Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

 Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Olee otú nwoke malitere ise igbo na sịga mgbe ọ dị obere si nwee ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ? Olee ihe nyeere onye nọ n’òtù ọjọọ na-eme ihe ike aka ịchịkwa iwe ya na ịkwụsị ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị? Ka anyị tụlee ihe onye nke ọ bụla n’ime ha kọrọ.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: HEINRICH MAAR

ADỊ M AFỌ: 38

ABỤ M ONYE: KAZAKHSTAN

NDỤ M BIRI: ISE IGBO NA SỊGA RIRI M AHỤ́

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’ebe ndịda Kazakhstan, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri abụọ site n’obodo Tashkent. Ebe ahụ na-ekpo ezigbo ọkụ n’oge okpomọkụ, ọ na-ajụkwa ezigbo oyi n’oge oyi, nke mere ka ọ bụrụ ebe dị mma ịkụ mkpụrụ vaịn na igbo.

Ndị mụrụ nne na nna m bụ ndị Germany. Ha abụọ na-ekpe chọọchị na-agụ Baịbụl, ma ha anaghị eme ihe chọọchị ha kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ha kụziiri m ikpe ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe n’eleghị anya n’akwụkwọ. Mgbe m dị afọ iri na anọ, Ndịàmà Jehova mụtụụrụ mama m na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m Baịbụl. Otu ụbọchị, anọ m na-ege ntị mgbe Ndịàmà abụọ na-amụrụ mama m ihe gosiri ya aha Chineke, bụ́ Jehova, na Baịbụl nke ya. Nke ahụ metụrụ m n’ahụ́. Mama m kwụsịrị ịmụ Baịbụl, enwekwaghị m ọganihu ọ bụla n’ihe metụtara Okwu Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, otu ụbọchị n’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi anyị kọrọ ọtụtụ ihe ọjọọ ọ nụrụ banyere Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ha na-akpọ ndị òtù nzuzo. Ebe ọ bụ na esorola m nwanne m nwaanyị gaa ọmụmụ ihe ụfọdụ nke Ndịàmà Jehova, agwara m onye nkụzi anyị na ihe ndị ahụ ọ na-akọ abụghị eziokwu.

Mgbe m ruru afọ iri na ise, e dupụrụ m ịga mụọ ọrụ n’obodo Leningrad, nke bụ́zi St. Petersburg, Russia. Akọọrọ m ndị mụ na ha bi n’ụlọ ihe ole na ole m mụtarala banyere Jehova. Ma, amalitere m ise sịga. Mgbe ọ bụla m laruru ụlọ na Kazakhstan, ọ na-adịrị m mfe ịzụta igbo, n’agbanyeghị na iwu megidere ya. M na-aṅụfekwa mmanya ọkụ ókè.

Mgbe m mụchara ọrụ, esoro m ndị agha òtù Soviet rụọ ọrụ soja afọ abụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, echefughị m eziokwu ụfọdụ m  mụtara na Baịbụl mgbe m dị obere. Mgbe ọ bụla ohere dapụtara, m na-agwa ndị agha ibe m banyere Jehova ma na-agbachitere Ndịàmà mgbe e kwuru ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ha.

Mgbe m rụsịrị ọrụ soja, akwagara m Germany. Mgbe m nọ n’ogige ndị si mba ọzọ kwata Germany, anatara m otu akwụkwọ e ji amụ Baịbụl nke Ndịàmà bipụtara. Eji m oké ịnụ ọkụ n’obi gụọ ya, ya edookwa m anya na ihe o kwuru bụ eziokwu. Ma, akwụsịlighị m ise sịga na igbo, bụ́ nke ririla m ahụ́. Ka oge ụfọdụ gasịrị, akwagara m n’ebe dị nso n’obodo Karlsruhe. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ otu Onyeàmà Jehova, ya amalitekwa ịmụrụ m Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Kemgbe, obi m na-agwa m na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Mgbe m gụchakwara akwụkwọ ahụ e ji amụ Baịbụl e nyere m, o doro m anya na Baịbụl zara ajụjụ niile dị ndị mmadụ mkpa ná ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o were m oge ịgbanwe àgwà ọjọọ m. N’ikpeazụ, echebaara m ndụmọdụ Baịbụl ahụ dị ná 2 Ndị Kọrịnt 7:1 echiche ma kpebie ịsachapụ onwe m “mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,” bụ́ nke pụtara ịkwụsị ise igbo na sịga.

O wechaghị m oge ịkwụsị ise igbo. Ma, o were m ọnwa isii ịkwụsị ise sịga. Otu ụbọchị, Onyeàmà na-amụrụ m Baịbụl jụrụ m, sị, “Olee ihe ị chọrọ iji ndụ gị eme?” Nke ahụ mere nnọọ ka m chebara sịga ahụ m na-ese echiche. Agbalịrị m ugboro ugboro ịkwụsị ise sịga. Ma, ugbu a, ekpebiri m ịna-ekpe ekpere mgbe sịga gụwara m, kama isecha ya rịọwa Chineke mgbaghara. N’afọ 1993, ewepụtara m ụbọchị m ga-akwụsị ya. Site n’enyemaka Jehova, akpatụbeghị m sịga aka kemgbe ahụ.

