Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Bụ ‘Onye Na-eme Oké Ihe’ Otú M Si Mata

Chineke Bụ ‘Onye Na-eme Oké Ihe’ Otú M Si Mata

 Chineke Bụ ‘Onye Na-eme Oké Ihe’ Otú M Si Mata

Dị ka Maurice Raj si kọọ

Ezinụlọ anyị na ọtụtụ puku ndị mbịarambịa ndị ọzọ gbara ọsọ ndụ n’otu n’ime oge ndị a kacha kwaa mgbọ n’Agha Ụwa nke Abụọ. Anyị gara ije ọtụtụ ụbọchị n’ime oké ọhịa Bọma, na-ehi ụra n’okpuru osisi n’abalị. Adị m afọ itoolu mgbe ahụ. E kekọtara ihe niile m nwere ma nyawa m ya n’azụ. Ma, ihe a ka bụ mmalite.

IHE A mere n’afọ 1942. Ụwa nọ n’agha, anyị nọ na-agba ọsọ n’ihi ndị agha Japan na-abịa n’ike n’ike. Ọ dịbeghị anya ha batara Bọma, nke a na-akpọzi Mianmaa, ma weghara olulu mmanụ dị na Yenangyaung. Tupu anyị eruo n’ókè India na Bọma, ndị agha Japan chụkwutere anyị ma chụghachi anyị n’obodo anyị.

Mgbe m bụ nwata, anyị bi na Yenangyaung, bụ́ ebe nna m nọ na-arụrụ Ụlọ Ọrụ Bọma Na-egwu Mmanụ ọrụ. Mgbe ndị Japan weghaara Yenangyaung, ụgbọelu ndị Briten tụrụ bọmbụ aghara aghara n’ebe ahụ olulu mmanụ juru. Ọ dị otu mgbe ezinụlọ anyị nọrọ n’olulu abalị atọ ka a na-atụ bọmbụ gburugburu anyị. Anyị mechara jiri ụgbọ mmiri gbaga Sale, bụ́ obodo nta dị n’Ayeyawadi, ma ọ bụ Osimiri Irawadi. Anyị nọzi ebe ahụ ruo mgbe agha ahụ biri, na-ekele Chineke na anyị dị ndụ.

Ọdachi Mere Ka M Mata Eziokwu

A mụrụ nwanne m nwoke nke m tọrọ n’afọ 1945, n’afọ Agha Ụwa nke Abụọ biri. Obi tọrọ nna m ụtọ na ọ mụtara nwa ná nká. Ma, obi ụtọ ya adịteghị aka. Mgbe ọnwa atọ gachara, nwanne m nwoke ahụ nwụrụ. Obi mgbawa gburu nna m n’oge na-adịghị anya nwanne m nwoke ahụ nwụchara.

Ndị enyi anyị, bụ́ ndị chọrọ ịkasi m obi, kwuru na Chineke akpọrọla nna m na nwanne m nwoke ka Ya na ha nọrọ n’eluigwe. Ọ gụsiri m agụụ ike ịgakwuru ha! Ezinụlọ anyị na-ekpe chọọchị Katọlik, bụ́ ebe a kụziiri m banyere okpukpe mgbe m dị obere. A kụziiri m na ndị ụkọchukwu na ndị nọn na-aga eluigwe ozugbo ha nwụrụ, ebe ndị ọzọ na-agatụgodị pọgatrị, bụ́ ebe mmekpa ahụ́ a na-anọ nwa oge, bụ́ ebe a na-asacha ha mmehie ha. Ebe m kpebisiri ike na m ga-agakwuru nna m na nwanne m nwoke, m kpebiri ịga ụlọ akwụkwọ seminarị ndị Katọlik dị na Memio, nke a na-akpọzi Pyin Oo Lwin, nke dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri site n’ebe anyị bi.

Mmadụ ga-agarịrị akwụkwọ iji ruo eruo ịga ụlọ akwụkwọ seminarị. Ebe m si ná mba ọzọ kwabata, ọ bụ naanị afọ abụọ ka m gara ụlọ akwụkwọ. E mechiziri ụlọ akwụkwọ niile n’oge agha ahụ. Ọ bụ eziokwu na ụlọ akwụkwọ mepeghachiri, ihe siiri ezinụlọ anyị ike. Nne m nọ na-elekọta mụ na ụmụnne m abụọ, na-elekọtakwa ụmụaka atọ bụ́ ụmụ nwanne ya nwaanyị nwụrụ anwụ. Ọ zụlighị anyị bụ́ ụmụ nwoke n’ụlọ akwụkwọ.

