Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?

 Olileanya Mbilite n’Ọnwụ—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?

“Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—ABỤ ỌMA 145:16.

1-3. Olee olileanya ụfọdụ ndị nwere maka ọdịnihu? Nye ihe atụ.

CHRISTOPHER dị afọ itoolu na nwanne ya nwoke, tinyere ụmụnne mama ha na ụmụ abụọ nke ụmụnne mama ha, ji otu ụtụtụ gaa n’ụlọ n’ụlọ n’ozi Ndị Kraịst ha n’ebe dịdebere obodo Manchester, England. Magazin anyị na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Teta!, kọrọ ihe merenụ. “Ha nile pụkọrọ ọnụ ịga legharịa anya na Blackpool, ebe ntụrụndụ ụsọ oké osimiri dị nso. Ha isii sooro mmadụ iri na abụọ nwụọ ozugbo n’ihe ọghọm okporo ụzọ, nke ndị uwe ojii kọwara dị ka ‘mgbukpọ zuru ezu.’”

2 N’abalị bọtara ụbọchị ọdachi ahụ, ezinụlọ ahụ gara Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, bụ́ ebe a tụlere isiokwu na-ekwu banyere ọnwụ. Nna ya kọrọ, sị: “Christopher bụ nwa nwoke na-eche echiche nke ọma. N’abalị ahụ, o kwuru n’ụzọ doro anya banyere ụwa ọhụrụ na olileanya ya maka ọdịnihu. Mgbe ahụ, ka mkparịta ụka anyị na-aga n’ihu, Christopher kwuru na mberede, sị: ‘Ihe o ji dị mma ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ na ọ bụ ezie na ọnwụ na-akpata mwute, anyị maara na anyị ga-ahụkwa onwe anyị ọzọ otu ụbọchị n’elu ụwa.’ Ọ dịghị otu n’ime anyị maara mgbe ahụ otú okwu ndị ahụ ga-esi bụrụ ndị a ga na-echeta mgbe nile.” *

3 Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, na 1940, a mara Onyeàmà bụ́ onye Austria aha ya bụ Franz, ikpe igbu ya site n’igbupụ ya isi n’ihi ịjụ imebi iguzosi ike n’ihe ya nye Jehova. Franz si n’otu ụlọ mkpọrọ dị na Berlin degara nne ya akwụkwọ ozi, sị: “Dabere n’ihe m maara, ọ bụrụ na m ṅụrụ iyi [agha] ahụ, ọ gaara abụ na emeela m mmehie kwesịrị ọnwụ. Nke ahụ ga-abụrụ m ihe ọjọọ. A gaghị akpọlite m n’ọnwụ. . . . Ma ugbu a, ezigbo nne m na ụmụnne m, a maala m ikpe, ụjọ atụkwala unu, ọ bụ ikpe ọnwụ, a gaje igbu m n’ụtụtụ echi. Ana m enweta ike site n’aka Chineke, dị ka ọ dịworo mgbe nile n’ihe banyere ezi Ndị Kraịst nile malite n’ogologo oge gara aga. . . . Ọ bụrụ na unu ga-eguzosi ike ruo ọnwụ, anyị ga-ezute ọzọ ná mbilite n’ọnwụ. . . . Ka ọ dịzie mgbe anyị ga-ahụ ọzọ.” *

4. Olee mmetụta ahụmahụ ndị a kọrọ n’ebe a nwere n’ahụ́ gị, oleekwa ihe ọzọ anyị ga-atụle?

4 Ma Christopher ma Franz ji nnọọ olileanya mbilite n’ọnwụ kpọrọ ihe. Nye ha, ọ bụ ihe ga-eme eme. N’ezie, akụkọ ndị a na-emetụ anyị n’obi! Iji mee ka ekele anyị nwere maka Jehova mikwuo emie na iji mee ka olileanya anyị nwere ná mbilite n’ọnwụ sikwuo ike, ka anyị tụlee ihe mere a ga-eji nwee mbilite n’ọnwụ na otú nke a kwesịrị isi metụta anyị n’otu n’otu.

Ọhụụ nke Mbilite n’Ọnwụ Elu Ala

5, 6. Gịnị ka ọhụụ ahụ Jọn onyeozi dekọrọ ná Mkpughe 20:12, 13 na-ekpughe?

