Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịmata Aha Chineke

Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịmata Aha Chineke

 Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịmata Aha Chineke

O NWERE onye chọrọ ime ka ị ghara ịmata aha Jehova na ịbụ ezigbo enyi Ya. Ònye bụ ajọ onye iro a? Baịbụl kọwara onye ọ bụ, sị: “Chi nke usoro ihe a [emewo] ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.” Chi nke ajọ ụwa dị ugbu a bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ chọrọ ka ị nọrọ n’ìsì ka ìhè nke “ihe ọmụma ahụ dị ebube banyere Chineke” ghara inwu n’obi gị. Setan achọghị ka ị mata aha Jehova. Ma, olee otú Setan si eme ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì?—2 Ndị Kọrịnt 4:4-6.

Setan ejirila okpukpe ụgha mee ka ndị mmadụ ghara ịmata aha Chineke. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, ụfọdụ ndị Juu leghaara Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ anya n’ihi omenala nke chọrọ ka ha ghara ịkpọ aha Chineke. Ka ọ na-erule na narị afọ ndị mbụ nke Oge Anyị, ọ dị ka à gwala ndị Juu na-agụpụta ihe n’ihu ọha ka ha ghara ịgụpụta aha Chineke otú e si dee ya n’Akwụkwọ Nsọ ha, kama, ka ha were okwu bụ́ ʼAdho·naiʹ, nke pụtara “Onyenwe Anyị,” dochie ya. O doro anya na ime nke a so mee ka ndị mmadụ gharazie iji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe. Ihe ka ọtụtụ eriteghị uru ndị a na-erite ná mmadụ na Chineke ịdị ná mma. Oleekwanụ banyere Jizọs? Olee otú o si lee aha Jehova anya?

Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Mere Ka A Mara Aha Chineke

Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Nna ya, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.” (Jọn 17:26) Ọ ga-abụrịrị na Jizọs kpọrọ aha Chineke ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-agụ ebe dị iche iche e dere aha ahụ dị mkpa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, mgbe ọ na-ekwu ihe e dere na ha ma ọ bụ mgbe ọ na-akọwa ha. N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na Jizọs kpọrọ Chineke aha ọtụtụ ugboro otú ahụ ndị amụma niile bú ya ụzọ mere. Ọ bụrụ na e nwere ndị Juu maliterela izere ịkpọ aha Chineke n’oge Jizọs na-eje ozi ya, o doro anya na Jizọs esoghị ha mee otú ahụ. Ọ katọrọ nnọọ ndị ndú okpukpe mgbe ọ gwara ha, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.”—Matiu 15:6.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọgidere na-eme ka a mara aha Chineke mgbe Jizọs nwụsịrị, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. (Gụọ igbe bụ́  “Ndị Kraịst Mbụ Hà Kpọrọ Aha Chineke?”) Na Pentikọst 33 O.A. (Oge Anyị), bụ́ ụbọchị e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst, Pita onyeozi gwara ìgwè ndị Juu na ndị sonyeere okpukpe ndị Juu ihe si n’amụma Joel, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ọrụ 2:21; Joel 2:32) Ndị Kraịst  oge gboo nyeere ndị si n’ọtụtụ mba aka ịmata aha Jehova. N’ihi ya, onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems kwuru ná nzukọ ndịozi na ndị okenye nwere na Jeruselem, sị: ‘Chineke chere ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.’—Ọrụ 15:14.

N’agbanyeghị nke ahụ, ike agwụghị onye iro nke aha Chineke. Ozugbo ndịozi nwụchara, Setan egbughị oge ịgha mkpụrụ nke ndapụ n’ezi ofufe. (Matiu 13:38, 39; 2 Pita 2:1) Dị ka ihe atụ, a mụrụ onye edemede bụ́ Onye Kraịst elu ọnụ bụ́ Justin Martyr ihe dị ka n’oge Jọn, bụ́ onyeozi ikpeazụ, nwụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Justin kwusiri ike ugboro ugboro n’ihe odide ya na Onye ihe niile si n’aka bụ “Chineke nke na-enweghị aha a na-akpọ ya.”

O doro anya na mgbe Ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ na-edepụtaghachi Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ha wepụrụ aha Jehova na ya ma jiri Kyʹri·os, bụ́ okwu Grik pụtara “Onyenwe Anyị,” dochie ya. Otú ahụ ka ha mekwara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Mgbe ndị odeakwụkwọ  ndị Juu si n’ezi ofufe dapụ kwụsịrị ịgụpụta aha Chineke agụpụta, ha ji ʼAdho·naiʹ dochie aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ ha ihe karịrị otu narị ugboro na iri atọ. E wepụkwara aha Chineke na Baịbụl a ma ama nke a sụgharịrị n’asụsụ Latịn, nke Jerome sụgharịchara n’afọ 405 O.A., bụ́kwa nke e mechara kpọwa Vulgate.

