Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwee Ka Okwu Chineke Bụrụ Ìhè Dịịrị Okporo Ụzọ Gị

Kwee Ka Okwu Chineke Bụrụ Ìhè Dịịrị Okporo Ụzọ Gị

 Kwee Ka Okwu Chineke Bụrụ Ìhè Dịịrị Okporo Ụzọ Gị

“Okwu Gị bụ . . . ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—ABỤ ỌMA 119:105.

1, 2. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka okwu Jehova ga-abụ ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị?

OKWU Jehova ga-abụ ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka o mee otú ahụ. Iji nweta ìhè ime mmụọ dị otú ahụ, anyị aghaghị iji ịdị uchu na-amụchi Okwu Chineke e dere ede anya ma na-etinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị ga-enwe ike ikwu ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru, nke bụ́: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105.

2 Ka anyị tụlezie Abụ Ọma 119:89-176. Lee ihe ọmụma bara ụba dị n’amaokwu ndị a, bụ́ ndị a haziri n’ahịrị 11! Ha pụrụ inyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14.

N’ihi Gịnị Ka Okwu Chineke Ga-eji Na-atọ Anyị Ụtọ?

3. Olee otú Abụ Ọma 119:89, 90 si egosi na anyị pụrụ ịdabere n’okwu Chineke?

3 Okwu Jehova ịdị na-atọ anyị ụtọ na-eme ka anyị kwụsie ike n’ụzọ ime mmụọ. (Abụ Ọma  119:89-96) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Jehova, ruo mgbe ebighị ebi ka e meworo ka okwu Gị guzosie ike n’eluigwe. . . . I mewo ka ụwa guzosie ike, o wee guzo.” (Abụ Ọma 119:89, 90) Site n’okwu Chineke—‘ụkpụrụ ya nile nke eluigwe’—ihe ndị dị na mbara igwe na-aga nnọọ gburugburu n’ụzọ ha, e mekwara ka ụwa guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. (Job 38:31-33; Abụ Ọma 104:5) Anyị pụrụ ịdabere n’okwu nile nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta; ihe Chineke na-ekwu ‘ga-aga nke ọma’ n’imezu nzube ya.—Aịsaịa 55:8-11.

4. Gịnị ka okwu Chineke ịtọ ndị ohu ya e wedara n’ala ụtọ na-emere ha?

4 Ọbụ abụ ahụ gaara ‘alaworị n’iyi n’ime mweda n’ala ya ma a sị na iwu Chineke abụghị ihe na-atọ ya ụtọ.’ (Abụ Ọma 119:92) Ọ bụghị ndị ala ọzọ nọ na-eweda ya n’ala; ọ bụ ụmụ Izrel na-emebi iwu, bụ́ ndị kpọrọ ya asị. (Levitikọs 19:17) Ma nke a emeghị ka ọ daa mbà, n’ihi na ọ hụrụ iwu Chineke, bụ́ nke gbara ya ume, n’anya. Na Kọrint, Pọl onyeozi nọrọ “n’ihe ize ndụ n’etiti ụmụnna ụgha,” ikekwe gụnyere “ndịozi ọkasị mma” bụ́ ndị na-achọ ihe ha ga-eji bo ya ebubo. (2 Ndị Kọrint 11:5, 12-14, 26) N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl lanarịrị n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na okwu Chineke na-atọ ya ụtọ. Ebe ọ bụ na Okwu Jehova e dere ede na-atọ anyị ụtọ, anyị ana-etinyekwa ihe ọ na-ekwu n’ọrụ, anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 3:15) Ọbụna asị ụwa kpọrọ anyị adịghị eme ka anyị chefuo nke ọ bụla n’ime ntụziaka Chineke. Anyị na ụmụnna anyị na-eji ịdị n’otu na ịhụnanya eme uche ya ka anyị na-elepụ anya n’ihu iji ọṅụ jeere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 119:93.