Deede m gawara ebe o nwetara ọrụ, ma, m dị naanị afọ iri na atọ, o nweghịkwa ezigbo ihe  m ga-arụli. Nwanne nna m, bụ́ Manuel Nathan, bi na Chauk, bụ́ obodo dị nso na Sale. M chere, sị, ‘M hapụ ụlọ anyị, otu onye apụọla ná ndị nne m na-enye nri.’ N’ihi ya, m gawara Chauk ka mụ na nwanne nna m biri.

Amaghị m na nwanne nna m na Ndịàmà Jehova malitere ịkpa n’oge na-adịbeghị anya, ọ na-anụkwa ya ọkụ n’obi ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọhụrụ ndị ọ mụtara na Baịbụl. O ji nwayọọ nwayọọ na-akọrọ m ha, ihe o ji malite bụ ịkọwara m ihe ekpere Nna Anyị Nọ n’Eluigwe, dị ka ndị Katọlik na-akpọ ya, pụtara. Otú e si amalite ya bụ: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị.”—Matiu 6:9, 10, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Nwanne nna m kọwaara m, sị, “Ya mere, Chineke nwere aha. Aha ya bụ Jehova.” O gosiziri m aha Chineke na Baịbụl. M chọrọ ịmụtakwu ihe. Ma, anaghị m agụ ihe nke ọma, ọbụna n’asụsụ obodo anyị bụ́ Tamil. Baịbụl na akwụkwọ e ji amụ Baịbụl nwanne nna m nwere bụkwa Bekee, bụ́ nke m na-amachaghị agụ. N’agbanyeghị na agachaghị m akwụkwọ, m ji nwayọọ nwayọọ na-aghọta ihe Baịbụl na-akụzi. (Matiu 11:25, 26) Abịara m chọpụta na ọtụtụ ozizi a kụziiri m esighị na Baịbụl. Emechara m gwa nwanne nna m, sị: “Deede, ihe a bụ eziokwu!”

Mgbe m dị afọ iri na isii, m malitere ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị m mụtara. N’oge ahụ, e nwere naanị Ndịàmà Jehova iri asaa na asaa na Mianmaa. Mgbe obere oge gafere, Robert Kirk, bụ́ Onyeàmà na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, si n’isi obodo anyị, bụ́ Rangun, nke bụ́zi Yangon, leta nwanne nna m na Chauk. M gwara Robert na mụ enyefeela Jehova onwe m. N’ihi ya, na Disemba 24, 1949, e mere m baptizim n’Osimiri Ayeyawadi, iji gosi na mụ enyefeela Chineke onwe m.

Imeri Ihe Isi Ike

N’oge na-adịghị anya, m kwagara Mandale iji chọta ezigbo ọrụ. Ebumnobi m bụ ịghọ onye ọsụ ụzọ, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma oge niile. Otu ụbọchị, mgbe m na-ekiri egwuregwu bọl, ihe ọdụdọ dọrọ m, dọtuo m n’ala. Amalitere m ịrịa akwụkwụ, n’ihi ya, m laghachikwuuru ndị ezinụlọ m ka ha nwee ike ịna-elekọta m.

Ihe ọdụdọ dọrọ m ruo afọ asatọ, ya dọọ m, ya akwụsị. Mgbe ahụ́ dịtụrụ m mma, m malitere ịrụ ọrụ ego. Ọ bụ ezie na nne m gwara m ka m ghara ịbanye ozi oge niile n’ihi ahụ́ m, otu ụbọchị, m gwara ya, sị: “Agaghịzi m eche. Achọrọ m ịghọ onye ọsụ ụzọ. Jehova ga-elekọta m!”

N’afọ 1957, m kwagara Yangon ma malite ịsụ ụzọ. O juru m anya na ihe ọdụdọ adọghị m ọzọ ruo afọ iri ise ọzọ, ya bụ, afọ 2007. Ugbu a, ọgwụ na-eme ka ọ ghara inye m oké nsogbu. N’afọ 1958, a họpụtara m ịbụ ọsụ ụzọ oge niile, mụ ana-ekwusa ozi ọma otu narị awa na iri ise kwa ọnwa.

Ebe mbụ e kenyere m ikwusa ozi ọma bụ Kionsha, bụ́ otu obodo nta dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Yangon. N’ebe ahụ, e nwere obere ìgwè mmadụ gụrụla akwụkwọ anyị e ji amụ Baịbụl ma chọọ ịmụtakwu Baịbụl. Mgbe mụ na Robert rutere ebe ahụ, ìgwè mmadụ buru ibu zukọtara. Anyị zara ọtụtụ ajụjụ ndị si na Baịbụl ha jụrụ ma gosi ha otú e si eduzi ọmụmụ ihe ná nzukọ anyị. N’oge na-adịghị anya, ụfọdụ n’ime ha sonyeere anyị n’ozi ọma. A gwara m ka m nọrọ n’obodo ahụ. N’ime ọnwa ole na ole, obere ìgwè ahụ ghọrọ ọgbakọ na-eme nke ọma. Taa, e nwere ihe karịrị otu narị Ndịàmà na iri ise n’ebe ahụ.

