Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Bụụrụ M Nnọọ Ihe Ùgwù”

“Ọ Bụụrụ M Nnọọ Ihe Ùgwù”

 Akwụkwọ Ozi Si Heti

“Ọ Bụụrụ M Nnọọ Ihe Ùgwù”

MGBE ala ọma jijiji mechara na Heti na Jenụwarị 12, 2010, o sidịịrị m ike ikiri ọdachi ahụ merenụ na tiivi mgbe a na-akọ akụkọ ụwa. N’abalị iri abụọ n’ọnwa ahụ, ezigbo enyi m Carmen kpọrọ m ma tụọrọ m arọ ka anyị gaa Heti rụọ ọrụ enyemaka. M matara Carmen afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, mgbe anyị rụrụ ọrụ nọọsụ n’efu n’ebe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kemgbe ahụ, anyị arụọla ọrụ n’efu n’ebe ndị ọzọ e wuru ihe owuwu, anyị aghọọkwala ezigbo enyi.

Agwara m Carmen na echeghị m na m ga-arụli ọrụ dị na Heti nakwa na obi agaghị ekwe m ịrụ ya. O chetaara m na anyị gbakọtara aka rụọ ọrụ nke ọma n’oge gara aga nakwa na anyị nwere ike inyere ibe anyị aka. Ihe o kwuru gbara m ume, mụ akpọọ isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin, Niu Yọk, mụ na onye na-ahazi ọrụ enyemaka ahụ n’Amerịka ekwurịtakwa okwu. M gwara ya aha m ka o debanye ya n’ebe a na-edeba aha ndị ọrụ enyemaka. M gwakwara ya aha Carmen ma kwuo na anyị ga-achọ ịrụkọ ọrụ ọnụ. A gwara m na e jighị n’aka na a ga-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị ma ọ bụ na anyị ga-arụkọ ọrụ ọnụ ma a kpọọ anyị.

N’ihi ya, m mewere ihe ndị m na-eme, chee na a gaghị akpọ m. Mgbe ụbọchị anọ gafere, na Mọnde bụ́ abalị iri abụọ na ise, e si na Bruklin kpọọ m na fon ma jụọ m ma m̀ ga-enweli ike ịga Heti n’echi ya! O juru m nnọọ anya. M kwetara ma gwa ha na m ga-anwa ike m. Ihe mbụ m mere bụ ịnara ikike n’ebe m na-arụ ọrụ. Ihe ọzọ m mere bụ ịkpọtụrụ Carmen, chọpụtazie na a kpọghị ya n’ihi na ọ naghị asụ French. Obi tọrọ m ụtọ, ma ụjọ nọkwa na-atụ m. N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jenụwarị, mgbe m jisichara ike zụta tiketi ụgbọelu, m so ụgbọelu si Niu Yọk gaa Santo Domingo nke dị na Dọminikan Ripọblik, bụ́ mba ya na Heti gba.

Otu Onyeàmà na-eto eto zutere m n’ọdụ ụgbọelu ma jiri ụgbọala buga m n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Dọminikan Ripọblik. Ndị nọọsụ abụọ ọzọ si Amerịka batakwa n’ụbọchị ahụ, anyị niile nọkwara n’otu ọnụ ụlọ n’abalị ahụ. N’ụtụtụ echi ya, e ji ụgbọala buga anyị n’alaka ụlọ ọrụ Heti dị na Pọto-Prins, bụ́ njem were anyị awa asaa na ọkara.

Mgbe anyị banyere na Heti, anyị hụrụ ọdachi ahụ merenụ. O siri ike ikweta na ọ bụ ala ọma jijiji mere naanị tịnkọm tịnkọm iri atọ na ise mebiri ala a mara mma otú ahụ. O siiri m ike ikiri ọdachi ahụ na tiivi; agaghị m akọli otú ahụ́ dị m mgbe m ji anya m hụ ya. Ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ, tinyere ụlọ onyeisi ala lara n’iyi, ebe ụlọ ndị ọzọ kụrụ righirighi. Ọtụtụ n’ime ha bụ ụlọ ndị mmadụ tara ahụhụ rụọ—ha niile alaa n’iyi n’otu ntabi anya. Naanị ihe m nọ  na-eche bụ na ihe dị mkpa ná ndụ n’ezie abụghị ihe onwunwe.

