Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya Dị Nso

Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya Dị Nso

Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya Dị Nso

IHE osise Paradaịs, dị ka nke dị n’ihu magazin a, na-amasị ndị ogbenye. Adam na Iv, bụ́ di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ, biri na paradaịs. Ogige Iden bụ ebe obibi ha. (Jenesis 2:7-23) Ọ bụ ezie na a tụfuru Paradaịs ahụ, ikwere na paradaịs nke na-abịa n’ihu—ụwa ọhụrụ nke ịda ogbenye na-adịghị na ya—abụghị nrọ nkịtị. Ọ dabesiri ike ná nkwa ndị dị na Bible.

Tụlee nkwa Jizọs Kraịst kwere n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala. Otu n’ime ndị omempụ ahụ ha na Jizọs so nwụọ gosiri okwukwe n’ikike Chineke nwere idozi nsogbu ụmụ mmadụ. O kwuru, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Okwu ndị a na-egosi na omempụ ahụ kweere na Jizọs ga-achị dị ka Eze, nakwa na a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Jizọs zara, sị: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:42, 43.

N’ikwu banyere ndị ga-ebi na Paradaịs, Bible na-ekwu, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” (Aịsaịa 65:21) Ee, “ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.

Gịnịkwanụ mere e ji kwere ka ịda ogbenye dịrị ugbu a? Olee aka Chineke na-enyere ndị dara ogbenye? Olee mgbe ịda ogbenye ga-emecha kwụsị?

Gịnị Mere E Ji Kwere Ka Ịda Ogbenye Dịrị?

N’ihi nnupụisi nke otu ajọ mmụọ ozi, bụ́ Setan Ekwensu, kpalitere, a tụfuru Paradaịs ahụ e tinyere Adam na Iv n’ime ya. N’iji agwọ mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya, Setan rafuru Iv imebi iwu Chineke nyere megide iri mkpụrụ nke otu osisi. Ọ ghọgburu ya ikweta na inwere onwe ya pụọ n’ebe Chineke nọ ga-eme ka o bie ndụ ka mma. Mgbe Iv nyere Adam mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, ya onwe ya kwa riri ya, si otú a gbakụta Chineke azụ ma kwenyere nwunye ya.—Jenesis 3:1-6; 1 Timoti 2:14.

N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a chụpụrụ di na nwunye ahụ na-enupụ isi na Paradaịs ahụ, sitekwa n’oge ahụ gaa n’ihu, ha aghaghị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ iji nweta ihe ndị e ji ebi ndụ. Ruo taa, Jehova ekwewo ka Setan chịa ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie, si otú ahụ gosi ihe ndị na-esi n’inupụrụ Chineke isi apụta. Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ egosila na ihe a kpọrọ mmadụ enweghị ike iweta Paradaịs n’ụwa. (Jeremaịa 10:23) Kama nke ahụ, nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ ewetala nsogbu ndị na-emebi ihe, ndị gụnyere ịda ogbenye.—Eklisiastis 8:9.

Otú ọ dị, ndị ogbenye anọghị n’enweghị enyemaka n’ụwa a nke jupụtara ná nsogbu. Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, nwere ezi nduzi maka ha.

“Ya Adịla Mgbe Unu Ga-echegbu Onwe Unu”

Mgbe Jizọs na-agwa ìgwè mmadụ na-ege ya ntị okwu, bụ́ ndị gụnyere ọtụtụ ndị ogbenye, o kwuru, sị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya nke ọma, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ ma ọ bụ na-ekpokọta ihe n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ karịa ha? . . . Ya mere, ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:26-33.

Ọ dịghị onye ogbenye mkpa izu ohi. (Ilu 6:30, 31) A ga-egbo mkpa ya ma o tinye Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya. Tụlee ihe banyere Tukiso, bụ́ nwoke bi na Lesotho, n’ebe ndịda Africa. Na 1998, ndị agha si mba ọzọ batara na Lesotho ịkwụsị isi a na-enupụrụ gọọmenti. N’ihi agha ahụ, a kwakọọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ahịa ndị mmadụ, ọrụ ndị mmadụ funahụrụ ha, e nwekwara oké ụkọ nri.

Tukiso bi n’akụkụ kasị daa ogbenye nke obodo ahụ. Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi ya kwakọọrọ ihe n’ụlọ ahịa ndị mmadụ iji nweta ihe ha ga-eri. Mgbe Tukiso lọtara n’ụlọ ya nke nwere nanị otu ọnụ ụlọ, ọ chọpụtara na Maseiso, bụ́ nwanyị ya na ya bi, kwakọọrọ ọtụtụ ihe. Tukiso gwara ya, sị: “Wepụsịa ihe ndị a èzí,” na-akọwa na izu ohi megidere iwu Chineke. Maseiso mere ihe a gwara ya. Ndị agbata obi ha chịrị ha ọchị ma wekọrọ nri ndị ahụ e zutere n’ohi.

