Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gịnị Ka Anyị Ga-eri?”

“Gịnị Ka Anyị Ga-eri?”

 “Gịnị Ka Anyị Ga-eri?”

NDỊ mmadụ na-ekwukarị banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ n’oge Jizọs jere ozi n’ụwa. Ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya, o jikwa ogbe achịcha na azụ̀ ole na ole nyejuo ìgwè mmadụ afọ ugboro abụọ. (Matiu 16:7-10; Jọn 2:3-11) Ọ bụ ihe a ma ama na Jizọs so ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya rie nri. Ndị iro Jizọs bodịrị ya ebubo na ọ bụ onye oké nri na onye na-aṅụ oké mmanya. (Matiu 11:18, 19) O doro anya na o nweghị nke Jizọs bụ n’ihe abụọ a ha kpọrọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ maara na ihe oriri na ihe ọṅụṅụ dị ndị mmadụ ezigbo mkpa, o jikwa nkà jiri ha kụziere ndị mmadụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere Chineke.—Luk 22:14-20; Jọn 6:35-40.

Olee ụdị ihe oriri a na-erikarị na ihe ọṅụṅụ a na-aṅụkarị n’oge Jizọs? Olee otú e si akwadebe ihe oriri? Oleekwa ihe ọ na-ewe iji kwadebe ya? Ịmata azịza nke ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịghọtakwu ihe ụfọdụ a kọrọ n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn na okwu ụfọdụ e dere na ha.

‘Nye Anyị Nri Maka Ụbọchị Taa’

Mgbe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, o mere ka ha mata na ọ dị mma ịrịọ Chineke ka o nye ha ihe ndị dị ha mkpa ná ndụ, ya bụ, “[nri] maka ụbọchị taa.” (Matiu 6:11) N’asụsụ mbụ e ji dee amaokwu a, okwu a a sụgharịrị “nri” bụ “achịcha.” N’oge Jizọs, ọtụtụ mmadụ na-ata achịcha kwa ụbọchị nke na n’asụsụ Hibru na Grik, otú e si asị mmadụ “rie nri” bụ “taa achịcha.” Na narị afọ mbụ, ihe ndị Juu na-erikarị bụ mkpụrụ akụ́kụ́ ndị e ji eme achịcha, dị ka ọka wit na bali, nakwa ọka spelt na milet. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na otu onye na-eri ihe dị ka mkpụrụ akụ́kụ́ dị narị kilogram abụọ kwa afọ, bụ́ nke na-enye onye ahụ ihe dị ka ọkara ume ahụ́ ya chọrọ.

E nwere ike ịzụ achịcha n’ahịa. Ma ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ndị Izrel na-eji aka ha eme nke ha, bụ́ ọrụ na-adịghị mfe. Akwụkwọ bụ́ Bread, Wine, Walls and Scrolls kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọ na-esi ike ichekwa ntụ ọka, ụmụ nwaanyị na-egwe ya kwa ụbọchị.” Awa ole ka ọ na-ewe igwe ya? Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ihe onye dị ike ọrụ nke ji nkume igwe nri egwe ọka wit ga-egweta n’otu awa agaghị erucha otu kilogram ntụ ọka. Ebe ọ bụ na ihe otu onye na-eri kwa ụbọchị bụ ihe dị ka ọkara kilogram ntụ ọka, nwaanyị nke chọrọ inyeju ezinụlọ ya dị mmadụ ise ma ọ bụ isii afọ ga-egwe ọka awa atọ.”

Chee echiche banyere Meri, nne Jizọs. Ọ bụ ezie na ọ na-arụ ọrụ ndị ọzọ n’ụlọ, ọ na-emekwa achịcha ga-ezuru di ya, ụmụ ya ndị nwoke ise na nwaanyị abụọ ma ọ dịkarịa ala. (Matiu 13:55, 56)  O doro anya na Meri rụsiri ọrụ ike inye ezinụlọ ya ‘nri maka ụbọchị taa,’ dị ka ụmụ nwaanyị Juu ndị ọzọ mere.

