Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Dịrị Ndụ n’Oge Baịbụl Hà Dịrị Ogologo Ndụ Otú E Kwuru na Ha Dịrị?

Ndị Dịrị Ndụ n’Oge Baịbụl Hà Dịrị Ogologo Ndụ Otú E Kwuru na Ha Dịrị?

 Ndị Dịrị Ndụ n’Oge Baịbụl Hà Dịrị Ogologo Ndụ Otú E Kwuru na Ha Dịrị?

JEANNE LOUISE CALMENT nwụrụ n’Ọgọst 4, 1997, n’obodo ya dị na ndịda ebe ọwụwa anyanwụ Frans. Ọ gbara otu narị afọ na iri abụọ na abụọ!

Ọganihu e nwerela na nkà mmụta sayensị, ahụ́ ike, na n’ihe ọmụmụ ndị ọzọ na-enyere ndị mmadụ aka taa ịdịkwu ogologo ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị anaghị anọru otu narị afọ ma ọ bụ nọfee ya. O nwere ike ịbụ ya mere mmadụ ịdị ogologo ndụ ji abụ ihe akụkọ, dị ka nke Oriakụ Calment bụ.

Baịbụl kwuru na n’oge ochie, ndị mmadụ dịrị nnọọ ogologo ndụ karịa otú a na-adị ugbu a, ọ fọrọ obere ka ụfọdụ dịruo otu puku afọ. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ndị mmadụ hà dịrị ogologo ndụ otú ahụ n’oge Baịbụl? Ò kwesịrị ịgbasa anyị taa?

Ndị Dịrị Ogologo Ndụ

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis kwuru banyere ndị ikom asaa dịrị ihe karịrị narị afọ itoolu, a mụkwara ha niile tupu Iju Mmiri nke oge Noa. Ha bụ Adam, Set, Inọsh, Kinan, Jered, Metusela, na Noa. (Jenesis 5:5-27; 9:29) O nwere ike ịbụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị dị ndụ taa amaghị ha, ma ha niile so n’ọgbọ iri mbụ e nwere mgbe e kechara mmadụ. A ma Metusela ama dị ka onye kacha dị ogologo ndụ—ọ gbara narị afọ itoolu na iri isii na itoolu!

Baịbụl kwukwara banyere mmadụ iri abụọ na ise, ma ọ dịkarịa ala, bụ́ ndị dịrị ndụ karịa afọ ole a na-adị taa. Ụfọdụ n’ime ha dịrị narị afọ atọ, narị afọ anọ, ma ọ bụdị narị afọ asaa ma ọ bụ karịa. (Jenesis 5:28-31; 11:10-25) Ma, ọtụtụ ndị chere na ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị dịrị ogologo ndụ otú ahụ bụ akụkọ ifo. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ihe E Dere na Baịbụl Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Ka Ò Mere Eme?

Otu akwụkwọ Ụlọ Ọrụ Max Planck nke Na-eme Nnyocha Banyere Ụba Mmadụ na Jamanị bipụtara kwuru na ndị na-eme  nnyocha chọpụtara na Oriakụ Calment, bụ́ onye a kpọburu aha, ruru afọ ole ahụ e kwuru na ọ dị site n’ịchọpụta na ‘obere ihe ụfọdụ o kwuru bụ eziokwu.’ Ihe ndị ahụ bụ ihe ụfọdụ merenụ bụ́ ndị metụtara ya ma ọ bụ ndị ikwu ya. E jizi ihe o kwuru tụnyere ihe odide obodo, nke ndị ọkàiwu, na nke chọọchị, nakwa isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ na ọnụ a gụrụ ndị mmadụ n’obodo. Ọ dị mma ịmara na ọ bụ ezie na a chọpụtalighị ma ihe niile o kwuru hà bụ eziokwu, ihe akaebe niile e nwere mere ka o doo anya na ọ dịruru afọ ole ahụ.

