Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Okwu ahụ Ọ̀ Bụ “Chineke” Ka Ọ̀ Bụ “chi”?

Okwu ahụ Ọ̀ Bụ “Chineke” Ka Ọ̀ Bụ “chi”?

NDỊ nsụgharị Baịbụl aghaghị ichebara ajụjụ a echiche mgbe ha na-asụgharị Jọn isi nke mbụ amaokwu nke mbụ. Lee otú e si sụgharịa amaokwu a ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ: “Okwu ahụ nọ ná mmalite, Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa chi.” (Jọn 1:1) Otú e si sụgharịa akụkụ ikpeazụ nke amaokwu a na Baịbụl ụfọdụ na-egosi na Okwu ahụ “dị ka Chineke,” ma ọ bụ ihe yiri ya. (Nsụgharị bụ́ A New Translation of the Bible, nke James Moffatt sụgharịrị nakwa nsụgharị bụ́ The New English Bible) Ma, lee otú e si sụgharịa akụkụ ikpeazụ nke Jọn 1:1 n’otu Baịbụl: “Okwu ahụ bụrụkwa Chineke.”—Bible Nsọ nke Igbo Union Version.

Ụtọ asụsụ Grik na amaokwu ndị ọzọ dị na Jọn isi nke mbụ na-egosi nke ọma na otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si sụgharịa ya magburu onwe ya nakwa na “Okwu ahụ” agaghị abụ “Chineke” ahụ e bu ụzọ kwuo okwu ya n’amaokwu ahụ. Ka o sina dị, ndị mmadụ na-aghọta amaokwu a n’ụzọ dị iche iche ebe ọ bụ na n’oge ochie asụsụ Grik enweghị okwu ndị na-egosi na o nweghị otu onye ma ọ bụ otu ihe a kapịrị ọnụ a na-ekwu mgbe a na-ekwu maka mmadụ ma ọ bụ ihe. Ọ bụ nke a mere o ji dị mkpa ka anyị tụlee otu Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ  a na-asụ n’oge na-adịghị anya e dechara Oziọma Jọn.

Asụsụ ahụ bụ Sahidic nke ndị Copt na-asụ. A malitere ịsụ asụsụ ndị Copt n’Ijipt n’ime narị afọ ole na ole Jizọs gachara ozi n’ụwa. Sahidic bụ olumba mbụ a malitere ide ede n’asụsụ ndị Copt. Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru banyere Baịbụl ndị mbụ a sụgharịrị n’asụsụ ndị Copt, sị: “Ebe ọ bụ na a malitere ịsụgharị [Septuagint] na [Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst] n’asụsụ ndị Copt n’ihe dị ka narị afọ abụọ a mụchara Kraịst, nke a pụtara na e si [n’ihe odide asụsụ Grik] sụgharịa ha, bụ́ ndị ka ọtụtụ ihe odide ndị a ka nwere ugbu a mee ochie.”

Ọ dị ihe abụọ mere Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Sahidic nke ndị Copt na-asụ ji pụọ nnọọ iche. Nke mbụ bụ na dị ka e kwuru na mbụ, ọ na-egosi otú Ndị Kraịst dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ atọ a mụchara Kraịst, bụ́ mgbe ndị ụka malitere ịkụzi ozizi Atọ n’Ime Otu, si ghọta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Nke abụọ bụ na o nwere otu ebe dị mkpa ụtọ asụsụ ndị Copt yiri ụtọ asụsụ Bekee. Asụsụ Siria, Latịn, na nke ndị Copt bụ asụsụ ndị mbụ e nwere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na ha. Asụsụ Siria na Latịn enweghị okwu ndị na-egosi na o nweghị otu onye ma ọ bụ otu ihe a kapịrị ọnụ a na-ekwu mgbe a na-ekwu maka mmadụ ma ọ bụ ihe, dị ka asụsụ Grik na-enweghị. Ma, asụsụ ndị Copt nwere ya. Ọkà mmụta bụ́ Thomas O. Lambdin, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Introduction to Sahidic Coptic, sị: “Mkpụrụ okwu ndị Copt, nke na-akapị otu onye ma ọ bụ otu ihe a na-ekwu okwu ya ọnụ na nke na-anaghị akapị ya ọnụ yiri nnọọ nke asụsụ Bekee.”

N’ihi ya, nsụgharị Baịbụl ndị Copt na-eme ka e nwee ihe àmà na-egosi otú e si aghọta Jọn 1:1 n’oge ahụ. Gịnị bụ ihe àmà ahụ? Na Baịbụl ahụ, n’akụkụ okwu ahụ bụ́ “chi” nke dị ná ngwụcha ngwụcha Jọn 1:1, e dere okwu na-egosi na e nweghị otu chi a kapịrị ọnụ a na-ekwu okwu ya. Ya mere, a sụgharịa ya n’asụsụ Igbo a na-asụ n’oge a, ọ ga-agụ, sị: “Okwu ahụ bụkwa chi.” O doro anya na ndị sụgharịrị Baịbụl n’oge ochie ghọtara na ihe Jọn dere na Jọn 1:1 apụtaghị na Jizọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Okwu ahụ bụ chi, ọ bụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.