Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ike Ịgwa Ndị Bụ́ Mmụọ Okwu?

Ì Nwere Ike Ịgwa Ndị Bụ́ Mmụọ Okwu?

 Ì Nwere Ike Ịgwa Ndị Bụ́ Mmụọ Okwu?

CHINEKE PỤRỤ IME IHE NIILE nyefere ndị ọzọ bụ́ mmụọ ọrụ ụfọdụ ka ha rụwara ya. Dị ka ihe atụ, o nyefere Jizọs Kraịst ọchịchị ụwa, ọ họpụtakwara ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-enye aka n’iduzi ọrụ ikwusa ozi ọma. (Mkpughe 14:6) Ma, ekpere dị iche. O nweghị onye Chineke nyefere ọrụ ịnụ ekpere. Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere.

Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ na-ege ntị n’ekpere anyị, ọ na-azakwa ha. Jọn onyeozi degaara ndị ohu Jehova ibe ya akwụkwọ ozi banyere ekpere, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, [Chineke] na-anụ olu anyị. Ọ bụrụkwa na anyị maara na ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị maara na anyị ga-enweta ihe niile anyị rịọrọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.”—1 Jọn 5:14, 15.

Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi achọghị ka anyị na-agwa ha okwu ma ọ bụ na-ekpegara ha ekpere. Ha ghọtara ma nabata ndokwa Chineke mere banyere ekpere, bụ́ nke na-agbasa ha mgbe ụfọdụ. Olee otú o si dị otú ahụ? Mgbe Daniel onye amụma kpegaara Jehova ekpere banyere mbibi e bibiri  Jeruselem, Chineke zara ekpere ya site n’iziga mmụọ ozi bụ́ Gebriel ka ọ gaa zie ya ozi ga-agba ya ume.—Daniel 9:3, 20-22.

Hà Bụ Ozi Si n’Aka Ndị Nwụrụ Anwụ?

Ànyị kwesịrị ịgbalị ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu? E nwere ọtụtụ akụkọ a na-akọ banyere ndị sị na ha na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ kwurịtara okwu. Dị ka ihe atụ, otu onye na-ajụ ndị mmụọ ase gara na nke otu nwaanyị bi n’Ayaland ma gwa ya na n’abalị ụnyaahụ ya, na ya na di ya, bụ́ Fred, kwurịtara okwu. Ma, Fred nwụrụ izu ole na ole tupu mgbe ahụ. Onye ahụ na-ajụ ndị mmụọ ase gara n’ihu kwuo ihe ọ sịrị na Fred kwuru, bụ́ ihe nwunye Fred chere na ọ bụ naanị ya maara. Ọ gaara adịrị ya nnọọ mfe ikweta na Fred dị ndụ n’ala mmụọ ma na-achọ ka o si n’aka onye ọbịa ahụ gwa ya okwu. Ma, ikweta nke a ga-emegide ihe doro anya Baịbụl kwuru banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.—Gụọ igbe dị n’okpuru.

Oleezi ihe na-ebute akụkọ ndị dị otú ahụ? Otu ụzọ ndị mmụọ ọjọọ si eduhie ndị mmadụ bụ ime ka hà bụ ndị nwụrụ anwụ, na nke a, otu n’ime ha mere ka ọ̀ bụ Fred. Olee ihe bụ ebumnobi ha? Ọ bụ ime ka ndị mmadụ jụ ihe Baịbụl na-akụzi nakwa ime ka okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ ghara isi ike nakwa ka ha ghara ịtụkwasịcha Ya obi. O doro anya na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eduhie ndị mmadụ “site n’ịrụ ọrụ niile dị ike na ime ihe ịrịba ama ụgha na ịrụ ọrụ ebube ụgha, sitekwa n’iji ụdị ajọ omume niile na-eduhie ndị na-ala n’iyi.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10.

O doro anya na e nwere ndị na-ajụ ndị mmụọ ase na ndị ha na ha na-emekọrịta ihe  bụ́ ndị chere n’ezie na ndị ha na ha na-ekwurịta okwu bụ ndị nwụrụ anwụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na e nwere ndị ha na ha na-ekwurịta okwu, ọ bụ ndị mmụọ na-emegide Jehova. N’otu aka ahụ, e nwere ndị chere na ha na-efe Chineke, ma ya abụrụ na ha hiere ụzọ. Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee ịdọ aka ná ntị a dị mkpa: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ya ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghị Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 10:20, 21.

Ebe anyị maara na anyị nwere ike ikpegara Onye Kasị Elu, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị, ekpere, olee ihe mere anyị ga-eji chọọ ikpegara onye ọ bụla ọzọ ekpere? A sị ka e kwuwe, Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe E Mere 16:9.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Ebe anyị maara na anyị nwere ike ikpegara Onye Kasị Elu, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị, ekpere, olee ihe mere anyị ga-eji chọọ ikpegara onye ọ bụla ọzọ ekpere?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8, 9]

Eziokwu na Ụgha

EZIOKWU: SETAN BỤ ONYE DỊ ADỊ

“Setan n’onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.”—2 Ndị Kọrịnt 11:14.

“Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8.

“Onye na-eme mmehie sitere n’Ekwensu, n’ihi na Ekwensu anọwo na-emehie site ná mmalite.”—1 Jọn 3:8.

“Ya mere, doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.

“Ekwensu . . . bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”—Jọn 8:44.

ỤGHA: MMADỤ NIILE NA-AGA N’ALA MMỤỌ MA HA NWỤỌ

“Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”—Jenesis 3:19.

“Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5.

“Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol [ili], ebe ị na-aga.”—Ekliziastis 9:10.

“Mmụọ ya na-apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ, echiche ya na-ala n’iyi.”—Abụ Ọma146:4.

EZIOKWU: NDỊ MMỤỌ OZI KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI NWERE MMASỊ N’EBE ANYỊ NỌ

“Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.”—Abụ Ọma 34:7; 91:11.

“Ọ̀ bụ na ha [ndị mmụọ ozi] niile abụghị ndị mmụọ na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi?”—Ndị Hibru 1:14.

“M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi nke bụ́ ozi obi ụtọ ọ ga-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile, o ji oké olu na-asị: ‘Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto.’”—Mkpughe 14:6, 7.

ỤGHA: JIZỌS NA CHINEKE HÀ

“Achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

“Mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:28.

“N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Ọkpara ahụ apụghị ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme.”—Jọn 5:19.