Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Ndụ Ezinụlọ

Banyere Ndụ Ezinụlọ

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Ndụ Ezinụlọ

Olee otú e kwesịrị isi lee alụmdi na nwunye anya obi ụtọ adịrị n’ezinụlọ?

Alụmdi na nwunye bụ nkekọ dị nsọ. Mgbe a jụrụ Jizọs ma iwu ọ̀ kwadoro ịgba alụkwaghịm, ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya. . . . Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụrụ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Matiu 19:4-6, 9) Ọ bụrụ na di na nwunye esoro ndụmọdụ Jizọs ma ghara ịkpa n’èzí, ahụ́ ga-eru mmadụ niile n’ezinụlọ ha ala, ha enweekwa obi ụtọ.

Gịnị mere ịhụ Chineke n’anya ji eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ?

Jizọs sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.” Gịnị bụ iwu nke abụọ kasị ukwuu? Jizọs sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya [tinyere ndị gị na ha kacha biri nso, bụ́ ndị ezinụlọ gị] dị ka onwe gị.” (Matiu 22:37-39) Ya mere, isi ihe na-eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ bụ anyị na Chineke ịdị n’ezigbo mma, n’ihi na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị hụ ibe anyị n’anya.

Olee otú ndị bụ́ di na nwunye nwere ike isi na-eme ibe ha obi ụtọ?

Ndị bụ́ di ga-eme ka nwunye ha nwee obi ụtọ ma ha soro ihe nlereanya Jizọs. Ịhụnanya ọ hụrụ nwunye ihe atụ ya, bụ́ ọgbakọ ya, mere ka o nyefee onwe ya maka ya. (Ndị Efesọs 5:25) Jizọs kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi.” (Matiu 20:28) Ọ dịtụghị mgbe Jizọs ji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ meso ndị nọ n’okpuru ya ihe, kama o mere ka ahụ́ ruo ha ala. (Matiu 11:28) N’ihi ya, ndị bụ́ di kwesịrị iji obiọma na-edu ndị ezinụlọ ha otú ga-abara ha niile uru.

Ndị bụ́ nwunye nwekwara ike irite uru n’ihe nlereanya Jizọs. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” O kwukwara, sị: “Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.” (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Jizọs eleghị ido onwe ya n’okpuru Chineke anya dị ka iweda onwe ya ala. Ọ na-akwanyere Nna ya ùgwù nke ukwuu. Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Nwunye nke na-edo onwe ya n’okpuru di ya n’ihi ịhụ Chineke n’anya na ịkwanyere Ya ùgwù na-eme nnọọ ka ezinụlọ ya nwee obi ụtọ.

Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si lee ụmụaka anya?

Jizọs wepụtara oge soro ụmụaka nọrịa, o nwekwara mmasị ịmata otú obi dị ha na ihe ha na-eche. Baịbụl kwuru, sị: “Jizọs kpọrọ ụmụntakịrị ka ha bịakwute ya, sị: ‘Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m.’” (Luk 18:15, 16) Otu mgbe, ndị mmadụ katọrọ ụfọdụ ụmụ okoro ndị kwupụtara okwukwe ha n’ebe Jizọs nọ. Ma, Jizọs jara ụmụ okoro ahụ mma, gwazie ndị ahụ katọrọ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I mewo ka otuto si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara pụta’?”—Matiu 21:15, 16.

Olee ihe ụmụaka nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

Jizọs setịpụụrụ ụmụaka ezi ihe nlereanya n’inwe mmasị n’ihe ime mmụọ. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, a chọtara ya “n’ụlọ nsọ ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.” Olee otú nke a si metụta ndị mmadụ? Baịbụl kwuru, sị: “Nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya.” (Luk 2:42, 46, 47) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndị Jizọs maara emeghị ka ọ dị mpako. Kama, o mere ka ọ kwanyere nne na nna ya ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.”—Luk 2:51.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi nke 14 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.