Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?

Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?

 Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?

E NWERE otu nwata nwoke aha ya bụ Ian. Papa ya bụ onye aṅụrụma. N’agbanyeghị na ha nwere ego, e nwere ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Papa ya anaghị achọ ịma otú obi dị ya. Ian kwuru, sị: “Ahụchaghị m papa m n’anya. Ihe kpatara ya bụ oké mmanya ọ na-aṅụ na otú o si emesi mama m ike.” Mgbe Ian na-eto, ọ malitere inwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dịkwa. Ọ sịrị: “M na-ajụ onwe m, ‘Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere o ji hapụ ndị mmadụ ka ha na-ata ahụhụ?’”

Gịnị mere ndị mmadụ ji ajụ ajụjụ a? Ọ bụrụgodị na i nwechaghị nsogbu ugbu a, o nwere ike ịna-ewute gị ma ị hụ ebe ndị ọ na-enweghị ihe ha mere na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Ma mgbe ajụjụ ahụ Ian jụrụ na-akacha eru ndị mmadụ n’ahụ́ bụ mgbe ha nọ n’ahụhụ ma ọ bụ mgbe onye ha hụrụ n’anya rịawara ọrịa ma ọ bụkwanụ nwụọ.

Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ekwu? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ bụ ka ọ nwaa anyị ọnwụnwa, kụziere anyị ihe ma mee ka isi jụọ anyị oyi. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ bụ mmehie ha mere n’ụwa ha mbụ.

Gịnị ka ihe ahụ ha na-ekwu pụtara? Ọ bụrụ na ihe ahụ ha na-ekwu bụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na Chineke achọdịghị ịma ma ànyị na-ata ahụhụ. Ọ pụtakwara na anyị enweghị ike ịhụ Chineke n’anya n’ihi na obi tara ya mmiri.

Gịnị ka Baịbụl na-akụzi? Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, ‘Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.’ Nke a abụghị eziokwu. N’ihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.” (Jems 1:13, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) N’eziokwu, mmadụ ekwesịdịghị ikwu na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi na ụdị onye Baịbụl gwara anyị na Chineke bụ gosiri na Chineke agaghị emeli ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Otu n’ime àgwà Chineke nwere bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Iji gosi anyị otú Chineke hụruru anyị n’anya, Baịbụl ji Chineke tụnyere nwaanyị na-enye nwa ara. Chineke kwuru, sị: “Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere? Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu,  ma mụ onwe m agaghị echefu gị.” (Aịzaya 49:15) Ì chere na nwaanyị na-enye nwa ara ga-ama ụma merụọ nwa ya ahụ́? Kama ime otú ahụ, ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime ka nwa ya kwụsị ịta ahụhụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. Ọ naghị eme ka ndị ọ na-enweghị ihe ha mere taa ahụhụ.—Jenesis 18:25.

N’agbanyeghị na Chineke hụrụ anyị n’anya, ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ka na-ata ahụhụ. I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, bụrụkwa onye kacha ike, gịnị mere na o wepụbeghị ihe ndị ahụ na-eme ka anyị na-ata ahụhụ?’

E nwere ezigbo ihe ndị mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ. Ka anyị leba anya n’otu n’ime ha: Ọ na-abụkarị ndị mmadụ na-akpatara ibe ha ahụhụ. Ọtụtụ ndị obi tara mmiri na-emesi ndị ọzọ ike, ha achọghịkwa ịgbanwe àgwà ọjọọ ha. N’ihi ya, otu ihe Chineke ga-eme nke ga-eme ka ahụhụ kwụsị bụ na ọ ga-ebibi ndị na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ.

Pita onyeozi kwuru ihe mere Chineke na-ebibibeghị ndị na-eme ihe ọjọọ. Ọ sịrị: “Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Ndidi Jehova Chineke na-enwere anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-emere anyị ebere.

N’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ. Ọ ga-eji ‘mkpagbu kwụọ ndị na-akpagbu ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ụgwọ.’ Ndị na-emesi ndị ọzọ ike “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke bụ́ mbibi ebighị ebi.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9.

Ian, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a, mechara mụta ihe mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ. Ihe ndị ahụ ọ mụtara mere ka obi ruo ya ala, meekwa ka ndụ ya gbanwee. Gụọ akụkọ ya na peeji nke 13 n’Ụlọ Nche a.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ na ihe ọ ga-eme ka ahụhụ kwụsị, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? I nwere ike ịdanlodu ya n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org

[Igbe dị na peeji nke 9]

Gịnị Ka Jizọs Kwuru Banyere Ahụhụ Ndị Mmadụ Na-ata?

Jizọs ekwughị na ọ bụ Chineke kpatara ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’oge ọ nọ n’ụwa. Kama nke ahụ, lee ihe ndị o mere.

Jizọs gosiri na Chineke anaghị ata ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ahụhụ. Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa, mee ka ndị ngwọrọ jewe ije, meekwa ka ndị ìsì hụ ụzọ. (Matiu 15:30) E nwere ihe abụọ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-akụziri anyị. Nke mbụ bụ na Jizọs ji ike Chineke nyere ya mee ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata belata. O jighị ya kpatara ndị mmadụ ahụhụ. Nke abụọ bụ na Jizọs agwọghị ndị mmadụ iji mezuo iwu, kama ọ bụ ‘ọmịiko ọ na-enwe’ ma ya hụ ndị ahụ́ na-adịghị mere o ji gwọọ ha. (Matiu 20:29-34) Otú ahụ obi na-adị Jizọs ma ọ hụ ndị na-ata ahụhụ bụkwa otú ọ na-adị Nna ya. N’ihi ya, ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere na-egosi anyị na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-ewute Chineke, ọ na-egosikwa anyị na Chineke chọkwara ime ka ahụhụ kwụsị.—Jọn 14:7, 9.

Jizọs mere ka anyị mata na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-akpata ọtụtụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Jizọs kwuru banyere Setan, sị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.” (Jọn 8:44) Jizọs kwukwara na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ “onye na-achị ụwa a,” kwuokwa na ọ bụ ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.”—Jọn 12:31; Mkpughe 12:9.

Jizọs gwara anyị na ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata ga-akwụsị n’ọdịnihu. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, . . . Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Mgbe Alaeze Chineke bịara, ahụhụ agaghịkwa adị n’ụwa, otú ahụ ọ na-adịghị n’eluigwe.

Ná mkpughe Jizọs kpugheere Jọn onyeozi, ọ gosiri ya otú ihe ga-adịrị ndị mmadụ mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa. N’oge ahụ, Alaeze Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 1:1; 21:3, 4.