Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Abụọ

 Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Abụọ

ỊNAKWERE ọbụbụeze Jehova ọ̀ na-achọ nrubeisi zuru okè n’aka anyị? Onye na-eguzosi ike n’ezi ihe ọ̀ na-eme ihe dị mma n’anya Chineke mgbe nile? Ụdị mmadụ dị aṅaa ka ezi Chineke ahụ na-ewere dị ka onye “dị ka obi Ya si chọọ”? (1 Samuel 13:14) Akwụkwọ Bible bụ́ Samuel nke Abụọ na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ.

Ọ bụ Gad na Netan, bụ́ ndị amụma abụọ ha na Eze Devid nke Izrel oge ochie nwere mmekọrịta chiri anya, dere Samuel nke Abụọ. * E dechara akwụkwọ ahụ ihe dị ka n’afọ 1040 T.O.A., ná ngwụsị nke ọchịchị afọ 40 nke Devid, ọ na-ekwu n’ụzọ bụ́ isi banyere Devid na mmekọrịta ya na Jehova. Akụkọ a na-akpali akpali na-akọ otú mba esemokwu tisasịrị si ghọọ alaeze dị n’otu nke nwere ihe ịga nke ọma n’okpuru eze dị ike. Akụkọ ahụ na-adọrọ mmasị jupụtara ná mmetụta uche ụmụ mmadụ bụ́ ndị e gosipụtara n’ụzọ siri ike.

DEVID ‘ANA-AGA N’IHU NA-EJE NA-ADỊ UKWUU’

(2 Samuel 1:1–10:19)

Ihe Devid mere mgbe a gwara ya banyere ọnwụ Sọl na Jonatan ekpughee mmetụta o nwere n’ebe ha nọ na n’ebe Jehova nọ. E chie Devid eze nke ebo Juda na Hibrọn. E mee ọkpara Sọl bụ́ Ish-boshet eze nke ebo ndị ọzọ nke Izrel. Devid agaa “n’ihu, na-eje na-adị ukwuu,” ka ihe dị ka afọ asaa na ọkara gasịkwara, e mee ya eze Izrel dum.—2 Samuel 5:10.

Devid anara ndị Jebus Jeruselem ma mee ya isi obodo nke alaeze ya. Mgbalị mbụ o mere ibufe igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem akpata ọdachi. Otú ọ dị, mgbalị ya nke abụọ agaa nke ọma, Devid agbaakwa egwú n’ihi ọṅụ. Jehova esoro Devid gbaa ndụ maka alaeze. Devid emerie ndị iro ya ka Chineke nọgidere na-anọnyere ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:18—Gịnị mere e ji kpọọ Joab na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ụmụ ndị ikom atọ nke Zeruaia, bụ́ nne ha? N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-esitekarị ná nna agụ osuso ọmụmụ. Ọ pụrụ ịbụ na di Zeruaịa nwụrụ n’akaghị nká, ma ọ bụ na e lere ya anya dị ka onye a na-ekwesịghị ideba aha ya n’Ihe Odide Nsọ. Ọ pụrụ ịbụ na e debara aha Zeruaịa n’ihi na ọ bụ nwanne Devid ma ọ bụ onye otu nna ji ya na ya. (1 Ihe E Mere 2:15, 16) Nanị mgbe e kwuru banyere nna nke ụmụnne atọ a bụ mgbe a na-ekwu banyere  ili ya nke dị na Betlehem.—2 Samuel 2:32.

5:1, 2—Ogologo oge ha aṅaa ka o were mgbe e gbusiri Ish-boshet tupu e chie Devid eze Izrel dum? O yiri ka ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Ish-boshet malitere ọchịchị nke were afọ abụọ obere oge ka ọnwụ Sọl gasịrị, ihe dị ka otu oge ahụ Devid malitere nke ya na Hibrọn. Devid chịrị Juda site na Hibrọn ruo afọ asaa na ọkara. Obere oge ka e mesịrị ya eze Izrel dum, o bufere isi obodo ya na Jeruselem. N’ihi ya, ihe dị ka afọ ise gafere mgbe Ish-boshet nwụsịrị tupu Devid aghọọ eze Izrel dum.—2 Samuel 2:3, 4, 8-11; 5:4, 5.

