Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mmetụta Jizọs Kraịst Na-enwe n’Ahụ́ Gị?

Olee Mmetụta Jizọs Kraịst Na-enwe n’Ahụ́ Gị?

 Olee Mmetụta Jizọs Kraịst Na-enwe n’Ahụ́ Gị?

N’IHI ihe anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ, è nwere obi abụọ ọ bụla na ozizi Jizọs na-emetụta ụwa dum? Otú ọ dị, ajụjụ dị mkpa bụ, “Olee mmetụta ozizi Jizọs na-enwe n’ahụ́ mụ onwe m?”

Ozizi Jizọs metụtara ọtụtụ ihe. Ihe ndị ọ kụziri pụrụ imetụta akụkụ nile nke ndụ gị. Ka anyị lekwasị anya n’ihe Jizọs kụziri banyere idebe ihe ndị ka mkpa n’ọnọdụ mbụ ná ndụ, ịbụ enyi Chineke, mmadụ na ndị ọzọ inwe ezi mmekọrịta, idozi nsogbu na izere ime ihe ike.

Debe Ihe Ndị Ka Mkpa n’Ọnọdụ Mbụ ná Ndụ Gị

Ụwa nke taa, bụ́ ebe ndị mmadụ na-eji ọrụ n’aka mgbe nile, na-ewekọrọ nnọọ oge na ike anyị nke na a na-elegharakarị ihe ime mmụọ anya. Tụlee ihe atụ nke otu nwa okorobịa anyị ga-akpọ Jerry, bụ́ onye dị afọ 20 na ụma. Ọ bụ  ezie na Jerry na-enwe mmasị iso ndị ọzọ ekwurịta ihe ime mmụọ ma jiri ihe ndị ọ na-amụta na ya kpọrọ ihe, ọ na-akwa arịrị, sị: “Enweghị m nnọọ ohere inwe ụdị nkwurịta okwu ahụ mgbe nile. Ana m arụ ọrụ ụbọchị isii n’izu. Ọ bụ nanị n’ụbọchị Sunday ka m na-adịghị arụ ọrụ. Mgbe m mesịkwara ihe ndị dịịrị m ime, ike na-agwụ m nnọọ.” Ya bụrụ na i nwere ụdị nsogbu ahụ, ị pụrụ irite uru site n’ihe Jizọs kụziri n’Ozizi Elu Ugwu.

Jizọs gwara ìgwè mmadụ gbakọtara ige ya ntị, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. Ọ̀ bụ na mkpụrụ obi adịghị mkpa karịa ihe oriri, ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe? Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya nke ọma, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ ma ọ bụ na-ekpokọta ihe n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ karịa ha? . . . Ya mere, ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:25-33) Gịnị ka anyị na-amụta site na nke a?

Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị ileghara mkpa anụ ahụ́ anyị na nke ndị ezinụlọ anyị anya. Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, Jizọs kwere nkwa na ọ bụrụ na anyị edebe ihe ndị mbụ n’ọnọdụ mbụ ma bute ihe ime mmụọ ụzọ, Chineke ga-ahụ na anyị nwetara ihe ndị ọzọ na-akpa anyị. Ihe Jizọs na-akụziri anyị n’ebe a bụ idebe ihe ndị ka mkpa n’ọnọdụ mbụ. Ịgbaso ndụmọdụ a na-eduga n’obi ụtọ, n’ihi na “obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Ghọọ Enyi Chineke

Ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha na-ahụ mkpa ọ dị ha na Chineke inwe ezi mmekọrịta. Olee otú anyị na mmadụ si amalite inwe ezi mmekọrịta? Ọ̀ bụ na anyị adịghị agbalị ịmatakwu onye ahụ? Anyị aghaghị iwepụta oge iji mụta otú o si eche echiche, àgwà ya, ihe ndị ọ ga-emeli, ihe ndị ọ rụzurula, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya. Ọ bụ otu ihe ahụ mgbe a bịara n’ịghọ enyi Chineke. Ọ dị mkpa inweta ezi ihe ọmụma banyere ya. Mgbe ọ na-ekpegara Chineke ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, ọ dị anyị mkpa ịmata Chineke iji bụrụ ndị enyi ya. Nanị ebe anyị ga-esi nweta ihe ọmụma ahụ bụ n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16) Anyị aghaghị iwepụta oge iji mụọ Akwụkwọ Nsọ.

Otú ọ dị, inwe nanị ihe ọmụma ezughị ezu. N’otu ekpere ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Ha [ndị na-eso ụzọ ya] edebewokwa okwu gị.” (Jọn 17:6) Ọ bụghị nanị na anyị ga-enweta ihe ọmụma banyere Chineke, kamakwa anyị aghaghị ime ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ. Olee otú ọzọ anyị pụrụ isi ghọọ ndị enyi Chineke? Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ọbụbụenyi nke  anyị na mmadụ gaa n’ihu ma ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme ihe megidere echiche na ụkpụrụ onye ahụ? Mgbe ahụ, echiche na ụkpụrụ Chineke kwesịrị iduzi nzọụkwụ anyị nile ná ndụ. Tụlee otú abụọ n’ime ụkpụrụ ya si emetụta mmekọrịta nke anyị na ụmụ mmadụ ndị ọzọ.

