Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Anya Jairo Na-enyere Ya Aka Ife Chineke

Anya Jairo Na-enyere Ya Aka Ife Chineke

Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa mere ka ọ bụrụ naanị anya gị bụ ihe i nwere ike imegharị emegharị n’ahụ́ gị? Ọ bụ ọrịa a ka Jairo nwanne m na-arịa. Ma, ọ ka na-enwe obi ụtọ ná ndụ ya. Tupu mụ ekwuo ihe mere o ji na-enwe obi ụtọ ná ndụ ya, ka m kọọrọ gị otú ọrịa ya a si malite.

Mgbe a mụrụ Jairo, o nwere ọrịa ụbụrụ. * Ọrịa ụbụrụ a mere ka ọ bụrụ naanị anya ya ka o nwere ike imegharị emegharị n’ahụ́ ya. Ọ na-abụ ya nọkata, ụkwụ ya na aka ya ana-ahịkọ ahịkọ. O nwekwara mgbe ụfọdụ ọrịa a na-adọ ya akwụkwụ, na-emerụsị ya ahụ́. Ọ bụrụkwa na ndị mmadụ nọ ya nso mgbe ahụ, o nwere ike imerụ ha ahụ́ ma ọ bụrụ na ha akpachapụghị anya. N’ihi ihe a na-eme ya, a na-ekegidekarị ụkwụ ya na aka ya n’ígwè ndị ngwọrọ ọ na-anọ na ya.

ỌRỊA A TARA YA AHỤHỤ MGBE Ọ NA-ETO

Ka Jairo na-eto, ọrịa a mere ka ahụ́ na-egbukwu ya mgbu. Akwụkwụ bidoro dọwa ya mgbe ọ dị ọnwa atọ. Ọ dọchaa ya, ọ naghịzi ama onwe ya. Mama anyị na-ekuru ya gbara gawa n’ụlọ ọgwụ chee na ọ nwụọla.

Akwụkwụ a na-adọ ya meziri ka ụkwụ ya na aka ya hịkọọ. Mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọkpụkpụ úkwù ya chikwapụrụ, a waakwa ya ahụ́ iji dozie ya. M ka na-echeta otú o si ebe ákwá n’abalị ọ bụla maka mgbu ahụ́ ahụ a wara ya na-egbu ya.

N’ihi otú ọrịa a si kwarụọ Jairo, ọ bụzi ndị ọzọ na-emere ya ihe niile, dị ka inye ya nri, iyiwe ya efe, na inyiwe ya n’àkwà. Ọ na-abụkarị mama anyị na papa anyị na-emere ya ihe ndị a. Ọ bụ eziokwu na ọ dị mkpa ka mmadụ na-elekọta Jairo mgbe niile, ma mama anyị na papa anyị na-agwa ya mgbe niile na ọ bụ Chineke ka ndụ ya dị n’aka n’agbanyeghị na ndị mmadụ na-enyekwa aka elekọta ya.

ANYỊ MATARA OTÚ ANYỊ NA YA GA-ESI NA-EKWURỊTA OKWU

Anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, kemgbe Jairo dị obere, mama anyị na papa anyị na-agụrụ ya akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl. Ha ma na mmadụ ga-aka na-enwe obi ụtọ ma ya na Chineke dịrị ná mma. N’agbanyeghị na o nweghị ihe Jairo ga-emeli iji gbakee n’ọrịa ọjọọ a ọ na-arịa, ọ ga-enweli olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ma, ihe na-echezi ha uche bụ otú ọ ga-esi mụta eziokwu dị na Baịbụl.

Otu ụbọchị, mgbe Jairo ka dị obere, papa anyị gwara ya, sị, “Jairo, gbalịanụ gwa m okwu. Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, gwa m okwu.” Jairo bidoro bewe ákwá mgbe papa anyị na-arịọ ya ka ọ gwa ya okwu. Jairo gbalịrị ka ọ gwa papa anyị okwu, ma o nwelighị ike ikwu ihe a ga-aghọta aghọta. O wutere papa anyị na ihe ahụ o kwuru mere ka Jairo bewe ákwá. Ma, ihe ahụ merenụ gosiri na Jairo ghọtara ihe papa anyị gwara ya. Ihe bụzi nsogbu bụ na yanwa enweghị otú ọ ga-esi ekwupụta obi ya.

