Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi n’Oge Na-adịghị Anya?

Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi n’Oge Na-adịghị Anya?

Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi n’Oge Na-adịghị Anya?

Olee ihe i chere bụ́ azịza ajụjụ ndị a dị n’okpuru?

N’oge na-adịghị anya, ụwa

(a) ọ̀ ga-aka mma karịa otú ọ dị ugbu a?

(b) ọ̀ ga-adị otú ọ dị ugbu a?

(ch) ọ̀ ga-adị njọ karịa otú ọ dị ugbu a?

Ị̀ NA-AGBALỊ inwe nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? E nwere ọtụtụ uru a na-erite n’ime otú ahụ. Nchọpụta ndị e mere gosiri na ụbụrụ na-aghọ ndị nwere olileanya na ihe ga-adị mma nkọ karị, ahụ́ na-esikwa ha ike karị. Otu nchọpụta e mere bụ́ nke were ogologo oge gosiri na ndị nwere olileanya na ihe ga-adị mma anaghị arịakarị ọrịa obi otú ndị na-enweghị olileanya na ihe ga-adị mma na-arịa. Ihe ndị a a chọpụtara kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru n’ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa, ma mmụọ nke dara mbà na-amịkpọ ọkpụkpụ.”—Ilu 17:22.

Ma, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike inwe obi ụtọ na inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ihi ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu ga-eme Ụwa n’ọdịnihu. Lee ụfọdụ n’ime ihe ọjọọ ndị ha kwuru ga-eme bụ́ ndị e ji mere akụkọ.

Ụwa Nọ n’Ihe Ize Ndụ

N’afọ 2002, otu ụlọ ọrụ ma nke a na-akọ nke dị na Stockholm, bụ́ nke na-amụ banyere ihe ndị na-eme na mbara ụwa, kwuru na nkịtị a gbara mmebi a na-emebi ụwa n’ihi ịchụ ego nwere ike ịkpata “ihe ndị nwere ike ibibi ihe ndị na-eme ka ụwa na-ekpo ọkụ ma ọ bụ na-ajụ oyi, bibiekwa ihe ndị dị ndụ n’ụwa.” Ha kwukwara na ịda ogbenye bụ́ nke ji ụmụ mmadụ aka n’ụwa dum, ndị ukwu rie ndị nta anọrọ agụụ, na otú e si na-emebisị ụwa nwere ike ime ka “ihe ghasasịa n’ụwa.”

N’afọ 2005, Òtù Mba Ụwa wepụtara ihe ha chọpụtara n’ihe ọmụmụ ha mụrụ afọ anọ banyere ihe ndị na-eme mbara Ụwa. Ihe karịrị otu puku ndị ọkachamara na narị atọ na iri isii ndị si mba iri itoolu na ise so mụọ ihe ọmụmụ a. Ha dọsiri aka ná ntị ike, sị: “Ihe ụmụ mmadụ na-eme na-akpa otú ihe ndị dị n’Ụwa si arụ ọrụ aka ọjọọ, nke na a gbachi nkịtị, ndị mmadụ agaghị ebili n’ụwa n’ọdịnihu.” Ha kwukwara na iji zere ọdachi, “a ga-agbanwe iwu dị iche iche, ụlọ ọrụ dị iche iche, na ihe dị iche iche a na-eme ugbu a.”

Anna Tibaijuka, bụ́ onyeisi ná Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ebe Obibi Ụmụ Mmadụ, kwuru ihe ndị na-eme nchọpụta kwekọrịtara. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ejiri aka a anyị ji, a ga-enwe ọdachi n’ọdịnihu.”

Ihe Mere A Ga-eji Nwee Nchekwube

Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị bipụtara magazin a, kweere na e nwere ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya nke ga-agbanwe ụwa nke ukwuu. Ma, o doro ha anya na mgbanwe ahụ agaghị emebi ụwa, kama, ọ ga-eme ka ụwa dị mma karịa otú ọ na-adịtụbeghị. Olee ihe mere obi ji sie ha ike otú a? Ọ bụ n’ihi na ha nwere okwukwe na nkwa ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ga-emezu. Lee otu n’ime nkwa ndị ahụ: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

Olileanya ahụ ha nwere, ọ̀ bụ nrọ? Tupu a zaa ajụjụ a, chebara ihe a echiche nke ọma: Ọtụtụ puku afọ gara aga, Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ọtụtụ n’ime oké nsogbu ndị anyị na-ahụ ugbu a na-akpa ụwa na ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Biko gụọ amaokwu ndị e dere n’isiokwu na-esonụ, ma jiri ihe ha kwuru tụlee ihe ndị ị na-ahụ na-eme n’ụwa. Ọ bụrụ na i mee otú a, okwukwe i nwere na ihe Baịbụl buru n’amụma banyere ọdịnihu ga-emezu ga-esikwu ike.