5. Olee otú Eze Esa si chọọ Jehova?

5 Mgbe anyị na-egosipụta nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị pụrụ ikpe ekpere, sị: “Ọ bụ Gị nwe m, zọpụta m; n’ihi na ihe ịrịba ama Gị nile ka m chọworo.” (Abụ Ọma 119:94) Eze Esa chọrọ Chineke ma kpochapụ ndapụ n’ezi ofufe na Juda. Ná nzukọ ukwu e nwere n’afọ nke 15 nke ọchịchị Esa (963 T.O.A.), ndị bi na Juda ‘bara n’ọgbụgba ndụ ịchọ Jehova.’ Chineke “wee mee ka ha chọta Ya” ma “mee ka ha zuru ike gburugburu.” (2 Ihe E Mere 15:10-15) Ihe atụ a kwesịrị ịgba onye ọ bụla nke kpafuworo site n’ọgbakọ Ndị Kraịst ume ịmaliteghachi ịchọ Chineke. Ọ ga-agọzi ma chebe ndị nile maliteghachiri iso ndị ya na-akpakọrịta.

6. Gịnị ga-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ime mmụọ?

6 Okwu Jehova na-eme ka anyị nwee amamihe nke pụrụ ichebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ime mmụọ. (Abụ Ọma 119:97-104) Iwu Chineke na-eme ka anyị mara ihe karịa ndị iro anyị. Ịṅa ntị n’ihe àmà ya na-eme ka anyị nwee uche, ‘ichebekwa ihe ịrịba ama ya na-eme ka anyị ghọta ihe karịa ndị okenye.’ (Abụ Ọma 119:98-100) Ọ bụrụ na ‘okwu ọnụ Jehova na-atọ okpo ọnụ anyị ụtọ karịa ka mmanụ aṅụ si atọ ọnụ anyị ụtọ,’ anyị ga-akpọ “ụzọ okwu ụgha ọ bụla asị” ma zere ya. (Abụ Ọma 119:103, 104) Nke a ga-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ime mmụọ ka anyị na-ezute ndị mpako, ndị na-eme ihe ike ike na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.—2 Timoti 3:1-5.

 Oriọna Dịịrị Ụkwụ Anyị

7, 8. N’ikwekọ n’Abụ Ọma 119:105, gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee?

7 Okwu Chineke na-enye ìhè ime mmụọ na-adịghị anyụ anyụ. (Abụ Ọma 119:105-112) Ma ànyị bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ma ànyị bụ ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ,” anyị na-ekwu, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Jọn 10:16; Abụ Ọma 119:105) Okwu Chineke dị ka oriọna na-enye okporo ụzọ anyị ìhè, ka anyị wee ghara ịsụ ngọngọ ma daa n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 6:23) Ma, anyị onwe anyị aghaghị ikwe ka okwu Jehova bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị.

8 Ọ dị anyị mkpa iguzosi ike dị ka onye dere Abụ Ọma nke 119. O kpebisiri ike ịghara isi n’ihe ịrịba ama Chineke fugharịa. O kwuru, sị: “Aṅụwo m iyi, mee ka o guzosie ike, na m ga-edebe ikpe nile nke ezi omume [Jehova].” (Abụ Ọma 119:106) Ya adịla mgbe anyị ga-eleda uru ịmụchi Bible anya na ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya bara.

9, 10. Olee otú anyị si mara na ndị raara onwe ha nye Jehova pụrụ ‘ifugharị site n’ihe ịrịba ama ya,’ ma olee otú a pụrụ isi zere nke a?

9 Ọbụ abụ ahụ ‘esighị n’ihe ịrịba ama Chineke fugharịa’ ma nke ahụ pụrụ ime onye raara onwe ya nye Jehova. (Abụ Ọma 119:110) Eze Solomọn fugharịrị, ọ bụ ezie na o si ná mba a raara nye Jehova, o mekwara ihe kwekọrọ n’amamihe Chineke na mbụ. ‘Ọbụna ndị inyom ala ọzọ mere ka o mehie’ site n’ime ka o fee chi ụgha.—Nehemaịa 13:26; 1 Ndị Eze 11:1-6.

10 “Osi ọnyà” ahụ, bụ́ Setan, na-esi ọtụtụ ọnyà. (Abụ Ọma 91:3) Dị ka ihe atụ, onye anyị na ya sobu na-efe ofufe pụrụ ịnwa ime ka anyị si n’ìhè ime mmụọ fugharịa ma banye n’ọchịchịrị nke ofufe ụgha. N’etiti Ndị Kraịst nọ na Taịataịra, e nwere “nwanyị ahụ bụ́ Jezibel,” ikekwe ìgwè ndị inyom na-akụziri ndị ọzọ ife arụsị na ịkwa iko. Jizọs anabataghị ihe ọjọọ dị otú ahụ, anyị ekwesịghịkwa ịnabata ya. (Mkpughe 2:18-22; Jud 3, 4) Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova ka anyị wee ghara ifugharị site n’ihe ịrịba ama ya, kama ka anyị nọgide n’ìhè Chineke.—Abụ Ọma 119:111, 112.

