Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Oge Na-adịghị Anya!

Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Oge Na-adịghị Anya!

Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Oge Na-adịghị Anya!

“Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” —Matiu 6:9, 10.

EKPERE a a ma ama, nke ọtụtụ ndị na-akpọ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị, na-eme ka ụmụ mmadụ nwee olileanya. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

Dị ka Ekpere Onyenwe Anyị na-egosi, Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa otú ahụ uche ya si eme n’eluigwe ugbu a. Nzube Chineke bụ ime ka ụwa ghọọ Paradaịs. (Mkpughe 21:1-5) Gịnị ka Alaeze Chineke bụ n’ezie? Oleekwa otú ọ ga-esi mee ka ụwa ghọọ Paradaịs?

Ọ Bụ Ọchịchị

Alaeze Chineke bụ ọchịchị. Tupu ọchịchị ọ bụla amalite ịchị, ọ ga-enwe ndị ọchịchị, nwee iwu, na ndị ọ ga-achị. Alaeze Chineke ò nwere ihe ndị a niile? Lee otú Baịbụl si zaa ajụjụ atọ na-esonụ:

Olee ndị ga-abụ ndị ọchịchị Alaeze Chineke? (Aịzaya 33:22) Jehova bụ́ Chineke họpụtara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ka ọ bụrụ eze nke Alaeze ahụ. (Matiu 28:18) Jehova duziri Jizọs, o wee họrọ ụmụ mmadụ ụfọdụ site “n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile” bụ́ ndị ya na ha ga-achị “ụwa dị ka ndị eze.”—Mkpughe 5:9, 10.

Olee iwu Alaeze Chineke nyere ndị ọ ga-achị? Ụfọdụ n’ime iwu ahụ nwere ihe ha chọrọ ka ndị e nyere ya na-eme. Jizọs kwuru iwu ndị kacha mkpa n’ime iwu ndị ahụ, sị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”—Matiu 22:37-39.

Iwu ndị ọzọ nwere ihe ndị ha kwuru ka ndị Alaeze Chineke ga-achị ghara ime. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Olee ndị ka Alaeze Chineke ga-achị? Jizọs ji ndị Alaeze Chineke ga-achị tụnyere atụrụ. Ọ sịrị: “Ha ga-ege ntị n’olu m, ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Iji soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị, mmadụ agaghị ekwu naanị n’ọnụ na ya na-eso Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jizọs, kamakwa, ọ ga na-eme ihe o nyere n’iwu. Jizọs sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.”—Matiu 7:21.

N’ihi ya, ndị Alaeze Chineke ga-achị na-akpọ aha Chineke, bụ́ Jehova, na-akwanyekwara ya ùgwù, otú ahụ Jizọs mere. (Jọn 17:26) Ha na-erube isi n’iwu ahụ Jizọs nyere ka ha na-akụziri ndị mmadụ banyere “ozi ọma nke a nke alaeze” ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha hụrụ ibe ha n’anya site n’ala ala obi ha.—Jọn 13:35.

“Ibibi Ndị Na-ebibi Ụwa”

Ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-egosi na Alaeze Chineke ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji mee ka ihe gbanwee nke ukwuu n’ụwa. Olee otú anyị si mara nke a? Na puku afọ abụọ gara aga, Jizọs kọwara ihe ịrịba ama nke ga-egosi na “alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, a na-ahụ ihe dị iche iche so n’ihe ịrịba ama ahụ n’ebe niile n’ụwa taa.

Olee ihe ọzọ ga-eme? Jizọs zara, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Matiu 24:21) Nke a agaghị adị ka ọdachi ụmụ mmadụ na-akpata. Kama, ọ bụ ihe Chineke ga-eweta iji ‘bibie ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) “A ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa,” bụ́ ndị na-emebisị ụwa n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha naanị. Ma, “ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya,” bụ́ ndị na-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara.—Ilu 2:21, 22.

