Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere I Nwere Ike Iji Tụkwasị Oziọma Anọ Dị na Baịbụl Obi

Ihe Mere I Nwere Ike Iji Tụkwasị Oziọma Anọ Dị na Baịbụl Obi

 Ihe Mere I Nwere Ike Iji Tụkwasị Oziọma Anọ Dị na Baịbụl Obi

“Ọtụtụ ndị enweela mmasị na ha. E jirila ha mee fim ndị furu ọtụtụ nde [dọla], . . . jirikwa ha dee akwụkwọ ndị kacha gaa ahịa . . . Òtù Ndị Kraịst dị iche iche anabatala ha. E jirila ha zie ọtụtụ ozizi okpukpe na ozizi ndị e ji agba mgba okpuru.” —SUPER INTERESSANTE, MAGAZIN NDỊ BRAZIL.

OLEE ihe a na-ekwudị okwu ya? Magazin ahụ na-ekwu banyere ihe ọtụtụ ndị malitere ime n’oge na-adịbeghị anya nakwa mmasị ha malitere inwe n’akwụkwọ Baịbụl adịgboroja ndị a kpọrọ oziọma, akwụkwọ ozi, na apọkalips, bụ́ ndị a chọtara n’etiti narị afọ nke iri abụọ na Nag Hamadi na n’ebe ndị ọzọ n’Ijipt. A na-akpọ akwụkwọ ndị a na ndị ọzọ yiri ha ihe odide Nọstik ma ọ bụ Apọkrịfa. *

À Kpara Nkata Ịgbanwe Ihe n’Oziọma Ndị Ahụ?

Ọtụtụ ndị taa na-enwe mmasị n’ihe odide Nọstik ma ọ bụ Apọkrịfa n’ihi na anyị bi n’oge ndị mmadụ na-atụkwasịkwaghị Baịbụl na okpukpe ndị dị kemgbe obi. Ihe odide ndị a emetụtala nnọọ otú ndị mmadụ si ele ozizi Jizọs Kraịst na Iso Ụzọ Kraịst n’onwe ya anya. Otu magazin kwuru, sị: “Oziọma Tọmọs na [akwụkwọ] apọkrịfa ndị ọzọ na-amasị otu ụdị ndị na-amụba amụba n’oge a: ndị na-anụrụ ihe ime mmụọ ọkụ n’obi, ma ha atụkwasịghị okpukpe obi.” Ngụkọ ndị e mere na-egosi na naanị na Brazil, “e nwere ụdị okpukpe iri atọ ma ọ dịkarịa ala, bụ́ ndị ihe ha kweere si n’akwụkwọ Apọkrịfa.”

Ọhụhụ a hụrụ akwụkwọ ndị a emeela ka ọtụtụ ndị kweta echiche bụ́ na na narị afọ nke anọ O.A. (Oge Anyị), Chọọchị Katọlik kpara nkata izochi eziokwu banyere Jizọs, na ụfọdụ n’ime ihe ndị a kọrọ banyere ndụ Jizọs n’ihe odide Apọkrịfa bụ ihe e zochiri ezochi, nakwa na a gbanwere ihe n’Oziọma anọ ndị dị na  Baịbụl ndị anyị nwere n’oge a. Ilen Pegelz, bụ́ prọfesọ nkà mmụta okpukpe, si otú a kwuo ya: “Anyị amalitela ịhụ ugbu a na ihe anyị na-akpọ Iso Ụzọ Kraịst—na ihe anyị na-akpọ ọdịnala Ndị Kraịst—bụ naanị ihe ole na ole a kọọrọ anyị, bụ́ ndị a họtara n’ọtụtụ ihe odide e nwere.”

