Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịma Aha Chineke Gụnyere

Ihe Ịma Aha Chineke Gụnyere

Ihe Ịma Aha Chineke Gụnyere

Ò NWERE ihe aha gị pụtara? N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ omenala ịgụ nwatakịrị aha nwere ezigbo ihe ọ pụtara. Aha a gụrụ nwa ahụ nwere ike ịbụ n’ihi ihe nne na nna ya kweere na ihe ha ji kpọrọ ihe ma ọ bụ ihe ha tụrụ anya nwa ahụ ga-abụ n’ọdịnihu.

Ịgụ ndị mmadụ aha nwere ezigbo ihe ha pụtara abụghị ihe ọhụrụ. N’oge Baịbụl, a na-agụkarị ndị mmadụ aha n’ihi ihe aha ndị ahụ pụtara. Aha a gụrụ mmadụ nwere ike igosi ọrụ a tụrụ anya ọ ga-arụ ná ndụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova gwara Devid ọrụ nwa ya bụ́ Sọlọmọn ga-arụ n’ọdịnihu, O kwuru, sị: “Aha ya ga-abụ Sọlọmọn [nke sitere n’okwu Hibru nke pụtara “Udo”], m ga-enye Izrel udo na ịnọ jụụ n’ụbọchị ya.”—1 Ihe E Mere 22:9.

Mgbe ụfọdụ Jehova na-agụ mmadụ aha ọhụrụ ma ọ bụrụ na o nwere ọrụ ọhụrụ onye ahụ ga-arụ. A gụrụ nwunye Ebreham bụ́ nwaanyị aga aha bụ́ Sera, nke pụtara “Nwunye Eze.” N’ihi gịnị? Jehova kọwara ya, sị: “M ga-agọzi ya, m ga-emekwa ka ọ mụọrọ gị nwa nwoke; m ga-agọzi ya, ọ ga-aghọkwa mba dị iche iche; ọ bụ n’ahụ́ ya ka ndị eze na-achị ndị dị iche iche ga-esikwa pụta.” (Jenesis 17:16) O doro anya na ihe ga-enye aka ịghọta ihe mere e ji gụọ Sera aha ọhụrụ bụ ịghọta ọrụ ọhụrụ ọ ga-arụ.

Oleekwanụ banyere aha kacha aha niile mkpa—Jehova? Olee ihe ọ pụtara? Mgbe Mozis jụrụ Chineke banyere aha Ya, Jehova zara ya, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Aha Jehova gosiri na ọ bụ Chineke nke na-arụ ọtụtụ ọrụ. Ka anyị jiri otu ihe atụ dị mfe nghọta kọwaa ya: O nwere ike ịdị mkpa ka nne rụọ ọtụtụ ọrụ kwa ụbọchị iji lekọta ụmụ ya—ọrụ nọọsụ, osi ite, na ọrụ onye nkụzi—dabere ná mkpa e nwere. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Jehova, ọ bụ ezie na Jehova na-arụ ihe ndị dị mkpa karịa ihe ndị ahụ. O nwere ike ịghọ ihe ọ bụla dị ya mma, rụọ ọrụ ọ bụla dị mkpa ka ọ rụọ iji mezuo ihe ọma ndị o zubeere ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ịma aha Jehova gụnyere ịghọta ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ na ikele ya maka ha.

Ọ dị mwute na ndị na-amaghị aha Chineke amaghị àgwà ọma ya. Ma, site n’ịmụ Baịbụl, i nwere ike ịghọta ọrụ ndị Jehova na-arụ dị ka Onye Ndụmọdụ maara ihe, Onye Nzọpụta dị ike, na Onye na-enye ihe n’ụba, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. N’ezie, ihe gbara ọkpụrụkpụ aha Jehova pụtara na-atụ anyị n’anya.

Ka o sina dị, ịmata aha Chineke anaghị adị mfe mgbe niile. Isiokwu na-esonụ ga-egosi ihe kpatara ya.