8:2—Ndị Moab ole ka e gburu mgbe ha na ndị Izrel nwesịrị esemokwu? Ọ pụrụ ịbụ na e kpebiri ọnụ ọgụgụ ndị e gburu site n’ịtụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kama ịbụ site n’ịgụ ha ọnụ. O yiri ka Devid ò mere ka ndị Moab ahụ dinarachaa ibe ha nso n’ala n’otu ahịrị. Mgbe nke ahụ gasịrị, ya ekwuo ka e jiri eriri ọ̀tụ̀tụ̀, ma ọ bụ ụdọ ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ahịrị ahụ. O yiri ka e gburu ụdọ ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ ma ọ bụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị Moab ma hapụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ndụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

2:1; 5:19, 23. Devid jụrụ Jehova ase tupu ya ebiri na Hibrọn na tupu ya agaa ịlụso ndị iro ya agha. Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịchọ nduzi Jehova tupu anyị ana-eme mkpebi ndị ga-emetụta ọnọdụ ime mmụọ anyị.

3:26-30. Ịbọ ọ́bọ̀ na-akpata ihe ọjọọ.—Ndị Rom 12:17-19.

3:31-34; 4:9-12. Àgwà nke emegwaraghị ihe na nke ebughị iro nke Devid kwesịrị nṅomi.

5:12. Anyị ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla na Jehova eziwo anyị ihe n’ụzọ ya ma mee ka o kwe anyị omume iso ya nwee ezi mmekọrịta.

6:1-7. Ọ bụ ezie na Devid bu ezi ihe n’obi, mgbalị ya iji ụgbọala buo Igbe ahụ megidere iwu Chineke, ọ gaghịkwa nke ọma. (Ọpụpụ 25:13, 14; Ọnụ Ọgụgụ 4:15, 19; 7:7-9) Ụza ijide Igbe ahụ aka na-egosikwa na ezi ebumnobi adịghị agbanwe ihe ndị Chineke chọrọ.

6:8, 9. Mgbe Devid nọ n’ọnọdụ lere okwukwe ya ule, o buru ụzọ wee iwe, mechazie tụwa ụjọ—eleghị anya ọbụna na-ata Jehova ụta maka ọdachi ahụ. Anyị aghaghị izere ịta Jehova ụta maka nsogbu ndị na-esi n’anyị ileghara iwu ya anya apụta.

7:18, 22, 23, 26. Ịdị umeala n’obi Devid, ofufe a na-ekewaghị ekewa o nyere Jehova na mbuli o buliri aha Chineke elu bụ àgwà ndị anyị kwesịrị iṅomi.

8:2. E mezuru amụma e buru ihe dị ka narị afọ anọ tupu mgbe ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.

9:1, 6, 7. Devid mezuru nkwa ya. Anyị onwe anyị kwa aghaghị ịdị na-agbalị imezu nkwa anyị.

JEHOVA EMEE KA IHE ỌJỌỌ BILIE MEGIDE ONYE O TERE MMANỤ

(2 Samuel 11:1–20:26)

Jehova agwa Devid, sị: “M ga-eme ka ihe ọjọọ si n’ụlọ gị bilie imegide gị, M ga-achịrịkwa ndị inyom gị n’anya gị nye ibe gị, ọ ga-esokwa ndị inyom gị dinaa n’anya anyanwụ a.” (2 Samuel 12:11) Gịnị mere e ji kwuo okwu a? Ọ bụ n’ihi mmehie Devid na Bat-sheba mere. Ọ bụ ezie na a gbaghaara Devid n’ihi na o nwere nchegharị, ọ lanahụghị ihe ndị si ná mmehie ya pụta.

Nke mbụ, nwa Bat-sheba mụrụ anwụọ. Mgbe ahụ, Amnọn edinaa nwa nwanyị na-amaghị nwoke nke Devid nke otu nna ji ya na ya, bụ́ Tema, n’ike. Onye otu nne ji ya na Tema bụ́ Absalọm egbuo Amnọn n’ịbọ ọ́bọ̀. Absalọm agbaa izu megide nna ya ma mee onwe ya eze na Hibrọn. A manye Devid ịgbaga Jeruselem. Absalọm esoro ndị iko nwanyị iri nke nna ya hapụrụ ka ha lekọta ụlọ nwee mmekọahụ. Devid alọghachi n’ọchịchị nanị mgbe e gburu Absalọm. Nnupụisi nke Sheba  bụ́ onye si n’ebo Benjamin akwụsị mgbe Sheba nwụrụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

14:7—Gịnị ka “icheku nke m” nọchiri anya ya? E ji obere ike ọkụ nke icheku mee ihe atụ nke nwa dị ndụ.