Ndị ọkà mmụta dị ka Pegelz kweere na ọ bụghị naanị na Baịbụl ka okwukwe Ndị Kraịst kwesịrị ịdabere; e nwere ebe ndị ọzọ, dị ka ihe odide Apọkrịfa. Dị ka ihe atụ, n’ihe omume bụ́ Bible Mysteries, nke e mere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ BBC, e kwuru n’isiokwu bụ́ “Meri Magdalin nke Ezigbo Ya” na ihe odide Apọkrịfa sịrị na Meri Magdalin bụụrụ “ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ onye ozizi na onye nduzi. Ọ bụghị naanị onye na-eso ụzọ; ọ bụ onyeozi nke ndịozi Jizọs.” Mgbe Wan Arịas na-ekwu okwu banyere ihe a sịrị na ọ bụ ọrụ Meri Magdalin, o dere n’akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ́ O Estado de S. Paulo, sị: “Ihe niile anyị maara taa na-eme ka anyị kwere na okpukpe Ndị Kraịst oge gboo, nke Jizọs hiwere, bụ nnọọ okpukpe ‘ụmụ nwaanyị’ ebe ọ bụ na chọọchị mbụ ndị e nwere bụ n’ụlọ ụmụ nwaanyị ka ha dị, bụ́ ebe ha rụrụ ọrụ dị ka ndị ụkọchukwu na ndị bishọp.”

Ọtụtụ ndị chere na akwụkwọ Apọkrịfa na-ekwu ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ karịa akwụkwọ ndị dị na Baịbụl. Ma, echiche dị otú ahụ na-akpata ajụjụ ụfọdụ dị mkpa: Okwukwe Ndị Kraịst ò kwesịrị ịdabere n’ihe odide Apọkrịfa? Ọ bụrụ na ihe odide Apọkrịfa ekwuo ihe megidere ozizi Baịbụl, olee nke anyị kwesịrị ikwere—Baịbụl ka ọ̀ bụ akwụkwọ Apọkrịfa? Ọ̀ bụ eziokwu na a kpara nkata na narị afọ nke anọ izochi akwụkwọ Apọkrịfa na ịgbanwe ihe ndị e dere n’Oziọma anọ ndị dị na Baịbụl iji wepụ ihe ndị dị mkpa e dere banyere Jizọs, Meri Magdalin, na ndị ọzọ? Iji nweta azịza ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’otu n’ime Oziọma anọ ndị dị na Baịbụl, bụ́ Oziọma Jọn.

Ihe Akaebe Si n’Oziọma Jọn

A chọtara iberibe ihe odide bara uru nke Oziọma Jọn n’Ijipt ná mmalite narị afọ nke iri abụọ, a na-akpọzikwa ya Papyrus Rylands 457 (P52). Ihe e dere na Jọn 18:31-33, 37, 38 na Baịbụl nke oge a dị na ya, ọ dịkwa n’Ọ́bá Akwụkwọ Jọn Raịlands, Manchesta, Ịngland. Ọ bụ iberibe ihe odide kacha ochie nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst e nwere. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na e dere ya n’ihe dị ka afọ 125 O.A., naanị ihe dị ka iri afọ abụọ na ise Jọn nwụchara. Ihe na-eju anya na ya bụ na ihe e dere n’iberibe akwụkwọ ahụ kwekọrọ nnọọ n’ihe odide ndị e dere mgbe oge ahụ gachara. Eziokwu bụ́ na Oziọma Jọn nke merela ochie otú ahụ eruola n’Ijipt n’oge ahụ, bụ́ ebe a chọtara iberibe ihe odide ahụ, na-eme ka anyị kwubie na e dere Oziọma Jọn na narị afọ mbụ O.A., nakwa na ọ bụ Jọn n’onwe ya dere ya, dị ka Baịbụl gosiri. N’ihi ya, akwụkwọ Jọn bụ akụkọ onye ji anya ya hụ ihe merenụ dere.