Jehova bụ́ Chineke nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji bibie ndị ajọ omume. Gịnị mere ọ ga-eji bibie ha? Tụlee ihe atụ a: Ka e were ya na o nwere ụlọ ị rụrụ. Ụfọdụ ndị bi na ya na-akpa ezigbo àgwà, ihe ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi; ha na-akwụ ụgwọ ụlọ, na-elekọtakwa ụlọ ahụ. Ma, ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ na-akpa àgwà ọjọọ, na-achọkwa ọdịmma onwe ha naanị; ha anaghị akwụ ụgwọ ụlọ, ha na-emebisịkwa ụlọ ahụ. N’agbanyeghị na ị dọọla ha aka ná ntị ugboro ugboro, ha nọgidere na-akpa àgwà ọjọọ. Gịnị ka ị ga-eme? Ebe ọ bụ gị nwe ụlọ ahụ, ị ga-achụpụ ndị ọjọọ ahụ bi na ya.

N’otu aka ahụ, ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, ka ọ dị n’aka ikpebi ndị ọ ga-ahapụ ka ha biri n’ụwa. (Mkpughe 4:11) Jehova kwuru na nzube ya bụ iwepụ ndị ajọ omume n’ụwa a, bụ́ ndị na-anaghị eme uche ya ma na-emegide ndị ọzọ.—Abụ Ọma 37:9–11.

Ime Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, nke Jizọs Kraịst bụ eze ya, ga-amalite ịchị ụwa. Jizọs kwuru na oge a bụ “mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ.” (Matiu 19:28) Olee otú ihe ga-adị mgbe ahụ? Lee nkwa ndị dị na Baịbụl:

Abụ Ọma 46:9. “Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.”

Aịzaya 35:1. “Ala ịkpa na ógbè mmiri na-adịghị ga-enwe aṅụrị, mbara ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, waakwa okooko dị ka okooko safrọn.”

Aịzaya 65:21-23. “Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghịkwa amụ ụmụ mụta nsogbu.”

Jọn 5:28, 29. “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”

Mkpughe 21:4. “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”

Ihe Mere Anyị Ga-eji Kwere

Ì kwere na nkwa niile dị na Baịbụl ga-emezu? Baịbụl buru amụma na ọtụtụ ndị agaghị ekwe. Ọ sịrị: “N’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha, na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.’” (2 Pita 3:3, 4) Ma, ndị ahụ na-akwa emo a hiere ụzọ nke ukwuu. Tụlee ihe anọ mere ị ga-eji kwere ihe Baịbụl kwuru:

(1) O nweela mgbe Chineke bibiri ndị ajọ omume n’ụwa n’oge gara aga. Otu n’ime ya bụ mgbe e ji Iju Mmiri bibie ndị ajọ omume n’oge Noa.—2 Pita 3:5-7.

(2) Okwu Chineke buru amụma kpọmkwem banyere ihe ndị na-eme n’ụwa.

(3) Ihe niile adịghị “kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.” Ụwa anyị emebiela nke ukwuu otú ọ na-emebitụbeghị, mmekọrịta ụmụ mmadụ na ibe ha na omume ha aghịghasịala.

(4) Taa, a na-ekwusa ‘ozi ọma nke alaeze’ n’ụwa niile, bụ́ nke na-egosi na “ọgwụgwụ ga-abịa” n’oge na-adịghị anya.—Matiu 24:14.

Ndịàmà Jehova na-agwa gị ka gị na ha mụwa Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ka i wee mụtakwuo banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi mgbe Alaeze Chineke ga na-achị. (Jọn 17:3) N’ezie, ihe magburu onwe ya ga-eru ụmụ mmadụ aka n’ọdịnihu. Oge kacha mma ga-abịa n’oge na-adịghị anya! Ị̀ ga-eso ná ndị ihe ọma a ga-eru aka n’ọdịnihu?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Ndị na-asị na ihe ga-adị kpọmkwem otú ha dị kemgbe na-ehie ụzọ nke ukwuu

[Foto dị na peeji nke 8]

Ị̀ ga-eso ná ndị ihe ọma a ga-eru aka n’ọdịnihu?