Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mere Ha Ji Jụ Mesaya Ahụ?

Olee Ihe Mere Ha Ji Jụ Mesaya Ahụ?

 Olee Ihe Mere Ha Ji Jụ Mesaya Ahụ?

MGBE Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị o kwuru tọrọ ìgwè mmadụ dị iche iche ụtọ, ọrụ ebube ndị ọ rụrụ tụkwara ha n’anya. N’ihi ya, ọtụtụ ndị “nwere okwukwe n’ebe ọ nọ” ma kweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma, ma ọ bụ Kraịst. Ha jụrụ onwe ha, sị: “Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke nwoke a na-eme?”—Jọn 7:31.

N’agbanyeghị ọtụtụ ihe akaebe gosiri na Jizọs bụ Mesaya ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị hụrụ Jizọs ma gee okwu ya ekweghị na ya. Ọ dị mwute na ọbụna ụfọdụ ndị kweere na ya na mbụ mechara gbakụta ya azụ. Olee ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji nnọọ jụ ikweta na Jizọs bụ Mesaya ahụ n’agbanyeghị ọtụtụ ihe akaebe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha hụrụ? Ka anyị tụlee ihe ndị kpatara ya, ka anyị na-atụlekwa ha, jụọ onwe gị, sị, ‘Ò nwere ike ịbụ na m ga-eme ụdị ihe ahụ taa?’

Olileanya Ndị A Na-emezughị

Mgbe a mụrụ Jizọs, ọtụtụ ndị Juu nọ na-atụ anya ọbịbịa Mesaya ahụ. Mgbe e ku Jizọs bịa n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ, ndị “na-echere nnapụta Jeruselem” site n’aka Mesaya ahụ e kwere ná nkwa bịara hụ ya. (Luk 2:38) Ka e mechara, ọtụtụ ndị hụrụ ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim nọ na-eche, sị: “Ọ̀ ga-abụ  na ọ bụ ya bụ Kraịst?” (Luk 3:15) Ma, olee ihe ndị Juu dị ndụ na narị afọ mbụ tụrụ anya ka Mesaya ahụ mee?

Ihe ọtụtụ ndị Juu kweere n’oge ahụ bụ na Mesaya ahụ ga-abịa napụta ha n’ọchịchị nchịgbu ndị Rom ma weghachi alaeze Izrel n’ụwa. Tupu Jizọs amalite ozi ya, ọtụtụ ndị ndú a na-akwanyere ùgwù bilitere ma gbaa ndị mmadụ ume ibuso ọchịchị dị n’oge ahụ agha. O nwere ike ịbụ na ihe ndị ikom a mere ka ndị mmadụ nwee atụmanya na-ezighị ezi banyere Mesaya ahụ.

Jizọs dị nnọọ iche n’ebe Mesaya ụgha ndị ahụ nọ. Ọ gbaghị ndị mmadụ ume ime ihe ike kama ọ kụziiri ndị na-ege ya ntị ka ha hụ ndị iro ha n’anya ma na-erubere ndị ọchịchị isi. (Matiu 5:41-44) Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime ya eze, ọ jụrụ. Kama nke ahụ, ọ kụziri na alaeze ya “abụghị nke ụwa a.” (Jọn 6:15; 18:36) N’agbanyeghị nke ahụ, echiche ndị mmadụ nwerela enwe banyere Mesaya ahụ metụtara ha nke ukwuu.

Jọn Onye Na-eme Baptizim ji anya ya hụ, jirikwa ntị ya nụ ihe ebube ndị na-egosi na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. Ma, mgbe a tụrụ Jọn mkpọrọ, o dunyere ndị na-eso ụzọ ya ịjụ Jizọs, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye ahụ nke Na-abịa, ka anyị ga-atụwa anya onye ọzọ?” (Matiu 11:3) Ikekwe, Jọn nọ na-eche ma ọ̀ bụkwa Jizọs bụ Onye Nnapụta ahụ e kwere ná nkwa nke ga-emezu olileanya ndị Juu.

O siiri ndịozi Jizọs ike ịghọta na a ga-egbu Jizọs ma kpọlite ya n’ọnwụ. N’otu oge mgbe Jizọs kọwara na ọ ga-adị mkpa ka Mesaya ahụ taa ahụhụ ma nwụọ, Pita “kpọpụrụ ya n’akụkụ wee malite ịbara ya mba.” (Mak 8:31, 32) N’oge ahụ, Pita aghọtabeghị otú ọnwụ Jizọs ga-esi daba n’ọrụ ya dị ka Mesaya ahụ.

