Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. * Ọ bụrụ na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ esi n’ọnwụ bilie, obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ ha. Ma, mmadụ ò kwesịrị ikwere na ihe a ga-eme eme? Anyị ga-amata azịza ajụjụ a ma anyị leba anya n’ihe mere ndịozi Jizọs Kraịst ji kweta na ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie.

Obi siri ndịozi Jizọs ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Gịnị mere obi ji sie ha ike? Ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ihe abụọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ndịozi Jizọs na ihe ‘karịrị narị ụmụnna ise’ ji anya ha hụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) O dokwara onye ukwu na onye nta anya na o sila n’ọnwụ bilie. Ihe a kọrọ na Matiu, Mak, Luk, na Jọn gosiri na nke a bụ eziokwu.—Matiu 27:62–28:20; Mak 16:1-8; Luk 24:1-53; Jọn 20:1–21:25.

Nke abụọ bụ na ndịozi Jizọs ji anya ha hụ mgbe Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, ha hụrụ mgbe ọ kpọlitere mmadụ n’ọnwụ n’obodo Nen, kpọlite onye ọzọ na Kapaniọm, kpọlitekwa onye ọzọ na Betani. (Luk 7:11-17; 8:49-56; Jọn 11:1-44) Onye nke ọ kpọlitere na Betani bụ enyi ya. Anyị ekwubuola okwu ya n’Ụlọ Nche a. Ma, ka anyị lebakwuo anya n’ihe merenụ mgbe ahụ.

“ABỤ M MBILITE N’ỌNWỤ”

Abalị anọ Lazarọs nwụchara, Jizọs gwara Mata nwanne Lazarọs, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata aghọtachaghị ihe Jizọs kwuru, ya agwa Jizọs, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili.” Ma, ihe o bu n’obi bụ na a ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ n’ọdịnihu. O juziri ya anya ịhụ na mgbe Jizọs kwuchara na ya bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ,” Jizọs mere ka nwanne ya nwoke si n’ọnwụ bilie.—Jọn 11:23-25.

Ò nwere ebe Lazarọs gara mgbe ahụ ọ nwụrụ nọọ abalị anọ n’ili? O nweghị ihe Lazarọs kwuru gosiri na o nwere ebe ọ gara nọrọ ndụ n’oge ahụ. Nke a gosiri na Lazarọs enweghị mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ nke gawara eluigwe mgbe ọ nwụrụ. Jizọs esighịkwa n’eluigwe, bụ́ ebe Lazarọs nọ na-ekpori ndụ n’akụkụ Chineke, kpọdata ya n’ụwa ma mee ka o bidokwa dịwa ndụ n’ụwa. Oleekwanụ ebe Lazarọs nọ mgbe ahụ ọ nwụrụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ nọ n’ili na-ehi ụra.—Ekliziastis 9:5, 10.

 Cheta na Jizọs kwuru na onye nwụrụ anwụ yiri onye na-ehi ụra e nwere ike ịkpọte n’ụra. Baịbụl kwuru, sị: “‘Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.’ Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: ‘Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.’ Otú ọ dị, ọ bụ banyere ọnwụ ya ka Jizọs na-ekwu. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. Ya mere, n’oge ahụ, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụwo.’” (Jọn 11:11-14) Mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ, Lazarọs malitekwara ịdị ndụ, ya na ụmụnne ya amalitekwa ibi. Ihe ọma ahụ Jizọs meere Lazarọs na ụmụnne ya enweghị atụ.

Mkpọlite Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na-egosi ihe ọma ọ ga-eme n’ọdịnihu. * Ebe Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, mgbe ọ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa, ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nọ n’ili. Ọ bụ ya mere o ji sị na ya bụ “mbilite n’ọnwụ.” Chegodị echiche otú obi ga-esi atọ gị ụtọ mgbe a ga-akpọlite ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, gị ahụ ha ọzọ. Obi ga-atọkwa ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ezigbo ụtọ.—Luk 8:56.

Chegodị echiche otú obi ga-esi atọ gị ụtọ mgbe a ga-akpọlite ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, gị ahụ ha ọzọ

INWE OKWUKWE GA-EME KA ANYỊ NWETA NDỤ EBIGHỊ EBI

Jizọs gwara Mata, sị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ; onye ọ bụla nke dị ndụ ma nwee okwukwe n’ebe m nọ agaghị anwụ ma ọlị.” (Jọn 11:25, 26) Ndị ahụ Jizọs ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ ga-achịwa ụwa agaghị anwụ ọzọ ma ọ bụrụhaala na ha akwụsịghị inwe okwukwe na Jizọs.

“Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:25

Mgbe Jizọs kwuchara gbasara mbilite n’ọnwụ, ọ jụrụ Mata ajụjụ mere ka Mata kwuo ihe dị ya n’obi. Ọ jụrụ Mata: “Ì kwere nke a?” Mata azaa ya, sị: ‘Ee, Onyenwe anyị; ekwere m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.’ (Jọn 11:26, 27) Ị̀ ga-achọ inwe okwukwe na Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ otú ahụ Mata nwere? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmata Chineke na ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ. (Jọn 17:3; 1 Timoti 2:4) Nke a ga-eme ka i nwee okwukwe. Gwa Ndịàmà Jehova ka ha kọọrọ gị ihe niile Baịbụl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ. Obi ga-atọ ha ụtọ ịkọwakwuru gị gbasara olileanya ọma ahụ anyị nwere, ya bụ, na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

^ para. 2 Gụọ isiokwu bụ́, “Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala.” Ọ dị na peeji nke 6 n’Ụlọ Nche a.

^ para. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa ahụ Baịbụl kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’ọnwụ, gụọ isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.