Ndị Okwu Chineke Kwagidere

11. Dị ka Abụ Ọma 119:119 si kwuo, olee otú Chineke si ele ndị na-emebi iwu anya?

11 Ọ bụrụ na anyị esighị n’ụkpụrụ ya kpafuo, Chineke ga-akwagide anyị. (Abụ Ọma 119:113-120) Anyị adịghị anabata “ndị nwere uche abụọ,” dị nnọọ ka Jizọs na-adịghị anabata ndị na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst ma dị ṅara ṅara. (Abụ Ọma 119:113; Mkpughe 3:16) N’ihi na anyị ji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi, ọ bụ ‘ebe nzuzo anyị,’ ọ ga-akwagidekwa anyị. Ọ ‘ga-eleda ndị nile si n’ụkpụrụ nile ya jehie site n’itinye aka n’aghụghọ na okwu ụgha, anya.’ (Abụ Ọma 119:114, 117, 118; Ilu 3:32) Ọ na-ele ndị ajọ omume dị otú ahụ anya dị ka “afụrụ ụzụ”—urughuru ihe ndị a na-ewepụ n’ọla ndị bara uru dị ka ọlaọcha na ọlaedo. (Abụ Ọma 119:119; Ilu 17:3) Ka anyị na-egosipụta mgbe nile na anyị hụrụ ihe àmà Chineke n’anya, ebe ọ bụ na anyị achọtụghị iso n’afụrụ ụzụ nke ndị na-emebi iwu e bibiri ebibi!

12. N’ihi gịnị ka egwu Jehova ji dị mkpa?

12 Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ajị anụ ahụ́ m guzooro ọtọ site n’oké egwu Gị [Jehova].” (Abụ Ọma 119:120) Anyị inwe egwu ziri ezi maka Chineke, bụ́ nke anyị na-egosipụta site n’izere ime ihe ọ na-adịghị anakwere, dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ọ ga-akwagide anyị dị ka ndị ohu ya. Inwe egwu nsọpụrụ maka Jehova mere ka Job  bie ndụ ezi omume. (Job 1:1; 23:15) Egwu Chineke pụrụ inyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ Chineke kwadoro n’agbanyeghị ihe anyị na-aghaghị idi. Otú ọ dị, ntachi obi chọrọ iji okwukwe na-ekpesi ekpere ike.—Jems 5:15.

Jiri Okwukwe Na-ekpe Ekpere

13-15. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee okwukwe na a ga-aza ekpere anyị? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ma ọ bụrụ anyị amaghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere? (ch) Kọwaa otú Abụ Ọma 119:121-128 pụrụ isi kwekọọ ‘n’ịsụ ude anyị na-adapụtaghị adapụta’ mgbe anyị na-ekpe ekpere.

13 Anyị pụrụ iji okwukwe na-ekpe ekpere ka Chineke gbatara anyị ọsọ enyemaka. (Abụ Ọma 119:121-128) Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị ji n’aka na a ga-aza ekpere anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ iwu Chineke n’anya “karịa ọlaedo, ee, karịa ọlaedo a nụchara anụcha.” Ọzọkwa, ‘anyị agụwo ihe ịrịba ama nile nke Chineke, nke dịịrị ihe nile, n’ihe ziri ezi.’—Abụ Ọma 119:127, 128.

14 Jehova na-anụ arịrịọ anyị n’ihi na anyị ji okwukwe na-ekpe ekpere, jirikwa nlezianya na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ịrịba ama ya. (Abụ Ọma 65:2) Oleekwanụ ma ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ anyị enwee nsogbu na-akpaghasị nnọọ uche nke na anyị amaghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere? Mgbe ahụ, “mmụọ nsọ n’onwe ya [na-eji] ịsụ ude na-adapụtaghị adapụta na-arịọrọ anyị arịrịọ.” (Ndị Rom 8:26, 27) N’oge ndị dị otú ahụ, Chineke na-anakwere ihe ndị dị n’Okwu ya dị ka ekpere ndị na-anọchi anya ihe ndị na-akpa anyị.

15 Akwụkwọ Nsọ jupụtara n’ekpere na okwu ndị ga-ekwekọ ‘n’ịsụ ude anyị na-adapụtaghị adapụta.’ Dị ka ihe atụ, tụlee Abụ Ọma 119:121-128. Otú e si kwuo ihe ndị dị na ya pụrụ ikwekọ n’ọnọdụ anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-atụ ụjọ ịbụ ndị e megburu, anyị pụrụ ịrịọ Chineke maka enyemaka dị ka ọbụ abụ ahụ mere. (Amaokwu nke 121-123) Ka e were ya na anyị chọrọ ime mkpebi siri ike. Mgbe ahụ, anyị pụrụ ikpe ekpere ka mmụọ Jehova nyere anyị aka icheta ihe àmà ya na itinye ya n’ọrụ. (Amaokwu nke 124, 125) Ọ bụ ezie na anyị ‘kpọrọ ụzọ okwu ụgha ọ bụla asị,’ ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịghara ịdaba  n’ọnwụnwa ụfọdụ ga-eme ka anyị mebie iwu ya. (Amaokwu nke 126-128) Ọ bụrụ na anyị na-agụ Bible kwa ụbọchị, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ na-enye aka pụrụ ịgbata anyị n’uche mgbe anyị na-arịọ Jehova arịrịọ.

Ndị Ihe Àmà Jehova Nyeere Aka

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka ihe àmà Chineke ji dị anyị mkpa, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ha anya? (b) Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi na-ele anyị anya, oleekwa ihe ka mkpa n’ezie?

16 Iji bụrụ ndị a ga-anụ ekpere ha na ndị ga-enweta ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ịṅa ntị n’ihe àmà ya. (Abụ Ọma 119:129-136) Ebe ọ bụ na anyị na-echefukarị ihe, ihe àmà dị ebube nke Jehova bụ́ nke na-eme ka anyị cheta na ntụziaka na iwu ya dị anyị mkpa. N’ezie, anyị na-enwe ekele maka ìhè ime mmụọ ndị anyị na-enweta site ná nghọta ọhụrụ ọ bụla nke okwu Chineke. (Abụ Ọma 119:129, 130) Anyị nwekwara ekele na Jehova ‘emewo ka ihu ya nye anyị ìhè’ iji gosi na ihe anyị na-atọ ya ụtọ, ọ bụ ezie na ‘anya mmiri nke dị ka ọtụtụ mmiri iyi na-agba anya anyị abụọ’ n’ihi ndị na-emebi iwu ya.—Abụ Ọma 119:135, 136; Ọnụ Ọgụgụ 6:25.

17 Anyị ji n’aka na anyị ga-anọgide na-enweta ihu ọma Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị kwekọrọ n’ihe àmà ezi omume ya. (Abụ Ọma 119:137-144) Dị ka ndị ohu Jehova, anyị na-ekweta na o ruuru ya ịdị na-echetara anyị ihe àmà ezi omume ya ma na-enye anyị ya dị ka iwu anyị kwesịrị irubere isi. (Abụ Ọma 119:138) Ebe ọ bụ na ọbụ abụ ahụ rubere isi n’iwu Chineke, gịnị mere o ji na-ekwu, sị: “Onye nta ka m bụ, na onye a na-eleda anya”? (Abụ Ọma 119:141) O doro anya na ọ na-ezo aka n’otú ndị iro ya si ele ya anya. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ezi omume, ndị ọzọ pụrụ ileda anyị anya. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka mkpa n’ezie bụ na anyị nwere ihu ọma Jehova n’ihi na anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe àmà ezi omume ya.

Ndị Nọ ná Nchebe na n’Udo

18, 19. Gịnị na-esi n’anyị idebe ihe àmà Chineke apụta?