Obere oge, mama anyị na papa anyị chọpụtara na Jairo chọwa ịgwa ha okwu, o nwere otú ọ na-esi emegharị anya ya. Ma, ọ na-ewute Jairo na a naghị aghọtacha ihe a ọ na-eji anya ya eme. Mgbe mama anyị na papa anyị ghọtawara ihe o ji anya ya agwa ha ma na-ewetara ya ihe ọ chọrọ, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị. Ọ bụ mmụmụ ọnụ ọchị a ka o ji asị ha na ha emeela.

Otu dọkịta na-enyere ndị nwere nsogbu ikwu okwu aka gwara anyị ihe ga na-enyere anyị aka ịna-aghọtakwu ihe Jairo na-ekwu. Ọ sịrị ka anyị na-eweli aka anyị abụọ elu ma anyị jụọ ya ajụjụ anyị chọrọ ka ọ zaa ee ma ọ bụ ee e. Ọ bụrụ na o legide anya n’aka nri, anyị amara na ọ zara ee. Ọ bụrụkwanụ na o legide anya n’aka ekpe, anyị amara na ọ zara ee e.

NNUKWU IHE EMEE NÁ NDỤ JAIRO

Ndịàmà Jehova na-enwe mgbakọ ugboro atọ n’afọ ọ bụla. A na-ejikwa Baịbụl akụziri ndị mmadụ ihe ná mgbakọ ndị a. Jairo na-enwekarị obi ụtọ ma a gwawa ndị a na-aga ime baptizim okwu ná mgbakọ ndị a. Otu ụbọchị, mgbe Jairo dị afọ iri na isii, papa anyị jụrụ ya, sị, “Jairo, ị̀ ga-achọ ime baptizim?” Ozugbo ahụ, o legidere papa anyị anya n’aka nri ya, papa anyị aghọta na ọ chọrọ ime baptizim. Papa anyị jụziri ya, sị, “Ì kwela Chineke nkwa n’ekpere na ị ga-efe ya ruo ebighị ebi?” Ozugbo ahụ, ya eleekwa papa anyị anya n’aka nri. Ihe a o mere gosiri na o kpebiela iji ndụ ya niile jewere Jehova ozi.

Mgbe a kụzichaara Jairo Baịbụl nke ọma, ọ ghọtara na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim. N’ihi ya, n’afọ 2004, mgbe ọ dị afọ iri na asaa, ọ zara ajụjụ kacha mkpa a jụtụrụla ya. A jụrụ ya, sị, “Ị̀ rarala onwe gị nye Chineke ime uche ya?” Otú Jairo si zaa ajụjụ nke a dị iche. O leliri anya n’eluigwe iji gosi na ya zara ee. Ọ bụ otú a kụziiri ya ka o si zaa ajụjụ nke a. N’ihi ya, ná mgbakọ ahụ, e mere ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova.

ANYA YA NYEERE YA AKA N’OFUFE Ọ NA-EFE CHINEKE

N’afọ 2011, anyị matara ihe ọzọ ga-enyere Jairo aka ịna-ekwu ihe dị ya n’obi. Ihe ahụ bụ kọmputa e ji anya agwa ihe ọ ga-eme. Kọmputa a na-ahụ anya Jairo. E nwekwara ihe ndị e sere ese dị n’ihu kọmputa a. Jairo chọwa ịgwa mmadụ okwu, ya elegide anya n’otu n’ime ihe ndị ahụ e sere ese ma ọ bụ tabie anya ya mgbe ọ na-ele ya. Kọmputa ahụ na-emepezi ihe e dere na nke ahụ ọ na-ele, bido gụwa ya.

