Ndịàmà Jehova hà na-eji okwukwe agwọ ọrịa?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Ndịàmà Jehova hà na-eji okwukwe agwọ ọrịa?
▪ Ọ dịtụbeghị mgbe Ndịàmà Jehova ji okwukwe agwọ ọrịa. Dị ka Jizọs, ha kweere na isi ọrụ ha bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha kwekwaara na ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst abụghị iji okwukwe agwọ ọrịa, kama ọ bụ ihe dị mkpa karịa ya.
O doro anya na ọgwụgwọ Jizọs Kraịst ji ọmịiko gwọọ ndị mmadụ ọrịa na narị afọ mbụ O.A. (Oge Anyị) nwere ezigbo ihe ọ pụtaara anyị niile. O si otú ahụ mee ka anyị jide n’aka na mgbe ọ ga-achịwa dị ka Eze nke Alaeze Chineke, “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.
Oleekwanụ maka taa? Ndị ji okwukwe agwọ ọrịa na Krisendọm nakwa n’ụfọdụ okpukpe na-abụghị nke Ndị Kraịst na-ekwu na ha ji ọrụ ebube agwọ ọrịa. Ma, Jizọs dọrọ anyị nnọọ aka ná ntị ka anyị zere ndị na-ekwu na ha ‘na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube’ n’aha ya. Ọ ga-agwa ha, sị: “Amaghị m ndị unu bụ, sinụ ebe m nọ pụọ, unu ndị ajọ mmadụ.” (Matiu 7:22, 23, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) N’ihi ya, ọrụ ebube ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa sịrị na ha na-arụ ọ̀ na-egosi n’ezie na Chineke kwadoro ha ma ọ bụ na-agọzi ha?
Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ọrịa ndị Jizọs gwọrọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Akwụkwọ Nsọ gwara anyị banyere ha tụnyere otú ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa si agwọ ya, anyị ga-enwe nnọọ ike ịmata ma iji okwukwe agwọ ọrịa taa ò si n’aka Chineke.
O nweghị mgbe Jizọs ji ịgwọ ọrịa dọta ndị na-eso ụzọ ma ọ bụ ìgwè mmadụ n’ebe ọ nọ. Kama nke ahụ, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa n’ebe ọtụtụ ndị na-anọghị. Ọtụtụ mgbe, ọ gwara ndị ọ gwọrọ ọrịa ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ọrụ ebube ahụ.—Luk 5:13, 14.
O nweghị mgbe Jizọs nara ndị mmadụ ego maka ọrụ ebube ọ rụrụ. (Matiu 10:8) O nweghịkwa mgbe ọ na-agwọtalighị onye ọ chọrọ ịgwọ. Ọ gwọrọ ndị ọrịa niile bịakwutere ya kpamkpam, ọ bụghịkwa okwukwe ha mere o ji gwọọ ha. (Luk 6:19; Jọn 5:5-9, 13) Leenụ, Jizọs kpọlitedịrị ndị mmadụ n’ọnwụ!—Luk 7:11-17; 8:40-56; Jọn 11:38-44.
Ọ bụ ezie na Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ, ihe o lekwasịrị anya n’ozi ya abụghị iji ọrụ ebube nweta ọtụtụ ndị na-eso ụzọ. Kama nke ahụ, ọrụ ya bụ́ isi bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Jizọs haziri ndị na-eso ụzọ ya ịbụ ndị na-eme ndị na-eso ụzọ, bụ́ ndị ga-akụziri ndị ọzọ banyere olileanya inweta ahụ́ ike zuru okè n’ọchịchị Alaeze Chineke.—Matiu 28:19, 20.
N’ezie, e nyere ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ onyinye ndị pụrụ iche e ji agwọ ọrịa, ma e nwere mgbe a ga-akwụsị inye onyinye ndị ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 12:29, 30; 13:8, 13) Ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst taa abụghị ịgwọ ọrịa, kama ọ bụ ịhụnanya achọghị ọdịmma onwe onye naanị nke jikọrọ ha. (Jọn 13:35) Iji okwukwe agwọ ọrịa taa emebeghị ka e nwee ezi òtù Ndị Kraịst si n’agbụrụ niile na n’ọnọdụ niile ná ndụ bụ́ ndị ụdị ịhụnanya ahụ jikọtara.
Ma, e nwere òtù Ndị Kraịst ndị ịhụnanya jikọtara nnọọ nke na ha na-ajụ imerụ ibe ha—ma ọ bụdị onye ọ bụla ọzọ—ahụ́, ọbụna mgbe e nwere agha kpụ ọkụ n’ọnụ. Olee ndị ha bụ? Ha bụ Ndịàmà Jehova. A maara ha n’ụwa niile dị ka ndị na-egosi ịhụnanya yiri nke Kraịst. E nwere ike ikwu na ndị si n’agbụrụ, mba, omenala, na ógbè dị iche iche ịdị n’otu bụ ọrụ ebube, ọ bụkwa naanị mmụọ nsọ Chineke na-eme ka nke a nwee isi. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gaa otu n’ime nzukọ ha ka i jiri anya gị hụrụ?
[Foto dị na peeji nke 13]
Chineke ọ̀ na-akwado ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa (bụ́ ndị e gosiri n’aka nri) n’ezie?