Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Olee ihe mere nwa okorobịa onye Mexico nke nọ n’òtù ọjọọ a na-akpọ Junior Satans (Ụmụ Obere Setan) ji gbanwee omume ya wee bụrụ nwa amaala na-arụsi ọrụ ike, nke na-akwụwa aka ọtọ? Olee ihe mere nwaanyị Japan nke na-eme nke ọma n’ịchụ nta ego ji kwụsị ịchụ akụnụba, oleekwa otú obi dị ya maka mgbanwe ndị o mere? Gịnị mere onye Russia nke na-ere ngwá agha iwu na-akwadoghị, bụ́ nke na-enye ya ezigbo ego, ji kwụsị ahịa iwu ahụ? Gụọ ihe ha kwuru n’otu n’otu.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: ADRIAN PEREZ

ADỊ M AFỌ: 30

ABỤ M ONYE: MEXICO

NDỤ M BIRI: M NỌBU N’ÒTÙ ỌJỌỌ

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na atọ, ezinụlọ anyị kwagara Ecatepec de Morelos, Mexico State. N’oge ahụ, imebisị ihe, ịṅụ ọgwụ ọjọọ na arụrụala ụmụaka na-arụ zuru obodo ahụ dum. N’oge na-adịghị anya, m malitere ịṅụbiga mmanya ókè, imebisị ihe ndị mmadụ, na ịkwa iko.

Ka oge na-aga, anyị laghachiri San Vicente, bụ́ ebe a mụrụ m. Ma, ịṅụ ọgwụ ọjọọ aghọọla nnukwu nsogbu n’ebe ahụ. A na-ahụkarị ozu ndị na-eto eto ka ha tọgbọ n’okporo ụzọ. M banyere n’òtù ọjọọ a na-akpọ Junior Satans (Ụmụ Obere Setan). Anyị na-ezu ohi, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ, karịchaa, ndị nke e ji imi ekuru. Ọtụtụ mgbe, anaghị m echeta otú m si lọrute n’ụlọ, m na-atọgbọrọkwa n’okporo ámá mgbe ụfọdụ n’amaghị ihe m na-eme. A tụrụ ụfọdụ n’ime ndị enyi m mkpọrọ maka izu ohi na igbu mmadụ.

N’agbanyeghị ihe ọjọọ niile m nọ na-eme, m kweere na Chineke. Iji mee ka akọnuche m ghara ịmagbu m n’ikpe, m na-eso eme ihe dị iche iche a na-eme na chọọchị, dị ka ngagharị nke obe n’Izu Ụka Dị Nsọ. Ma, mgbe anyị mechara nke ahụ, anyị niile, tinyere onye mere ka à ga-asị na ọ bụ ya bụ Kraịst, na-eji ịṅụbiga mmanya ókè apịachi ihe niile anyị mere n’ụbọchị ahụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe ọ fọrọ obere ka m gbaa afọ iri abụọ, Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri m Baịbụl. Aghọtara m na ndụ m na-ebi enweghị isi, ghọtakwa na ọ bụrụ na m jide aka m ji ugbu a na ihe agaghị agaziri m. Ihe metụrụ m n’ahụ́ bụ ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:8, nke sịrị: “Onye na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́ ya ga-aghọrọ ire ure site n’anụ ahụ́ ya, ma onye na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ ga-aghọrọ ndụ ebighị ebi site na mmụọ nsọ.” Amaokwu a mere ka m ghọta na m kwesịrị iburu ọdịnihu m n’uche na-agha mkpụrụ, ma ọ bụrụ na m chọrọ ka ihe gaziere m.

Ka m na-amụ Baịbụl, m malitere ịghọta na Jehova bụ Chineke dị ndụ, onye nwere mmasị n’ebe m nọ, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie ndị m mere n’oge gara aga. Ihe ndị mere ná ndụ m mere ka o doo m anya na ọ na-anụ ma na-aza ekpere.