“Bịanụ, Rie Nri Ụtụtụ”

Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’otu isi ụtụtụ. Ndị na-eso ụzọ ya ji abalị dum chọọ azụ̀, n’egbuteghị nke ọ bụla. Jizọs gwara ndị enyi ya ahụ ike gwụrụ, sị: “Bịanụ, rie nri ụtụtụ.” O wee nye ha azụ̀ e gbutere ọhụrụ na achịcha. (Jọn 21:9-13) Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị n’ebe a ka a kpọrọ nri ụtụtụ aha n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn, ndị mmadụ na-atakarị achịcha, akị, na mkpụrụ vaịn ma ọ bụ mkpụrụ oliv n’ụtụtụ n’oge ahụ.

Oleekwanụ maka nri ehihie? Olee ihe ndị gara ọrụ na-eri? Akwụkwọ bụ́ Life in Biblical Israel kwuru, sị: “Ihe a na-erikarị n’ehihie bụ nri ndị na-anaghị anyị arọ n’ahụ́, nke bụ́ achịcha, ụdị ọka dị iche iche, oliv, na mkpụrụ fig.” O nwere ike ịbụ ihe ndị ahụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs bu mgbe ha si Saịka lọta ma hụ ka Jizọs na nwaanyị Sameria nọ na-ekwurịta okwu n’akụkụ olulu mmiri. ‘Ọ bụ ihe dị ka n’awa nke isii,’ ma ọ bụ n’etiti ehihie, ndị na-eso ụzọ Jizọs ‘gawakwara n’ime obodo ịzụta ihe oriri.’—Jọn 4:5-8.

Ná mgbede, mmadụ niile nọ n’ezinụlọ na-ezukọ iri nri kacha mkpa n’ụbọchị. Akwụkwọ bụ́ Poverty and Charity in Roman Palestine, First Three Centuries C.E. kwuru banyere nri a, sị: “Ihe ka ọtụtụ na-ata achịcha ma ọ bụ rie ọka bali, ụdị mkpụrụ akụ́kụ́ na àgwà dị iche iche e siri esi, ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, ha erie nke e ji ọka wit sie. Ha na-etinyekarị nnu na mmanụ ma ọ bụ mkpụrụ oliv na ha, mgbe ụfọdụ ha etinye ha ihe ndị dị ka ose, mmanụ aṅụ, ma ọ bụ mmiri mkpụrụ osisi ndị na-atọ ụtọ.” O nwekwara ike ịbụ na mmiri ara ehi nkịtị, mmiri ara ehi kpụkọrọ akpụkọ, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi ndị a ghọtara ọhụrụ na ndị nke a mịrị amị na-eso ná nri a. E nwere ihe dị ka ụdị akụ́kụ́ iri atọ n’oge ahụ, dị ka yabasị, galik, karọt, kabeeji, na ndị ọzọ. A na-akụkwa ihe karịrị ụdị mkpụrụ osisi iri abụọ na ise n’ebe ahụ, dị ka (1) fig, (2) det, na (3) pọmigranet.

Ì nwere ike iji anya nke uche gị hụ ụfọdụ n’ime ihe oriri ndị a n’elu tebụl mgbe Jizọs na Lazarọs na ụmụnne ya ndị nwaanyị, bụ́ Mata na Meri, riri nri anyasị? Chegodị echiche ụdị ísì ọma juru n’ụlọ ahụ mgbe Meri ji “ezigbo mmanụ nad” tee Jizọs n’ụkwụ, ísì ihe oriri ahụ na ísì mmanụ ahụ na-esi ísì ụtọ eju ebe niile.—Jọn 12:1-3.

“Mgbe Ị Na-akpọ Oriri”

N’oge ọzọ, mgbe Jizọs nọ na-eri ihe oriri “n’ụlọ otu n’ime ndị na-achị achị bụ́ onye Farisii,” ọ kụziiri ndị nọ n’ebe ahụ otu ihe bara uru. Ọ sịrị: “Mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ. N’ihi na  a ga-akwụ gị ụgwọ ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.” (Luk 14:1-14) Ọ bụrụ na onye Farisii ahụ mere ihe a Jizọs kwuru, olee ụdị nri o nwere ike inye ndị ọ kpọrọ?