Mgbe e mechara, aghọrọ m onye nlekọta  na-ejegharị ejegharị, na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche iche na ìgwè dị iche iche nọ n’ebe ọgbakọ na-adịghị na Mianmaa dum. M na-abanye nnukwu ụgbọala, nọrọ n’elu ibu gbaa ọtụtụ kilomita n’okporo ụzọ dị uzuzu uzuzu, jiri ụkwụ gaa n’oké ọhịa, jiri ụgbọ mmiri gafee osimiri dị iche iche, jirikwa ụkwụ gafee ọtụtụ ugwu. Ọ bụ ezie na agbasighị m ike, ahụrụ m na Jehova nyere m ike ịnọgide na-eje ozi.—Ndị Filipaị 4:13.

“Jehova Ga-enyere Gị Aka”

N’afọ 1962, e zigaziri m n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Yangon, bụ́ ebe Robert nyetụrụ m ọzụzụ. N’oge na-adịghị nnọọ anya, ndị ọchịchị nyere iwu ka ndị niile na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ bi na Mianmaa laa, n’ime izu ole na ole, ha niile lara. O juru m anya na e nyere m ọrụ ilekọta alaka ụlọ ọrụ anyị.

Echere m, sị, ‘Olee otú m ga-esi arụli ọrụ a? Agụghị m ezigbo akwụkwọ, ọrụ ahụ edochabeghịkwa m anya.’ Mgbe ọtụtụ ndị tọrọ m hụrụ na ụjọ ji m, ha gwara m, sị: “Maurice, echegbula onwe gị. Jehova ga-enyere gị aka. Anyị niile kwụ gị n’azụ.” Okwu ahụ ha gwara m gbara m nnọọ ume! Mgbe ọnwa ole na ole gafere, m gbakọtara akụkọ ozi mgbaafọ nke ozi ọma anyị kwusara na Mianmaa bụ́ nke ga-apụta na 1967 Yearbook of Jehovah’s Witnesses. N’ime afọ iri atọ na asatọ sochiri ya, m gbakọtara akụkọ ozi mgbaafọ nke ozi ọma e kwusara na Mianmaa. Site n’oge ruo n’oge, ihe ndị merenụ mere ka o doo m anya na Jehova na-eduzi ọrụ anyị n’ezie.

Dị ka ihe atụ, mgbe m tinyeburu akwụkwọ ka m bụrụ nwa amaala Mianmaa, enweghị m narị chat * anọ na iri ise a chọrọ iji nweta akwụkwọ ikike a na-enye ndị bụ́ ụmụ amaala, n’ihi ya, m kpebiri ichere. Otu ụbọchị, mgbe m na-agafe ụlọ ọrụ weburu m n’ọrụ ọtụtụ afọ gara aga, onyeisi ọrụ m mbụ hụrụ m. O tiri mkpu, sị: “Raj, bịa were ego gị. I chefuru ịnara ego e kwesịrị ịkwụ gị mgbe ị gbara arụkwaghị m.” Ọ dị narị chat anọ na iri ise.

Mgbe m hapụrụ ụlọ ọrụ ahụ, echere m echiche banyere ihe niile m nwere ike iji narị chat anọ na iri ise mee. Ma, ebe ọ bụ kpọmkwem ego a chọrọ iji nweta akwụkwọ ikike a na-enye ndị bụ́ ụmụ amaala, echere m na ọ bụ uche Jehova ka m jiri ya nweta ya. Mkpebi ahụ m mere bara ezigbo uru. Ebe m ghọrọ nwa amaala, m nweziri ike ịnọgide n’obodo ahụ, nwere onwe m ime njem, ịtụbata akwụkwọ, rụọkwa ihe ndị ọzọ dị mkpa n’ọrụ ikwusa ozi ọma na Mianmaa.

Mgbakọ Distrikti E Nwere n’Ebe Ugwu

Mgbe ọ na-erula afọ 1969, ọrụ anyị nọ na-enwe ọganihu n’ike n’ike n’obodo Miitkina nke dị n’ebe ugwu Mianmaa, n’ihi ya, anyị kpebiri inwe mgbakọ distrikti n’obodo a. Ma, ihe kacha chee anyị aka mgba bụ inwe ụgbọ njem ga-ebute Ndịàmà niile ga-esi n’ebe ndịda abịa. Anyị kpere ekpere ma rịọ Ụlọ Ọrụ Ụgbọ Okporo Ígwè nke Mianmaa ka ha debere anyị nkebi ụgbọ isii. O juru anyị nnọọ anya mgbe ha kwuru na ha nabatara arịrịọ anyị.