Ma, ọ bụ malite na narị afọ nke abụọ gbagowe ka e dere ihe odide Apọkrịfa niile, nke bụ́ otu narị afọ ma ọ bụ karị ka ihe e dere na ha mecharala. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-agbalị ịrụ ụka na ihe odide Apọkrịfa dabeere n’ihe odide na omenala ndị ka mee ochie, ma e nweghị ihe akaebe na-akwado nke a. N’ihi ya, e kwesịrị ịjụ, sị, Olee nke i kwesịrị inwe  okwukwe na ya karị—ọ̀ bụ ihe ndị ji anya ha hụ kwuru ka ọ̀ bụ ihe ndị biri otu narị afọ mgbe ihe ahụ mechara kwuru? Azịza ya doro anya. *

Olee maka ebubo ahụ bụ́ na a gbanwere ihe ndị dị n’Oziọma ndị dị na Baịbụl iji zochie ihe ụfọdụ n’akụkọ ndụ Jizọs? È nwere ihe akaebe na-egosi na dị ka ihe atụ, e degharịrị ihe n’Oziọma Jọn na narị afọ nke anọ iji zochie eziokwu? Iji zaa ajụjụ a, ọ dị mkpa ka anyị buru n’obi na otu n’ime ebe ndị bụ́ isi e si nweta ihe ndị e dere na Baịbụl ndị e nwere n’oge a bụ ihe odide ochie e dere na narị afọ nke anọ nke a na-akpọ Vatikan 1209. Ọ bụrụ na a gbanwere ihe na Baịbụl anyị na narị afọ nke anọ, ọ ga-adị n’ihe odide a. Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ na e nwere ihe odide ọzọ nke nwere ihe ka ukwuu n’akwụkwọ Luk na Jọn, bụ́ nke a na-akpọ Bodmer 14, 15 (P75), nke e dere malite n’afọ 175 O.A. ruo n’afọ 225 O.A. Ndị ọkachamara kwuru na ọ fọrọ nnọọ obere ka ihe odide ahụ na nke Vatikan 1209 bụrụ otu. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, e nweghị ezigbo ihe a gbanwere n’Oziọma ndị dị na Baịbụl, anyị nwekwara Vatikan 1209 iji gosi na nke a bụ eziokwu.

E nweghị ihe akaebe, nke e dere ede ma ọ bụ ụdị ọzọ, na-egosi na a gbanwere ihe n’ihe odide Jọn—ma ọ bụ n’Oziọma ndị nke ọzọ—na narị afọ nke anọ. Mgbe ọkà mmụta bụ́ Pita M. Hed, nke Mahadum Kembrij, nyochasịrị ụfọdụ iberibe ihe odide ndị a chọtara n’Ọksirinkọs, Ijipt, o dere, sị: “Ihe odide ndị a na-egosi na ihe e dere n’ihe odide ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee malite na narị afọ nke anọ gbagowe, bụ́ ndị e si na ha nweta ihe odide Grik oge ochie e dere n’oge a, bụ eziokwu. O nweghị ihe dị na ha ga-eme ka anyị gbanwee nnọọ otú anyị si ghọta ihe e dere n’ihe odide Agba Ọhụrụ nke oge gboo.”

Olee Ihe Anyị Nwere Ike Ikwubi?

Ndị Kraịst n’ebe niile nabatara Oziọma anọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ, ya bụ, Matiu, Mak, Luk, na Jọn, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’etiti narị afọ nke abụọ. Ihe odide Teshan bụ́ Diatessaron (okwu Grik nke pụtara “site n’ihe odide anọ” ahụ), nke a chịkọtara n’agbata afọ 160 O.A. na 175 O.A., dabeere naanị n’Oziọma anọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ, o nweghịkwa ihe dị na ya si ‘n’oziọma’ Nọstik ndị ahụ. (Gụọ igbe bụ́  “A Gbachiteere Oziọma Anọ ahụ n’Oge Gboo.”) Ihe ọzọkwa dị mkpa bụ ihe Aịreniọs, bụ́ onye dịrị ndụ ná ngwucha narị afọ nke abụọ O.A., kwuru. O kwuru na ọ ga-abụrịrị Oziọma anọ ka e nwere, ebe e nwere akụkụ anọ nke ụwa, nweekwa ifufe anọ. Ọ bụ ezie na e nwere ike inyo ihe atụ ahụ o mere enyo, ihe o kwuru kwadoro na ọ bụ naanị Oziọma anọ dị n’Akwụkwọ Nsọ n’oge ahụ.

