-echetụdị n’echiche ime ihe di ya na-agaghị achọ ime. O doro anya na Sisera amaghị ụdị onye Jeel bụ. Jeel ejirila anya ya hụ otú ndị Kenan obi fere azụ si emegbu ndị mmadụ. Ọ ga-abụkwa na ọ ma na o nwere ihe o kwesịrị ime ugbu a. O nwere ike ịzọ nwoke ọjọọ a ndụ ma ọ bụkwanụ gosi na ya kwụ n’akụkụ Jehova ma gbuo nwoke a bụ́ onye iro ndị Chineke. Olee nke ọ ga-eme eme? Olee otú nwaanyị ga-esi egbu onye agha a bụ́ a kwaa akwụrụ?

Jeel chetara ihe ọ ga-eme ozugbo. O gosiri Sisera ebe ọ ga-anọ zuru ike. Sisera gwara ya ka ọ ghara ịgwa onye ọ bụla na-achọ ya na ya nọ ebe ahụ. Mgbe o dinara ala, Jeel ji ákwà kpuchie ya. Mgbe ọ gwara Jeel ka o kunyetụ ya mmiri, o nyere ya mmiri ara ehi. Obere oge, ezigbo ụra eburu Sisera. Jeel ewerezie mkpọ́ ụlọikwuu na hama, bụ́ ngwá ụlọ ụmụ nwaanyị ndị bi n’ụlọikwuu ma otú e si eji ha arụ ọrụ, jiri nwayọọ gbere igbe rute nso n’ebe Sisera dowere isi. Oge eruola ka o gbuo onye Jehova chọrọ ka e gbuo. O mewe ya obi abụọ ugbu a, ma ọ bụ, ya gbutụ oge, o nwere ike ịta isi ya. Ọ̀ ga-abụ na o chetara otú nwoke a sirila mekpọọ ndị Chineke ọnụ kemgbe ọtụtụ afọ? Ka ọ̀ ga-abụ na o chewere nnukwu ihe ọma meere ya ma o mee Jehova obi ụtọ? Baịbụl agwaghị anyị. Naanị ihe anyị ma bụ na o teghị aka, kpọtọkpọtọ agbaa n’ihu ehi, Jeel egbuo Sisera.—Ndị Ikpe 4:18-21; 5:24-27.

Berak mechara chọrọ Sisera rute n’ụlọ Hiba. Jeel gosiri ya ozu Sisera ebe mkpọ́ ahụ o ji gbuo ya ka dị n’agba ntị ya, ya amata na ihe ahụ Debora kwuru emezuola. Nwaanyị egbuola Sisera bụ́ dike n’agha. O nweghị ụdị aha ọjọọ ndị nkatọ na-akpọbeghị Jeel n’ihi ihe a o mere. Ma, Berak na Debora ma na ihe ahụ Jeel mere abụghị ihe ọjọọ. N’abụ ha si n’ike mmụọ nsọ rọọ, ha toro Jeel, sị na ọ bụ “onye a gọziri agọzi karịsịa, n’ime ndị inyom” n’ihi otú o si kata obi mee ihe o mere. (Ndị Ikpe 4:22; 5:24) Debora abịaghị mewere Jeel anyaụfụ. Kama, ihe bụ́ mkpa ya agwụla na okwu Jehova mezuru.

Ebe ọ bụ na Sisera anwụọla, Eze Jebin enweghịzi ike ime ụmụ Izrel ihe ọ bụla. Mmegbu ndị Kenan na-emegbu ụmụ Izrel emechaala kwụsị. Obi ruru ụmụ Izrel ala si mgbe ahụ ruo afọ iri anọ. (Ndị Ikpe 4:24; 5:31) Jehova gọziri Debora, Berak, na Jeel maka na ha nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe otú Debora nwere, kata obi na-eme ihe Jehova kwuru, ma na-agba ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ, Jehova ga-eme ka anyị merie onye ọ bụla chọrọ ka anyị kwụsị ife ya, obi ga na-erukwa anyị ala mgbe niile.

^ para. 7 Ndị ọzọ bụ́ ndị amụma nwaanyị bụ Miriam, Họlda na nwunye Aịzaya.—Ọpụpụ 15:20; 2 Ndị Eze 22:14; Aịzaya 8:3.

^ para. 9 Abụ Debora gosiri na ụmụ nwaanyị so n’ihe nkwata Sisera na-ejikarị alọta n’agha. Mgbe ụfọdụ, ndị agha ya na-eketacha ihe karịrị otu nwaanyị n’ime ndị ọ kpọ lọta. Ihe a kpọrọ ụmụ nwaanyị ná Ndị Ikpe 5:30 bụ “akpa nwa.” Ihe a a kpọrọ ha gosiri na ndị Kenan weere na ụmụ nwaanyị ndị ahụ bara uru naanị n’ihi akụkụ ahụ́ ha e ji enwe mmekọahụ. O yikarịrị ka o nweghị ihe e ji idina nwaanyị n’ike kpọrọ na Kenan.

^ para. 17 A kọrọ akụkọ gbasara otú e si lụọ agha a ná Ndị Ikpe isi anọ, nakwa n’abụ Debora na Berak rọrọ n’isi nke ise. Ihe ụfọdụ a na-akọghị ná Ndị Ikpe isi anọ dị n’abụ ahụ dị n’isi nke ise, ndị nke na-adịghịkwa n’isi nke ise dị n’isi nke anọ.