19:29—Gịnị mere Devid jiri zaa Mefiboshet ihe ahụ ọ zara ya mgbe Mefiboshet kọwasịịrị ya ihe merenụ? Mgbe ọ nụrụ ihe Mefiboshet kwuru, Devid aghaghị ịghọtawo na ya mejọrọ ihe mgbe o kweere ihe Ziba kwuru n’ajụghị ase. (2 Samuel 16:1-4; 19:24-28) O yikarịrị ka nke a ọ̀ kpasuru Devid iwe, ọ chọghịkwa ịnụkwu ihe ọ bụla banyere okwu ahụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

11:2-15. Ezoghị ọnụ nke akụkọ banyere mmejọ Devid na-agba akaebe na Bible bụ Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ.

11:16-27. Mgbe anyị mere mmehie dị oké njọ, anyị ekwesịghị ịgbalị ikpuchi ya dị ka Devid mere. Kama, anyị kwesịrị ikwupụtara Jehova mmehie anyị ma chọọ enyemaka ya site n’aka ndị okenye ọgbakọ.—Ilu 28:13; Jems 5:13-16.

12:1-14. Netan setịpụụrụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ ezi ihe nlereanya. Ha ga-enyere ndị dabara ná mmehie aka ichegharị. Ndị okenye aghaghị iji nkà rụọ ọrụ a.

12:15-23. Ile ihe mere ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị nyeere Devid aka imeghachi omume n’ụzọ dị mma mgbe ọ na-ata ahụhụ.

15:12; 16:15, 21, 23. Mgbe o yiri ka Absalọm ọ̀ ga-aghọ eze, mpako na oké ọchịchọ dugara onye ndụmọdụ maara ihe bụ́ Ahitofel ịghọ onye sabo. Inwe ọgụgụ isi ma ghara ịdị umeala n’obi na iguzosi ike n’ihe pụrụ ịbụ ọnyà.

19:24, 30. Mefiboshet nwere ekele n’ezie maka ebere Devid. O ji obi ya nile nakwere mkpebi eze mere banyere Ziba. Inwe ekele n’ebe Jehova nọ na inwe ekele maka nzukọ ya kwesịrị ịkpali anyị ịdị na-edo onwe anyị n’okpuru.

20:21, 22. Amamihe nke otu onye pụrụ igbochiri ọtụtụ ndị ọdachi.—Eklisiastis 9:14, 15.

KA ANYỊ DABA “N’AKA JEHOVA”

(2 Samuel 21:1–24:25)

E nwee ụnwụ nri ruo afọ atọ n’ihi ikpe ọmụma ọbara nke mara Sọl maka igbu ndị Gibiọn. (Joshua 9:15) Iji bọọ ọ́bọ̀ ikpe ọmụma ọbara ahụ, ndị Gibiọn ekwuo ka a kpọpụtara ha ụmụ ndị ikom Sọl asaa ka ha gbuo. Devid enyefee ha n’aka ndị Gibiọn, mmiri  ozuzo ewetakwa oké ọkọchị ahụ ná njedebe. Ndị dike Filistia anọ ‘adaa site n’aka Devid na site n’aka ndị ohu ya.’—2 Samuel 21:22.

Devid emee mmehie dị oké njọ site n’inye iwu ka a gụọ ndị ọ na-achị ọnụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Ya echegharịa ma họrọ ịdaba “n’aka Jehova.” (2 Samuel 24:14) N’ihi ya, ọrịa na-efe efe egbuo iri puku mmadụ asaa. Devid agbasoo iwu Jehova, ihe otiti ahụ akwụsịkwa.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

21:8—Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ na ada Sọl bụ́ Maịkal nwere ụmụ ise, ebe 2 Samuel 6:23 na-ekwu na ọ nwụrụ n’amụtaghị nwa? Nkọwa a kasị nakwere bụ na ha bụ ụmụ nwanne nwanyị Maịkal bụ́ Merab, bụ́ onye lụrụ Adriel. O yiri ka Merab ọ̀ nwụrụ mgbe ọ na-akatabeghị ahụ́, Maịkal bụ́ onye na-amụtaghị nwa azụlitekwa ụmụaka ahụ.

