Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozi Ọma na Narị Asụsụ Ise

Ozi Ọma na Narị Asụsụ Ise

Ozi Ọma na Narị Asụsụ Ise

MGBE agha obodo kpụ ọkụ n’ọnụ na Rwanda, otu obere ìgwè ndị nsụgharị si n’ụlọ ha gbapụ, hapụ ihe niile ha nwere. Ma, ha jisiri ike bute obere kọmputa ha, bụ́ ndị ha bu gbaga n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ha nwee ike ịnọgide na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Kinyarwanda.

Otu nwa agbọghọ bi n’Ebe Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia na-ede ihe na kọmputa ya ruo n’ime ime abalị, n’agbanyeghị na ike gwụrụ ya, okpomọkụ ana-eme ya, a na-ewegharịkwa ọkụ, bụ́ nke na-enye ya nsogbu n’ọrụ nsụgharị ya. Olee ihe o bu n’uche na-arụ ya? Ọ bụ ka ọ sụgharịchaa ihe ahụ ọ na-asụgharị tupu ụbọchị a ga-ebi ya.

Ndị nsụgharị a so n’ìgwè ndị nsụgharị dị puku abụọ na narị atọ wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ n’ebe karịrị otu narị na iri itoolu n’ụwa. Afọ ndụ ha dị malite n’iri afọ abụọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ itoolu, ha na-arụsikwa ọrụ ike iji hụ na ndị mmadụ nwetara ozi Baịbụl na-akasi obi na narị asụsụ ise.—Mkpughe 7:9.

Ime Ka Akwụkwọ Anyị Ruo Ndị Na-asụ Asụsụ Dị Iche Iche Aka

N’ime afọ ole na ole gara aga, ọrụ nsụgharị Ndịàmà Jehova amụbaala otú ọ na-amụbatụbeghị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1985, a na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ iri abụọ na atọ n’otu mgbe, bụ́ nke na-abụghị obere ihe n’oge ahụ. Taa, e nweela Ụlọ Nche n’otu narị asụsụ na iri asaa na isii, a na-ebipụtakwa ha niile n’otu mgbe ka ndị na-agụ ha gburugburu ụwa nwee ike ịmụ otu ihe n’otu mgbe.

N’ihe dị ka iri asụsụ ise, Ụlọ Nche bụ naanị magazin a na-ebipụtachi anya. N’ihi gịnị? Ndị ji ibi akwụkwọ mere aka ọrụ enwechaghị ihe mere ha ga-eji na-ebipụta akwụkwọ n’asụsụ ógbè dị iche iche. Ma Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa na-eji obi ha dum enye onyinye bụ́ nke ha na-ejikọta ọnụ ma hụ na e bipụtara Okwu Chineke na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ebe ọ bụla ha dị mkpa n’ụwa.—2 Ndị Kọrịnt 8:14.

Ọ na-atọ nnọọ ndị mmadụ ụtọ ịgụ ozi Baịbụl n’asụsụ nke ha. Dị ka ihe atụ, e bipụtala akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’oge na-adịbeghị anya n’asụsụ Miskito, bụ́ asụsụ ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ na-asụ na Nicaragua. Otu nwaanyị rịọrọ ka e nye ya Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible * n’asụsụ Miskito, pastọ nke otu chọọchị dị n’ebe ahụ nọkwa mgbe e wetaara ya akwụkwọ ahụ. Mgbe pastọ ahụ hụrụ akwụkwọ ahụ mara mma, ọ chọrọ iwere ya. Nwaanyị ahụ ekweghị enye ya akwụkwọ ahụ, ọbụna mgbe pastọ ahụ kwere nkwa inye ya mkpụrụ kọfị dị kilogram iri abụọ n’arọ maka akwụkwọ ahụ!

N’ime afọ iri gara aga, a sụgharịala akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị asụsụ iri na abụọ nke ndị Mexico, bụ́ ndị gụnyere asụsụ Maya, Nahuatl, na asụsụ Tzotzil. N’ihe na-erughị afọ iri, ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eji asụsụ ndị obodo ahụ na asụsụ ndị ogbi amụ ihe mụbara site n’iri asaa na abụọ ruo ihe karịrị otu puku na narị abụọ. Ndịàmà Jehova nwere ike ịkụnye ozi Baịbụl n’obi ndị mmadụ, ma hapụrụ ya Chineke ka o mee ka mkpụrụ nke eziokwu ahụ pulite.—1 Ndị Kọrịnt 3:5-7.

Baịbụl Ọgbara Ọhụrụ A Sụgharịrị n’Iri Asụsụ Asatọ

N’ime afọ ole na ole gara aga, Ndịàmà Jehova arụsiela ọrụ ike iwepụta Baịbụl NsọNsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ zuru ezu ma ọ bụ ndị na-ezughị ezu n’iri asụsụ asatọ. Olee ihe ndị mmadụ kwurula banyere nke a? Otu Onyeàmà bụ́ onye South Africa kwuru banyere Baịbụl Tswana, sị: “Ọ bụ nnọọ ngwá ọrụ bara uru. Ọ ga-eme ka m jirikwuo Okwu Chineke kpọrọ ihe. Asụsụ e ji sụgharịa ya dị mfe ọgụgụ ma dị ụtọ.” Otu onye gụrụ Baịbụl Tsonga na Mozambique dere, sị: “N’agbanyeghị na anyị nwere akwụkwọ ndị ọzọ niile e ji amụ Baịbụl, enweghị Baịbụl dị ka anyị inwe égbè eluigwe na àmụ̀mà n’enweghị mmiri ozuzo! Ma, anyị nwetara mmiri ozuzo ahụ mgbe e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Tsonga.”

Ndị na-asụgharị ma na-ekesa ozi ọma dị na Baịbụl na-emezu otu amụma oge ochie n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Graf dị na peeji nke 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NSỤGHARỊ AKWỤKWỌ

ỤWA ỌHỤRỤ NDỊ ỌZỌ

Mbipụta zuru ezu ma ọ bụ

nke na-ezughị ezu

80 2010 500 2010

36 2000

13 1990 200 1990

190 1980

7 1970 165 1970

125 1960

1 1950 88 1950

ASỤSỤ OLE E NWERE HA

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ihe dị ka puku mmadụ abụọ na narị atọ wepụtara onwe ha ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na narị asụsụ ise

BENIN

SLOVENIA

ITIOPIA

BRITAIN