Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

 Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE otú ndụ otu nwa agbọghọ nke na-enweghị mmasị n’ebe Chineke nọ si jiri ndụ ya mewe ihe bara uru ugbu a? Gịnị ka otu nwa okorobịa onye Katọlik mụtara banyere ọnwụ nke mere ka ndụ ya gbanwee? Gịnịkwa ka otu nwa okorobịa bụ́ onye ike ụwa gwụrụ mụtara banyere Chineke nke mere ka ọ ghọọ Onye Kraịst na-ekwusa ozi ọma? Gụọ ihe ha kwuru.

“Kemgbe ọtụtụ afọ, m na-eche, sị, ‘Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ n’ụwa a?’”​—ROSALIND JOHN

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1963

ABỤ M ONYE: BRITEN

NDỤ M BIRI: ENWERE M EZIGBO ỌRỤ M NA-ARỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo a na-akpọ Krọịdọn nke dị n’ebe ndịda Lọndọn. Abụ m nwa nke isii n’ụmụ itoolu nne na nna m mụrụ. Nne na nna m si n’otu obodo a na-akpọ Sent Vinsent nke dị na Karibian bịa biri na Lọndọn. Mama m na-ekpe chọọchị Metọdist. Ma, enweghị m mmasị ịmụ banyere Chineke n’agbanyeghị na ọ na-agụ m agụụ mgbe niile ịmụta ọtụtụ ihe m na-amaghị. Mgbe ọ bụla anyị mechiri akwụkwọ, m na-agakarị n’akụkụ ọdọ mmiri e nwere n’ebe anyị bi nọrọ na-agụ ọtụtụ akwụkwọ m wetara n’ọ́bá akwụkwọ.

Afọ ole na ole m gụchara akwụkwọ, ọ bịara gụsiwekwuo m agụụ ike inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. N’ihi ya, m bidoro ịrụ ọrụ. Ihe m na-arụ bụ inyere ndị na-enweghị ụlọ, ndị nwere nkwarụ, na ndị ụbụrụ ha na-anaghị aghọcha nkọ aka. Ka m na-arụ ọrụ ahụ, m banyere mahadum ka m gụọ ihe gbasara ahụ́ ike. Mgbe m gụchara, e buliri m n’ọkwá ọtụtụ ugboro karịa ka m tụrụ anya ya. M bịaziri kporiwe ndụ karịa otú m na-ekporibu. Ebe ọ bụ na m bụzi ọga nke onwe m, ndị mmadụ na-achọ m abịa, mụ ana-arụrụ ha ọrụ. Ihe m ji arụ ọrụ m bụ naanị kọmputa na Ịntanet. M na-aga mba ọzọ nọọ ọtụtụ izu. Mgbe ọ bụla m gara, m na-anọ na họtel mara mma kporie ndụ ma gwuo egwuregwu ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie m ike. Echere m na ihe ndị ahụ bụ ihe kacha mma m nwere ike iji ndụ m na-eme. Ma n’oge niile ahụ, m na-echeta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Kemgbe ọtụtụ afọ, m na-eche, sị, ‘Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ n’ụwa a? Gịnịkwa bụ isi ndụ a m dị?’ Ma o nweghị mgbe m gụrụ Baịbụl ka m mata azịza ha. Otu ụbọchị n’afọ 1999, Margaret bụ́ nwanne m nwaanyị nke m tọrọ na otu enyi ya nwaanyị bịara n’ụlọ m. Ha abụọ bụ Ndịàmà Jehova. Enyi ya nwaanyị ahụ nwere nnọọ mmasị n’ebe m nọ. Mgbe m na-amala ihe na-emenụ, m kwetara ka ọ kụziwere m Baịbụl. Ma ọrụ ahụ m na-arụ na otú m si na-ebi ndụ mere ka m ghara inwecha ohere ka anyị na-amụ Baịbụl.