Mgbe anyị rutere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, onye na-anabata ndị ọbịa hụrụ anyị ka anyị na-abịa, gbara ọsọ si n’oche ya gbapụta n’ọnụ ụzọ makụọ anyị ma mụmụọ ọnụ ọchị. O kelere anyị maka ịhapụ ihe niile anyị na-eme bịa ebe a. Mgbe anyị richara nri ehihie, anyị gara n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova, bụ́ nke e jizi mere ụlọ ọgwụ. N’ebe ahụ, m hụrụ Ndịàmà ndị ọzọ bịara ịrụ ọrụ enyemaka, tinyere di na nwunye si Jamanị ndị bụ́cha dibịa Bekee, na onye na-enyere ha aka, na otu nwaanyị na-aghọ́ nwa si Swizaland.

M malitere ọrụ n’abalị ụbọchị ahụ. E nwere ndị ọrịa iri na asatọ, ma Ndịàmà ma ndị na-abụghị Ndịàmà, bụ́ ndị dina na matarasị a tọgbọrọ n’ala Ụlọ Mgbakọ ahụ. Otú e mere otu onye ka e mere ibe ya, ndị nlekọta ahụ́ ike bụ́ Ndịàmà nyekwara ha ọgwụ n’efu.

N’abalị ahụ, otu onye ọrịa nke dị iri afọ asatọ nwụrụ. Nwunye ya nọ ya n’akụkụ, tinyere mụ na onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ. Mgbe e mechara, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ketly malitere ibe ákwá n’ihi ahụ́ ụfụ. E gbupụrụ ya aka nri ya n’ihi ahụ́ o merụrụ mgbe ala ọma jijiji ahụ mere. Otu Onyeàmà nke na-amụrụ Ketly Baịbụl nọ ya n’akụkụ. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ọ na-ehi ụra kwa abalị n’akụkụ ihe ndina Ketly n’Ụlọ Mgbakọ ahụ.

M gakwuuru Ketly, chọọ ka m mee ka ahụ́ ụfụ ya belata, ma, nsogbu ya abụghị naanị ahụ́ ụfụ nkịtị. Ọ gwara m na ya nọ n’ụlọ enyi ya mgbe ala ọma jijiji ahụ mere. Ha aghọtaghị ihe na-emenụ. Ha ko ibe ha n’aka gbagawa na veranda mgbe otu mgbidi dakwasịrị ha, kụgide ha n’ala. Ọ kpọrọ enyi ya òkù, ma ọ zaghị ya. O kwuru na ya matara ozugbo na enyi ya anwụọla. Ahụ́ enyi Ketly tọgbọ n’elu nke ya ruo mgbe ndị gbataara ha ọsọ enyemaka bịara awa anọ ala ọma jijiji ahụ mechara. E gbupụrụ Ketly aka nri ya malite n’ubu ya.

N’abalị mbụ m n’ebe ahụ, Ketly nọ na-echeta ihe ahụ merenụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ ihi ụra. Ka ọ nọ na-ebe ákwá, ọ gwara m, sị: “M maara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ụbọchị ikpeazụ na ala ọma jijiji. M maara na anyị nwere olileanya na-enye obi ụtọ. M maara na m kwesịrị ikele Chineke na m dị ndụ. Ma, weretụgodị ya na ị bụ m. Ihe niile nọ na-agaziri gị, ma na mberede, gị ahụzie onwe gị n’ọnọdụ a m nọ.” Ebe ọ na-enweghị ihe m ga-emeli, m jidere ya aka, ma soro ya bewe ákwá. Anyị abụọ begidere ákwá ruo mgbe ụra buuru ya.

