Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Ọdịnihu Ụmụ Mmadụ

Banyere Ọdịnihu Ụmụ Mmadụ

 Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Ọdịnihu Ụmụ Mmadụ

Jizọs ò kwere nkwa na ndị mmadụ ga-adị ndụ n’eluigwe?

Ee, o kwere! A kpọlitere Jizọs n’onwe ya n’ọnwụ, ya alakwuru Nna ya n’eluigwe. Ma, tupu ya anwụọ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, ọ gwara ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị. . . . M na-aga ịkwadebere unu ebe.” (Jọn 14:2) Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-enwe ohere ọma a. Jizọs mere ka nke a doo anya mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.”—Luk 12:32.

Olee ihe “ìgwè atụrụ nta” ga-aga eluigwe ime?

Nna Jizọs chọrọ ka mmadụ ole na ole a soro Jizọs chịa n’eluigwe. Olee otú anyị si mara? Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ gwara Jọn onyeozi na ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 1:1; 5:9, 10) Nke a bụ ozi ọma. Otu n’ime ihe ndị kasị ụmụ mmadụ mkpa bụ ezi ọchịchị. Olee ihe ọchịchị a Jizọs ga-abụ eze ya ga-arụ? Jizọs kwuru, sị: “Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ.” (Matiu 19:28) Ọchịchị ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-achị ga-eme ka “ihe dị ọhụrụ,” ma ọ bụ mee ka ihe zuo okè otú ahụ ọ dị tupu di na nwunye mbụ dịrị ndụ n’ụwa emehie.

 Olee ihe Jizọs kwuru ga-abụ olileanya nke ụmụ mmadụ ndị ọzọ?

E kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ n’ụwa, ha adịghị ka Jizọs, bụ́ onye e kere ịdị ndụ n’eluigwe. (Abụ Ọma 115:16) N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Unu si n’ebe dị n’ala; esi m n’ebe dị n’elu.” (Jọn 8:23) Jizọs kwuru na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ga-atọ ezigbo ụtọ n’ụwa n’ọdịnihu. O nwere mgbe o kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Ọ nọ na-ekwu ihe e si n’ike mmụọ nsọ dee n’abụ ọma, nke bụ́: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile. Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:11, 29.

Ya mere, ọ bụghị naanị “ìgwè atụrụ nta,” bụ́ ndị ga-aga eluigwe, ga-adị ndụ ebighị ebi. Jizọs kwukwara banyere olileanya ọtụtụ nde mmadụ bi n’ụwa nwere ike inwe. O kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Olee otú Chineke ga-esi kwụsị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata?

Jizọs kwuru na ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha n’ụzọ ihe abụọ na-akpatara ha ihe isi ike mgbe o kwuru, sị: “A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a; ugbu a, a ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31) Nke mbụ bụ na a ga-ekpe ndị ajọ omume na-akpatara ndị ọzọ ahụhụ ikpe ma bibie ha. Nke abụọ abụrụ na a ga-achụpụ Setan, ọ gaghị enwekwa ike iduhie ụmụ mmadụ.

Oleekwanụ banyere ndị dịrịla ndụ n’oge ndị gara aga ma nwụọ n’enwetaghị ohere ịmụta banyere Chineke na Kraịst ma nwee okwukwe na ha? Jizọs gwara onye ajọ omume nwụrụ n’akụkụ Ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Mgbe Jizọs ga-akpọlite nwoke ahụ n’ọnwụ na paradaịs n’ụwa, ya na ọtụtụ nde mmadụ ndị ọzọ ga-enwe ohere ịmụ banyere Chineke. Ọ ga-enwe ohere iso ná ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Ọrụ 24:15.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere isiokwu a, gụọ isi nke 3 na nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 23]

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29