N’afọ 2002, akwagara m ebe ọzọ n’Ingland. N’ebe ahụ, m banyeghachiri mahadum ka m nwee ike inweta akara ugo kachanụ a na-enweta na mahadum. Mụ na obere nwa m nwoke malitekwara ịga ọmụmụ ihe mgbe niile n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na akwụkwọ ahụ m na-agụ na mahadum na-atọ m ụtọ, ma ihe m na-amụta na Baịbụl ka ya mma n’ihi na o mere ka m ghọtakwuo ihe kpatara anyị ji enwe nsogbu  n’ụwa na otú nsogbu ndị ahụ ga-esi akwụsị. M bịara ghọta na ihe e kwuru na Matiu 6:24 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị na mmadụ enweghị ike ịbụ ohu nna ukwu abụọ. Ọ bụrụ na onye ahụ abụghị ohu Chineke, ya abụrụ ohu nke akụnụba. Ama m na m kwesịrị ikpebi ihe ndị ka mkpa m ga-eji ndụ m na-eme.

N’afọ 2001, tupu mụ akwaga ebe m bizi, m na-esokarị Ndịàmà Jehova aga otu n’ime ọmụmụ ihe ha. N’oge ahụ, akwụkwọ a na-amụ n’ọmụmụ ihe ahụ bụ Is There a Creator Who Cares About You? * [È Nwere Onye Okike nke Hụrụ Gị n’Anya?] Ọ bịara doo m anya na ọ bụ naanị onye kere anyị, bụ́ Jehova, ga-akwụsịli nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe. Ma ugbu a m banyeghachiri mahadum, ihe a na-akụziri m bụ na ọ bụghị ikwere na Chineke ga-eme ka ndụ mmadụ nwee isi. Ihe a ha na-ekwu were m ezigbo iwe. Mgbe ọnwa abụọ gafere, m kwụsịrị ịga mahadum ahụ ma kpebie na m ga-ejizi ofufe Chineke kpọrọ ihe.

Otu ebe m gụrụ na Baịbụl nke mere ka m gbanwee otú m si ebi ndụ bụ Ilu 3:5, 6. Ebe ahụ kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” Uru m na-erite ugbu a m na-amụ banyere Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, karịrị ihe ọ bụla akara ugo kachanụ a na-enweta na mahadum gaara enye m, ya bụ, ma akụnụba ma ùgwù ndị mmadụ ga na-akwanyere m. Ka m na-amụtakwu ihe bụ́ uche Jehova banyere ụwa a na ihe Jizọs meere anyị nke bụ́ iji ndụ ya chụọ àjà maka anyị, ọ bịara na-agụsikwu m agụụ ike inyefe Onye kere anyị ndụ m. E mere m baptizim n’Eprel 2003. Mgbe e mechara m baptizim, eji m nwayọọ nwayọọ hapụ ihe ụfọdụ na-adịghị mkpa m na-emebu.

URU NDỊ M RITERELA: Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ na mụ na Jehova bụ enyi. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ya. Ugbu a m matara onye ọ bụ, obi eruola m ala. Ihe ọzọkwa na-eme ka obi na-atọ m ụtọ bụ na mụ na ndị na-efe ezi Chineke na-akpakọrịta.

Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl nakwa n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enyere m aka ịmata ọtụtụ ihe na-agụ m agụụ ịmata. Ọ na-atọ m ụtọ ịkụziri ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. Ọ bụ ya bụ isi ihe m ji ndụ m na-eme. M jikwa ya na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mụta ịkpa ezi àgwà ma nwee olileanya ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke. Kemgbe ọnwa Jun afọ 2008, m na-ekwusa ozi ọma oge niile. M na-enwe obi ụtọ ugbu a karịa mgbe mbụ, ihe m nwere na-ezuru m. E ji m ndụ m na-eme ihe bara uru ugbu a. Ana m ekele Jehova na o meela ka ndụ m nwee isi.

‘Ọnwụ enyi m nwoke wutere m nke ukwuu.’​—ROMAN IRNESBERGER

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1973

ABỤ M ONYE: ỌSTRIA

NDỤ M BIRI: ANA M AGBA CHAA CHAA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’otu obere obodo dị n’Ọstria. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ bara ọgaranya, ihe ọjọọ adịchaghịkwa na ya. Papa m na mama m bụ ndị Katọlik, ha na-akpọkwa m aga chọọchị.

E nwere otu ihe mere mgbe m dị obere. Ihe ahụ kpara m aka ọjọọ. N’ehihie otu ụbọchị, n’afọ 1984, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na otu, mụ na otu ezigbo  enyi m gara gbaa bọl. Ma n’ehihie ahụ, enyi m ahụ nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala. Ọnwụ ya wutere m nke ukwuu. Ọtụtụ afọ ihe ahụ mechara, m ka nọ na-eche ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.

Mgbe m gụchara akwụkwọ, m bidoro ịrụ ọrụ. M malitere ịgba chaa chaa, ya abịa rie m ahụ́. N’agbanyeghị na o riri m ahụ́ nakwa na m na-eji nnukwu ego agba ya, ego anaghị akọ m. Oge m na-eji egwu egwuregwu karịrị akarị, m bịakwara nwee mmasị n’egwú rọk. Kwa abalị, m na-aga n’ebe a na-akụ egwú nakwa n’ụlọ oriri na nkwari. Naanị ihe m na-eme bụ ikpori ndụ na ibi ndụ rụrụ arụ. N’agbanyeghị ihe ndị a, anaghị m enwe obi ụtọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1995, otu agadi nwoke bụ́ Onyeàmà Jehova bịara ozi ọma n’ụlọ m ma nye m otu akwụkwọ. Akwụkwọ ahụ kọrọ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ahụ na-enye m nsogbu n’obi, nke bụ́, Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? Anatara m ya akwụkwọ ahụ ebe ọ bụ na ọnwụ enyi m nwoke ahụ ka na-ewute m. M gụchara akwụkwọ ahụ, ma ebe kwuru gbasara ọnwụ ma ebe kwuru ihe ndị ọzọ.

Ihe m gụrụ n’akwụkwọ ahụ zara ajụjụ ndị ahụ m na-ajụ gbasara ọnwụ. Ma, m mụtakwuru ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ ahụ. Ebe ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị bụ ndị Katọlik, ọ bụ naanị Jizọs ka m kweere na ya. Ma, Baịbụl ahụ m na-amụ mere ka m kwerekwa na Jehova Chineke bụ́ Nna Jizọs, meekwa ka mụ na ya ghọọ ezigbo enyi. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara na Jehova chọrọ ka anyị mara onye ọ bụ, o nweghịkwa ihe ọ na-ezoro ndị chọrọ ife ya. (Matiu 7:7-11) Amụtara m na àgwà anyị nwere ike ime Chineke obi ụtọ ma ọ bụ wute ya. Amụtakwara m na Jehova anaghị agha ụgha, ọ na-emezu ihe niile o kwuru. Nke ahụ mere ka m nwee mmasị n’amụma ndị dị na Baịbụl. M mekwara nchọpụta ka m mata otú amụma ndị ahụ si na-emezu. Ihe ndị m chọpụtara mere ka m nwekwuo okwukwe na Chineke.

N’oge na-adịghị anya, o doro m anya na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ka ha nyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta Baịbụl. Ọ na-abụ m hụ amaokwu Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova, m na-eji Baịbụl ndị Katọlik m gụọ ha. Ka m na-emekwu nchọpụta, ọ bịara na-edokwu m anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu.

Baịbụl ahụ m na-amụ mere ka m ghọta na Jehova chọrọ ka m na-erubere ya isi. Ihe ndị m gụrụ ná Ndị Efesọs 4:22-24 mere ka m ghọta na m kwesịrị ‘iyipụ mmadụ ochie m,’ nke ‘kwekọrọ n’ụzọ m si eme omume n’oge gara aga’ nakwa na ‘m kwesịrị iyiri mmadụ ọhụrụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị.’ Nke ahụ mere ka m kwụsị ime omume rụrụ arụ. M bịakwara chọpụta na m kwesịrị ịkwụsị ịgba chaa chaa n’ihi na ịgba chaa chaa na-eme ka mmadụ bụrụ onye anyaukwu ma hụ ego n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) M ghọtara na ọ bụrụ na m ga-akwụsị ihe ọjọọ ndị ahụ, m kwesịrị ịhapụ ndị enyi ochie m ma nweta ndị enyi ọhụrụ, bụ́ ndị mụ na ha na-efe Chineke.