Tukiso mere nke a n’ihi ihe ọ mụtara n’ọmụmụ Bible ya na Ndịàmà Jehova. Ọ̀ nọrọ n’agụụ n’ihi irube isi n’iwu Chineke? Ee e. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị okenye nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke Tukiso na-eso amụ ihe kpọtụụrụ ya ma wetara ya nri. N’ezie, Ndịàmà Jehova bi na South Africa, bụ́ mba dịdebere Lesotho, ezigaworo ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bi na Lesotho ihe enyemaka karịrị tọn abụọ. Isi Tukiso rubeere Chineke na enyemaka ịhụnanya nke ndị ọgbakọ ahụ kpaliri Maseiso. Ya onwe ya malitekwara ịmụ Bible. Ha abụọ mechara lụọ n’ụzọ iwu kwadoro ma si otú a ruo eruo ịbụ ndị e mere baptizim dị ka Ndịàmà Jehova. Ha ka ji ikwesị ntụkwasị obi ejere Chineke ozi.

Jehova Chineke na-eche banyere ndị ogbenye. (Lee igbe bụ́ “Olee Otú Chineke Si Ele Ndị Ogbenye Anya?”) O jirila ịhụnanya mee ndokwa inyere ndị ọzọ dị ka Tukiso na Maseiso aka ịmụtakwu banyere ya. N’Okwu ya kwa, o nyela ndụmọdụ ndị bara uru n’ihe banyere ndụ a na-adị kwa ụbọchị.

Ezi Ndokwa

Ndịàmà Jehova na-agbalị mgbe nile iṅomi nchebara echiche Chineke nwere maka ndị ogbenye. (Ndị Galeshia 2:10) Mgbe e nwere ọdachi n’obodo, ya emetụtakwa ezi Ndị Kraịst, a na-emekarị ndokwa maka enyemaka ndị dị mkpa. Nke ka mkpa bụ na Ndịàmà na-enwe nchegbu maka mkpa ime mmụọ nke mmadụ nile, gụnyere ndị ogbenye. (Matiu 9:36-38) N’ime afọ 60 gara aga, ọtụtụ ndị ozi a zụrụ azụ ewepụtala onwe ha ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ala ndị na-abụghị nke ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ si Finland mụtara asụsụ Sesotho ma kụziere Tukiso na Maseiso ihe ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 28:19, 20) Ozi ala ọzọ dị otú ahụ na-agụnyekarị ịhapụ ndụ ntụsara ahụ́ ná mba bara ọgaranya na ịkwaga n’ala dara ogbenye.

Ọ dịghị ihe ga-eme ka ezi Ndị Kraịst zuo ohi iji nweta ihe ndị e ji ebi ndụ. Kama nke ahụ, ha nwere okwukwe n’ike Jehova Chineke nwere igbo mkpa ha. (Ndị Hibru 13:5, 6) Otu ụzọ Jehova si egbo mkpa ndị ya bụ site ná nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ya ofufe, bụ́ ndị na-elekọta ibe ha.

Ụzọ ọzọ Jehova si enyere ndị ogbenye aka bụ site n’inye ha ndụmọdụ bara uru banyere otú ha ga-esi na-ebi ndụ kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, Bible na-enye iwu, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Ndị Efesọs 4:28) Ọtụtụ ndị na-enweghị ọrụ enyela onwe ha ọrụ, na-arụ ọrụ ndị siri ike, dị ka ịkụ na ilekọta akwụkwọ nri. Bible na-enyekwara ndị ogbenye aka ichekwa ego site n’ịkụziri ha izere àgwà ọjọọ, dị ka ịṅụbiga mmanya ókè.—Ndị Efesọs 5:18.

Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya—Ole Mgbe?

Bible na-egosi na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ọchịchị Setan. (2 Timoti 3:1) N’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-ezite Jizọs Kraịst ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. Gịnị ga-eme n’oge ahụ? Jizọs zara ajụjụ a n’otu n’ime ihe atụ ya. O kwuru, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya nile, mgbe ahụ ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba nile gbakọọ n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.”—Matiu 25:31-33.

Atụrụ ahụ dị n’ihe atụ a bụ ndị na-anakwere ịchịisi Jizọs. Jizọs jiri ha tụnyere atụrụ n’ihi na ha na-eso ya dị ka Onye na-azụ ha. (Jọn 10:16) Ndị a yiri atụrụ ga-enweta ndụ n’okpuru ịchịisi zuru okè nke Jizọs. Ọ ga-abụ ndụ obi ụtọ n’ime ụwa ọhụrụ nke ịda ogbenye na-adịghị na ya. A ga-ebibi ndị yiri ewu, bụ́ ndị jụrụ ịchịisi Jizọs, ruo mgbe ebighị ebi.—Matiu 25:46.

Alaeze Chineke ga-eweta mmebi iwu ná njedebe. Mgbe ahụ, ịda ogbenye ga-abụ ihe mgbe ochie. Ndị na-ahụ ibe ha n’anya ma na-eche banyere ha ga-ebi n’ụwa. A pụrụ ịhụ ịbụ eziokwu nke ụwa ọhụrụ dị otú ahụ n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-ahụ n’anya nke Ndịàmà Jehova, n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

OLEE OTÚ CHINEKE SI ELE NDỊ OGBENYE ANYA?

Bible na-akọwa Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ dị ka “Onye na-enye ndị agụụ na-agụ nri.” (Abụ Ọma 146:7) Ihe karịrị otu narị amaokwu ndị na-eme ka nchegbu Chineke nwere maka ndị ogbenye pụta ìhè dị n’ime ya.

Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova nyere mba Izrel oge ochie Iwu ya, o nyere ụmụ Izrel bụ́ ndị ọrụ ugbo iwu ka ha ghara iwecha ihe ubi nile dị n’akụkụ ubi ha. Ha agaghị agaghachi n’osisi oliv ma ọ bụ n’osisi vaịn ịga tụtụrụ mkpụrụ ndị ha hapụrụ. Iwu ndị a bụ ndokwa ịhụnanya e mere maka ndị ala ọzọ, ụmụ mgbei, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ na ndị ọzọ e wedara n’ala.—Levitikọs 19:9, 10; Deuterọnọmi 24:19-21.

Ọzọkwa, Chineke nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ, ma ọ bụ nwa mgbei, unu ewedala ya n’ala. Ọ bụrụ na i weda ya n’ala ma ọlị, o wee tikuo m n’ụzọ ọ bụla n’ezie, aghaghị m ịnụ ntiku ya; iwe m ga-adị ọkụ, M ga-ewerekwa mma agha gbuo unu; nwunye unu ga-aghọ ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-aghọkwa ụmụ mgbei.” (Ọpụpụ 22:22-24) N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ụmụ Izrel bara ọgaranya leghaara okwu ndị ahụ anya. N’ihi nke a, nakwa n’ihi omume ọjọọ ndị ọzọ, Jehova Chineke dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị ọtụtụ ugboro site n’aka ndị amụma ya. (Aịsaịa 10:1, 2; Jeremaịa 5:28; Emọs 4:1-3) N’ikpeazụ, Chineke mere ka ndị Asiria, nakwa ka e mesịrị, ndị Babịlọn, merie ókèala Izrel. E gburu ọtụtụ ụmụ Izrel, dọrọkwa ndị lanahụrụnụ n’agha gaa ná mba ọzọ.

Ọkpara Chineke ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, ṅomiri nchegbu ịhụnanya Nna ya nwere maka ndị ogbenye. N’ịkọwa nzube nke ozi ya, Jizọs kwuru, sị: “Mmụọ Jehova dịkwasịrị m, n’ihi na o tere m mmanụ ịkpọsara ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 4:18) Nke a apụtaghị na ọ bụ nanị ndị ogbenye ka Jizọs ziri ozi ọma. O ji ịhụnanya nyere ndị ọgaranya aka. Otú ọ dị, mgbe Jizọs na-eme nke ahụ, o gosipụtara nchegbu o nwere maka ndị ogbenye mgbe mgbe. Dị ka ihe atụ, o nyere otu onye ọchịchị bara ọgaranya ndụmọdụ a: “Ree ihe nile i nwere kesaara ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe; bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Luk 14:1, 12-14; 18:18, 22; 19:1-10.

Jehova Chineke na Ọkpara ya na-echegbu onwe ha maka ndị ogbenye. (Mak 12:41-44; Jems 2:1-6) N’igosipụta nchegbu o nwere maka ndị ogbenye, Jehova na-echeta ọtụtụ nde ndị ogbenye nwụrụ anwụ. A ga-akpọlite ndị nile dị otú ahụ n’ọnwụ baa n’ụwa ọhụrụ nke ịda ogbenye na-agaghị adị na ya.—Ọrụ 24:15.

[Foto]

Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-egosi na ụwa ọhụrụ ga-ekwe omume

[Foto dị na peeji nke 5]

Tukiso na Maseiso na onye ozi ala ọzọ duziiri Tukiso ọmụmụ Bible

[Foto dị na peeji nke 5]

Maseiso na onye ozi ala ọzọ duziiri ya ọmụmụ Bible n’ọnụ ụzọ ụlọ ya