URU NDỊ M RITERELA: Ugbu a m kwụsịrịla ise sịga na igbo, bụ́ àgwà na-emebi ahụ́ nke riri m ahụ́ ma na-efu m oké ego, ahụ́ agbasikwuola m ike. Taa, obi dị m ụtọ na m wepụtara onwe m na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Germany. Obi dị m nnọọ ụtọ na m mụtara ịṅa ntị na ndụmọdụ Baịbụl! Ịma ihe Baịbụl na-akụzi emeela ka m jiri ndụ m na-eme ihe bara uru.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: TITUS SHANGADI

ADỊ M AFỌ: 43

ABỤ M ONYE: NAMIBIA

NDỤ M BIRI: M NỌRỌ N’ÒTÙ ỌJỌỌ NKE NA-EME IHE IKE

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’otu ime ime obodo dị n’ógbè Ohangwena, n’ebe ugwu Namibia. E tiri ndị obodo anyị ihe ma gbuo ụfọdụ n’ime ha n’agha a lụrụ n’ógbè a n’agbata afọ 1980 na afọ 1988. N’obodo anyị, ọ bụrụ na nwata nwoke na-alụ ọgụ nke ọma ma na-akụli ụmụaka ibe ya ihe, a na-asị na ọ bụ dimkpa. N’ihi ya, amụrụ m otú e si alụ ọgụ.

Mgbe m gụchara akwụkwọ, agara m biri  n’ụlọ nwanne nne m, n’obodo Swakopmund dị n’ụsọ oké osimiri. Obere oge m rutere, abanyere m n’òtù ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enupụ isi. Anyị na-aga n’ebe a na-anaghị ekwe ka ndị isi ojii bata n’obodo ahụ, dị ka n’ụlọ oriri na n’ụlọ mmanya, naanị iji kpasuo ọgụ. Mgbe mgbe, anyị na ndị nche na ndị uwe ojii na-alụ ọgụ. Kwa abalị, m na-eji mma ogè dị nkọ akpagharị, iji lụso onye ọ bụla chọrọ m okwu ọgụ.

Otu abalị mgbe anyị na ndị òtù ọzọ anyị na ha na-adịghị ná mma na-alụ ọgụ, ọ fọrọ ntakịrị ka e gbuo m. Otu n’ime ndị ahụ anyị na ha na-alụ ọgụ si n’azụ chọọ ibepụ m isi, ma, onye òtù anyị hụrụ ya, kụọ ya ihe, ya atụbọọ. N’agbanyeghị otú a ọnwụ si kụọrọ m aka n’ụzọ, anọgidere m na-eme ihe ike. Mgbe ọ bụla mụ na mmadụ sewere okwu, ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ bụ m na-ebu ụzọ akụ ihe.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe mbụ Onyeàmà Jehova ziri m ozi ọma, ọ gụụrụ m amaokwu ụfọdụ n’Abụ Ọma nke 37 ma gwa m na e nwere nkwa ndị ọzọ magburu onwe ha Chineke kwere n’akwụkwọ Mkpughe banyere ọdịnihu. Ma ebe ọ na-ekwughị ebe nkwa ndị ahụ dị n’akwụkwọ Mkpughe, eweere m Baịbụl gụchaa Mkpughe n’abalị ahụ. Nkwa m gụtara ná Mkpughe 21:3, 4, nke bụ́ na “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ,” tọrọ m ụtọ. Mgbe ọzọ Ndịàmà bịara, ekwetara m ka mụ na ha mụwa Baịbụl.

O siiri m ezigbo ike ịgbanwe otú m si eche echiche na otú m si eme omume. Ma, amụtara m n’Ọrụ 10:34, 35 na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” Arụsikwara m ọrụ ike ime ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:18, nke bụ́: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”

Ọ bụghị naanị na m mụtara ịchịkwa iwe m, kama m kwụsịkwara ise sịga, bụ́ àgwà ririla m nnọọ ahụ́. Mgbe mgbe, m na-eji anya mmiri ekpegara Jehova ekpere ka o nyere m aka. Ma o doro anya na otú m si chọọ ịkwụsị ya na mbụ ezighị ezi. M were sịga m ga-aṅụ, mụ agwa onwe m na ọ bụ nke “ikpeazụ,” m ṅụchaa ya, mụ ekpee ekpere. Onyeàmà na-amụrụ m Baịbụl nyeere m aka ịhụ mkpa ọ dị ikpe ekpere mgbe sịga gụwara m. Ọ dịkwa mkpa ka mụ na ndị na-ese sịga kwụsị ịkpa. Esokwaara m aro a tụụrụ m, nke bụ́ ịgwa ndị mụ na ha na-arụ ọrụ otú ise sịga si dị njọ. Nke a nyeere m nnọọ aka n’ihi na o mere ka ndị ọrụ ibe m na-ese sịga kwụsị inyetụ m sịga.

Emechaziri m kwụsị ise sịga, kwụsịkwa ndụ ọjọọ m na-ebibu. Mgbe m mụsịrị Baịbụl ọnwa isii ma na-eme ihe ndị m na-amụta, eruru m eru ịghọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim.

URU NDỊ M RITERELA: Ọ bịara doo m anya na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ ezi okpukpe mgbe m hụrụ otú ha si ahụrịta ibe ha n’anya, n’agbanyeghị agbụrụ ha na ụcha akpụkpọ ahụ́ ha. Tupu mụ aghọọdị Onyeàmà e mere baptizim, otu onye ọcha anyị na ya nọ n’ọgbakọ kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya rie ihe. Ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Mụ na onye ọcha anọtụbeghị ọdụ kwurịta okwu n’udo, ka ọ fọkwa ịga n’ụlọ ya rie ihe. Ugbu a, eso m n’ezigbo òtù ụmụnna nọ n’ụwa dum.

N’oge ndị gara aga, ndị nche na ndị uwe ojii nwara ime ka m gbanwee otú m si eche echiche na otú m si eme omume, ma ha emelighị ya. Ọ bụ naanị Baịbụl meliri ka m gbanwee àgwà m ma nwee obi ụtọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]

“Mgbe mgbe, m na-eji anya mmiri ekpegara Jehova ekpere ka o nyere m aka”