Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

 Ị̀ Maara?

Olee ndị bụ́ ndị odeakwụkwọ ahụ megidere Jizọs?

Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, o zutere ndị odeakwụkwọ na Jeruselem nakwa n’obodo nta dị iche iche. N’ebe ndị na-abụghị Jeruselem, ndị ikom a bụ ndị ọrụ ọkwá ha na-adịchaghị elu, ndị maara Iwu Mozis nke ọma, ọ ga-abụkwa na ha rụrụ ọrụ idepụta ihe ma ọ bụ ikpe ikpe n’ụlọikpe, rụọkwa ọrụ ndị a ọbụna n’ebe ndị ọzọ ndị Juu bi na-abụghị na Palestaịn.—Mak 2:6; 9:14; Luk 5:17-21.

Na Jeruselem, ndị odeakwụkwọ na ndị ọchịchị ndị Juu rụkọchiri ọrụ anya. (Matiu 16:21) Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru na ọrụ ha n’ebe ahụ “yiri ka ọ̀ bụ inyere ndị nchụàjà aka, ma n’ikpe ikpe ma n’ịhụ na ndị mmadụ debere omenala na iwu ndị Juu, ha nyekwara aka n’ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọikpe Sanhedrin.” Ebe ọ bụ na ndị odeakwụkwọ bụ aka ochie n’ịkụzi Iwu ahụ, ụfọdụ n’ime ha sodị na Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu ndị Juu. Ha na ndị isi nchụàjà na ndị Farisii rụkọrọ ọrụ.

Ọtụtụ mgbe, Baịbụl gwara anyị na ndị odeakwụkwọ megidere Jizọs. Ma, ụfọdụ n’ime ha emegideghị ya. Dị ka ihe atụ, otu odeakwụkwọ gwara Jizọs, sị: “M ga-eso gị gaa ebe ọ bụla ị chọrọ ịga.” Jizọs gwara odeakwụkwọ ọzọ, sị: “Ị nọghị alaeze Chineke ebe dị anya.”—Matiu 8:19; Mak 12:28-34.

Olee ihe mmadụ ịbụ onye e tere mmanụ pụtara?

N’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge Baịbụl, ite mmadụ mmanụ n’isi bụ otú e si egosi na a hụrụ onye ahụ n’anya ma ọ bụkwanụ otú e si ele mmadụ ọbịa. Mmanụ a na-ejikarị eme ya bụ mmanụ oliv e tinyere ihe na-esi ísì ụtọ. Ndị Hibru na-awụsakwa mmadụ mmanụ n’isi, ma ọ bụ tee onye ahụ mmanụ, mgbe a na-ahọpụta ya ịrụ ọrụ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, e tere Erọn mmanụ mgbe a họpụtara ya ịbụ nnukwu onye nchụàjà. (Levitikọs 8:12) Mgbe a họpụtakwara Devid ịbụ eze, ‘Samuel weere mpi mmanụ tee ya mmanụ, mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.’—1 Samuel 16:13.

N’asụsụ Hibru, ihe a na-akpọ isi otú ahụ ete mmadụ mmanụ bụ ma·shachʹ, bụ́ ebe e si nweta okwu bụ́ ma·shiʹach, ma ọ bụ Mesaya. Okwu Grik ya na ya bụ otu bụ khriʹo, bụ́ ebe e si nweta khri·stosʹ, ma ọ bụ Kraịst. N’ihi ya, e nwere ike ịkpọ ma Erọn ma Devid mesaya, ma ọ bụ onye e tere mmanụ. A kpọkwara Mozis kraịst, ma ọ bụ onye e tere mmanụ, n’ihi na Chineke họpụtara ya ịbụ onye nnọchianya Ya.—Ndị Hibru 11:24-26.

Chineke ji aka ya họpụta Jizọs onye Nazaret ịnọ n’ọkwá dị elu. E jighị mmanụ nkịtị tee Jizọs mmanụ, kama, e ji mmụọ nsọ Chineke tee ya mmanụ. (Matiu 3:16) Ebe Jizọs bụ Onye E Tere Mmanụ nke Jehova họpụtara, ọ dabara adaba na a na-akpọ ya Mesaya, ma ọ bụ Kraịst.—Luk 4:18.