Ka Jairo na-amụtakwu eziokwu dị na Baịbụl, ọ bịara na-agụkwu ya agụụ ịkụziri ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. N’ezinụlọ anyị, anyị na-ewepụta otu ụbọchị amụkọ Baịbụl ọnụ. Ọ na-abụ anyị mụwa ihe, Jairo lee mụ anya, ya elee kọmputa ya. Ọ na-eji ihe a ọ na-eme agwa m ka m dee ihe ndị ọ ga-aza ma anyị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. M na-etinyere ya ihe ndị ahụ na kọmputa otú ọ ga-enwe ike iji ya zaa ajụjụ.

Anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe, ọ na-eji nwayọọ na-ele anya n’ihu kọmputa ahụ ka ọ chọta ihe e sere ese nke bu azịza ọ chọrọ ịza. Ọ chọta ya, ya elegide ya anya, kọmputa ahụ a gụpụtazie ya. Mgbe ọ bụla ọ zara ajụjụ n’ọmụmụ ihe, obi na-atọ ya ụtọ, ọ na-amụmụkwa ọnụ ọchị n’ihi na ọ ma na ọ gbaala ụmụnna ya ume. Otu enyi Jairo a na-akpọ Alex sị na ‘obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla Jairo zara ajụjụ n’ọmụmụ ihe.’

Jairo na-eji kọmputa ya aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-ejikwa ya ezi ndị mmadụ ozi ọma

Jairo na-ejikwa anya ya ezi ndị ọzọ ozi ọma. Otu n’ime ụzọ ndị ọ na-esi eme ya bụ ile anya na kọmputa ya n’ebe e sere ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nọ na paradaịs. O legide anya ebe ahụ, kọmputa ya ebido kwuwe, sị, “Baịbụl gwara anyị ná Mkpughe 21:4 na ụwa a ga-aghọ paradaịs, nakwa na ọnwụ na ọrịa agaghịzi adị.” Ọ bụrụ na onye ọ gwara ihe a egosi na ya nwere mmasị, ọ na-elezi anya n’ihe ọzọ e sere na kọmputa ya. O legide anya na ya, kọmputa ya ekwuo, sị, “Ị̀ ga-achọ ka mụ na gị mụwa Baịbụl?” Ọ bụ otú a ka o si zie papa nnukwu anyị ozi ọma. O jukwara anyị anya na papa nnukwu anyị kwetara ka ọ mụwara ya Baịbụl. Onyeàmà Jehova ọzọ nyeere Jairo aka ya ejiri nwayọọ nwayọọ kụziere papa nnukwu anyị Baịbụl. Obi dị anyị niile ụtọ na papa nnukwu anyị mere baptizim ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova nwere na Madrid n’ọnwa Ọgọst afọ 2014.

Ndị nkụzi Jairo chọpụtakwara na o jighị ife Chineke egwu egwu. Dị ka ihe atụ, Rosario, bụ́ otu n’ime ndị na-akụziri ya otú ya na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu, kwuru, sị: “Ụbọchị ọ bụla ikpe chọọchị gụwara m, m ga-ekpewe Àmà Jehova. Ahụla m otú okwukwe Jairo si mee ka ọ na-enwe obi ụtọ ná ndụ n’agbanyeghị ọrịa ọjọọ a ọ na-arịa.”

Jairo na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ bụla m gụụrụ ya nkwa Chineke kwere na “onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịzaya 35:6) Ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe obi na-anaghị adịcha ya mma, ma ọ na-enwekarị obi ụtọ. Ihe na-eme ya obi ụtọ bụ na ọ ma na o nwere Chineke, nweekwa Ndịàmà Jehova ibe ya na-akpa ya nso. Otú ihu si abụ ya ọchị ọchị na okwukwe siri ike o nwere n’ebe Chineke nọ gosiri na ife Chineke na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu onye ahụ nọ na ya.

^ para. 5 Ọrịa ụbụrụ a na-akụ mmadụ ngwọrọ. O nwekwara ike ime ka akwụkwụ dọwa mmadụ, ka agụụ ghara ịna-agụ ya, nakwa ka onye ahụ daa ogbi. Ọrịa ụbụrụ a Jairo na-arịa bụ nke ọjọọ ya. O nwere ike ime ka ụkwụ na aka mmadụ maa tịtịrịrị nakwa ka olu onye ahụ na-ete rekwe rekwe.