Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ma E Nwee Ọdachi

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ma E Nwee Ọdachi

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ma E Nwee Ọdachi

Ebe ọ bụ na ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emezi aghara aghara, na-emebikwa ihe karịa otú ha na-emebu, gịnị ka mmadụ ga-eme? Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime.

Gbaara ọdachi ọsọ. Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” (Ilu 22:3) Ezigbo ndụmọdụ a nwere ike inyere mmadụ aka n’ihe gbasara ọdachi. Ọ bụrụ na e kwuru na ugwu nke dị nso n’ebe i bi ga-agbọpụta ọkụ, ma ọ bụ na a ga-enwe oké idei mmiri ma ọ bụ ajọ ifufe, ị ga-egosi na ị maara ihe ma i si ebe ahụ pụọ gaa n’ebe ọdachi ahụ na-agaghị erute. Ndụ gị karịrị ụlọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ i nwere.

Ụfọdụ ndị nwedịrị ike ikpebi na ha agaghị ebi n’ebe a na-enwekarị ọdachi. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “E nwere ebe ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emekarị. Ebe ndị ahụ adịghịkwa ọtụtụ, ọ bụkwa n’ebe ndị ahụ ka ọtụtụ nnukwu ọdachi ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-eme.” Dị ka ihe atụ, ọdachi na-emekarị n’ebe ndị dị nso n’oké osimiri. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume, ebila n’ebe ọdachi ndị na-emere onwe ha nwere ike ime, ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na i bi n’ebe ahụ, gaa biri n’ebe katụ mma. I mee otú ahụ, ị gaghị ata nnukwu ahụhụ ma e nwee ọdachi.

Buru ụzọ kpebie ihe ị ga-eme. N’agbanyeghị ihe niile i mere, ọdachi ka nwekwara ike ime na mberede n’ebe i bi. Ma, ihe agaghị esichara gị ike ma i buru ụzọ kpebie ihe ị ga-eme ma e nwee ọdachi. Nke a dabakwara n’ihe e kwuru n’Ilu 22:3. I kwesịrị inwe obere akpa ị kwanyere ihe ndị dị mkpa ị ga-eji gbapụ ma e nwee ọdachi. Otu akwụkwọ nke kwuru ihe mmadụ ga-eme ma e nwee ọdachi sịrị na e kwesịrị ịkwanye ihe ndị a n’akpa ahụ: Ọgwụ a na-aṅụ aṅụ na ndị nke e nwere ike ite onye merụrụ ahụ́, mmiri ọṅụṅụ, ihe oriri ndị a gbara ná mkpọ, nakwa akwụkwọ ndị dị mmadụ mkpa, dị ka akwụkwọ ịnshọransị. Ọ ga-adịkwa mma ka gị na ndị ezinụlọ gị kwurịta ụdị ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe unu bi na ihe unu ga-eme ma nke ọ bụla n’ime ha mee.

Gị na Chineke dịrị ná mma. Nke a ga-abara gị uru n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Baịbụl kwuru na Chineke bụ “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile, . . . onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” Amaokwu Baịbụl ọzọ kwuru na ọ bụ “onye na-akasi ndị e wedara n’ala obi.”—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4; 7:6.

N’eziokwu, Chineke maara nnọọ nsogbu ndị na-abịara ndị tụkwasịrị ya obi. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-akasikwa anyị obi n’ụzọ dị iche iche. (1 Jọn 4:8) Chineke ga-enyere gị aka ma ị rịọ ya n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya, ọ bụghị ka ọ rụọrọ gị ọrụ ebube. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike ime ka ndị nọ ná nsogbu cheta ebe ndị ha gụrụ na Baịbụl bụ́ ebe ndị nwere ike ịkasi ha obi ma mee ka ahụ́ ruo ha ala. N’eziokwu, obi nwere ike ịdị ndị na-efe Chineke otú ọ dị eze Izrel, bụ́ Devid, onye kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla, n’ihi na ị nọnyeere m; ọ bụ mkpara gị na mkpanaka gị na-akasi m obi.”—Abụ Ọma 23:4.

Ndị Kraịst na-enyere ibe ha aka. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Onye Kraịst bụ́ onye amụma, nke aha ya bụ Agabọs, kwuru na “oké ụnwụ ga-ada n’elu ụwa dum mmadụ bi; bụ́ ụnwụ nke dara n’oge Klọdiọs.” Oké ụnwụ ahụ kpara ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Judia aka ọjọọ. Gịnị ka Ndị Kraịst nọ n’ebe ndị ọzọ mere mgbe ha nụrụ na ihe na-esiri ụmụnna ha ike? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka o nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.” (Ọrụ 11:28, 29) Ha gbataara ụmụnna ha ọsọ enyemaka n’ihi na ha hụrụ ha n’anya.

N’oge anyị a, ndị na-efe Chineke na-agbatakwara ụmụnna ha ọsọ enyemaka. Ọtụtụ ndị maara na Ndịàmà Jehova na-agbatara Ndịàmà Jehova ibe ha ọsọ enyemaka. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nnukwu ala ọma jijiji kpara mkpamkpa na Chile n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Febụwarị afọ 2010, Ndịàmà Jehova gara ozugbo nyere ndị ọdachi ahụ dakwasịrị aka. Otu nwaanyị nke aha ya bụ Karla, onye mmiri si n’oké osimiri buuru ụlọ ya, kwuru, sị: “Obi tọrọ m ụtọ na [Ndịàmà Jehova ibe m], bụ́ ndị si n’ebe ndị ọzọ, bịara n’echi ya nyere anyị aka. O doro anya na Jehova ji aka ahụ ha nyeere anyị kasie anyị obi. Nke a mere ka ahụ́ ruo m ala, ya edookwa m anya na Jehova hụrụ m n’anya.” Papa nnukwu Karla abụghị Onyeàmà Jehova, mgbe ọ hụkwara ihe merenụ, ọ sịrị: “Ahụtụbeghị m ụdị ihe a na chọọchị anyị, bụ́ nke m kperela ọtụtụ afọ.” Ihe a ọ hụrụ mere ka ọ gwa Ndịàmà Jehova ka ha mụwara ya Baịbụl.

Ọ bụrụ na ị hụrụ Chineke n’anya, ndị ibe gị, bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya, agaghị ahapụ gị ma e nwee ọdachi. Ma, ò nwere mgbe a na-agaghị enwekwa ọdachi n’ụwa a? Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru.

[Foto dị na peeji nke 6]

I kwesịrị inwe obere akpa ị kwanyere ihe ndị dị mkpa ị ga-eji gbapụ ma e nwee ọdachi

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke ga-enyere gị aka ma ị rịọ ya n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya, ọ bụghị ka ọ rụọrọ gị ọrụ ebube

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị Kraịst na-enyere ibe ha aka ma e nwee ọdachi

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ahụ́ bịara ruo m ala, ya edookwa m anya na Jehova hụrụ m n’anya”