Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Nzuzo I Nwere Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ

Ihe Nzuzo I Nwere Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ihe Nzuzo I Nwere Ike Ịkọrọ Ndị Ọzọ

Ò NWETỤLA mgbe a kọọrọ gị ihe nzuzo?— * E nwere otu m chọrọ ịkọrọ gị. Na Baịbụl, a kpọrọ ya “ihe nzuzo ahụ dị nsọ . . . nke e zoro ezo kemgbe.” (Ndị Rom 16:25) Ná mmalite, ọ bụ naanị Chineke maara “ihe nzuzo ahụ dị nsọ.” Ka anyị hụ otú Chineke si mee ka ọtụtụ ndị mata ihe nzuzo a.

Ka m burugodị ụzọ jụọ gị otu ajụjụ, ị̀ maara ihe “ihe dị nsọ” pụtara?— Ọ pụtara ihe dị ọcha ma ọ bụ ihe pụrụ nnọọ iche. N’ihi ya, a kpọrọ ihe nzuzo ahụ ihe nzuzo dị nsọ n’ihi na o si n’aka Chineke, bụ́ onye dị nsọ. Olee ndị i chere chọrọ ịmata ihe nzuzo a pụrụ iche?— Ọ bụ ndị mmụọ ozi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ na-agụ ndị mmụọ ozi agụụ inyoba anya n’ihe ndị a.” N’ezie, ha chọrọ ịghọta ihe nzuzo a dị nsọ.—1 Pita 1:12.

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o kwuru banyere ihe nzuzo ahụ dị nsọ ma malite ịkọwa ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo dị nsọ nke alaeze Chineke.” (Mak 4:11) Ị̀ hụrụ ihe ihe nzuzo ahụ dị nsọ na-akọ banyere ya?— Ọ bụ banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya!—Matiu 6:9, 10.

Ugbu a, ka anyị hụ otú Alaeze Chineke si bụrụ ihe nzuzo “kemgbe” ruo mgbe Jizọs bịara n’ụwa ma malite ịkọwa ya. Mgbe Adam na Iv mebichara iwu Chineke, a chụpụkwa ha n’ogige Iden, ndị ohu Chineke matara na Chineke ka ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs. (Jenesis 1:26-28; 2:8, 9; Aịzaya 45:18) Ha dere banyere obi ụtọ ndị mmadụ ga-enwe n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa.—Abụ Ọma 37:11, 29; Aịzaya 11:6-9; 25:8; 33:24; 65:21-24.

Chegodị echiche ugbu a banyere Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke. Ị̀ maara onye Chineke họọrọ ịbụ Onye Ọchịchị ahụ?— Ọ bụ Ọkpara Ya, bụ́ Jizọs Kraịst, “Onyeisi Udo.” Baịbụl kwuru, sị: “Ịchịisi ga-adị n’ubu ya.” (Aịzaya 9:6, 7) Mụ na gị ga-enwetarịrị “ihe ọmụma banyere ihe nzuzo dị nsọ nke Chineke, ya bụ, Kraịst.” (Ndị Kọlọsi 2:2) Anyị kwesịrị ịmara na Chineke weere ndụ mmụọ ozi mbụ (Ọkpara ya bụ́ mmụọ) o kere ma tinye ya n’akpa nwa Meri. Ọkpara ahụ, onye bụ́ mmụọ ozi dị ike, bụ onye Chineke zitere n’ụwa ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28; Jọn 3:16; 17:3.

Ma, ihe anyị kwesịrị ịmara banyere ihe nzuzo a dị nsọ abụghị naanị na Chineke ahọrọla Jizọs ka ọ bụrụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Ya. Otu ihe so  n’ihe nzuzo ahụ dị nsọ bụ na ndị ọzọ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ga-esonyere Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ n’eluigwe. Ha ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe!—Ndị Efesọs 1:8-12.

Ka anyị mata aha ụfọdụ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ya na-aga ịkwadebere ha ebe. (Jọn 14:2, 3) Ọ bụrụ na ị gụọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ, ị ga-ahụ aha ụfọdụ ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze Nna ya.—Matiu 10:2-4; Mak 15:39-41; Jọn 19:25.

Ruo ogologo oge, a maghị mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe n’Alaeze ya. Ma ugbu a, anyị maara ole ha dị. Ị̀ maara ole ha dị?— Baịbụl sịrị na ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Nke a sokwa n’ihe nzuzo ahụ dị nsọ.—Mkpughe 14:1, 4.

Ì kwetara na ‘ihe nzuzo a dị nsọ nke alaeze Chineke’ bụ ihe nzuzo kacha mma mmadụ nwere ike ịmata?— Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị gbalịa ịmụta ihe niile anyị nwere ike ịmụta banyere ya, iji nwee ike ịkọwara ndị niile anyị nwere ike ihe ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Olee ihe a kpọrọ ihe nzuzo anyị kwuru okwu ya, oleekwa ihe mere e ji kpọọ ya ihe ahụ?

▪ Olee ihe bụ́ ihe nzuzo a, oleekwa onye malitere ịkụziri ndị mmadụ banyere ya?

▪ Olee ihe ụfọdụ ị mụtara banyere ihe nzuzo a?

▪ Olee otú i nwere ike isi kọwaara enyi gị ihe nzuzo ahụ dị nsọ?

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee ihe i chere ndị mmụọ ozi nọ na-agbalị ịmata?