Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-achọghị Nsogbu Agbachitere Aha Ọma Ha

Ndị Na-achọghị Nsogbu Agbachitere Aha Ọma Ha

 Ndị Na-achọghị Nsogbu Agbachitere Aha Ọma Ha

IHE ỤMỤ AMAALA RỌSHỊA GA-EBURU N’UCHE: Akụkọ a e bipụtara na magazin a ga-eme ka ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ mara na a naghị ekwe ndị mmadụ kpee okpukpe masịrị ha na Rọshịa. Ụlọ Nche bụ magazin a kacha asụgharị n’ọtụtụ asụsụ ma na-ekesa n’ụwa. A ga-ebipụta magazin a ihe karịrị nde iri anọ. Isiokwu a ga-agbakwa n’otu narị asụsụ na iri asatọ na asatọ. O nwere ike ụfọdụ ndị ọchịchị achọghị ka ụwa niile mara ihe a na-eme Ndịàmà Jehova na Rọshịa. Ma, ihe a Jizọs kwuru ga-emezu: “Ọ dịghị ihe ọ bụla e zochiri nke ọma nke a na-agaghị ekpughe, ọ dịghịkwa ihe nzuzo nke a na-agaghị amata.”—LUK 12:2.

NA Disemba 2009 nakwa Jenụwarị 2010, ụlọikpe abụọ n’ime ụlọikpe ndị kacha elu na Rọshịa kwuru na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ òtù ọjọọ. O yiri ka ihe ndị mere n’oge gara aga hà na-achọ imeghachi. N’oge ndị Kọmunist na-achị Rọshịa, e boro ọtụtụ puku Ndịàmà ebubo na ha bụ ndị iro mba Rọshịa. A chụgara ọtụtụ n’ime ha n’obodo ọzọ, tụọ ụfọdụ mkpọrọ ma kpọga ụfọdụ n’ebe a na-amanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ ike. Mgbe ọchịchị ahụ dara, e kwuru na aka Ndịàmà Jehova dị ọcha. Ọchịchị ọhụrụ nke nọchiri ya kwuru na ha abụghị ndị ọjọọ. * Ugbu a, o yiri ka ụfọdụ ndị hà ekpebisiela ike ịkpọ Ndịàmà Jehova aha ọjọọ ọzọ.

Ná mbido afọ 2009, ndị ọchịchị malitere imegide Ndịàmà Jehova. Naanị na Febụwarị, ndị ọkàiwu gọọmenti mere nnyocha karịrị narị ise n’ebe dị iche iche ná mba ahụ. Gịnị mere ha ji mee nke a? Ọ bụ iji chọpụta iwu ndị a sịrị na Ndịàmà dara. N’ọnwa ndị sochirinụ, ndị uwe ojii gara kpaghasịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nọ na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’ụlọ ụmụnna ha. Ha bukọọrọ akwụkwọ Ndịàmà ahụ na ihe ha ndị ọzọ. Ndị ọchịchị gbaara ndị ọkàiwu si mba ndị ọzọ, bụ́ ndị nọ na-enyere Ndịàmà aka, ụgbọ nwa mkpi ma nye iwu ka ha ghara ịbatakwa ná mba ahụ.

N’Ọktoba 5, 2009, ndị na-ahụ maka ihe ndị a na-esi ná mba  ọzọ ebubata na Rọshịa jichiri akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị e bubatara ná mba ahụ. Ha jichiri ya n’ebe dị nso n’obodo Senti Pitasbọg. E biri akwụkwọ ndị ahụ na Jamanị, e bukwa n’obi ibugara ha ọtụtụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Rọshịa. Ndị a gwara ka ha nyochaa akwụkwọ ndị ahụ bụ ndị na-enyocha ahịa iwu na Rọshịa. Ọ̀ bụ maka gịnị? Otu akwụkwọ si n’aka ndị ọchịchị kwuru na akwụkwọ ndị ahụ e bubatara “nwere ike inwe ihe ndị ga-akpata esemokwu n’etiti okpukpe dị iche iche.”

N’oge na-adịghị anya, nsogbu ahụ a na-enye Ndịàmà Jehova bịara ka njọ. Ụlọikpe Kasị Elu nke Rọshịa nakwa nke Altaị (nke so ná mba Rọshịa) kwuru na ọtụtụ akwụkwọ Ndịàmà na-ebipụta, tinyere magazin a ị na-agụ ugbu a, bụ akwụkwọ ndị òtù ọjọọ. Ndịàmà Jehova tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ndị ahụ, mba dị iche iche n’ụwa tinyekwara ọnụ n’okwu ahụ, ma ihe na-ebenụ ka na-ebekwa! A gbanwebeghị ihe ụlọikpe ndị ahụ kwuru, n’ihi ya, ịtụbata na ikesa akwụkwọ ndị ahụ e ji amụ Baịbụl na Rọshịa megidere iwu.

Olee ihe Ndịàmà ga-eme ná mbọ ndị ahụ a na-agba imebi aha ọma ha na igbochi ha ịrụ ọrụ ha? Olee otú ihe ahụ ụlọikpe ndị ahụ kwuru ga-esi emetụta ikike ụmụ amaala Rọshịa niile nwere ikpe okpukpe masịrị ha?

Ha Mere Ihe Ngwa Ngwa n’Ihi Mmeso Ọjọọ A Na-emeso Ha

Na Fraịdee, Febụwarị 26, 2010, ihe dị ka otu narị puku Ndịàmà Jehova na puku iri isii bi n’ebe niile na Rọshịa malitere ikesa traktị pụrụ iche dị nde iri na abụọ nke isiokwu ya bụ, Could It Happen Again? A Question for the Citizens of Russia (Ò Nwere Ike Ime Ọzọ? Ajụjụ Ụmụ Amaala Rọshịa Ga-aza). Dị ka ihe atụ, n’obodo Usolie-Sibiriskoye dị na Saịberịa, ọtụtụ narị Ndịàmà zukọrọ n’okporo ámá dị iche iche mgbe o ji ọkara gafee elekere ise nke ụtụtụ. Ụfọdụ n’ime ha so ná ndị a chụgara Saịberịa n’afọ 1951 n’ihi okwukwe ha. Ha kesara puku traktị iri abụọ ha ketara, n’agbanyeghị oké oyi na-atụ n’oge ahụ.

Ụfọdụ Ndịàmà Jehova na ndị nta akụkọ nwere nzukọ na Mọsko, bụ́ isi obodo Rọshịa, bụ́ ebe ha nọ mee ka ndị mmadụ mata maka traktị ahụ ha ji ụbọchị atọ kesaa. Otu n’ime ndị a kpọrọ ka ha kwuo okwu ná nzukọ ahụ bụ Maazị Lev Levinson, bụ́ ọkachamara nke si n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ. Ọ kọtụrụ otú e si nye Ndịàmà Jehova nsogbu ma kpagbuo ha na Jamanị n’oge ọchịchị ndị Nazi, nakwa na Sọviet Yuniọn, ma kwuo na ndị ọchịchị mechara kwuo na aka Ndịàmà Jehova dị ọcha. O kwukwara, sị: “Prezident Yeltsin nyere iwu ka okpukpe niile a kpagburu mgbe ọchịchị Kọmunist na-achị Sọviet Yuniọn nwere onwe ha ikpe  okpukpe ha. O kwesịkwara ịbụ na e nyeghachila ha ihe niile a naara ha. Ndịàmà Jehova enweghị ala ma ọ bụ ụlọ nke ha n’oge ndị Kọmụnist na-achị Sọviet Yuniọn nke a ga-asị ka e nyeghachi ha, ma ha nwetaghachiri aha ọma e ji mara ha.”

A na-achọkwa imebi aha ọma ha ọzọ. Maazị Levinson kwuru, sị: “N’otu mba ahụ kwuru na ihe ha mere [Ndịàmà] wutere ha, a malitekwala ịkpagbu ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’enweghị ihe ha mere.”

Traktị ahụ Ha Kesara Metụrụ Ndị Mmadụ n’Ahụ́

Traktị ahụ e kesara ọ̀ rụrụ ihe e bu n’obi kesaa ya? Maazị Levinson kwuru, sị: “Mgbe m na-aga nzukọ ahụ anyị [na ndị nta akụkọ] nwere, m hụrụ ka ndị mmadụ nọ n’ụgbọ okporo ígwè na-agụ akwụkwọ nta ahụ Ndịàmà Jehova kesara na Rọshịa dum taa. . . . Ndị mmadụ nọ ọdụ na-agụ ya, ha jikwa nnọọ obi ha dum na-agụ ya.” * Dị ka ihe atụ, gụọ ihe ndị a merenụ.

Otu agadi nwaanyị bi n’otu obodo dị n’ebe etiti Rọshịa, bụ́ ebe ndị Alakụba bijuru, natara traktị ahụ ma jụọ ihe e dere na ya. Mgbe a gwara ya na ọ na-ekwu banyere ikike ndị mmadụ nwere na Rọshịa ikpebiri onwe ha ihe ha ga na-eme, o tiri mkpu, sị: “Nke bụ́ na e mechaala nwee onye kwulitere ihe ndị a na-emenụ! Ihe mba Rọshịa na-eme n’okwu a bụ ihe ha mere n’oge ọchịchị Kọmunist. Unu emeela nnọọ. Ọrụ unu amaka!”

