Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Gịnị mere otu nwoke ihe kacha ya mkpa ná ndụ bụ ịgba ọgba tum tum, ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ime egwuregwu ji ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile? Gịnị kpaliri onye ji ịgba chaa chaa mere aka ọrụ ịkwụsị omume ahụ riri ya ahụ́ ma malite ịrụ ezigbo ọrụ nke o ji na-elekọta ezinụlọ ya? Gịnị kpaliri otu nwa agbọghọ a zụlitere n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ma ya ajụ ụkpụrụ Baịbụl ichebara ndụ ya echiche? Gụọ ihe ha kwuru.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: TERRENCE J. O’BRIEN

ADỊ M AFỌ: 57

ABỤ M ONYE: AUSTRALIA

NDỤ M BIRI: AṄỤRỤ M ỌGWỤ ỌJỌỌ, NWEEKWA MMASỊ N’ỊGBA ỌGBA TUM TUM

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Anyị bi n’obodo Brisbane na-ekwo ekwo, bụ́ isi obodo Queensland, mgbe m ka dị obere. Ezinụlọ anyị na-ekpe Katọlik, ma mgbe m gbasịrị afọ asatọ, anyị kwụsịrị ịga chọọchị, ọ dịkwaghị mgbe anyị kwurịtara ihe banyere okpukpe. Mgbe m dị afọ iri, ezinụlọ anyị kwagara Gold Coast dị n’Australia. Anyị bi nso na mmiri, ejikwa m oge niile m dị afọ iri na ụma gwuo mmiri ma gbaa ụgbọ epeepe n’elu ebili mmiri.

N’agbanyeghị nke ahụ, enweghị m obi ụtọ mgbe m dị obere. Nna m hapụrụ ezinụlọ anyị mgbe m dị afọ asatọ. Nne m lụgharịrị di, ịṅụbiga mmanya ókè na esemokwu ghọkwara ihe e ji mara ezinụlọ anyị. Otu abalị, mgbe nne m na nna m sechara ezigbo okwu, m nọ n’àkwà m kpebie na m mechaa lụọ nwaanyị, ọ dịghị ihe ga-eme ka mụ na nwunye m see okwu. N’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere n’ezinụlọ anyị, ezinụlọ anyị—nke gụnyere ụmụaka isii, nne m, na di nne m—ka na-akpachi anya.

Mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo iri afọ abụọ, ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m kpawara arụ. Ha sewere igbo, ụtaba, na ọgwụ ike ndị ọzọ, na-aṅubigakwa mmanya ókè. Ebikwara m ụdị ndụ àchọrọ m ịma ahụ ndị ọgbọ m na-ebi. Enwekwara m mmasị n’ịgba ọgba tum tum. N’agbanyeghị na m nwere ajọ ihe ọghọm ole na ole, anọgidere m na-enwe mmasị n’ịgba ọgba tum tum ma kpebie ịgbara ọgba tum tum mụ gaa Australia gburugburu.

N’agbanyeghị nnwere onwe niile ahụ m nwere, obi na-adakarị m mbà mgbe m chere echiche banyere otú ụwa dị na otú ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ si eleghara nsogbu ụmụ mmadụ anya. Ọ gụsiri m agụụ ike ịmata eziokwu banyere Chineke, okpukpe, na ọnọdụ ụwa. Ma, mgbe m jụrụ ndị ụkọchukwu Katọlik abụọ ajụjụ ndị ahụ na-enye m nsogbu n’obi, ihe ha zara m kụdara m obi. M jụkwara ndị ụkọchukwu Protestant otu ajụjụ ndị ahụ, ma ihe ha zara m kụdakwara m obi ka ihe ahụ ndị nke Katọlik zara m. Otu enyi m meziri ndokwa ka mụ na otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Eddie kwurịta okwu. Mụ na Eddie kwurịtara okwu ugboro anọ, na nke ọ bụla n’ime ha, o jikwa Baịbụl zaa m ajụjụ ndị m jụrụ ya. Malite nnọọ mgbe mbụ mụ na ya kwurịtara okwu, amaara m na achọtala m ihe pụrụ iche. Ma, n’oge ahụ, ahụghị m mkpa ọ dị ịgbanwe ihe ọ bụla n’otú m si ebi ndụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe ahụ m ji ọgba tum tum na-agba Australia gburugburu, mụ na Onyeàmà ọzọ m zutere n’ụzọ kwurịtakwara okwu. Ma, mgbe m lọghachiri Queensland, mụ na Ndịàmà ekwurịtaghị okwu ọzọ ruo ọnwa isii.