Olee ihe ihe a niile na-egosi? Ọ na-egosi na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst—tinyere Oziọma anọ ahụ—bụ́ ndị anyị nwere taa enwechaghị ihe a gbanwere na ha malite na narị afọ nke abụọ gbagowe. E nweghị ezigbo ihe mere a ga-eji kwere na a kpara nkata ịgbanwe ma ọ bụ izochi akụkụ ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ e si n’ike mmụọ nsọ dee. Kama nke ahụ, ọkà mmụta Baịbụl bụ́ Brus Metsga dere, sị: “Ka  ọ na-erula ngwụcha narị afọ nke abụọ, . . . ọgbakọ ndị kwere ekwe dị n’ebe dị iche iche, ọ bụghị naanị n’ógbè Mediterenian niile, kamakwa malite na Briten ruo na Mesopotemia, enweela nnọọ otu olu na ihe ka ukwuu n’Agba Ọhụrụ ziri ezi.”

Ndịozi bụ́ Pọl na Pita kwadoro eziokwu nke Okwu Chineke. Ha abụọ dọchara Ndị Kraịst ibe ha aka ná ntị banyere ịnabata ma ọ bụ ikwere ihe ọ bụla ọzọ na-abụghị ihe a kụziiri ha. Dị ka ihe atụ, Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Timoti, chee ihe ahụ e nyefere n’aka gị nche, na-agbakụta okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha. N’ihi iji ihe ọmụma dị otú ahụ na-akpa nganga, ụfọdụ adapụwo n’okwukwe.” Pita gbara akaebe, sị: “Ee e, ọ bụghị site n’iso akụkọ ụgha e ji akọ chepụta ka anyị mere ka unu mata banyere ike na ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, kama ọ bụ site n’ịbụ ndị ji anya ha hụ ịdị ebube ya.”—1 Timoti 6:20, 21; 2 Pita 1:16.

Ọtụtụ narị afọ gara aga, Aịzaya onye amụma si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 40:8) Obi nwekwara ike isi anyị ike otú ahụ na Onye ahụ ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee Akwụkwọ Nsọ nwekwara ike ichekwa ya ruo ogologo oge ka e wee “zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Nọstik” si n’okwu Grik pụtara “ihe ọmụma zoro ezo” ebe “Apọkrịfa” si na nke nwere ike ịpụta “ihe e zochiri nke ọma.” E ji okwu ndị a akọwa akwụkwọ adịgboroja ma ọ bụ ndị na-esoghị n’akwụkwọ Baịbụl, bụ́ ndị e dere ka ha yie Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Ọrụ Ndịozi, akwụkwọ ozi dị iche iche, na Mkpughe, bụ́ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ par. 11 Nsogbu ọzọ e nwere n’ihe odide Apọkrịfa bụ na ọ bụ naanị ole na ole n’ime ha fọrọ ugbu a. Naanị ihe fọrọ na Gospel of Mary Magdalene nke e kwuru okwu ya n’elu bụ obere iberibe akwụkwọ abụọ, tinyere nke katụ ha ogologo bụ́ nke ọ ga-abụ na ọkara nke ihe e dere na ya adịkwaghị. Ihe ọzọkwa bụ na e nwere ezigbo ọdịiche n’ihe e dere n’ihe odide ndị ka dịnụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Papyrus Rylands 457 (P52), iberibe ihe odide Oziọma Jọn nke e dere na narị afọ nke abụọ O.A., bụ́ iri afọ ole na ole e dechara nke mbụ ya