Otu nwaanyị bi na Cheliabinsk nke e nyere traktị ahụ kwuru, sị: “Anatabuola m traktị ahụ, gụọkwa ya. Akwụ m unu n’azụ. Ọ dịghị okpukpe ọzọ m maara ga-ahazi onwe ha nke ọma otú a ma gbachitere ihe ndị ha kweere. Otú unu si eji ejiji na-adị m mma, unu na-echebakwara ndị ọzọ echiche. O doro anya na unu kwenyesiri ike n’ihe unu kweere. Ọ dị m ka Chineke ọ̀ nọnyeere unu.”

 Na Senti Pitasbọg, a jụrụ otu nwoke nke sịrị na ya anatala traktị ahụ ma ihe ọ gụtara na ya ọ̀ dị ya mma. Ọ sịrị: “Ee. Mgbe m na-agụ ya, akpata oyi wụrụ m n’ahụ́, ebedịrị m ákwá. A tụrụ nne nne m mkpọrọ [n’oge ọchịchị Kọmunist], ọ kọkwaara m ọtụtụ ihe banyere ndị a tụkọrọ ya na ha mkpọrọ. Ọtụtụ ndị n’ime ha bụ ndị omekome, ma e nwekwara ndị aka ha dị ọcha a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Echere m na onye ọ bụla kwesịrị ịma ihe merenụ, n’ihi ya, ihe unu na-eme dị mma.”

Gịnị Ga-eme na Rọshịa n’Ọdịnihu?

Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ maka otú ha si nwere onwe ha na-ekpe okpukpe ha na Rọshịa kemgbe iri afọ abụọ gara aga. Ma, o doro ha anya na ọ dị mfe ịnapụ ha ikike ha nwere ikpe okpukpe masịrị ha. Ka oge na-aga, anyị ga-ama ma aha ọjọọ a a malitere ịkpọ ha ọ̀ na-egosi na Rọshịa ejirikwala nwayọọ nwayọọ na-achọ imegbu ndị mmadụ otú ha mere na mbụ.

Ma, Ndịàmà Jehova ekpebisiela ike na ihe ọ sọkwara ya mee, ha ga-anọgide na-ezisa ozi udo na ozi na-eme ka mmadụ nwee olileanya, bụ́ nke dị na Baịbụl. Traktị ahụ pụrụ iche ha kesara kwuru ihe bụ́ mkpebi ha, sị: “Mmegbu a na-emegbu anyị agaghị emechili anyị ọnụ. Anyị agaghị akwụsị iji akọ na nkwanye ùgwù na-akọrọ ndị mmadụ banyere Jehova Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl. (1 Pita 3:15) Anyị akwụsịghị ime otú ahụ mgbe ọchịchị ndị Nazi nke Jamanị chiri anyị ọnụ n’ala, anyị akwụsịghị n’oge a kacha megbuo ndị mmadụ ná mba anyị, anyị agaghịkwanụ akwụsị ime otú ahụ ugbu a.—Ọrụ 4:18-20.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Awa ole na ole tupu Ndịàmà Jehova na ndị nta akụkọ enwee nzukọ ahụ, ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị na Mọsko malitere ikesa traktị ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

A chụgara Vladimir Litvin (onye dị afọ 81) n’obodo Krasnoyaskii Krayi mgbe ọ dị afọ iri na anọ. N’isi ụtụtụ Fraịdee so n’ụbọchị ndị e kesara traktị ahụ pụrụ iche, o du ụfọdụ Ndịàmà Jehova gaa kesaa ya

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Nikolai Yasinski (onye dị afọ 73) ji obi ya niile soro kesaa traktị ahụ. Ọ jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ eziokwu na ha na-aga ịkpagbu anyị ọzọ ma napụ anyị ikike anyị nwere ife Jehova otú ha meburu?”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Stepan Levitsky (onye dị afọ 85) na nwunye ya, Yelena. A tụrụ Stepan mkpọrọ afọ iri naanị maka na a hụrụ ebe o ji otu magazin Ụlọ Nche

[Igbe dị na peeji nke 19]

 Asambodo E Ji Gosi na Aka Ha Dị Ọcha

Ọ bụ n’afọ 1990 ka a tọhapụrụ Ndịàmà Jehova ikpeazụ a tụrụ mkpọrọ n’oge ọchịchị Kọmunist. Obi tọrọ ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ụtọ mgbe e kwuru na o nweghị ihe ọjọọ ha mere ma nye ha asambodo kwuru na ha “abụghị ndị iro mba Rọshịa,” kama na ha bụ ndị a tara ahụhụ n’agbanyeghị na aka ha dị ọcha. A kpọrọ asambodo ahụ e nyere ha Asambodo E Ji Gosi na Aka Ha Dị Ọcha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Ì Chere na Akwụkwọ Ndị A Bụ Akwụkwọ Ndị Òtù Ọjọọ?

