Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Chineke Ji Zite Jizọs n’Ụwa?

Gịnị Mere Chineke Ji Zite Jizọs n’Ụwa?

 Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Mere Chineke Ji Zite Jizọs n’Ụwa?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Olee ebe Jizọs nọ tupu Chineke ezite ya n’ụwa?

Jizọs bụ mmụọ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa n’obodo a na-akpọ Betlehem. Ọ bụ ya bụ onye mbụ Chineke kere. O nweghị onye ọzọ ya na Chineke so kee Jizọs. Nke a mere e ji akpọ ya Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, e nwere ọtụtụ mgbe o kwuchitere ọnụ Chineke. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya Okwu ahụ. O sokwa Chineke kee ihe niile ọzọ e kere eke. (Jọn 1:2, 3, 14) Tupu e kee ụmụ mmadụ, Jizọs na Chineke biri ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ n’eluigwe.—Gụọ Maịka 5:2; Jọn 17:5.

2. Olee otú Chineke si zite Ọkpara ya n’ụwa?

Jehova si n’eluigwe bufee ndụ Jizọs n’akpa nwa Meri. Ọ bụ ike mmụọ nsọ ya ka o ji mee ya. N’ihi ya, ọ bụghị nwoke tụwara Meri ime Jizọs. N’oge a mụrụ Jizọs, ndị mmụọ ozi gara zie ndị ọzụzụ atụrụ ozi n’abalị na a mụọla Jizọs. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ bi n’ọhịa na-azụ atụrụ ha n’oge e ziri ha ozi ahụ. (Luk 2:8-12) Nke a gosiri na ọ bụghị n’oge oyi kacha atụ n’afọ ka a mụrụ Jizọs, kama ọ ga-abụ ná mbido ọnwa Ọktoba mgbe oge oyi na-ebidobeghị. Meri na di ya bụ́ Josef mechara kpọrọ Jizọs gaa n’ụlọ ha dị na Nazaret ma nọrọ n’ebe ahụ zụọ ya. Josef zụrụ Jizọs, jirikwa ya mere nwa.—Gụọ Matiu 1:18-23.

Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ, e mere ya baptizim. N’oge ahụ, Chineke kwuru n’ihu ndị mmadụ na Jizọs bụ Ọkpara ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka Jizọs maliteziri ọrụ Chineke dunyere ya ka ọ bịa rụọ n’ụwa.—Gụọ Matiu 3:16, 17.

  3. Gịnị mere Chineke ji zite Jizọs n’ụwa?

Chineke zitere Jizọs ka ọ kụziere ndị mmadụ eziokwu. Jizọs kụziiri ha banyere Alaeze Chineke. Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-eweta udo n’ụwa niile. Jizọs mekwara ka ndị mmadụ mara na ha nwere ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 4:14; 18:36, 37) Jizọs kụzikwaara ha ihe ndị ha ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. (Matiu 5:3; 6:19-21) Ihe Jizọs mere abụghị soro okwu ọnụ m, esola omume m. Dị ka ihe atụ, o gosiri otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke, ma n’oge anyị nọ n’ahụhụ. Mgbe e mere ya ihe na-adịghị mma, o megwaraghị.—Gụọ 1 Pita 2:21-24.

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri obi ha niile na-ahụ ndị ọzọ n’anya. N’agbanyeghị na ọkwá ya dị elu n’oge ya na Nna ya nọ n’eluigwe, o rubeere Nna ya isi ma bịa n’ụwa ka ya na ụmụ mmadụ biri. Nke a gosiri na ọ dị umeala n’obi. O nweghị mmadụ ọ bụla hụrụ anyị n’anya otú Jizọs si hụ anyị n’anya.—Gụọ Jọn 15:12, 13; Filipaị 2:5-8.

4. Olee uru ọnwụ Jizọs baara anyị?

Ihe ọzọ mere Chineke ji zite Jizọs bụ ka ọ nwụọ n’ihi mmehie anyị. (Jọn 3:16) Anyị niile bụ ndị mmehie. Ihe nke a pụtara bụ na anyị na-eme mmehie, bụrụkwa ndị na-ezughị okè. Ọ bụ ya mere anyị ji arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ. Ma nwoke mbụ bụ́ Adam zuru okè. Ebe ọ bụ na Adam enweghị mmehie, ọ gaghị anwụ ma ọ bụkwanụ rịa ọrịa. Ma, ọ ghọrọ onye na-ezughị okè mgbe o nupụụrụ Chineke isi. Anyị si n’aka Adam keta mmehie, mmehie mekwara ka anyị na-anwụ anwụ.—Gụọ Ndị Rom 5:12; 6:23.

Jizọs zuru okè, n’ihi ya, ọ nwụghị maka na o mere mmehie. Ọ bụ mmehie anyị mere o ji nwụọ. Ọnwụ Jizọs ga-eme ka anyị dị ndụ ebighị ebi, meekwa ka Chineke gọzie anyị.—Gụọ 1 Pita 3:18.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 4 na nke 5 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.