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

 A Gbachiteere Oziọma Anọ ahụ n’Oge Gboo

N’oge na-adịghị anya okpukpe Ndị Kraịst malitere, ndị na-arụ Baịbụl ụka kwuru na Oziọma anọ ahụ ekwekọrịtaghị, n’ihi ya kwa, na e kwesịghị ịtụkwasị akụkọ ndị dị na ha obi. Onye Siria na-ede akwụkwọ bụ́ Teshan (ihe dị ka 110-180 O.A.) gbachiteere Oziọma anọ ahụ. O kweere na ọ bụrụ na e jiri nlezianya jikọta ihe ndị e dere n’Oziọma anọ ahụ ọnụ ma mee ka ha bụrụ otu akụkọ kama ịbụ akụkọ anọ, a gakwaghị enwe ihe ga-eme ka e chee na ha na-emegide ibe ha.

Teshan malitere ịkwadebe akwụkwọ ga-ejikọta Oziọma anọ ahụ. A maghị ma asụsụ mbụ o ji dee akwụkwọ ahụ ọ̀ bụ Grik ka ọ̀ bụ Siriak. Nke ọ bụla ọ bụ, n’ihe dị ka afọ 170 O.A., Teshan dechara akwụkwọ ahụ, bụ́ nke a na-akpọ Diatessaron, bụ́ okwu Grik nke pụtara “site n’ihe odide anọ” ahụ. Olee ihe mere i ji kwesị inwe mmasị n’ihe odide a na-esighị n’ike mmụọ nsọ?

Na narị afọ nke iri na itoolu, ndị na-akatọ Baịbụl malitere ịkụzi na o nweghị nke ọ bụla n’ime Oziọma anọ ahụ e dere tupu ọkara narị afọ nke abụọ O.A.; n’ihi ya, na e nwechaghị uru akụkọ dị na ha bara. Ma, ihe odide ochie nke Diatessaron bụ́ ndị a chọtarala kemgbe ahụ emeela ka o doo anya na a marala Oziọma anọ ahụ nke ọma ma nabata ha dị ka Oziọma ndị dị na Baịbụl ka ọ na-erule ọkara narị afọ nke abụọ O.A. nakwa na ọ bụ naanị ha anọ ka a maara ma nabata otú ahụ n’oge ahụ.

Nchọta a chọtara Diatessaron na nkọwa ya bụ́ ndị e dere n’asụsụ Arabik, Aminian, Grik, na Latịn mere ka ọkà mmụta Baịbụl bụ́ Saa Frederik Kenyọn dee, sị: “Ihe ndị a a chọpụtara emechaala mee ka a ghara inwekwa obi abụọ ọ bụla banyere ihe Diatessaron bụ ma gosi na ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 170 A.D., e werela nnọọ Oziọma anọ dị na Baịbụl dị ka akwụkwọ pụrụ iche ndị a na-agaghị ejili akwụkwọ ọ bụla ọzọ kọrọ akụkọ ndụ Onye Nzọpụta anyị tụnyere.”

[Foto]

Teshan

Diatessaron n’Arabik

[Chaatị dị na peeji nke 8, 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

“dk.” pụtara “ihe dị ka.”

33 O.A.

Jizọs anwụọ

dk. 41

E dee Matiu

dk. 58

dee Luk

dk. 65

E dee Mak

dk. 98

E dee Jọn

125

Rylands 457 (P52)

dk. 140

A malite ide ihe odide Apọkrịfa

dk. 175

Bodmer 14, 15 (P75)

Narị afọ nke anọ

Vatikan 1209

[Foto dị na peeji nke 10]

Vatikan 1209

Ihe odide Vatikan 1209 e dere na narị afọ nke anọ, bụ́ nke dị n’elu, gosiri na o nwechaghị ihe a gbanwere n’Oziọma ndị dị na Baịbụl

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Bibliorum Sacrorum Graecus Codex Vaticanus, 1868

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 9]

© Ndị Na-elekọta Ọ́bá Akwụkwọ Chesta Biti, Dọblịn