Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

 Ị̀ Maara?

Olee ndị bụ́ ndị Magus ahụ bịara leta Jizọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ?

Akụkọ ọmụmụ Jizọs nke a kọrọ n’Oziọma Matiu kwuru na ndị ọbịa si “n’ebe ọwụwa anyanwụ,” bụ́ ndị hụrụ kpakpando nke eze ọhụrụ a mụrụ, nyere nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs onyinye. Ihe odide Grik nke Oziọma Matiu kpọrọ ndị ọbịa ahụ maʹgoi, ya bụ, “ndị magus.” (Matiu 2:1) Olee ihe anyị maara banyere ha?

Ebe mbụ gbara ọkpụrụkpụ e kwuru banyere ndị Magus bụ n’ihe onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus dere. Herodotus, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke ise T.O.A. (Tupu Oge Anyị) dere na ndị Magus so n’òtù ndị nchụàjà ndị Peshia ndị aka ọrụ ha bụ ịgụ kpakpando, ịkọwa nrọ, na ịkọ ọgwụ. N’oge Herodotus, ndị Peshia na-ekpe okpukpe Zoroaster. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ndị Magus o kwuru banyere ha bụ ndị nchụàjà okpukpe Zoroaster. Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, sị: “E nwere ike ikwu na onye mágos n’oge ndị Gris na-achị ụwa nwere ihe ọmụma na ikike karịrị nke mmadụ, mgbe ụfọdụkwa, bụrụ onye na-eme anwansi.”

Ọtụtụ n’ime ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst n’oge gboo, bụ́ ndị na-enye nkọwa, dị ka Justin Martyr, Origen, na Tertullian, kọwara ndị Magus ahụ letara Jizọs dị ka ndị na-agụ kpakpando. Dị ka ihe atụ, Tertullian dere n’akwụkwọ ya bụ́ On Idolatry, sị: “Anyị maara na e nwere ihe jikọrọ anwansi na ịgụ kpakpando. N’ihi ya, ọ bụ ndị na-akọwa kpakpando bụ ndị mbụ . . . nyere Ya [Jizọs] ‘onyinye.’” Ọtụtụ ndị nsụgharị Baịbụl sụgharịrị maʹgoi “ndị na-agụ kpakpando” bụ́ nke kwekọrọ ná nghọta a.

Gịnị mere Matiu ji kwuo na ọ bụ onye amụma Jeremaya kwuru ihe dị n’akwụkwọ Zekaraya?

Ọ bụ na Matiu 27:9, 10, ka e kwuru ihe ahụ, bụ́ ebe onye dere Oziọma ahụ kwuru banyere ego e nyere Judas Iskarịọt maka ịrara Jizọs nye. Amaokwu ndị ahụ kwuru, sị: “Mgbe ahụ, e mezuru ihe e kwuru site n’ọnụ Jeremaya onye amụma, sị: ‘Ha wee chịrị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ, bụ́ ego ole a ga-akwụ n’isi onye ahụ e kwuru ọnụ ahịa ya, . . . ha wee were ya zụta ala onye ọkpụite.’” Onye buru amụma mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ bụ Zekaraya, ọ bụghị Jeremaya.—Zekaraya 11:12, 13.

O yiri ka à na-ebute akwụkwọ Jeremaya ụzọ mgbe ụfọdụ, kama ibute akwụkwọ Aịzaya, n’akwụkwọ ndị a kpọrọ “Akwụkwọ Ndị Amụma.” (Matiu 22:40) N’ihi ya, mgbe Matiu kwuru “Jeremaya” n’ebe a, ọ na-ekwu banyere akwụkwọ niile dị n’otu nkebi Akwụkwọ Nsọ a gụrụ aha akwụkwọ mbụ dị na ya. Zekaraya so n’akwụkwọ ndị dị ná nkebi a.

N’otu ụzọ ahụ, Jizọs kpọrọ ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọkwa Ihe Odide “Abụ Ọma.” N’ihi ya, mgbe o kwuru na ihe niile e dere banyere ya “n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma na Abụ Ọma” ga-emezu, ihe ọ na-ekwu bụ amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum.—Luk 24:44.