Otu ụbọchị mgbe m si ọrụ na-alọta, ahụrụ m ụmụ nwoke abụọ jikere nke ọma bu akpa ka ha na-aga n’okporo ámá, echekwara m na ha bụ Ndịàmà Jehova. Agakwuuru m ha, chọpụta na ha bụ Ndịàmà Jehova ma gwazie ha ka ha bịa mụwara m Baịbụl. Amalitere m ozugbo ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà, ọbụna gaa otu nnukwu mgbakọ ha mere na Sydney n’afọ 1973. Ma, mgbe ezinụlọ anyị—karịsịa nne m—chọpụtara ihe m na-eme, o wutere ha nke ukwuu. N’ihi nke a na ihe ndị ọzọ, akwụsịrị m iso Ndịàmà. Ruo otu afọ, etinyere m oge m niile n’ihe ọzọ na-atọ m ezigbo ụtọ, bụ́ ịkụ cricket.

Ma, emechara m chọpụta na naanị oge m nwere obi ụtọ n’ezie bụ mgbe ahụ mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Akpọtụụrụ m ha ọzọ ma maliteghachi ịga ọmụmụ ihe ha. Akwụsịkwara m ịkpakwuru ndị enyi m na-aṅụ ọgwụ ọjọọ.

Ihe kpaliri m nnọọ ime mgbanwe ndị a bụ ihe m mụtara banyere onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, bụ́ Job. Mụ na Bill, bụ́ Onyeàmà katatụrụ ahụ́ dị obiọma ma na-akwụsi ike n’ihe, mụchiwere Baịbụl anya. Mgbe anyị mụchara banyere Job, Bill jụrụ m onye ọzọ Setan borola ebubo na o jighị obi ya niile na-efe Chineke. (Job 2:3-5) Mgbe m kpọchara ndị niile m maara a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, Bill ji ndidi gwa m, sị, “Ha so.” Mgbe ahụ, o lere m anya ná mkpụrụ anya, sị, “Setan na-ekwukwa otu ihe ahụ banyere gị!” Ọ fọrọ nke nta ka m si n’oche m dapụ. Tupu anyị amalite ọmụmụ ihe ahụ, amaara m na ihe ndị m na-amụta bụ eziokwu. Ma ugbu a, m ghọtara ihe mere m kwesịrị iji mee ihe ndị m na-amụta eme. Mgbe ọnwa anọ gasịrị, e mere m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Akpata oyi na-awụ m mgbe ọ bụla m chere otú ndụ m gaara adị ugbu a ma a sị na amaliteghị m iso ụkpụrụ Baịbụl ná ndụ m. Ikekwe, m gaarala nnọọ anwụ. Ọtụtụ n’ime ndị enyi m mbụ anwụọla n’ihi ịṅụ ọgwụ ọjọọ na oké mmanya. Ha enwekwaghị obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha. M chere na ndụ m gaara adịkwa otú ahụ.

Alụọla m nwaanyị, mụ na nwunye m, Margaret, na-ejekwa ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia. Ọ dịbeghị onye ezinụlọ anyị sonyeere m n’ife Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na Margaret amụọrọla ọtụtụ ndị nakwa ndị di na nwunye Baịbụl, bụ́ ndị gbanwerela ndụ ha otú ahụ m mere. Ka anyị na-eme nke ahụ, anyị enweela ọtụtụ ezigbo ndị enyi. Ihe ọzọ bụ na Margaret, bụ́ onye a zụlitere dị ka Onyeàmà, enyerela m aka imezu mkpebi ahụ m mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ anọ gara aga. Anyị alụọla ihe karịrị iri afọ abụọ na ise, anyị nwekwara obi ụtọ n’alụmdi na nwunye anyị. Anyị anaghị ekwekọrịta n’ihe niile, ma ruo ugbu a anyị esebeghị okwu. Anyị chere na ọ bụ Baịbụl nyeerela anyị aka ibi n’udo.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: MASAHIRO OKABAYASHI

ADỊ M AFỌ: 39

ABỤ M ONYE: JAPAN

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE NA-AGBA CHAA CHAA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Azụlitere m n’Iwakura, bụ́ obodo na-ebuchaghị ibu nke ga-ewe ihe dị ka ọkara awa ma e jiri ụgbọ okporo ígwè si na Nagoya gawa ya. Echetara m na nne m na nna m dị obiọma. Ma, emechara m mata na nna m bụ onye yakuza, ya bụ, onye òtù ndị omempụ, nakwa na ruo oge ụfọdụ, ebe o si enweta ego o ji na-azụ ezinụlọ anyị dị mmadụ ise bụ igwu ndị mmadụ wayo. Ọ na-aṅụ oké mmanya kwa ụbọchị, mgbe m gbakwara afọ iri abụọ, ọrịa imeju gburu ya.

Nna m bụ onye Korea, n’ihi ya, mgbe mgbe, ndị bi anyị gburugburu anaghị achọ ka anyị na ha mekọta ihe. Ihe a na ihe ndị ọzọ mere ka ndụ siere m ezigbo ike mgbe m dị afọ iri na ụma. Edenyere m aha n’ụlọ akwụkwọ kọleji ma na-aga naanị mgbe ụfọdụ, kwụsịkwa ka otu afọ gasịrị. O siiri m ike inweta ọrụ n’ihi na aha m abaala n’akwụkwọ ndị uwe ojii dị ka onye dara iwu, tinyekwara na nna m bụ onye Korea. Emechara m chọta ọrụ, ma, emerụrụ m ahụ́ n’ikpere, bụ́ nke mere ka m gharakwa inwe ike ịrụ ọrụ ọkpụkpụ aka.

M malitere iji ụdị ịgba chaa chaa yiri ọkụ na-eri ego akpa afọ m. N’oge ahụ, mụ na nwa agbọghọ nke chọrọ ka m chọta ezigbo ọrụ ma lụọ ya ebirila. Ma ana m enweta ezigbo ego n’ịgba chaa chaa, achọkwaghị m ịgbanwe ụdị ndụ m na-ebi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu ụbọchị, otu Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị ma nye m akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? (Ndụ—Olee Otú O Si Malite? Ò Si n’Evolushọn Ka Ò Si n’Okike?) Echetụbeghị m echiche banyere ajụjụ ahụ. Ma, mgbe m gụchara akwụkwọ ahụ, ekweere m ịmụkwu Baịbụl. Ọ dịla anya m chewere ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ. Azịza ndị doro anya m nwetara na Baịbụl banyere nke a na isiokwu ndị ọzọ mere ka ọ dị m ka akpịrịkpa ò si n’anya m dapụ.

Ahụrụ m mkpa ọ dị ime ihe ndị m na-amụta na Baịbụl eme. N’ihi ya, m lụrụ nwaanyị ahụ mụ na ya bi n’ụzọ iwu kwadoro, kwụsị ise sịga, kpụọ ogologo ntutu m m tere ihe ka ọ chagharịa, meekwa ka m dị mma ile anya. M kwụsịkwara ịgba chaa chaa.

Ọ dịghị nke ọ bụla ná mgbanwe ndị a dịịrị m mfe. Dị ka ihe atụ, akwụsịlighị m ise ụtaba n’ike onwe m. Ma ikpesi ekpere ike na ịdabere n’ebe Jehova Chineke nọ nyeere m aka ịkwụsị ya. Ọzọkwa, ọrụ mbụ m nwetara mgbe m kwụsịchara ịgba chaa chaa siiri m ezigbo ike. Ihe m na-akpata na ya bụ naanị ọkara nke ihe m na-akpata n’ịgba chaa chaa, ọrụ ahụ sikwara ike ma na-agwụ m ike. Otu ebe na Baịbụl nyeere m aka n’oge a ihe na-esiri m ike bụ Ndị Filipaị 4:6, 7. O kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” Ọtụtụ mgbe, nkwa a mezuru ná ndụ m.

URU NDỊ M RITERELA: Mgbe mbụ mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, obi adịghị nwunye m mma. Ma, mgbe ọ hụrụ nnukwu mgbanwe ndị m na-eme ná ndụ m, ọ malitere iso m amụ ihe na iso m aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ugbu a, anyị abụọ bụ Ndịàmà Jehova. Obi dị m nnọọ ụtọ na anyị abụọ na-efekọ Chineke ọnụ!

Tupu m malite ịmụ Baịbụl, echere m na m nwere obi ụtọ. Ma, ugbu a, amatala m ihe bụ́ mmadụ inwe ezi obi ụtọ. Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl adịtụghị mfe, ma o doro m anya na ọ bụ ụzọ kacha mma isi ebi ndụ.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: ELIZABETH JANE SCHOFIELD

ADỊ M AFỌ: 35

ABỤ M ONYE: UNITED KINGDOM

NDỤ M BIRI: MKPA M BỤ NAANỊ IKPORI NDỤ NÁ NGWỤSỊ IZU

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etolitere m na Hardgate, bụ́ obere obodo dị ná mpụga Glasgow, Scotland. Mgbe m dị afọ asaa, nne m, bụ́ onye ghọrọla Onyeàmà Jehova, malitere ịkụziri m Baịbụl. Ma, mgbe m dị afọ iri na asaa, ihe ka m mkpa bụ mụ na ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ ịkpa—ịga oriri na nkwari abalị, ige egwú rock na-ada oké ụda, na ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ihe ime mmụọ anaghị agbatatụdị m n’uche. Mkpa m bụ ikpori ndụ ná ngwụsị izu. Ma, ihe a niile gbanwere mgbe m gbara afọ iri abụọ na otu.