5 N’ọhụụ ọ hụrụ banyere ihe ndị ga-eme n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst Jizọs, Jọn onyeozi hụrụ ka a na-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ibi n’elu ala. Ọ kọrọ, sị: “M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta. . . .  Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” (Mkpughe 20:12, 13) N’agbanyeghị ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ ha—ma hà bụ “ndị ukwu” ma hà bụ “ndị nta”—a ga-atọhapụ ndị nile nọ n’ime Hedis (Shiol), ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị nile nwụrụ n’ime oké osimiri ga-adị ndụ ọzọ n’oge ahụ. Ihe omume a dị ebube bụ otu akụkụ nke nzube Jehova.

6 Ọchịchị puku afọ Kraịst ga-eji ijichi Setan na ịtụba ya n’ime abis malite. Ọ dịghị onye a kpọlitere n’ọnwụ ma ọ bụ onye lanahụrụ mkpagbu ukwu ahụ nke Setan ga-eduhie n’oge ọchịchị ahụ n’ihi na ọ gaghị anọ n’ọrụ. (Mkpughe 20:1-3) Otu puku afọ pụrụ iyi gị ogologo oge, ma n’ezie, Jehova na-ele ya anya dị ka “otu ụbọchị.”—2 Pita 3:8.

7. Olee ihe a ga-elekwasị anya na ya kpee ikpe n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst?

7 Dị ka a hụrụ n’ọhụụ ahụ, Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst ga-abụ oge ikpe. Jọn onyeozi dere, sị: “M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ, e meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ; ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ. E kpekwara ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ dị ka omume ha si dị. . . . E kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị.” (Mkpughe 20:12, 13) Rịba àmà na ihe a ga-elekwasị anya na ya kpee ikpe ahụ abụghị ihe mmadụ mere ma ọ bụ ihe ọ na-emeghị tupu ya anwụọ. (Ndị Rom 6:7) Kama nke ahụ, o nwere ihe jikọrọ ya na ‘akwụkwọ mpịakọta’ ndị a ga-emeghe. Ọ bụ n’ihe ndị mmadụ mere mgbe ọ mụtachara ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ka a ga-elekwasị anya kpebie ma à ga-edeba aha ya ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ ahụ.’

“Mbilite n’Ọnwụ nke Ndụ” Ka Ọ̀ Bụ “Mbilite n’Ọnwụ nke Ikpe”

8. Olee ụzọ ihe abụọ ndị e si n’ọnwụ kpọlite pụrụ inweta?

8 Ná mmalite nke ọhụụ Jọn, a kọwara Jizọs dị ka onye ji “mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis.” (Mkpughe 1:18) Ọ na-eje ozi dị ka “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ” nke Jehova, bụ́ onye e nyere ike ikpe “ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.” (Ọrụ 3:15; 2 Timoti 4:1) Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ime ka ndị nọ n’ụra ọnwụ dịghachi ndụ. Jizọs gwara ìgwè mmadụ o kwusaara ozi ọma, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ndị mere ezi ihe gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28-30) Ya mere, ọdịnihu dị aṅaa dịịrị ndị ikom na ndị inyom oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi?

9. (a) Mgbe ha siri n’ọnwụ bilite, olee ihe obi abụọ na-adịghị na ya na ọtụtụ ndị ga-amụta? (b) Nnukwu ọrụ izi dị aṅaa ka a ga-arụ?

9 Mgbe ndị oge ochie a kwesịrị ntụkwasị obi bịara ná mbilite n’ọnwụ, ha ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya na nkwa ndị ahụ ha tụkwasịrị obi emezuola. Lee ka ọ ga-esi masị ha ịmata onye Mkpụrụ nwanyị Chineke ahụ e kwuru okwu ya n’amụma mbụ dị na Bible, na Jenesis 3:15, bụ! Lee obi ụtọ ha ga-enwe ịnụ na Mezaịa a e kwere ná nkwa, bụ́ Jizọs, kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, si otú a nye ndụ ya dị ka àjà mgbapụta! (Matiu 20:28) Ndị na-anabata ha ná ndụ ga-enwe ọṅụ dị ukwuu inyere ha aka ịghọta na ihe mgbapụta a bụ ngosipụta nke obiọma na-erughịrị mmadụ na ebere Jehova. Mgbe ndị a kpọlitere n’ọnwụ hụrụ ihe Alaeze Chineke na-arụzu n’imezu nzube Jehova maka ụwa, obi abụọ adịghị ya na obi ha ga-ejupụta n’otuto nye Jehova. Ha ga-enwe ohere buru ibu igosipụta na ha na-eguzosi ike n’ihe nye Nna ha nke eluigwe na-ahụ n’anya na Ọkpara ya. Onye ọ bụla dị ndụ ga-enwe obi ụtọ ikere òkè ná nnukwu ọrụ izi ihe dị mkpa iji kụziere ọtụtụ ijeri ndị e si n’ili na-akpọlite ihe, bụ́ ndị ọ ga-adịkwa mkpa ịnakwere ihe mgbapụta Chineke nyere.

10, 11. (a) Ohere ndị dị aṅaa ka Narị Afọ Iri ahụ ga-enye ndị nile bi n’ụwa? (b) Olee otú nke a kwesịrị isi metụta anyị?

 10 Mgbe a kpọlitere Ebreham n’ọnwụ, ọ ga-enweta nkasi obi dị ukwuu n’ịmata ihe ndụ dị ka ya n’okpuru ọchịchị nke “obodo” ahụ nke ọ tụrụ anya ya. (Ndị Hibru 11:10) Lee nnukwu obi ụtọ Job bụ́ onye oge ochie nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-enwe mgbe ọ matara na ụzọ ndụ ya wusiri ndị ohu Jehova ndị ọzọ ike bụ́ ndị chere ule nke iguzosi ike n’ezi ihe ihu! Leekwa nnọọ otú Daniel ga-esi chọọ ịmata otú amụma ndị o ji ike mmụọ nsọ detuo si mezuo!

11 N’ezie, ndị nile ga-adị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ, ma ọ̀ bụ site ná mbilite n’ọnwụ, ma ọ̀ bụ site n’ịlanahụ mkpagbu ukwu ahụ, ga-enwe ọtụtụ ihe ha ga-amụta banyere nzube Jehova maka ụwa na ndị bi n’ime ya. Olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na ito Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi ga-eme nnọọ ka ọrụ izi ahụ ga-ewe Narị Afọ Iri bụrụ nke na-enye obi ụtọ n’ezie. Otú ọ dị, ihe kasị mkpa ga-abụ ihe anyị ga-eme n’otu n’otu ka anyị na-amụta ihe ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ànyị ga-etinye ihe anyị mụtara n’ọrụ? Ànyị ga-atụgharị uche n’ihe ọmụma ahụ dị oké mkpa nke ga-ewusi anyị ike iguzogide mgbalị ikpeazụ nke Setan ịdọpụ anyị n’eziokwu ahụ ma tinye ya n’ọrụ?

12. Gịnị ga-enyere onye ọ bụla aka ikere òkè zuru ezu ma n’ọrụ izi ahụ ma n’ime ka ụwa ghọọ paradaịs?

12 E kwesịghị ichefu ngọzi ndị dị ebube ga-esite n’itinye uru nke àjà mgbapụta Kraịst n’ọrụ. Ndị a kpọghachiri ná ndụ ná mbilite n’ọnwụ agaghị enwe ụdị ọrịa ma ọ bụ nkwarụ ndị ha nwere ugbu a. (Aịsaịa 33:24) Ezi ahụ́ ike na atụmanya nke inwe ahụ́ ike zuru okè ga-eme ka ndị nile ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ kere òkè zuru ezu n’ọrụ nke ịkụziri ọtụtụ ijeri mmadụ ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ụzọ nke ndụ. Ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ga-ekerekwa òkè n’ọrụ kasịnụ a rụtụworo n’ụwa—ọrụ nke ime ka ụwa nile ghọọ paradaịs iji wetara Jehova otuto.

13, 14. Gịnị mere a ga-eji tọpụ Setan n’oge ule ikpeazụ ahụ, gịnịkwa ka ọ pụrụ ịrụpụtara anyị n’otu n’otu?

13 Mgbe a tọhapụrụ Setan n’abis maka ule ikpeazụ, ọ ga-agbalị iduhie ụmụ mmadụ ọzọ. Dị ka Mkpughe 20:7-9 si kwuo, a ga-ebibi ‘mba ma ọ bụ ìgwè mmadụ ndị o duhiere,’ bụ́ ndị mmetụta ọjọọ nke Setan nwetara: ‘Ọkụ ga-esite n’eluigwe daa ma repịa ha.’ Nye ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’etiti ha n’ime Narị Afọ Iri ahụ, mbibi a ga-eme ka mbilite n’ọnwụ nke ha bụrụ nke ọmụma ikpe. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe bụ́ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enweta onyinye nke ndụ ebighị ebi. N’ezie, nke ha ga-abụ “mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”—Jọn 5:29.

14 Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ pụrụ isi kasie anyị obi ọbụna ugbu a? N’ezie, olee ihe anyị na-aghaghị ime iji jide n’aka na anyị ga-erite uru na ya n’ọdịnihu?

Ihe Anyị Ga-amụta Ugbu A

15. Olee otú ikwere ná mbilite n’ọnwụ pụrụ isi nyere gị aka ugbu a?

15 Ọ pụrụ ịbụ na onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị na nso nso a, ọ pụkwara ịbụ na ị na-agbalị ime nnukwu mgbanwe ndị oké mfu ahụ chọrọ gị n’aka. Olileanya mbilite n’ọnwụ na-enyere gị aka inweta udo nke obi na ume nke ndị na-amaghị eziokwu ahụ na-adịghị enweta. Pọl kasiri ndị Tesalonaịka obi, sị: “Anyị achọghị ka unu ghara ịma ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ; ka unu wee ghara iru újú dị nnọọ ka ndị ọzọ si eru, bụ́ ndị na-enweghị olileanya.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:13) Ị̀ na-ahụ onwe gị n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ebe ị na-ekiri ndị a na-akpọlite n’ọnwụ? Nweta nkasi obi ugbu a site n’ịtụgharị uche n’atụmanya nke ịhụ ndị ị hụrụ n’anya ọzọ.

16. Olee mmetụta ị pụrụ inwe n’oge mbilite n’ọnwụ?

16 Ọ pụrụ ịbụ na ị na-ata ahụhụ ugbu a n’ụzọ anụ ahụ́ n’ihi nnupụisi Adam, ikekwe na-arịa ọrịa. Ekwela ka obi erughị ala nke a na-akpata mee ka i chefuo atụmanya na-enye ọṅụ nke ịbụ onye a kpọlitere n’ọnwụ na ịdịghachi ndụ n’ahụ́ ike na ume ọhụrụ n’ime  ụwa ọhụrụ. Mgbe anya gị megheziri, gị ahụkwa ndị nwere ọṅụ bụ́ ndị chọrọ iso gị ṅụrịa ọṅụ mgbe a kpọlitere gị n’ọnwụ, ị ga-ekelerịrị Chineke maka obiọma na ịhụnanya ya.

17, 18. Olee ihe mmụta abụọ anyị kwesịrị iburu n’obi?

17 Ka ọ dịgodị, tụlee ihe mmụta abụọ anyị kwesịrị iburu n’obi. Otu bụ mkpa ọ dị iji mkpụrụ obi anyị dum jeere Jehova ozi ugbu a. N’iṅomi Nna anyị Ukwu, bụ́ Kraịst Jizọs, ndụ anyị nke anyị ji chụọ àjà na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị agbata obi anyị nọ. Ya bụrụ na mmegide ma ọ bụ mkpagbu anapụ anyị ihe ndị anyị ji biri ma ọ bụ nnwere onwe anyị, anyị kpebiri ịnọgidesi ike n’okwukwe n’agbanyeghị ule ndị anyị pụrụ iche ihu. Ya bụrụ na ndị mmegide eyie anyị egwu ọnwụ, mgbe ahụ olileanya mbilite n’ọnwụ na-akasi anyị obi ma na-ewusi anyị ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na Alaeze ya. Ee, ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ na-eme ka anyị soro ná ndị ga-enweta ngọzi ndị Jehova kwadebeere ndị ezi omume.

18 Ihe mmụta nke abụọ metụtara otú anyị si eche ọnwụnwa ndị anụ ahụ́ na-emehie emehie na-akpata ihu. Ihe ọmụma anyị nwere n’ihe banyere olileanya mbilite n’ọnwụ na obi ekele anyị nwere maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova na-eme ka mkpebi anyị iguzosi ike n’okwukwe sikwuo ike. Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa. Ọzọkwa, ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Ihe ụrà nke ụwa, dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, agaghị na-adọrọcha mmasị anyị ma anyị jiri ya tụnyere “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:17-19) Ọ bụrụ na a nwaa anyị ime omume rụrụ arụ, anyị ga-eguzogidesi ọnwụnwa ahụ ike. Anyị na-aghọta na ọ bụrụgodị na anyị anwụọ tupu Amagedọn, ịnọgide na-akpa àgwà ndị  na-adịghị amasị Jehova nwere ike itinye anyị n’otu ọnọdụ ahụ ndị na-enweghị atụmanya mbilite n’ọnwụ nọ na ya.

19. Ihe ùgwù dị aṅaa na-enweghị atụ ka anyị na-ekwesịghị ichefu?

19 Karịsịa, anyị ekwesịghị ichefu ihe ùgwù ahụ na-enweghị atụ nke ime ka obi Jehova ṅụrịa ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. (Ilu 27:11) Anyị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ma ọ bụ anyị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo ná ngwụsị nke ajọ usoro ihe a na-eme ka Jehova mara ebe anyị kwụ n’ihe iseokwu ahụ metụtara ọbụbụeze eluigwe na ala. Lezienụ ihe ọṅụ ọ ga-abụ ibi ndụ n’ụwa Paradaịs site n’ịlanahụ mkpagbu ukwu ahụ ma ọ bụ ịbụ onye a kpọlitere n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube!

Imeju Ọchịchọ Anyị

20, 21. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ma a sị na anyị nwere ọtụtụ ajụjụ ndị a na-azabeghị banyere mbilite n’ọnwụ? Kọwaa.

20 Ntụle anyị tụlere mbilite n’ọnwụ azachaghị ajụjụ nile. Olee ihe Jehova ga-emere ndị lụrụ di na nwunye tupu ha anwụọ? (Luk 20:34, 35) À ga-akpọlite ndị mmadụ n’ebe ha nọrọ nwụọ? À ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na nso ebe ndị ezinụlọ ha bi? E nwere ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ banyere usoro mbilite n’ọnwụ. Ka o sina dị, anyị aghaghị iburu n’uche okwu Jeremaịa nke bụ́: “Jehova dị mma n’ebe ndị na-ele anya Ya nọ, Ọ dị mma n’ebe mkpụrụ obi nke na-achọ Ya nọ. Ọ dị mma ka mmadụ chere nzọpụta Jehova, derekwa duu n’ichere ya.” (Abụ Ákwá 3:25, 26) N’oge nke Jehova, a ga-aza anyị ajụjụ anyị nile n’ụzọ ga-eju anyị afọ. Gịnị mere anyị pụrụ iji jide nke a n’aka?

21 Tụgharịa uche n’okwu ọbụ abụ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ mgbe ọ bụrụ banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:16) Ka anyị na-etolite, ọchịchọ anyị na-agbanwe. Ihe anyị tụrụ anya ya mgbe anyị ka bụ ụmụaka abụghịzi ọchịchọ anyị taa. Otú anyị si ele ndụ anya na-adabere n’ahụmahụ ndị anyị nwerela nakwa n’olileanya anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọ sọrọ ọchịchọ anyị ndị ziri ezi ha bụrụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, Jehova ga-emezucharịrị ha.

22. Gịnị mere anyị ji nwee ezi ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova?

22 Ihe dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ugbu a bụ ikwesị ntụkwasị obi. “Ihe a na-achọ n’aka ndị nlekọta ụlọ bụ ka a hụ mmadụ dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 4:2) Anyị bụ ndị nlekọta nke ozi ọma ahụ dị ebube nke Alaeze Chineke. Ịdị uchu anyị ji ekwusara ndị nile anyị zutere ozi ọma a na-eme ka anyị soro ná ndị ga-enweta ndụ. Echefukwala eziokwu ahụ bụ́ na “mgbe na ihe ndapụta” na-adabara anyị nile. (Eklisiastis 9:11) Iji belata nchegbu ọ bụla nke ọnọdụ a na-ejighị n’aka nke ndụ pụrụ ịkpata, jigidesie olileanya ahụ dị ebube nke mbilite n’ọnwụ ike. Mara na ọ bụrụ na ị ga-anwụ tupu Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst amalite, ị pụrụ inweta nkasi obi n’eziokwu ahụ bụ́ na a ga-enwe ahụ́ efe. N’oge nke Jehova, ị ga-enwe ike ikwughachi okwu ahụ Job gwara Onye Okike: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.” Otuto dịrị Jehova, bụ́ onye ọ na-agụ agụụ ịkpọghachi ndị nile nọ ná ncheta ya ná ndụ!—Job 14:15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee Teta! December 8, 1989, peeji nke 10, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 3 Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 662, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ihe a ga-elekwasị anya na ya kpee ndị mmadụ ikpe na Narị Afọ Iri ahụ?

• Gịnị mere ụfọdụ ga-eji nweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ,” ndị ọzọ enweta “mbilite n’ọnwụ nke ikpe”?

• Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ pụrụ isi kasie anyị obi ugbu a?

• Olee otú Abụ Ọma 145:16 si enyere anyị aka n’ihe banyere ajụjụ ndị metụtara mbilite n’ọnwụ bụ́ ndị a na-azabeghị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Olee otú ikwere ná mbilite n’ọnwụ pụrụ isi nyere anyị aka ugbu a?