O siiri m ike ịkwụsị ihe ndị ahụ. Ma amalitere m ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’ụlọ nzukọ ha ma nweta ndị enyi ọhụrụ n’ebe ahụ. N’oge ahụ, m ka nọkwa na-amụsi Baịbụl ike n’onwe m. Mbọ niile ahụ m gbara mere ka m kwụsị ige egwú ndị na-adịghị mma m na-ege, hapụ ihe ụfọdụ m chọrọ ime ná ndụ ma malite iji ejiji dị mma. N’afọ 1995, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Abụkwaghị m onye anyaukwu ugbu a, m kwụsịkwala ịhụ ego n’anya. Ana m ewebu iwe ọkụ, ma ugbu a  anaghịzi m eme otú ahụ. Anaghịzi m echegbu onwe m maka echi.

Obi dị m ụtọ na m sorola ná ndị na-efe Jehova n’ụwa niile. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n’ime ha nwere nsogbu ndị ha na ha na-alụ, ma ha ka ji obi ha niile na-efe Chineke. Obi dị m ezigbo ụtọ na m ji ike m niile na oge m niile na-efe Jehova ma na-enyere ndị ọzọ aka, ọ bụghị ime ihe masịrị m.

“Ndụ m enweela isi ugbu a.”​—IAN KING

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1963

ABỤ M ONYE: INGLAND

NDỤ M BIRI: IKE ỤWA GWỤRỤ M

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’Ingland. Ma ezinụlọ anyị kwagara Ọstrelia mgbe m dị ihe dị ka afọ asaa. Ebe anyị gara biri n’Ọstrelia bụ na Gold Kost, nke dị na Kwinsland. Ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche abịa elegharị anya na Gold Kost. Ọ bụ eziokwu na ezinụlọ anyị enwechaghị ego, ma anyị na-eriju afọ.

N’agbanyeghị na anyị na-eriju afọ, anaghị m enwe obi ụtọ. Ike ụwa bịara gwụ m. Papa m bụ onye aṅụrụma. Ahụchaghị m ya n’anya. Ihe kpatara ya bụ oké mmanya ọ na-aṅụ na otú o si emesi mama m ike. Ma emechara m mata ihe mere o ji na-akpa àgwà otú ahụ. Ọ bụ n’ihi ihe ndị mere ya mgbe ọ gara agha na Malaya.

Mgbe m na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndịrị, m bidoro ịṅụbiga mmanya ókè. Mgbe m gbara afọ iri na isii, m hapụrụ ụlọ akwụkwọ ma ghọọ onye agha mmiri. M malitere ịṅụ ọgwụ ike. Ịṅụ sịga na ịṅụ mmanya bịakwara rie m ahụ́. M bịaziri na-aṅụbiga mmanya ókè kwa ụbọchị, ọ bụghị naanị ná ngwụsi izu.

Mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo afọ iri abụọ na mgbe m gbacharala afọ iri abụọ, amalitere m inwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dịkwa. M na-ajụ onwe m, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere o ji hapụ ndị mmadụ ka ha na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ?’ E nwedịrị mgbe m dere uri. Edere m n’uri ahụ na ọ bụ Chineke kpatara ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa.

Mgbe m dị afọ iri abụọ na atọ, m kwụsịrị ọrụ agha mmiri ahụ m na-arụ. Arụziri m ọrụ n’ebe dị iche iche, mechaakwa gaa mba ọzọ nọọ otu afọ. Ma ihe ndị a emeghị ka m nwee obi ụtọ. O nweghị ihe na-amasị m iji ndụ m eme. O nweghịkwa ihe na-adị m mma. Ọ na-adị m ka mmadụ ịgbalịwa ka ọ rụta ụlọ, nwee ezigbo ọrụ, e buliekwa ya n’ọkwá abaghị uru ọ bụla. Naanị ihe m ga-asị na-enye m obi ụtọ bụ ịṅụ mmanya na ige egwú.