Onye bara ọgaranya nwere ike inye ndị ọ kpọrọ oriri achịcha pụrụ iche, ndị e mere n’ụdị dị iche iche ma tinye ha mmanya, mmanụ aṅụ, mmiri ara ehi, na ihe ndị ga-eme ka ha siwe ísì ọma. O nwekwara ike inye ha bọta na mmiri ara ehi kpụkọrọ akpụkpọ. O dokwara anya na ọ ga-enye ha mkpụrụ oliv a ghọrọ ọhụrụ, ndị nke e chekwara echekwa, ma ọ bụ mmanụ oliv. Akwụkwọ bụ́ Food in Antiquity kwuru na “otu onye na-eri iri kilogram mmanụ oliv abụọ n’ihe oriri kwa afọ, jirikwa ya na-eme mmanụ otite na mmanụ ọkụ.”

Ọ bụrụ na onye Farisii bi oké osimiri nso, ya na ndị ọ kpọrọ oriri nwere ike iri azụ̀ e gbutere ọhụrụ. Ndị na-ebighị mmiri nso na-erikarị azụ̀ ndị e ji mmanya gbara ụka ma ọ bụ nnu chekwaa. Onye ahụ kpọrọ oriri nwekwara ike inye ndị ọ kpọrọ anụ, bụ́ ihe ndị ogbenye na-anaghị atakarị. A na-enwekarị nri e ji àkwá sie n’ụdị oriri ahụ. (Luk 11:12) E nwere ike iji mkpá akwụkwọ na ihe ndị ọzọ na-ewepụta ụtọ nri, dị ka mint, dil, kọmin, na mọstad, mee ka nri ahụ tọkwuo ụtọ. (Matiu 13:31; 23:23; Luk 11:42) Ndị ahụ a kpọrọ oriri nweziri ike iji ọka wit a mịrị amị e tinyere almọnd, mmanụ aṅụ, na ihe ndị na-ewepụta ụtọ nri, tachaa ọnụ.

O yiri ka à na-enye ndị a kpọrọ oriri mkpụrụ vaịn, ma nke a ghọtara ọhụrụ, ma nke a mịrị amị, ma ọ bụ mmanya ya. A hụla ọtụtụ puku ebe a na-azọchapụta mmanya na Palestaịn, bụ́ nke gosiri na a na-aṅụkarị mmanya vaịn n’oge ahụ. N’otu ebe na Gibiọn, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ebe iri isii na atọ a na-echekwa mmanya, bụ́ ndị a wara ná nnukwu nkume, e nwekwara ike ịdọwa mmanya ruru otu narị puku lita na ha.

“Unu Echegbula Onwe Unu Mgbe Ọ Bụla”

Ka ị na-agụ akwụkwọ Baịbụl ndị kọrọ banyere ndụ Jizọs, leruo anya iji hụ ugboro ole Jizọs kpọrọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ aha n’ihe atụ ndị o mere ma ọ bụ otú o si kụzie ihe ụfọdụ bara uru mgbe ọ na-eri nri. N’ezie, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya riri ihe oriri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ, karịchaa mgbe ha na ezigbo ndị enyi ha nọ, ma ha ejighị ihe ndị ahụ mere ihe ndị kacha mkpa ná ndụ.

Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ile ihe oriri na ihe ọṅụṅụ anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ọ gwara ha, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” (Matiu 6:31, 32) Ndị na-eso ụzọ ya nabatara ndụmọdụ a, Chineke gbokwaara ha mkpa ha. (2 Ndị Kọrịnt 9:8) O nwere ike ịbụ na ihe oriri gị dị iche n’ihe ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ riri. Ma, nwee obi ike na Chineke ga-egboro gị mkpa gị ma ọ bụrụ na i bute ofufe ya ụzọ ná ndụ gị.—Matiu 6:33, 34.