18 Idebe ihe àmà Chineke na-eme ka anyị nọrọ ya nso. (Abụ Ọma 119:145-152) N’ihi na anyị na-ege ntị n’ihe àmà Jehova, anyị nweere onwe anyị iji obi anyị dum na-akpọku ya, anyị pụkwara ịtụ anya na ọ ga-anụ ekpere anyị. Anyị pụrụ ibili n’ụra ma tikuo ya mkpu maka enyemaka tupu “chi ọbụbọ.” Lee oge magburu onwe ya ọ bụ iji kpee ekpere! (Abụ Ọma 119:145-147) Chineke nọkwa anyị nso n’ihi na anyị na-ezere ịgbaso nzube ọjọọ ma na-ele okwu ya anya dị ka eziokwu, ọbụna dị ka Jizọs mere. (Abụ Ọma 119:150, 151; Jọn 17:17) Mmekọrịta nke anyị na Jehova na-akwagide anyị n’ụwa a nọ ná nsogbu, ọ ga-emekwa ka anyị gabiga agha ukwu ya bụ́ Amagedọn.—Mkpughe 7:9, 14; 16:13-16.

19 N’ihi nkwanye ùgwù miri emi anyị nwere maka okwu Chineke, anyị na-enweta ezi nchebe. (Abụ Ọma 119:153-160) N’adịghị ka ndị ajọ omume, anyị ‘esibeghị n’ihe àmà Jehova nile wezụga onwe anyị.’ Anyị hụrụ ihe ịrịba ama Chineke n’anya, n’ihi ya kwa, anyị nọ ná nchebe ebe o nwere obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe anyị nọ. (Abụ Ọma 119:157-159) Ihe àmà Jehova na-akpali ikike iche echiche anyị ka anyị wee na-echeta ihe ọ chọrọ anyị n’aka n’ọnọdụ nke ọ bụla kpọmkwem. N’aka nke ọzọ, ihe ịrịba ama Chineke bụ ihe nduzi, anyị kwetakwara nnọọ na o ruuru Onye Okike anyị iduzi anyị. N’ịmara na ‘isi ihe nke okwu Chineke bụ eziokwu’ nakwa na anyị apụghị iduzi nzọụkwụ anyị n’enwetaghị enyemaka ya, anyị na-eji obi ụtọ anakwere nduzi ya.—Abụ Ọma 119:160; Jeremaịa 10:23.

20. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee “udo nke hiri nne”?

20 Ịhụnanya anyị nwere maka iwu Jehova na-ewetara anyị udo hiri nne. (Abụ Ọma 119:161-168) Mkpagbu adịghị anapụ anyị “udo nke Chineke” nke na-enweghị atụ. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Anyị ji nnọọ ikpe Jehova kpọrọ ihe nke na anyị na-eto ya maka ikpe ya mgbe mgbe—“ugboro asaa n’ụbọchị.” (Abụ Ọma 119:161-164) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu Gị n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.” (Abụ Ọma 119:165) Ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime anyị hụrụ iwu Jehova n’anya ma na-edebe ya, anyị  agaghị asụ ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ n’ihi ihe onye ọzọ mere ma ọ bụ n’ihi ihe ọ bụla ọzọ.

21. Olee ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na anyị ekwesịghị ịsụ ngọngọ ma ọ bụrụ na esemokwu ebilite n’ọgbakọ?

21 Ọtụtụ n’ime ndị a kpọtụrụ aha na Bible ekweghị ka ihe ọ bụla ghọọrọ ha ihe mkpọbi ụkwụ na-adịgide adịgide. Dị ka ihe atụ, e meghị ka Onye Kraịst bụ́ Gaịọs sụọ ngọngọ kama ọ “nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ” n’agbanyeghị omume asọpụrụghị Chineke nke Daịọtrefis. (3 Jọn 1-3, 9, 10) Pọl gbara ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst bụ́ Yuodia na Sintiki ume “inwe otu uche ahụ n’ime Onyenwe anyị,” eleghị anya n’ihi na ha sere okwu. O doro anya na e nyeere ha aka idozi nsogbu ha, ha anọgidekwa na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. (Ndị Filipaị 4:2, 3) Ya mere, anyị ekwesịghị ịsụ ngọngọ ma ọ bụrụ na e nwee otú esemokwu si bilite n’ọgbakọ. Ka anyị lekwasị anya n’ịdị na-edebe ihe ịrịba ama Jehova, na-echeta na ‘ụzọ anyị nile dị n’ihu ya.’ (Abụ Ọma 119:168; Ilu 15:3) Mgbe ahụ, ọ dịghị ihe ga-anapụcha anyị “udo nke hiri nne” anyị nwere.