21:9, 10—Ruo ogologo oge ha aṅaa ka Rizpa chere ụmụ ya nwoke abụọ na ụmụ ụmụ ise Sọl, bụ́ ndị ndị Gibiọn gburu, nche? A kwụgburu mmadụ asaa a “n’ụbọchị owuwe ihe ubi, n’ụbọchị mbụ”—March ma ọ bụ April. A tọgbọrọ ozu ha n’elu ugwu. Rizpa chere ozu asaa ahụ nche ehihie na abalị ruo mgbe Jehova gosipụtara na iwe ya ajụrụla site n’ime ka oké ọkọchị ahụ kwụsị. O yighị ka è nwere oké mmiri ozuzo ọ bụla tupu e wechaa ihe ubi n’October. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na Rizpa chere nche ruo ọnwa ise ma ọ bụ isii. Mgbe nke ahụ gasịrị, Devid kwuru ka e lie ọkpụkpụ ndị ikom ahụ.

24:1—N’ihi gịnị ka Devid ịgụ ndị mmadụ ọnụ ji bụrụ mmehie dị oké njọ? Iwu ahụ emegideghị ịgụ ndị mmadụ ọnụ. (Ọnụ Ọgụgụ 1:1-3; 26:1-4) Bible ekwughị ihe Devid bu n’obi gụọ ndị ahụ ọnụ. Otú ọ dị, 1 Ihe E Mere 21:1 na-egosi na ọ bụ Setan kpaliri ya ime otú ahụ. Ka o sina dị, onyeisi usuu ndị agha ya, bụ́ Joab, maara na mkpebi Devid ideba aha ndị ahụ n’akwụkwọ adịghị mma, ọ gbalịkwara igbochi Devid ime ya.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

22:2-51. Lee ụzọ magburu onwe ya abụ Devid bụrụ si gosi na Jehova bụ ezi Chineke ahụ, onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi kpamkpam!

23:15-17. Devid kwanyeere iwu Chineke metụtara ndụ na ọbara ùgwù n’ụzọ miri emi nke na n’oge a, o zeere itinye aka ọbụna n’ihe yiri imebi iwu ahụ. Anyị aghaghị ịzụlite ụdị àgwà ahụ n’ebe iwu nile nke Chineke dị.

24:10. Akọ na uche Devid kpaliri ya ichegharị. Akọ na uche anyị, ọ̀ dị ndụ ruo n’ókè nke ime ka anyị mee otú ahụ?

24:14. Devid maara nke ọma na Jehova na-eme ebere karịa ụmụ mmadụ. Ànyị kweere nke ahụ?

24:17. O wutere Devid na mmehie ya wetaara mba ahụ n’ozuzu ahụhụ. Onye mere ihe ọjọọ kwesịrị ịkwa ụta maka nkọcha omume ya pụrụ iwetara ọgbakọ.

‘Ịdị Dị Ka Obi Chineke Si Chọọ’ Bụ Ihe Anyị Ga-emeli

Eze nke abụọ nke Izrel bụ ‘nwoke dị ka obi Jehova si chọọ.’ (1 Samuel 13:14) Ọ dịghị mgbe Devid gbaghara ụkpụrụ Jehova, ọ chọghịkwa inwere onwe ya pụọ n’ebe Chineke nọ. Mgbe ọ bụla Devid mehiere, ọ na-ekweta mmehie ya, nabata ịdọ aka ná ntị, ma gbazie ụzọ ya. Devid bụ nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọ̀ bụ na anyị agaghị abụ ndị maara ihe ịdị ka ya, karịsịa mgbe anyị mere mmehie?

Akụkọ ndụ Devid na-egosi n’ụzọ doro anya na ịnakwere ọbụbụeze Jehova na-achọ ịnakwere ụkpụrụ Ya banyere ihe ọma na ihe ọjọọ na ịgbalị ibi ndụ kwekọrọ na ya dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Nke a bụ ihe anyị ga-emeli. Lee ekele anyị pụrụ inwe maka ihe ndị anyị mụtara site n’akwụkwọ Samuel nke Abụọ! Ozi a sitere n’ike mmụọ nsọ dị ndụ ma na-akpa ike n’ezie.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụ ezie na Samuel esoghị dee ya, akwụkwọ ahụ na-aza aha ya n’ihi na akwụkwọ Samuel abụọ ahụ dịbu n’otu mpịakọta n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Samuel dere akụkụ ka ukwuu nke Samuel nke Mbụ

[Foto dị na peeji nke 16]

Icheta onye mere ka o guzosie ike dị ka eze nyeere Devid aka ịnọgide na-adị umeala n’obi

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

“Lee M na-eme ka ihe ọjọọ si n’ụlọ gị bilie imegide gị”

Bat-sheba

Tema

Amnọn