Ọ dịghịrị m mfe ịgbanwe otú m si ebi ndụ. Ịhapụ òtù ọjọọ ahụ m nọ adịghị mfe. Òtù dị iche iche nwere ebe ụfọdụ ndị nọ n’òtù ọzọ na-anaghị abanye, enweghịkwa m ike isi na ha gafere, ọ bụ ezie na anọkwaghị m n’òtù ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, m na-ezo ezo ka ndị bụbu ndị enyi m ghara ịhụ m, n’ihi na ha ga-achọ otú ha ga-esi enweta m ka m soro ha mewe omume ọjọọ m na-emebu.

Ma, mgbe m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, m chọpụtara na ndị nọ n’ọgbakọ ahụ hụrụ onwe ha n’anya, na-akpasokwa ibe ha àgwà ọma. Obi tọrọ m ụtọ ịhụ na ha nwere okwukwe siri ike, nakwa na ha na-eme ihe ha na-akụzi. Ịnọ n’etiti ha dị nnọọ iche n’ịnọ n’etiti ndị mụ na ha na-akpabu.

URU NDỊ M RITERELA: M ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova e mere baptizim kemgbe afọ iri gara aga. M na-agbalịsi ike itinye ihe Baịbụl na-akụzi n’ọrụ ná ndụ m. N’ihi ya, ndị ezinụlọ anyị na-akwanyere m ùgwù. Ugbu a, ha ma na m na-arụsi ọrụ ike, m na-enyekwara ha aka mgbe ego dị ha mkpa. Mama m malitere ịmụ Baịbụl, ọ ghọwokwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ugbu a. Papa m amalitewokwa ịgbanwe otú o si ebi ndụ. Ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ anyị abụghị Ndịàmà Jehova, ma, mgbe ha hụrụ otú ndụ m si gbanwee, ha kwetara na Baịbụl nwere ike inyere mmadụ aka ka ndụ ya ka mma.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: YAYOI NAGATANI

ADỊ M AFỌ: 50

ABỤ M ONYE: JAPAN

NDỤ M BIRI: ỊCHỤ NTA EGO DORO M ANYA

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etolitere m n’otu obere obodo nke ndị bi na ya hụrụ onwe ha n’anya. Papa m nwere nnukwu ụlọ ahịa n’obodo ahụ, bụ́ ebe mmadụ iri na-erere anyị ahịa. Ụlọ anyị dị n’akụkụ ụlọ ahịa ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ezie na papa m na mama m anaghị enwe efe, owu anaghị ama anyị.

Anyị dị ụmụ nwaanyị atọ ha mụrụ. Ọ bụ m bụ ada. N’ihi ya, malite mgbe m dị obere, a zụrụ m ka e nwee ike inyefe m ahịa anyị na-azụ. M lụrụ di na nwata. Di m kwụsịrị ọrụ ọ na-arụ n’ụlọ akụ̀ wee bịa na-enye aka n’ahịa ahụ ezinụlọ anyị na-azụ. Ngwa ngwa, anyị mụrụ ụmụ atọ. Mama m na-anọ n’ụlọ na-elekọta ụmụ m ma na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ma, mụ onwe m na-anọ n’ụlọ ahịa anyị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere oge ezinụlọ anyị na-eji anọkọ ọnụ.

Mgbe oge na-aga, e nwere ihe isi ike n’obodo anyị, ọ kpakwara ahịa anyị aka ọjọọ. N’ihi ya, anyị kpebiri imeghe ebe a na-ere ihe e ji achọ ụlọ mma n’ebe dị nso n’okporo ụzọ awara awara. Ụbọchị bọtara ụbọchị anyị ga-eme oriri e ji amalite ịrụ ụlọ ahịa ahụ, papa m, bụ́ onyeisi ụlọ ahịa anyị, tụbọrọ n’ihi ọrịa ụbụrụ nke bịara ya ná mberede. Ọrịa ahụ mere ka ọ kwụsị ikwu okwu nke ọma, n’ihi ya, ọ bụ m hụziri banyere ụlọ ahịa ọhụrụ ahụ, di m ana-ere ahịa n’ụlọ ahịa ochie ahụ. Ọ dịghịkwa onye n’ime anyị na-enwe efe.