Olee maka ihe ndị a kọrọ na Baịbụl? È kwesịrị ịtụkwasị ha obi? Eenụ! Ọ bụ ezie na ọ bụghị ihe niile e dere na ya ka a hụrụla n’akwụkwọ ndị ọzọ na-abụghị nke okpukpe, ihe akaebe e nwetara n’akụkọ ihe mere eme, nkà mmụta sayensị, na ngụkọ oge egosila ugboro ugboro na e nwere ike ịtụkwasị ihe e dere na Baịbụl obi. * Nke ahụ ekwesịghị iju anyị anya, n’ihi na Baịbụl n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke na-ekwu eziokwu, ya bụrụgodị na mmadụ niile bụ ndị ụgha.” (Ndị Rom 3:4, Contemporary English Version) N’ezie, ebe Baịbụl bụ akwụkwọ “si n’ike mmụọ nsọ Chineke,” ọ naghị akọ akụkọ ifo.—2 Timoti 3:16.

O doro anya na Mozis, bụ́ onye Jehova Chineke duziri ide akwụkwọ ise mbụ nke Baịbụl, so n’otu n’ime ndị a kacha mara amara na ndị a kacha akwanyere ùgwù kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ. Ndị Juu weere ya dị ka onye nkụzi kachanụ ha nwetụrụla. Ndị Alakụba weere ya dị ka onye amụma kachanụ ha nwetụrụla. Ndị Kraịst weere Mozis dị ka onye obu ụzọ nke Jizọs Kraịst. Ò ziri ezi ikwu na e kwesịghị ịtụkwasị ihe onye a dị mkpa a ma ama dere obi?

Otú E Si Agụ Oge Mgbe ahụ Ọ̀ Dị Iche?

Ụfọdụ ndị ekwuola na otú e si agụ oge n’oge ahụ dị iche nakwa na ihe a kpọrọ otu afọ n’oge ahụ bụ naanị otu ọnwa. Ma, ileru ihe e dere na Jenesis anya ga-eme ka o doo anya na otú e si agụ oge n’oge ahụ bụkwa otú e si agụ ya n’oge a. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ. N’akụkọ Iju Mmiri ahụ, e dere na Iju Mmiri ahụ malitere mgbe Noa dị narị afọ isii, “n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri na asaa n’ọnwa ahụ.” Ọ gara n’ihu ikwu na mmiri ahụ rikpuru ụwa ruo otu narị ụbọchị na iri ise nakwa na “n’ọnwa nke asaa, n’abalị iri na asaa n’ọnwa ahụ, ụgbọ ahụ kwụsịrị n’ugwu Ararat.” (Jenesis 7:11, 24; 8:4) Ya mere, e kwuru na ọnwa ise—malite n’abalị iri na asaa nke ọnwa nke abụọ ruo n’abalị iri na asaa nke ọnwa nke asaa n’afọ ahụ—bụ otu narị ụbọchị na iri ise. O doro anya na ihe ahụ e kwuru na otu afọ bụ otu ọnwa abụtụghị eziokwu.

Ugbu a, ka anyị tụlee ihe atụ nke abụọ. Jenesis 5:15-18 kwuru na Mahalalel mụrụ nwa nwoke mgbe ọ dị afọ iri isii na ise, mgbe ọ mụsịkwara ya, ọ dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri atọ ma nwụọ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri itoolu na ise. Inọk nwa nwa ya mụkwara nwa nwoke mgbe ọ dị afọ iri isii na ise. (Jenesis 5:21) Ọ bụrụ na otu afọ bụ otu ọnwa, ihe ọ pụtara bụ na ndị ikom abụọ ahụ mụrụ nwa mgbe onye nke ọ bụla n’ime ha dị naanị afọ ise! Nke a ò nwere ike ime eme?

Ihe ọmụmụ banyere ihe ndị mgbe ochie kwadoro ihe Baịbụl kwuru banyere ndị dịrị ogologo ndụ. Baịbụl kwuru na nna ochie bụ́ Ebreham bụ onye obodo Ọọ nakwa na o mechara gaa biri na Heran, mechaakwa gaa biri n’ógbè Kenan, kwuokwa na o busoro Kedọlaoma, bụ́ eze Ilam, agha ma merie ya. (Jenesis 11:31; 12:5; 14:13-17) Ihe ndị a chọpụtara egosila na ebe ndị a na ndị ahụ a kpọrọ aha dịrị adị. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie kwukwara banyere otú ala ndị ahụ dị nakwa omenala nke ndị a kpọkọtara ha na Ebreham aha. Ebe ọ bụ na ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru banyere Ebreham mere eme, olee ihe mere a ga-eji nwewe obi abụọ banyere otu narị afọ na iri asaa na ise ọ dịrị ndụ?—Jenesis 25:7.