Mgbalị Ndị A Na-eme n’Oge A Iwepụ Aha Chineke

Taa, ndị ọkà mmụta Baịbụl maara na aha Jehova pụtara ihe dị ka puku ugboro asaa na Baịbụl. N’ihi ya, ụfọdụ nsụgharị Baịbụl ndị a ma ama, dị ka Jerusalem Bible nke ndị Katọlik, La Biblia Latinoamérica nke ndị Katọlik a sụgharịrị n’asụsụ Spanish, na nsụgharị Reina-Valera a ma ama, nke a sụgharịkwara na Spanish, nwere aha Chineke n’ọtụtụ ebe. Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl na-ede aha Chineke dị ka “Yawe.”

Ọ dị mwute na ọtụtụ chọọchị ndị na-akwado nsụgharị Baịbụl na-amanye ndị ọkà mmụta Baịbụl iwepụ aha Chineke ná nsụgharị Baịbụl ha. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi Vatikan degaara ndị isi oche nke nzukọ ndị bishọp Katọlik na Jun 29, 2008, ha kwuru, sị: “N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị mmadụ ejirila nwayọọ nwayọọ malite ịkpọ aha Chineke Izrel.” Akwụkwọ ozi ahụ nyere ntụziaka a doro anya: “A gaghị akpọ . . . aha Chineke ma ọ bụ gụpụta ya agụpụta.” Ọzọ, “a bịa n’ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị a na-asụ n’oge a, . . . a ga-eji okwu bụ́ Adonai/Kyrios: ‘Onyenwe Anyị,’ sụgharịa mkpụrụ okwu Hibru anọ na-anọchi anya aha Chineke.” O doro anya na nzube Vatikan ji nye ntụziaka a bụ ịkwụsị ndị mmadụ ịkpọ aha Chineke.

Ndị Protestant na-akparịkwa aha Jehova otú ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị sụgharịrị Baịbụl ndị Protestant bụ́ New International Version nke e bipụtara n’asụsụ Bekee n’afọ 1978, dere, sị: “Jehova bụ aha pụrụ iche nke Chineke, anyị kwesịkwara nnọọ idenye ya ná nsụgharị a. Ma, nsụgharị a furu anyị nde dọla abụọ na narị puku dọla abụọ na iri ise, o dokwara anya na ego niile ahụ ga-ala n’iyi ma ọ bụrụ na dị ka ihe atụ, anyị asụgharịa Abụ Ọma nke 23 otú a, ‘Yawe bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ.’”

E wezụga nke ahụ, chọọchị dị iche iche emeela ka ndị Latịn Amerịka ghara ịma aha Chineke. Steven Voth, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere nsụgharị nke na-arụrụ United Bible Societies (UBS) ọrụ, dere, sị: “Otu n’ime nrụrịta ụka ndị a ka na-enwe n’etiti ndị Protestant nọ ná mba ndị dị na Latịn Amerịka bụ ma à ga-edenye aha ahụ bụ́ Jehová na Baịbụl ma ọ bụ na a gaghị edenye ya . . . Ọ bụ nnọọ ihe  ijuanya na ọtụtụ chọọchị Protestant nke oge a . . . kwuru na ha chọrọ nsụgharị Baịbụl Reina-Valera, mbipụta nke 1960, nke na-enweghị aha ahụ bụ́ Jehová. Kama nke ahụ, ha chọrọ ka e jiri okwu bụ́ Señor [Onyenwe Anyị] dochie ya.” Voth kwuru na UBS jụrụ ime ihe a ha kwuru ná mmalite, ma mechaa kweta, bipụtazie nsụgharị Baịbụl Reina-Valera nke “na-enweghị okwu ahụ bụ́ Jehová.”

Iwepụ aha Chineke n’Okwu ya e dere ede ma jiri “Onyenwe Anyị” dochie ya na-egbochi ndị na-agụ ya ịmata onye Chineke bụ. Ime otú ahụ na-akpata mgbagwoju anya. Dị ka ihe atụ, onye na-agụ Baịbụl nwere ike ghara ịma ma “Onyenwe Anyị” ọ̀ bụ Jehova ka ọ̀ bụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. N’ihi ya, n’amaokwu ahụ Pita kwuru ihe Devid kwuru, nke bụ́: “Jehova gwara Onyenwe m [bụ́ Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ], sị: ‘Nọdụ ala n’aka nri m,’” ọtụtụ nsụgharị Baịbụl kwuru, sị: “Onyenwe Anyị sịrị Onyenwe M.” (Ọrụ 2:34, NIV) Ọzọkwa, David Clines, n’edemede ya bụ́ “Yawe na Chineke nke Nkà Mmụta Okpukpe Ndị Kraịst” kwuru, sị: “Otu n’ime ihe mwepụ e wepụrụ Yawe n’ozizi Ndị Kraịst kpatara bụ na ndị mmadụ na-elekwasịkarịzi Kraịst anya.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-aga chọọchị amachaghị na ezi Chineke ahụ nke Jizọs kpegaara ekpere bụ Onye dị adị nke nwere aha, bụ́ Jehova.