Ahịa na-aga n’ụlọ ahịa ọhụrụ ahụ nke ọma. Afọ juru m ná mgbalị niile m na-eme, m wee were oge m kwesịrị iji na-ehi ụra na-ere ahịa. Ọ bụ ezie na m hụrụ ụmụ m n’anya, ihe m na-eche mgbe niile bụ banyere ahịa. Anaghị m enwe efe ka mụ na di m kwurịta okwu. Mgbe ọ bụla anyị kwuru okwu, anyị na-arụ ụka nke ukwuu. Iji mee ka nchegbu m na-enwe belata, mụ na ndị enyi m na ndị mụ na ha na-azụ ahịa malitere ịga na-aṅụ mmanya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ abalị niile. Naanị ihe m na-eme bụ ịzụ ahịa, ịṅụ mmanya, na ihi ụra. M na-akpata ego, ma, enweghị m obi ụtọ, aghọtaghịkwa m ihe mere o ji dị otú ahụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri m Baịbụl, e nwere ụzọ ebe atọ na Baịbụl metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu. M bere ákwá mgbe m ghọtara ihe Matiu 5:3 na-ekwu, bụ́ ebe sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” Amaokwu a gosiri ihe mere na enweghị m afọ ojuju n’agbanyeghị na m nwere ego, n’agbanyeghịkwa na ndị enyi m na-akwanyere m ùgwù. M ghọtara na ọ bụ naanị ịmara mkpa ime mmụọ m na igbo ya ga-eme ka m nwee ezi obi ụtọ.

N’oge ahụ, akụnụba mba Japan ghasasịrị, m wee hụ ná ndụ ndị enyi m na ihe 1 Timoti 6:9 kwuru bụ eziokwu, bụ́ ebe sịrị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.” M ghọtara na ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:24 metụtara m. Ọ sịrị na “unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” N’ihi ya, m kpebiri ịgbanwe ndụ m.

M ghọtara na m nọ na-eleghara nne na nna m, di m, na ụmụ m anya. O dokwara anya na mụ amalitela ịkpa àgwà ụfọdụ na-adịghị mma. M dịzi mpako. Anaghịkwa m enwe ndidi mgbe mụ na ndị mmadụ na-emekọ ihe. Obere ihe na-akpasu m iwe. Ná mmalite, m chere na ọ gaghị adịrị m mfe ịgbanwe ghọọ Onye Kraịst. Otú ọ dị, m hụrụ ụmụ m n’anya nke ukwuu, m chọpụtakwara na ka m na-etinye ndụmọdụ Baịbụl n’ọrụ n’otú m si emeso ezinụlọ m ihe, ụmụ m mewere nke ọma. Mụ na ha na-anọ karịa ka anyị na-anọbu, m na-akpọkwa ha aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

URU NDỊ M RITERELA: Mmata m matara ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ na mmalite m malitere ife Chineke, na-ebi ndụ na-atọ ya ụtọ, emeela ka m nwee ezi ọṅụ na afọ ojuju. Anaghịzi m ahapụ ezinụlọ m n’ihi ahịa, n’ihi ya, a maliteghachila ịkwanyere m ùgwù n’ezinụlọ m.

Mgbe mama m hụrụ na àgwà m akala mma n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru, ọ malitere ịmụ Baịbụl wee ghọọ Onye Kraịst. Obi tọrọ m ụtọ na papa m na di m anaghị emegide anyị n’ihi mkpebi anyị mere. Mụ na ụmụ m adịkwuola nnọọ ná mma, ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a.