Gị na Ndị Ọzọ Nwee Ezi Mmekọrịta

N’otu oge, Jizọs kọrọ otu obere akụkọ iji kụzie ihe bara uru banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ kọrọ banyere otu eze nke chọrọ ka ya na ndị ohu ya mee mpịazi. Otú ọ dị, otu n’ime ha ji nnukwu ụgwọ, o nweghịkwa ụzọ ọ ga-esi kwụọ ya. Eze ahụ nyere iwu ka e ree nwoke ahụ, nwunye ya na ụmụ ya ma kwụọ ụgwọ o ji. Onye ahụ ji ụgwọ ahụ dara n’ala ma rịọ, sị: “Nweere m ndidi, m ga-akwụghachikwa gị ihe nile.” N’ịbụ onye nwere ọmịiko, eze ahụ gbaghaara ya ụgwọ ahụ o ji. Ma ohu ahụ pụrụ, hụ otu ohu ibe ya nke ji ya obere ụgwọ, ma gwa ya ka ọ kwụọ ya ụgwọ o ji ya. Ọ bụ ezie na ohu ibe ya a rịọrọ ya ka o meere ya ebere, ohu nke mbụ ahụ tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ya ụgwọ nile o ji ya. Mgbe eze ahụ nụrụ nke a, iwe were ya. Ọ jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ na i kwesịghị . . . imere ohu ibe gị ebere, dị ka m mewokwaara gị ebere?” Ọ tụbara ohu ahụ nke na-enweghị mgbaghara n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụghachi ụgwọ nile o ji. Iji gosi ihe mmụta dị n’akụkọ ahụ, Jizọs kwuru, sị: “N’ụzọ yiri nke ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi unu.”—Matiu 18:23-35.

Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị na-emejọ mgbe mgbe. Anyị agaghị akwụchali Chineke nnukwu ụgwọ anyị jikọsịrị ya n’ihi imehie megide ya. Nanị ihe anyị nwere ike ime bụ ịrịọ ya mgbaghara. Jehova Chineke dịkwa njikere ịgbaghara mmehie anyị nile ma ọ bụrụhaala na anyị agbaghara ụmụnna anyị mmehie ha mere megide anyị. Lee nnukwu ihe mmụta nke ahụ bụ! Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.”—Matiu 6:12.

Dozie Nsogbu Site n’Iwepụ Ihe Kpatara Ya

Jizọs maara ụmụ mmadụ nke ọma. Ndụmọdụ ya na-enye aka idozi nsogbu site n’iwepụ ihe kpatara ya. Tụlee ihe atụ abụọ na-esonụ.

Jizọs kwuru, sị: “Unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị, ‘Egbula ọchụ; ma onye ọ bụla nke gburu ọchụ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.’ Otú ọ dị, asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-eweso nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.” (Matiu 5:21, 22) N’ebe a, Jizọs gosiri na ihe na-akpata nsogbu nke igbu ọchụ dị omimi karịa omume ọjọọ ahụ n’onwe ya. Ọ bụ àgwà nke na-ebilite n’obi onye ahụ gburu ọchụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ebughị iwe n’obi, ime ihe ike e buru ụzọ mee atụmatụ ya agaghị adị. Lee oké mwụfu ọbara a ga-ezere ma ọ bụrụ na e jiri ozizi a mee ihe!

Rịba ama otú Jizọs siri gosi isi ihe na-akpata nsogbu ọzọ nke na-eweta obi mgbawa dị ukwuu. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya. Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya ma si n’ebe ị nọ tụfuo ya.” (Matiu 5:27-29) Jizọs kụziri na nsogbu ahụ karịrị omume ahụ rụrụ arụ n’onwe ya. Ihe kpatara nsogbu ahụ bụ ihe bu ya ụzọ—agụụ mmekọahụ. Ọ bụrụ na mmadụ aghara ịnọgide na-enwe agụụ na-ezighị ezi ma ‘tụfuo ha’ site n’obi ya, mgbe ahụ, ọ ga-ezere nsogbu nke bụ́ omume rụrụ arụ pụrụ isi na ya pụta.

“Mịghachi Mma Agha Gị n’Ọnọdụ Ya”

N’abalị ahụ a raara Jizọs nye ma jide ya, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya mịpụtara mma agha ya iji chebe ya. Jizọs nyere ya iwu, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile  na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) N’ụtụtụ echi ya, Jizọs gwara Pọntiọs Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Ọ̀ bụ na ezi uche adịghị n’ozizi a?

Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si meghachi omume n’ozizi Jizọs banyere ịghara ime ihe ike? Akwụkwọ bụ́ The Early Christian Attitude to War na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ nnọọ na ọ [ozizi Jizọs] kagburu ụdị ime ihe ike nile na imerụ ndị ọzọ ahụ́ dị ka ihe ndị iwu na-akwadoghị, o doro anya na ọ kagbukwara ịlụ agha . . . Ndị Kraịst oge mbụ nabatara ihe Jizọs kwuru, ma ghọta na ozizi ya pụtara na ha kwesịrị ịdị nro ma ghara ịdị na-emegwara ihe. Ha weere ya na ihe e ji mara okpukpe ha bụ udo; ha megidere nnọọ ịlụ agha n’ihi ọbara a na-akwafu na ya.” Lee otú a gaara esiwo zere ọdachi ndị e nwere n’oge ndị gara aga ma a sị na ndị nile zọọrọ na ha bụ Ndị Kraịst gbasoro ozizi a n’ezie!

Ị Pụrụ Irite Uru Site n’Ozizi Nile nke Jizọs

Ozizi Jizọs ndị anyị tụlerela mara mma, dị mfe nghọta ma dị irè. Ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ irite uru site n’ịmata ozizi ya na itinye ha n’ọrụ. *

Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịhụ otú ị pụrụ isi rite uru n’ozizi ndị amamihe kasị dịrị na ha nke mmadụ ọ bụla zitụrụla. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ịkpọtụrụ ha ma ọ bụ iji adres dị na peeji nke 2 nke magazin a degara ha akwụkwọ ozi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Maka ntụle dị n’usoro nke ozizi Jizọs nile, lee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 5]

“Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri”

[Foto dị na peeji nke 7]

Ozizi Jizọs pụrụ inwe ezi mmetụta ná ndụ gị