Mgbe Jizọs banyere Jeruselem obere oge tupu Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A. (Oge Anyị), ìgwè mmadụ obi dị ụtọ nabatara ya ma na-eto ya dị ka Eze. (Jọn 12:12, 13) Nke ahụ gbanwere nnọọ ngwa ngwa! N’ime izu ahụ, e jidere Jizọs ma gbuo ya. Mgbe Jizọs nwụchara, mmadụ abụọ na-eso ụzọ ya kwara arịrị, sị: “Anyị nọ na-enwe olileanya na nwoke a bụ onye a kara aka ịnapụta Izrel.” (Luk 24:21) Ọbụna mgbe Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ha ka nọkwa na-eche na Mesaya ahụ ga-ehiwe alaeze n’ụwa. Ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” O doro anya na ndị gere Jizọs ntị nwere olileanya na-ezighị ezi banyere Mesaya ahụ bụ́ ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’obi na n’uche ha.—Ọrụ 1:6.

Mgbe Jizọs laghachichara eluigwe, a wụkwasịkwa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ, ndị na-ezo ụzọ ya ghọtara nke ọma na Mesaya ahụ ga-abụ Eze n’eluigwe. (Ọrụ 2:1-4, 32-36) Ndịozi bụ́ Pita na Jọn ji nkwuwa okwu kwusaa banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs ma rụọ ọrụ ebube dị iche iche iji gosi na Chineke kwadoro ha. (Ọrụ 3:1-9, 13-15) Ọtụtụ puku mmadụ nọ na Jeruselem nabatara ozi ha ma ghọọ ndị kwere ekwe. Ma, nke a adịghị ndị isi ndị Juu mma n’obi. Dị nnọọ ka ha megidere Jizọs, ha megideweziri ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs. Olee ihe mere ndị ndú okpukpe ndị Juu ji jụ Jizọs n’eleghị anya n’azụ?

Ndị Ndú Okpukpe Jụrụ Ya

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, otú ndị okpukpe Juu si eche echiche na otú ha si eme omume adịla nnọọ iche n’ihe Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee na-akụzi. Ndị ndú okpukpe nke oge ahụ—ndị Sadusii, ndị Farisii, na ndị odeakwụkwọ—gbasoro ọdịnala ụmụ mmadụ, jiri ha kpọrọ ihe karịa Okwu Chineke e dere ede. Mgbe mgbe, ha boro Jizọs ebubo na o mebiri Iwu n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube iji gwọọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. Jizọs gbaghara ozizi ha ndị na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ, si otú ahụ gosi na ikike ha na ihe ha na-ekwu, nke bụ́ na Chineke na-akwado ha, enweghị isi. Ma, Jizọs si n’ezinụlọ a na-amaghị ama, ọ gaghịkwa ụlọ akwụkwọ okpukpe ha. Ka a sịkwa ihe mere o ji siere ndị ikom ahụ dị mpako ike ikweta na Jizọs bụ Mesaya ahụ! Esemokwu ndị  ahụ ha na Jizọs nwere kpasuru ha nnọọ iwe nke na ha “gbaara [Jizọs] izu ka ha wee gbuo ya.”—Matiu 12:1-8, 14; 15:1-9.

Ma, olee ihe ndị ndú okpukpe ahụ ga-ekwu banyere ikike Jizọs nwere ịrụ ọrụ ebube? Ha ekwughị na ọ rụghị ọrụ ebube ndị ahụ. Kama nke ahụ, ha kwuluru Chineke ma nwaa ime ka ndị mmadụ ghara inwe okwukwe na Jizọs site n’ikwu na ikike ya si n’aka Setan. Ha kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”—Matiu 12:24.

E nwere ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ mere ha ji jụwaa isi ikweta na Jizọs bụ Mesaya. Mgbe Jizọs kpọlitesịrị Lazarọs n’ọnwụ, ndị ndú nke òtù okpukpe dị iche iche gbarịtara izu ma kwuo, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama? Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ, ndị Rom ga-abịakwa were ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” Ndị ndú okpukpe ahụ gbara izu igbu Jizọs na Lazarọs n’ihi na ha na-atụ ụjọ na ikike ha na ọkwá ha ga-efunahụ ha!—Jọn 11:45-53; 12:9-11.

Ọha na Eze Kpọrọ Ha Asị ma Kpagbuo Ha

Àgwà ndị ndú okpukpe ndị Juu na narị afọ mbụ mere ka ihe siere onye ọ bụla kwetara na Jizọs bụ Mesaya ahụ ike. Ebe ọkwá ha na-ebu ha isi, ha ledara onye ọ bụla nwere okwukwe na Jizọs anya ma kwuo, sị: “Ọ̀ dị otu n’ime ndị na-achị achị ma ọ bụ n’ime ndị Farisii nke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ?” (Jọn 7:13, 48) Ụfọdụ ndị ndú ndị Juu, dị ka Nikọdimọs na Josef onye Arimatia, ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma ha ekweghị ka ndị ọzọ mara n’ihi ụjọ. (Jọn 3:1, 2; 12:42; 19:38, 39) Ndị ndú ndị Juu kpebiri na “ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwupụta na [Jizọs] bụ Kraịst, a ga-achụpụ ya n’ụlọ nzukọ.” (Jọn 9:22) Ọha na eze ga na-eze onye dị otú ahụ eze, na-akwakwa ya emo ma mapụ ya n’iwu.