Akwụkwọ ndị a e depụtara n’okpuru bụ ụfọdụ n’ime akwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Ụlọikpe Kasị Elu na Rọshịa kpọrọ akwụkwọ ndị òtù ọjọọ

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible * (nke e sere n’elu)

Bịaruo Jehova Nso

Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?

Mankind’s Search for God *

Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1 *

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

Akwụkwọ ndị a na-agba ndị mmadụ ume ka ha kwanyere Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ùgwù. Ha na-agba ndị na-agụ ha ume ka ha na-eche echiche nke ọma nakwa ka ha na-echebara ihe ụmụ mmadụ chepụtara bụ́ ndị a na-akụziri ha echiche. Ì chere na gọọmenti kwesịrị iti iwu ka mmadụ ghara ịgụ akwụkwọ ndị a?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 35 I nwere ike ịgụ akwụkwọ ndị a n’Ịntanet n’ọtụtụ asụsụ na www.watchtower.org.

^ par. 38 I nwere ike ịgụ akwụkwọ ndị a n’Ịntanet n’ọtụtụ asụsụ na www.watchtower.org.

^ par. 39 I nwere ike ịgụ akwụkwọ ndị a n’Ịntanet n’ọtụtụ asụsụ na www.watchtower.org.

^ par. 40 I nwere ike ịgụ akwụkwọ ndị a n’Ịntanet n’ọtụtụ asụsụ na www.watchtower.org.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Ozi Dị Oké Mkpa

Traktị ahụ bụ́ Could It Happen Again? A Question for the Citizens of Russia mere ka o doo ọhaneze anya na Ndịàmà Jehova abụghị òtù ọjọọ. O mere ka a mata na ihe ndị a na-eme ugbu a iji mebie ọrụ Ndịàmà Jehova yiri ihe ndị mere n’oge gara aga bụ́ ndị mechara kpata mkpagbu ọjọọ a kpagburu Ndịàmà n’oge ọchịchị Kọmunist. Traktị ahụ gwara ndị gụrụ ya ka ha gaa na www.jw-russia.org bụ́ ebe pụrụ iche Ndịàmà debere ihe n’Ịntanet n’asụsụ Rọshịan ka ha matakwuo banyere Ndịàmà Jehova na ọrụ ha na Rọshịa. Traktị ahụ kwukwara ihe onyeisi ala Rọshịa bụ́ Dmitri Medvedev kwuru na vidio e tinyere n’Ịntanet, nke o kwuru n’ụbọchị mba Rọshịa wepụtara maka icheta ndị ọchịchị ha mekpọrọ ọnụ. * Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova ebughị ibu na Sọviet Yuniọn n’oge ahụ, ha so ná ndị ọchịchị Kọmunist chiri ọnụ n’ala.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Igbe dị na peeji nke 21]

 Icheta Ndị E Chiri Ọnụ n’Ala

N’oge na-adịbeghị anya, n’ụbọchị ndị Rọshịa na-echeta ndị e megburu mgbe ọchịchị Kọmunist na-achị Sọviet Yuniọn, onyeisi ala Rọshịa bụ́ Dmitri Medvedev kwuru ihe ndị na-esonụ:

“Taa bụ Ụbọchị Anyị Ji Echeta Ndị Ọchịchị Mba Anyị Chiri Ọnụ n’Ala. . . . Anyị agaghị aghọtacha ụdị ahụhụ ndị mmadụ tara ná mba anyị n’oge ahụ . . . E gbukpọrọ obodo na ndị dị iche iche ná mba anyị. . . . A kpagburu ndị okpukpe dị iche iche. [Anyị ji oge a na-echeta ọtụtụ nde mmadụ e gburu, ya bụ, ndị e gburu n’ekpeghị ha ikpe ma ọ bụ dee n’akwụkwọ na e gburu ha; ndị a chụpụrụ n’ala ha ma kpọga ha n’ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ, napụ ha ihe ndị ruuru ha n’ihi na ha na-arụ ọrụ a sịrị na ọ dị njọ ma ọ bụ n’ihi na ha si n’agbụrụ a kpọrọ agbụrụ ọjọọ. A kpọrọ ma nne ma nna ma ụmụ ha ‘ndị iro mba Rọshịa’ nakwa ‘ndị na-akwado ndị iro mba Rọshịa.’ Ka anyị chebagodịrị ihe a echiche: Ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ n’ihi ahụhụ na ebubo ụgha e boro ha. A napụrụ ha ihe niile ruuru ha, e lighịdị ha otú e kwesịrị isi lie mmadụ. Kemgbe ọtụtụ afọ, e chefuru ha, ya eyie ka ọ dịghị mgbe ha dịrị ndụ.

“O nweghị ezigbo ihe anyị ga-asị mere anyị ji chie ndị mmadụ ọnụ n’ala.”