Echetara m ihe mere otu ụbọchị nke mere ka m nwee mmasị ịmata ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ. Anọ m na Pọland n’ụbọchị ahụ. M gara ịhụ otu ụlọ mkpọrọ a ma ama dị n’Aụchwits bụ́ ebe a nọ mekpọọ ọtụtụ mmadụ ọnụ n’oge gara aga. Agụọla m banyere arụ niile a kpara n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’akwụkwọ. Ma mgbe m ji anya m abụọ hụ otú ụlọ mkpọrọ ahụ hà, echetara m  ihe niile m gụrụ n’akwụkwọ, ya ewute m nke ukwuu. Aghọtaghị m ihe mere ndị mmadụ ga-eji kpọchie obi mekpọọ ụmụ mmadụ ibe ha ọnụ otú ahụ. Ka m nọ na-agagharị n’ụlọ mkpọrọ ahụ, anya mmiri nọ na-agba m, mụ ana-ajụ onwe m ihe mere ndị mmadụ ji kpaa arụ niile ahụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m si mba ọzọ lọta n’afọ 1993, amalitere m ịgụ Baịbụl ka m mata azịza nke ajụjụ ndị ahụ m na-ajụ onwe m. Obere oge m malitere ịgụ Baịbụl, Ndịàmà abụọ bịara ozi ọma n’ụlọ m. Ha gwara m ka m bịa mgbakọ ha nke a ga-eme n’otu ámá egwuregwu dị nso n’ebe m bi. M mechara gaa.

Ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, agara m kirie otu egwuregwu n’ámá egwuregwu ahụ. Ma ihe m hụrụ ná mgbakọ Ndịàmà Jehova ahụ dị iche n’ihe m hụrụ mgbe m gara kirie egwuregwu n’ebe ahụ. Ndịàmà Jehova jikeere nke ọma bịa mgbakọ ahụ, ihu bụkwa ha ọchị ọchị, ụmụaka ha kpakwara àgwà ka ndị a zụrụ azụ. Ihe juru m anya bụ ihe mere n’oge nri ehihie. Ọtụtụ n’ime ha nọ n’ebe a na-agba bọl rie nri ha. Ma mgbe ha laghachiri n’oche ha, ahụghị m iberibe nri ọ bụla n’ebe ahụ ha nọ rie nri. Ihe kacha ju m anya bụ na o yiri ka o nweghị onye nwere nsogbu n’ime ha, ahụ́ rukwara ha niile ala. Ọ bụ ụdị ndụ a ka m chọkwaranụ ibi. Agaghị m echetali ihe ndị e kwuru n’ụbọchị ahụ, ma o nweghị ihe ga-eme ka m chefuo àgwà ọma ha kpara.

Ná mgbede ụbọchị ahụ, echetara m otu nwa nwanne nna m, bụ́ onye gụrụla Baịbụl, gụọkwa banyere okpukpe dị iche iche. Afọ ole na ole gara aga, ọ gwara m na Jizọs kwuru na ihe e ji amata ezigbo okpukpe bụ mkpụrụ ha na-amị ma ọ bụ àgwà ha. (Matiu 7:15-20) Ihe a mere ka m gwa onwe m na m kwesịrị ịchọpụta ihe mere Ndịàmà Jehova ji dị iche. Oge ahụ bụ oge mbụ m bịara nwetụwa olileanya ná ndụ.

N’izu na-eso ya, Ndịàmà Jehova abụọ ahụ bịaghachiri n’ụlọ m. Ha gwara m ka mụ na ha mụwa Baịbụl, m kwetakwara. M malitekwara ịga ọmụmụ ihe ha.

Mgbe m mụwara Baịbụl, m bịara mata na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa na ahụhụ ndị mmadụ na-ata. M mụtakwara na ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme na-ewute ya. (Jenesis 6:6; Abụ Ọma 78:40, 41) Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebisiri ike na agaghị m eme ihe ọ bụla ga-ewute ya. M chọziri ime ihe ga-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọ bụ ya mere m ji kwụsị ịṅụ oké mmanya na ịṅụ sịga. M kwụsịkwara ime omume rụrụ arụ. N’ọnwa Mach afọ 1994, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Obi adịla m ụtọ ugbu a. M nwee nsogbu ugbu a, ihe m na-eme abụghị ịga ṅụọ mmanya ka m chefuo nsogbu m. Kama, ihe m na-eme bụ ịkọsara ya Jehova.—Abụ Ọma 55:22.

Ihe a bụ afọ iri m lụrụ otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Karen. Karen bụ asampete. Anyị nwekwara ezigbo nwata nwaanyị anyị ji mere nwa. Aha ya bụ Nella. Anyị atọ na-aga ekwusa ozi ọma mgbe niile, na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mụta eziokwu banyere Chineke. Ndụ m enweela isi ugbu a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma e nweghị ya n’asụsụ Igbo.