Mmegide a na-emegide ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọrọ ajọ mkpagbu. N’ihi otú ndịozi ahụ si na-ekwusa ozi ọma n’atụghị ụjọ, ha tara ezigbo ahụhụ n’aka ndị Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu nke ndị Juu. (Ọrụ 5:40) Ndị mmegide boro onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Stivin ebubo ụgha na o kwuluru Chineke. Ndị Sanhedrin mara ya ikpe ọnwụ, a tụgbuokwa ya na nkume. Mgbe nke ahụ gasịrị, “a malitere ịkpagbu ọgbakọ ahụ dị na Jeruselem; a chụsasịrị mmadụ niile n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria, ma e wezụga ndịozi.” (Ọrụ 6:8-14; 7:54–8:1) Aka Sọl, bụ́ onye mechara ghọọ Pọl onyeozi, dị ná mkpagbu a kpagburu Ndị Kraịst, bụ́ nke nnukwu onye nchụàjà na “ìgwè ndị okenye” kwadoro.—Ọrụ 9:1, 2; 22:4, 5.

N’agbanyeghị ọnọdụ ahụ tara akpụ, Ndị Kraịst mụbara n’ike n’ike n’afọ ndị sochiri ọnwụ Jizọs. N’agbanyeghịkwa na ọtụtụ puku mmadụ ghọrọ ndị kwere ekwe, Ndị Kraịst ka dị ole na ole na Palestaịn na narị afọ mbụ. Mmadụ ikwupụta n’ihu ọha na ya bụ onye na-eso ụzọ Kraịst nwere ike ime ka a mapụ ya n’iwu ma ọ bụdị meso ya ihe ike.

Mụta Ihe n’Ihe Mere Ndị Jụrụ Jizọs

Dị ka anyị hụrụla, nghọtahie, nsogbu si n’aka ndị obodo, na mkpagbu mere ka ọtụtụ ndị dị ndụ na narị afọ mbụ ghara inwe okwukwe na Jizọs. Taa, ihe ndị na-ezighị ezi a na-ekwu banyere Jizọs na ozizi ya nwekwara ike ime ka mmadụ ghara inwe okwukwe na Jizọs. Dị ka ihe atụ, a kụzierela ọtụtụ ndị na Alaeze Chineke dị n’obi ha ma ọ bụ na ọ bụ mgbalị ụmụ mmadụ ga-eweta ya. E meela ka ndị ọzọ chewe na nkà mmụta sayensị na nkà na ụzụ ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha, si otú ahụ mee ka ha ghara ịma na ọ dị ha mkpa inwe okwukwe na Mesaya ahụ. Ọtụtụ ndị na-akatọ Baịbụl n’oge a na-ekwu na ihe ndị e dere na  Baịbụl mere n’oge Jizọs na-eje ozi n’ụwa emeghị eme; ha si otú ahụ na-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere na Jizọs bụ Mesaya ahụ.

Ihe ozizi ndị dị otú ahụ rụpụtarala bụ ime ka ọtụtụ ndị ghara ịma ọrụ Mesaya ahụ ma ọ bụ ghara iche na ọ dị mkpa iche banyere ya. Ma, e nwere ihe akaebe ndị na-egosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ taa karịa ka e nwere na narị afọ mbụ, bụ́ ndị ga-enyere ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu aka. Anyị nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru zuru ezu nwere ọtụtụ amụma e buru banyere ihe Mesaya ahụ ga-eme, nweekwa Oziọma anọ dị na Baịbụl kwuru ihe ndị Jizọs mere iji mezuo amụma ndị ahụ. *

Ihe akaebe ndị nwere ike inyere anyị aka ịhọrọ ma ọ bụ ikpebi ihe anyị ga-eme n’okwu a juru eju. Anyị kwesịkwara ime mkpebi ahụ ngwa ngwa. N’ihi gịnị? N’ihi na Baịbụl gosiri na n’oge na-adịghị anya Jizọs, bụ́ Eze Mesaya nke Alaeze Chineke, ga-eme ihe iji wepụ ndị niile na-emebi ụwa ma weta ọchịchị ezi omume nke ga-eme ka ndị niile na-erubere ọchịchị ya isi dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke e mere ka ọ bụrụ paradaịs. (Daniel 2:44; Mkpughe 11:15, 18; 21:3-5) Ọdịnihu a magburu onwe ya nwere ike ịbụ nke gị ma ọ bụrụ na ị gbalịa ịmụ banyere Jizọs ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ ugbu a. Buru okwu ndị a Jizọs ji ọnụ ya kwuo n’obi: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Lee chaatị bụ́ “Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya Ahụ” nke dị na peeji nke 200 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Ị̀ gaara ekwere na Mesaya ahụ ma a sị na ị nọ ndụ n’oge Jizọs?

[Foto dị na peeji nke 21]

Ekwela ka echiche ndị i nwerela enwe gbochie gị ịmụta eziokwu banyere Jizọs