Ka oge na-aga, anyị kwadebere ihe niile dị mkpa maka mgbakọ ahụ. N’ụbọchị a haziri ka ndị ga-abịa mgbakọ ahụ rute, anyị gara n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè n’ehihie, na-atụ anya ka ugbo okporo ígwè ahụ rute mgbe ọ kụrụ elekere abụọ na ọkara nke ehihie. Ka anyị nọ na-eche,  onyeisi ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ nyere anyị ozi teligram nke kwuru, sị: “Anyị ewepụla nkebi ụgbọ okporo ígwè isii ahụ Watch Tower Society rịọrọ ka e nye ha.” Ọ sịrị na ụgbọ okporo ígwè ahụ enweghị ike ịdọkpụ nkebi ụgbọ ndị e tinyekwuru na ya rịa ugwu.

Olee ihe anyị ga-eme? Ihe mbụ batara anyị n’obi bụ iyigharị mgbakọ ahụ. Ma, ihe nke ahụ pụtara bụ itinyeghachi akwụkwọ ikike ọzọ, bụ́ nke ga-ewe ọtụtụ izu! Ka anyị ji obi anyị niile na-ekpegara Jehova ekpere, ụgbọ okporo ígwè ahụ wụchara. Ihe anyị hụrụ tụrụ anyị n’anya—Ndịàmà juru nkebi ụgbọ okporo ígwè isii ahụ niile! Ha nọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-efe aka. Mgbe anyị jụrụ ihe merenụ, otu n’ime ha kọwara, sị, “Ha wepụrụ nkebi ụgbọ okporo ígwè isii, ma ọ bụghị nke anyị!”

N’agbata afọ 1967 na 1971, Ndịàmà nọ na Mianmaa mụbara okpukpu abụọ, ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị isii. N’afọ 1978, e bufere alaka ụlọ ọrụ anyị n’ụlọ elu dị okpukpu abụọ. Mgbe iri afọ abụọ ọzọ gafere, Ndịàmà amụbaala ruo ihe karịrị puku abụọ na narị ise. E wusakwuru alaka ụlọ ọrụ anyị. Na Jenụwarị 22, 2000, John E. Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, si Amerịka bịa kwuo okwu e ji nyefee Jehova ụlọ elu dị okpukpu atọ e ji mere ọfịs na ụlọ obibi nke anyị ka nọ na ya taa.

Icheta Ngọzi Ndị M Nwerela

Taa, mmadụ iri ise na abụọ wepụtara onwe ha ibi ma na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ a dị na Yangon, e nwekwara ihe dị ka puku Ndịàmà atọ na narị ise nọ n’ọgbakọ iri asaa na anọ na n’ígwè dị iche iche ná mba a dum. Obi dị m ụtọ ikwu na n’afọ 1969, tupu ezigbo nne m anwụọ, ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova.

Doris Ba Aye, bụ́ onye ọsụ ụzọ n’otu ọgbakọ dị n’obodo a, ghọrọ onye nsụgharị n’alaka ụlọ ọrụ anyị n’ihe dị ka afọ 1965. Tupu mgbe ahụ, n’afọ 1959, ọ gara klas nke iri atọ na abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụ́ ụlọ akwụkwọ na-azụ Ndịàmà Jehova ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ. Mma ọ mara, àgwà ọma ya, na otú o si jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe mere ka m hụ ya n’anya. Anyị lụrụ n’afọ 1970. Ruo taa, anyị ka hụrụ Jehova na ibe anyị n’anya.

Ruo ihe karịrị iri afọ isii ugbu a, ahụla m otú Chineke si na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma ná mba a. N’ezie, ọ dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya. Ọ bụ ‘Onye na-eme oké ihe dị iche iche,’ dị ka m hụrụla ná ndụ m niile.—Abụ Ọma 106:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 N’oge ahụ, ego a bụ ihe dị ka iri dọla (Amerịka) itoolu na ise, nke bụ́ nnukwu ego.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ebe m nọ n’ozi ọma, na Rangun, Bọma, ihe dị ka n’afọ 1957

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe m na-aga otu mgbakọ distrikti na Kaleimo, Bọma, n’ihe dị ka afọ 1978

[Foto dị na peeji nke 29]

Alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị, nke e wusakwuru n’afọ 2000

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Doris taa

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe anyị na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