22. (a) Ọ bụrụ na anyị na-erubere Chineke isi, olee ihe ùgwù anyị pụrụ inweta? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ụfọdụ ndị siworo n’ọgbakọ Ndị Kraịst fugharịa anya?

22 Ọ bụrụ na anyị na-erubere Jehova isi mgbe nile, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke ịnọgide na-eto ya. (Abụ Ọma 119:169-176) Site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, ọ bụghị nanị na anyị na-enweta nchebe ime mmụọ kamakwa ‘egbugbere ọnụ anyị na-ekwu otuto Jehova.’ (Abụ Ọma 119:169-171, 174) Nke a bụ ihe ùgwù kachasịnụ anyị pụrụ inwe n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ọbụ abụ ahụ chọrọ ịdịgide ndụ ma na-eto Jehova, ma n’ụzọ ụfọdụ anyị na-amaghị, o ‘fugharịrị dị ka atụrụ nke furu efu.’ (Abụ Ọma 119:175, 176) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị siworo n’ọgbakọ Ndị Kraịst fugharịa ka hụrụ Chineke n’anya, ha ka pụkwara ịchọ ito ya. Ya mere, ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji nyere ha aka inwetaghachi nchebe ime mmụọ ma nwee ọṅụ nke iso ndị Jehova na-eto ya.—Ndị Hibru 13:15; 1 Pita 5:6, 7.

Ìhè Na-adịgide Adịgide n’Okporo Ụzọ Anyị

23, 24. Olee uru i riteworo site n’Abụ Ọma nke 119?

23 Abụ Ọma nke 119 pụrụ ịbara anyị uru n’ụzọ dịgasị iche. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ime ka anyị na-adaberekwu na Chineke, n’ihi na ọ na-egosi na ezi obi ụtọ na-abịa site ‘n’ijegharị n’iwu Jehova.’ (Abụ Ọma 119:1) Ọbụ abụ ahụ na-echetara anyị na ‘isi ihe nke okwu Chineke bụ eziokwu.’ (Abụ Ọma 119:160) Nke a n’ezie kwesịrị ime ka anyị jiri Okwu Chineke nile e dere ede kpọrọ ihe. Ịtụgharị uche n’Abụ Ọma nke 119 kwesịrị ịkpali anyị iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Ọbụ abụ ahụ rịọrọ Chineke ọtụtụ ugboro, sị: “Zi m ụkpụrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 119:12, 68, 135) Ọ rịọkwara arịrịọ, sị: “Zi m ịdị mma nke ezi uche na ihe ọmụma; n’ihi na ọ bụ n’ihe nile I nyere n’iwu ka m kwerewooro.” (Abụ Ọma 119:66) Anyị kwesịrị ikpe ekpere yiri nke ahụ.

24 Izi ihe Chineke na-eme ka o kwe anyị omume iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ọbụ abụ ahụ kpọrọ onwe ya ohu Chineke ugboro ugboro. N’ezie, o ji okwu a na-emetụ n’ahụ́ mee ihe mgbe ọ na-agwa Jehova okwu: “Ọ bụ Gị nwe m.” (Abụ Ọma 119:17, 65, 94, 122, 125; Ndị Rom 14:8) Lee ihe ùgwù ọ bụ ijere Jehova ozi na ito ya dị ka otu n’ime Ndịàmà ya! Ị̀ na-eji ọṅụ ejere Chineke ozi dị ka onye nkwusa Alaeze? Ya bụrụ otú ahụ, jide n’aka na Jehova ga-anọgide na-akwado gị ma na-agọzi gị n’ọrụ a dị ùgwù ma ọ bụrụ na ị na-atụkwasị okwu ya obi mgbe nile ma kwere ka ọ bụrụ ìhè dịịrị okporo ụzọ gị.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka okwu Chineke kwesịrị iji na-atọ anyị ụtọ?

• Olee otú okwu Chineke si akwagide anyị?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ihe àmà Jehova si enyere anyị aka?

• N’ihi gịnị ka ndị Jehova ji nọrọ ná nchebe na n’udo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Okwu Chineke na-enye ìhè ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ bụrụ na anyị hụrụ ihe àmà Jehova n’anya, ọ dịghị mgbe ọ ga-ele anyị anya dị ka “afụrụ ụzụ”

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ọ bụrụ na anyị na-agụ Bible kwa ụbọchị, akụkụ ya ndị na-enye aka pụrụ ịgbata anyị n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere