Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Mee Ka Ụzọ Gị Dị Larịị’ Ka Ihe Gaziere Gị

‘Mee Ka Ụzọ Gị Dị Larịị’ Ka Ihe Gaziere Gị

MGBE ndị Izrel hapụrụ Babịlọn lawa Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova chọrọ ka ije ha gaa siriri werere. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ. Wụọnụ ájá n’ụzọ, wụọnụ ájá n’okporo ụzọ. Wepụsịanụ nkume dị na ya.” (Aịza. 62:10) Olee otú ha si mee ihe a Jehova gwara ha? O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bu ụzọ gaa kpochie olulu ndị dị n’ụzọ ma ọ bụ mezie ebe ndị mebiri emebi. O doro anya na ihe a ha mere baara ndị Izrel ndị ọzọ uru mgbe ha na-ala Jeruselem.

Anyị nwere ike iji ihe a ha mere tụnyere ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi. Jehova achọghị ka ihe ọ bụla nọchiere anyị ụzọ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Mee ka ụzọ nke ụkwụ gị na-aga dị larịị, ka e meekwa ka ụzọ gị niile guzosie ike.” (Ilu 4:26) Ọ ga-abara anyị niile uru ma anyị mee ihe a Baịbụl kwuru.

KPEBIE IME IHE DỊ MMA

O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ebe mmadụ kwuru banyere nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ, sị: ‘Onye a ga-abụ onye e ji eje mba’ ma ọ bụ ‘Onye a ga-abụ ebe a nọ.’ Ahụ́ gbasiri ọtụtụ ndị na-eto eto ike. Ụbụrụ na-aghọ ha nkọ. Ha na-achọkwa ime ihe ndị ga-abara ha uru. Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha.” (Ilu 20:29) Ọ bụrụ na onye na-eto eto ejiri amamihe ya na ike ya na-ejere Jehova ozi, ọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ.

Taa, ụfọdụ ndị ụwa anaghị eji amamihe ndị na-eto eto egwu egwu. Ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi ya ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya nwere ike ịna-agwa ya ka ọ gaa mahadum ka o nwee ike bụrụ ọgaranya n’ụwa ochie a. E nwee nwanna ụkwụ na-aghọ nkọ n’ịgba bọl ma ọ bụ n’ịgba ọsọ, ndị mmadụ nwere ike ịgwa ya ka ọ gbalịa jiri ya mere aka ọrụ. À gwatụla gịnwa ma ọ bụ onye ị ma ụdị ihe a? Gịnị ga-enyere Onye Kraịst aka ikpebi ime ihe dị mma?

Ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere mmadụ aka ime ihe o kwesịrị ime ka ihe gaziere ya n’ozi Jehova. Ekliziastis 12:1 kwuru, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” Olee otú gịnwa ma ọ bụ onye na-eto eto nwere ike isi cheta Jehova?

Chegodị banyere otu nwa okorobịa bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Aha ya bụ Eric. * Ịgba bọl na-atọ ya ụtọ. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ gbawarala obodo ya bọl. Ọ pụtara na ọ gaghị adị anya ya agaa ala Bekee ka a kụzikwuoro ya otú e si agba bọl. O nweziri ike ime ka o jiri ịgba bọl mere aka ọrụ. Gịnị ka ọ ga-eme ka o nwee ike ‘icheta Onye Okike Ukwu ya’? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Eric mere?

Mgbe Eric nọ n’ụlọ akwụkwọ, ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ọ mụtara na Chineke ga-akwụsị nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe. N’ihi ya, ọ ghọtara na ime uche Chineke dị mkpa karịa ịgba bọl. E mere ya baptizim, ya ejirizie oge ya na ike ya na-ejere Jehova ozi. O mechara ghọọ ohu na-eje ozi ma na-enyere ọgbakọ aka. Kama ịgbawa mbọ ka o jiri ịgba bọl mere aka ọrụ, ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị.

A sị na Eric ji ịgba bọl mere aka ọrụ, o nwere ike inwe ezigbo ego, bụrụkwa onye a ma ama. Ma, ọ ghọtara na ihe Ilu 18:11 kwuru bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike, ha dịkwa ka mgbidi nchebe n’echiche ya.” Ego nwere ike imegharị mmadụ anya. Ọ naghị eme ka obi ruo mmadụ ala. Kama, ndị chọrọ ịbụ ọgaranya ‘na-eji ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’—1 Tim. 6:9, 10.

Ọtụtụ ndị na-eto eto abanyela n’ozi oge niile. N’ihi ya, obi na-adị ha ezigbo ụtọ, na-erukwa ha ala. Eric kwuru, sị: ‘Esorola m n’ọtụtụ ndị ji oge ha niile na-ejere Jehova ozi. E nwere ike ikwu na ọ bụ ha bụzi òtù egwuregwu nke m. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ya. Ana m ekele Jehova maka na o mere ka m mata otú obi ga-esi na-adị m ụtọ, ihe ana-agazikwara m.’

Gịnwa kwanụ? Kama ịchọwa otú ị ga-esi bụrụ onye a ma ama n’ụwa a, ọ́ gaghị aka mma ka ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile, si otú ahụ ‘mee ka ụzọ gị dị larịị’ n’anya Jehova?—Gụọ igbe bụ́ ‘ M Ritere Uru M Na-agaraghị Erite na Mahadum.’

WEPỤ IHE Ọ BỤLA NỌCHIIRI GỊ ỤZỌ

Mgbe otu nwanna na nwunye ya gara alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka, ha hụrụ otú obi si dị ndị na-eje ozi na Betel ụtọ. Nwunye nwanna ahụ mechara dee, sị: “Mere nke a mere nke ọzọ anaghị ekwe anyị mara ihe anyị kwesịrị ime.” N’ihi ya, ha kpebiri iji oge ha na ike ha jekwuoro Jehova ozi.

Ná mmalite, ọ dịghịrị ha mfe ịhapụ ihe ndị na-eri ha oge. Ma, otu ụbọchị ha gụchara ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ha chebaara ihe ha gụrụ echiche. Ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ si na Jọn 8:31, bụ́ ebe Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.” N’ihi ya, ha malitere iche, sị: “Mbọ ọ bụla anyị gbara ka anyị nwee ike wepụta oge jekwuoro Chineke ozi agaghị efu ọhịa.” Ha rere nnukwu ụlọ ha, hapụ ihe ndị ọzọ na-eri ha oge ma kwaga n’ebe e nwere ọgbakọ chọrọ enyemaka. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ ugbu a. Ha na-eso arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ewepụtakwa onwe ha arụ ọrụ ná mgbakọ distrikti. Olee otú obi dị ha? Ha kwuru, sị: “Ugbu a anyị hapụrụ ihe ndị na-eri anyị oge, ụdị obi ụtọ anyị nwere enweghị atụ n’ihi na anyị mere ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị mee.”

NỌSIE IKE N’ỤZỌ NKE NDỤ

Sọlọmọn dere, sị: “Anya gị abụọ kwesịrị ilegide n’ihu, ee, anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.” (Ilu 4:25) Onye na-anya ụgbọala ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. O kwesịrị ịna-ele anya n’ihu. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya, mee ka anyị ghara ikpebi otú anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi ma gbalịa mee ya.

Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi? I nwere ike ịbanye n’ozi oge niile. I nwekwara ike ịkwaga n’ebe e nwere ọgbakọ ókèala ya buru ibu ma ndị nkwusa nọ na ya adịrị ole na ole. Ọgbakọ ụfọdụ nwere ọtụtụ ndị nkwusa ma ndị okenye ha na ndị ohu na-eje ozi adịrị ole na ole. Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, i nwere ike ịga nyere ha aka. I nwere ike ịjụ onye nlekọta sekit unu ma è nwere ụdị ọgbakọ ahụ na sekit unu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga jewe ozi n’ebe dị anya, i nwere ike ịgba mbọ chọpụta gbasara ọgbakọ ndị e kwesịrị inyere aka n’ebe ahụ. *

Ka anyị gaghachi n’ihe ahụ e kwuru n’Aịzaya 62:10. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị Juu rụsiri ọrụ ike ka ha wepụ ihe ndị nọchiri ụzọ ka ndị Chineke nwee ike ịlaghachi Jeruselem. Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ka i jekwuoro Jehova ozi, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka ka i mee ihe ndị i kpebiri ime. Ka ị na-agba mbọ iwepụ ihe ndị nọchiiri gị ụzọ, na-arịọ ya ka o nye gị amamihe. Ị ga-emecha hụ otú Chineke ga-esi nyere gị aka ka ‘ụzọ gị dị larịị.’—Ilu 4:26.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ para. 18 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 111 ruo 112.