Kwa ụbọchị, a na-eziga otu dibịa Bekee na ndị nọọsụ abụọ ka ha gaa nyere ndị chọrọ enyemaka aka. E zigara m Peti Goav, nke na-ewe awa abụọ ma e si na Pọto-Prins jiri ụgbọala gawa ya. Mụ na ndị ọrụ enyemaka abụọ ndị ọzọ—otu nọọsụ si Flọrịda na otu dibịa Bekee si Frans—so gaa ebe ahụ. Anyị rutere ebe ahụ mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ, bupụtasịa ibu anyị ma buba ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ebe ahụ. A gwala ndị mmadụ na anyị na-abịa, n’ihi ya, ha nọ ọdụ anọ na-eche ka anyị rute.

Anyị malitere ọrụ ozugbo. Okpomọkụ dị, ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’ahịrị na-eche ka a gwọọ ha nọkwa na-amụba. O ruru ihe dị ka elekere atọ tupu anyị akwụsịtụ ọrụ iji zurutụ ike. Anyị atọ gbara otu narị mmadụ na iri na anọ ọgwụ mgbochi ọrịa, lebakwara otu narị mmadụ na ise ọzọ chọrọ enyemaka anyị anya. Ike gwụchara m, ma obi tọrọ m ụtọ na m nwere ike inyere ndị nọ ná mkpa aka.

M nọrọ ihe karịtụrụ izu abụọ n’ọrụ enyemaka ahụ m rụrụ na Heti. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na m rụrụ ọrụ awa iri na abụọ kwa  abalị n’Ụlọ Mgbakọ ahụ. Ọrụ ahụ abụghị obere ọrụ, arụtụbeghị m ụdị ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụụrụ m ihe ùgwù na ngọzi ịga ebe ahụ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m nwere ike ịkasitụ ndị Heti, bụ́ ndị tara oké ahụhụ obi ma metụkwa ka obi ruo ha ala.

E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ha. Dị ka ihe atụ, e gbupụrụ Eliser, bụ́ nwata nwoke dị afọ iri na ise so ná ndị ọrịa m lekọtara, otu ụkwụ. M hụrụ na ọ na-edebe ihe oriri ya ka ya na Jimmy, bụ́ onye na-arahụ n’akụkụ ihe ndina ya kwa abalị, rie ya. Ọ kọwaara m na ọ bụghị mgbe niile ka Jimmy na-eri nri tupu ya abịawa ná mgbede. Ihe a Eliser mere kụziiri m na ọ bụghị naanị mgbe anyị bara ọgaranya—ma ọ bụdị ahụ́ esie anyị ike—ka anyị nwere ike inyetụ ndị ọzọ ihe.

Ahụkwara m àgwà a n’etiti ndị ọrụ enyemaka mụ na ha rụkọrọ ọrụ. Ahụ́ adịghị otu n’ime ha; azụ na-egbu onye nke ọzọ mgbu. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị niile butere ọdịmma ndị ọrịa ụzọ kama nke anyị. Nke a gbara m ume ịnọgide n’ọrụ ahụ. Ike gwụchara anyị niile, ma anyị nyeere ibe anyị aka ma nọgide na-aga n’ihu n’ọrụ ahụ. Agaghị m echefu nnọọ ọrụ ahụ echefu! Obi dị m ụtọ ịnọ ná nzukọ nke ezi Ndị Kraịst dị obiọma, na-ahụ ibe ha n’anya, ma na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ.

Tupu mụ ahapụ Heti, ndị ọrịa abụọ e gbupụrụ aka nri ha jisiri ike deere m akwụkwọ ozi ekele ma sị na m ga-agụrịrị ya mgbe m banyerela n’ụgbọelu. Nke ahụ bụ ihe m mere. Akwụkwọ ozi ndị ahụ ruru m n’obi, ákwá ekwekwaghị m nkwụsị.

Kemgbe m lọtara, mụ na ụfọdụ ndị enyi ọhụrụ m nwetara na Heti na-akparịta. N’oge nsogbu na ihe isi ike, a na-emete ezigbo ndị enyi, matakwa ndị bụ́ ezigbo enyi. Echeghị m na e nwere ihe isi ike ga-abịa n’ọdịnihu ga-emebi enyi mụ na ha. Ọ bụụrụ m nnọọ ihe ùgwù.