Agara m ileta ụfọdụ ndị ikwu m na Northern Ireland. N’oge m nọ n’ebe ahụ, ekiriri m ememme ịkwụ n’ahịrị ndị Protestant mere. Otú ndị Protestant na ndị Katọlik si gosi asị ha kpọrọ ibe ha n’ụbọchị ahụ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. N’ezie, o mere ka m chee echiche. Echetara m ihe nne m kụziiri m na Baịbụl, amakwa m na ọ dịghị mgbe Chineke ga-enwe mmasị ná ndị na-ejighị iwu ịhụnanya ya kpọrọ ihe. Ọ bịara doo m anya na m ji ndụ m niile na-achọ ọdịmma onwe m, leghara ụdị ndụ Chineke chọrọ ka m bie anya. Ekpebiri m na mgbe m laghachiri Scotland, m ga-agbasi mbọ ike ịchọpụta ihe Baịbụl na-akụzi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe mbụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ọzọ n’obodo anyị, ihere onwe m nọ na-eme m, ahụ́ erughịkwa m ala. Ma, mmadụ niile nabatara m. Ka m malitere ime ihe ndị m na-amụta na Baịbụl, otu onye dị nnọọ obiọma nọ n’ọgbakọ ahụ malitere inwe mmasị pụrụ iche n’ebe m nọ. O mere nnọọ ka ahụ́ ruo m ala ọzọ n’ọgbakọ ahụ. Ndị enyi m mụ na ha na-akpabu nọgidere na-akpọ m òkù iso ha gaa oriri na nkwari abalị, ma agwara m ha na mkpa m bụ irubere iwu Baịbụl isi. Ha mechara kwụsị ịkpọ m.

N’oge gara aga, eweere m Baịbụl dị ka akwụkwọ iwu nkịtị. Otú m si ele ihe anya bịaziri gbanwee. Amalitere m ịhụ ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl ka ndị bụ́ mmadụ otú m bụ, na-emehiekwa ihe ka m. Ha mehiekwara ihe, ma Jehova Chineke gbaghaara ha mgbe ha si n’ala ala obi ha chegharịa. Obi bịara sie m ike na ọ bụ ezie na m gbakụtara Chineke azụ mgbe m dị obere, ọ ga-agbaghara m ma chefuo ihe ndị m mejọrọ n’oge gara aga ma ọ bụrụ na m gbalịsie ike ime ihe na-atọ ya ụtọ.

Àgwà nne m masịkwara m nke ukwuu. Ọ bụ ezie na m hapụrụ Chineke, ọ dịghị mgbe o mere otú ahụ. Otú o si nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova mere ka m ghọta na ife Jehova bara uru. Mgbe m dị obere ma na-eso nne m aga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, ozi ọma anaghị atọ m ụtọ, ọ dịghịkwa mgbe m kwetara na m ga-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ọtụtụ awa. Ma, ugbu a, ekpebiri m ịnwale nkwa ahụ Jizọs kwere na Matiu 6:31-33. O kwuru, sị: “Unu Echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ . . . Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa. Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” Obere oge e mechara m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, akwụsịrị m ọrụ oge niile m na-arụ, nweta ọrụ nwa oge, ghọọkwa onye na-ekwusa ozi ọma oge niile.

URU NDỊ M RITERELA: Mgbe m ka na-eto eto ma na-eche naanị banyere ikpori ndụ ná ngwụsị izu, ọ dịghị mgbe m nwere afọ ojuju. Ndụ m tọgbọ chakoo. Ugbu a m ji oge m niile na-ejere Jehova ozi, enweela m afọ ojuju. Ndụ m enweela isi. Alụọla m di, mụ na di m na-eletakwa ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova kwa izu, na-agba ha ume. M weere ọrụ a dị ka ọrụ kacha mkpa m rụtụrụla ná ndụ m. Ana m ekele nnọọ Jehova maka inye m ohere imezi ihe m mebiri ná ndụ m!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 27]

“Malite nnọọ mgbe mbụ mụ na ya kwurịtara okwu, amaara m na achọtala m ihe pụrụ iche. Ma, n’oge ahụ, ahụghị m mkpa ọ dị ịgbanwe ihe ọ bụla n’otú m si ebi ndụ”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]

“Akwụsịlighị m ise ụtaba n’ike onwe m. Ma ikpesi ekpere ike na ịdabere n’ebe Jehova Chineke nọ nyeere m aka ịkwụsị ya”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 30]

“N’oge gara aga, eweere m Baịbụl dị ka akwụkwọ iwu nkịtị. Otú m si ele ihe anya bịaziri gbanwee. Amalitere m ịhụ ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl ka ndị bụ́ mmadụ otú m bụ, na-emehiekwa ihe ka m”