ONYE M BỤ

AHA M BỤ: MIKHAIL ZUYEV

ADỊ M AFỌ: 51

ABỤ M ONYE: RUSSIA

NDỤ M BIRI: M NA-ERE NGWÁ AGHA IWU NA-AKWADOGHỊ

AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ahịhịa mara mma ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ juru n’obodo a mụrụ m, bụ́ Krasnogorsk. Osimiri Moscow na-esi n’ebe ndịda ya asọfe. Oké ọhịa juru n’ebe ọdịda anyanwụ nakwa n’ebe ugwu obodo a, jukwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu.

Mgbe m bụ nwata, ịkụ ọkpọ na iji ngwá ọgụ egwuri egwu na-amasị m. M na-ewepụta oge dị ukwuu na-emega ahụ́. M na-akpụkwa égbè na mgbọ ndị iwu na-akwadoghị, na-akpụkwa mma. Mgbe oge na-aga, ọ ghọrọ ihe m ji akpa ego. M haziri ọrụ m nke ọma, m na-eresị ndị omekome ihe ndị m rụpụtara, ya ana-agaziri m.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe afọ 1989 gafechara, Ndịàmà Jehova gwara m okwu. Ma ná mmalite, atụkwasịghị m ha obi. Ha na-ajụ ọtụtụ ajụjụ.

Otu ụbọchị, otu n’ime ha gụụrụ m Ndị Rom 14:12, bụ́ ebe sịrị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” M wee jụọ onwe m ihe m ga-aza Chineke. Amaokwu a mere ka m malite ịmụ ihe Chineke chọrọ n’aka m.

M gbalịsiri ike na-etinye ndụmọdụ Baịbụl, nke e dere ná Ndị Kọlọsi 3:5-10, n’ọrụ. Ebe ahụ sịrị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị. Ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ ka ọnụma Chineke ji abịa. . . . Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu. Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha. Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ.”

O siiri m ike nke ukwuu ime ihe ndị ahụ. Ndị “na-azụ m ahịa” n’oge gara aga nọgidere na-enye m ego ka m resị ha ngwá agha, o sikwaara m ike ijide onwe m mgbe ndị mmadụ kparịrị m. N’agbanyeghị nke ahụ, m bibiri ngwá agha dị iche iche dị oké ọnụ ahịa m na-ere. Ihe m nọ na-amụta banyere ịhụnanya Chineke na Kraịst gosiri m mere ka m malite ịhụ ha n’anya. M nọgidesiri ike na-amụ Baịbụl, na-aga ọmụmụ ihe n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe, na-ekpekwa ekpere ka Chineke nyere m aka.

URU NDỊ M RITERELA: Ụmụnna m Ndị Kraịst nyeere m aka, m wee jiri nwayọọ nwayọọ mụta ezi àgwà, ọ bụ ezie na ọ dịghịrị m mfe. Otu ihe na-eme m obi ụtọ bụ nghọta m ghọtara na Jehova bụ́ Chineke hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị, ọbụna ndị nwụrụ anwụ, n’anya. (Ọrụ 24:15) Ihe ọzọ dị m mma nke ukwuu bụ na Ndịàmà Jehova na-ekwu eziokwu, na-akwụwakwa aka ọtọ. Enwere m obi ekele maka ezi mmasị ha nwere n’ebe m nọ, otú ha si eguzosi ike n’ebe Chineke nọ masịkwara m.

Ná mmalite, ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ m na ndị enyi m enweghị mmasị n’okpukpe ọhụrụ m. Ma, ihe mere obi ji dajụọ ha bụ na ha ghọtara na ọ ka mma na m nọ n’okpukpe ọhụrụ a karịa ịnọ n’òtù ndị na-eme mpụ. Obi dị m ụtọ na ihe m na-eme ná ndụ m abụkwaghị ire ngwá agha, kama ọ bụ inyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Chineke nke udo.

[Foto dị na peeji nke 27]

M na-eso eme ihe dị iche iche ndị Katọlik na-eme iji mee ka akọnuche m ghara ịmagbu m n’ikpe

[Foto dị na peeji nke 28]

M na-akpata ego, ma enweghị m obi ụtọ