N’ihi ya, e nweghị ihe mere a ga-eji nyowe ihe Baịbụl kwuru banyere ogologo ndụ ụfọdụ ndị dịrị n’oge ochie enyowe. Ma, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee ihe gbasara m ma ndị ahụ hà dịrị ogologo ndụ otú ahụ ma ọ bụ na ha adịghị?’

 I Nwere Ike Ịdị Ogologo Ndụ Karịa Otú I Chere!

Ogologo ndụ ndị ikom ahụ dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ dịrị na-egosi na ahụ́ mmadụ nwere nnọọ ike ịdịte ndụ aka. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka ndị ọkà mmụta sayensị lebakwuo anya n’ahụ́ mmadụ nakwa n’ụzọ magburu onwe ya e si kee ya, tinyere ikike o nwere idozi onwe ya na ịgwọ onwe ya. Gịnị ka ha chọpụtara? Ha chọpụtara na ahụ́ mmadụ nwere ike ịdịru ebighị ebi. Otu prọfesọ na-akụzi banyere nkà mmụta ọgwụ, bụ́ Tom Kirkwood, kwuru, sị, “[Ihe mere ndị mmadụ ji aka nká] bụ otu n’ime ihe ndị gbara ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike gharịị.”

Ma, ihe kpatara ịka nká agbaghị Jehova Chineke gharịị, ọ bụghịkwa nsogbu ọ na-agaghị akwụsịli. O kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, ka o zuo okè, o zubekwara ka ụmụ mmadụ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dị mwute na Adam kpebiri ịgbakụta Chineke azụ. N’ihi ya, o mere mmehie ma ghọọ onye na-ezughị okè. Ọ bụ nke a bụ nkọwa ahụ gbara ndị ọkà mmụta sayensị gharịị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ mmehie na ezughị okè mere ka anyị na-arịa ọrịa, na-aka nká, ma na-anwụ anwụ.

Ma, nzube Onye Okike anyị hụrụ anyị n’anya agbanwebeghị. Ihe pụrụ iche na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ na o nyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị ka ihe mgbapụta, bụ́ nke megheere ụmụ mmadụ ohere izu okè na ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 15:22) Ezughị okè akpawabeghị ike n’ahụ́ ndị dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ otú ọ na-akpa n’ahụ́ anyị, ọ bụkwa ya mere ha ji dị nnọọ ogologo ndụ karịa ka anyị na-adị n’oge a. Ma, oge anyị a dị nso n’oge nkwa Chineke ga-emezu karịa oge ha. N’oge na-adịghị anya, mmehie na ezughị okè niile dị anyị n’ahụ́ ga-apụcha, ndị mmadụ agaghịkwa na-aka nká ma na-anwụ anwụ.—Aịzaya 33:24; Taịtọs 1:2.

Olee otú ụdị ngọzi ndị ahụ ga-esi ruo gị aka? Echela na nkwa Chineke bụ naanị nrọ. Jizọs kwuru, sị: “Onye na-anụ okwu m ma kwere n’onye ahụ nke zitere m nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 5:24) N’ihi ya, mụọ Baịbụl ma mee ihe ị mụtara na ya eme. I mee otú ahụ, ị na-eṅomi ihe nlereanya nke ndị Pọl onyeozi kwuru banyere ha bụ́ ndị “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19) I nwere ike ijide n’aka na Chineke ahụ nke mere ka ndị a kpọrọ aha na Baịbụl dị ogologo ndụ otú ahụ nwekwara ike ime ka ị dị ndụ ebighị ebi!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe e sere na peeji nke 12]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

1000

969 METUSELA

950 NOA

930 ADAM

900

 

 

 

800

 

 

 

700

 

 

 

600

 

 

 

500

 

 

 

400

 

 

 

300

 

 

 

200

 

 

 

100 MMADỤ OGE A

 

 

 

AFỌ NDỤ