Setan arụsiela ọrụ ike ime ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì n’ihe banyere Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ike ịmata Jehova nke ọma.

I Nwere Ike Ịmata Aha Jehova

O doro anya na Setan ebusola aha Chineke agha, o jirikwala aghụghọ were okpukpe ụgha mee nke ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ikike dị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa nke ga-akwụsịli Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova ime ka ndị chọrọ ịmata eziokwu banyere ya na nzube ya maka ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi mara aha ya.

Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi bịaruo Chineke nso site n’ịmụ Baịbụl. Ha na-eso ihe nlereanya Jizọs, bụ́ onye gwara Chineke, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) Ka ị na-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl ndị gosiri ọrụ dị iche iche Jehova rụrụla iji gọzie ụmụ mmadụ, ị ga-amata ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha o nwere.

Nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job na “Chineke nwere mmekọrịta chiri anya,” gị na ya nwekwara ike inwe ya. (Job 29:4) Ịmụta Okwu Chineke ga-eme ka ị mara aha Jehova. Ịmata aha Chineke ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova ga-emezu ihe ahụ o kwuru aha ya pụtara—‘M ga-abụ ihe ọ bụla m chọrọ ịbụ.’ (Ọpụpụ 3:14) N’ihi ya, ọ ga-emezu nnọọ nkwa niile o kwere ụmụ mmadụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]

 Ndị Kraịst Mbụ Hà Kpọrọ Aha Chineke?

N’oge ndịozi Jizọs na narị afọ mbụ O.A., e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ ala. Ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ na-ezukọchi anya ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Ndị Kraịst mbụ ahụ hà hụrụ aha Jehova n’Akwụkwọ Nsọ ha?

Ebe ọ bụ na a malitela ịsụ Grik ná mba dị iche iche, ihe ọtụtụ ọgbakọ na-agụ bụ Septuagint Grik, bụ́ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru nke a sụgharịchara na narị afọ nke abụọ T.O.A. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na malite mgbe mbụ a sụgharịrị Septuagint, nsụgharị a na-eji utu aha bụ́ Kyʹri·os, bụ́ okwu Grik nke pụtara “Onyenwe Anyị,” edochi aha Chineke ebe ọ bụla ọ pụtara. Ma, ihe ndị a chọpụtara na-egosi na nke ahụ abụghị eziokwu.

Ibé akwụkwọ ndị e gosiri n’ebe a bụ akụkụ ụfọdụ nke Septuagint Grik bụ́ ndị a sụgharịrị na narị afọ mbụ T.O.A. Ha gosiri nnọọ aha Jehova, bụ́ nke e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ יהוה (YHWH) na-anọchi anya aha Chineke dee n’ihe odide Grik. Prọfesọ George Howard dere, sị: “Anyị nwere Baịbụl Septuagint Grik atọ dị iche iche ndị dị tupu oge Ndị Kraịst, ọ dịghịkwa otu ebe e ji kyrios sụgharịa mkpụrụ akwụkwọ anọ ahụ na-anọchi anya aha Chineke na ha ma ọ bụdị sụgharịa ya asụgharịa. Anyị nweziri nnọọ ike ikwu na ọ bụ ọdịnala ndị Juu tupu oge Agba Ọhụrụ, n’oge Agba Ọhụrụ, nakwa mgbe oge ahụ gafere ide aha Chineke ede . . . n’ihe odide Grik nke Akwụkwọ Nsọ.”—Biblical Archaeology Review.

Ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs hà denyere aha Chineke n’ihe odide ha si n’ike mmụọ nsọ? Prọfesọ Howard dere, sị: “Mgbe aha Chineke na Hibru pụtara na Septuagint, bụ́ nke chọọchị Agba Ọhụrụ gụrụ ma kwuo ihe ndị dị na ya, o doro anya na ndị dere Agba Ọhụrụ na-edebanye mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ na-anọchi anya aha Chineke n’ihe odide ha.”

N’ihi ya, anyị nwere nnọọ ike ikwubi na Ndị Kraịst mbụ hụrụ aha Chineke ma ná nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ha.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto niile: Société Royale de Papyrologie du Caire

 [Foto dị na peeji nke 4, 5]

Ibé akwụkwọ aịzaya n’akwụkwọ mpịakọta osimiri nwụrụ anwụ, nke e gosiri ebe ndị aha chineke dị na ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Shrine of the Book, Foto © The Israel Museum, Jeruselem

[Foto dị na peeji nke 7]

Chọọchị dị iche iche egbochiela ide aha Chineke na Baịbụl n’ihi ọdịnala ndị Juu ma ọ bụdị iji kpata ego

[Foto dị na peeji nke 8]

Jizọs gosiri ihe nlereanya n’ime ka a mara aha Chineke