Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere Baịbụl ji ekwu banyere inwe mmekọahụ aghara aghara mgbe ọ na-ekwu banyere ofufe chi ụgha bụ́ Bel?

Chi ndị Kenan bụ́ Bel bụ nnọọ chi ọmụmụ na chi ihe ubi. Ndị na-efe ya kweere na ọ bụ Bel na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi na-eme nke ọma nakwa ka anụ ụlọ ha na-amụ ọtụtụ ụmụ. Ya mere, akwụkwọ e ji eme nnyocha bụ́ Manners and Customs in the Bible kwuru na “a na-enwe mmekọahụ n’ụlọ arụsị dị iche iche iji mee ka ala mee nri site n’ịgba chi oké mmiri ozuzo bụ́ Bel na nwunye ya bụ́ Ashera ume inwe mmekọahụ, si otú ahụ mee ka ala mepụta ihe nke ọma, anụmanụ amụọkwa ọtụtụ ụmụ.”

Ndị Kenan kweere na Bel na-alaba n’ime ala n’oge ọkọchị bụ́ mgbe ike nke chi akọrọ na ọnwụ, bụ́ Mot, na-akarị nke ya. Ma, ha kweere na mmalite mmiri ozuzo na-egosi na Bel enwetaghachila ike, bụ́kwa nke ga-eme ka ihe ubi na anụmanụ mewekwa nke ọma. Ndị Kenan na-eme ememme nke inwe mmekọahụ aghara aghara n’oge a. Ka a sịkwa ihe mere ụmụ Izrel ịrapara n’ahụ́ Bel nke Piọ ji mee ka ha na “ndị inyom Moab wee malite inwe mmekọahụ rụrụ arụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-3.

Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii yiri “ili e tere nzụ”?

Jizọs kpọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihu abụọ ma gwa ha, sị: “Unu yiri ili e tere nzụ, bụ́ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla.” (Matiu 23:27) Ndị Juu na-eme ka a na-ahụ ili nke ọma site n’ite ha nzụ n’ọgwụgwụ oge udu mmiri, n’abalị iri na ise nke ọnwa Eda, bụ́ otu ọnwa tupu Ememme Ngabiga eruo. N’ezie, mmiri ozuzo na-asachapụ nzụ ahụ.

Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia kwuru na a na-ete ili nzụ iji hụ na e merụghị “ọtụtụ ndị na-esi n’ụzọ ahụ agafe n’oge Ememme Ngabiga.” Iwu dị n’Ọnụ Ọgụgụ 19:16 kwuru na onye ọ bụla metụrụ ozu, ọkpụkpụ mmadụ, ma ọ bụ ili aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo abalị asaa. Ọ bụrụ na onye Izrel na-adịghị ọcha esoro mee ememme okpukpe, a ga-egbu ya. (Levitikọs 15:31) Jizọs nyere ihe atụ a naanị abalị ole na ole tupu Ememme Ngabiga eruo; n’ihi ya, ndị na-ege ya ntị ga-echeta nnọọ nzụ ahụ a na-ete n’ili kwa afọ. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị okpukpe ahụ na-emegide ya abụghị ihe ha yiri n’elu ahụ́ nakwa na mmadụ ịga ha nso ga-eme ka onye ahụ rụọ arụọ n’anya Chineke.

[Foto dị na peeji nke 15]

Bel nke àmụ̀mà nke a tụrụ na nkume ụrọ n’agbata narị afọ nke 14 na nke 13 tupu oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris