Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ebube Ndị Ị Hụrụla!

Ọrụ Ebube Ndị Ị Hụrụla!

 Ọrụ Ebube Ndị Ị Hụrụla!

IHE ọzọ okwu ahụ bụ́ “ọrụ ebube” pụtara bụ “ihe omume, ihe, ma ọ bụ ọrụ pụrụ nnọọ iche ma ọ bụ nke a na-adịghị ahụkarị.” Anyị nile ahụla ụdị ọrụ ebube a, bụ́ nke na-esiteghị n’aka Chineke.

N’ihi na ụmụ mmadụ amụtakwuola banyere iwu ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke, ha arụzuola ihe ndị e lere anya na mbụ dị ka ihe ndị na-agaghị ekwe omume. Dị ka ihe atụ, otu narị afọ gara aga, o nwere ike ịbụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ lere ihe ndị kọmputa, telivishọn, ihe ndị e ji enyocha mbara igwe, na ihe ndị yiri ha merela ka ha gharazie inwe ihe ha bụ ugbu a anya dị ka ihe ndị na-agaghị ekwe omume.

N’ihi na ha aghọtala na ha amachaghị nkà  ndị dị ebube dị n’ihe ndị Chineke kere, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekweta na ha enweghịzi ike ikwu hoo haa na ihe agaghị eme eme. Nanị ihe ha nwere ike ikwu bụ na ihe ahụ eyighị ihe ga-eme eme. Ha na-esi otú a ekweta na a pụrụ inwe “ọrụ ebube” n’ọdịnihu.

Ya bụrụgodị na anyị bu isi ihe “ọrụ ebube” pụtara n’uche, ya bụ, ihe “ndị e weere na ọ bụ ike karịrị nke mmadụ mere ha,” anyị nwere ike ikwu na onye ọ bụla n’ime anyị ahụla ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ anyanwụ, ọnwa na kpakpando—ha nile bụcha ihe ndị “ike karịrị nke mmadụ mere,” ihe ndị Onye Okike n’onwe ya mere. E wezụga nke ahụ, ònye ga-akọwali n’ụzọ zuru ezu, otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ? otú ụbụrụ si arụ ọrụ? ma ọ bụ otú nwa nọ n’afọ si eto? Akwụkwọ bụ́ The Body Machine na-ekwu, sị: “Ahụ́ mmadụ, bụ́ nke usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ na akwara na-achịkwa, bụ ngwá ọrụ dị mgbagwoju anya e ji anụ ísì, anụ ihe, ebitụ ihe aka, anụ ụtọ ihe, na nke e ji ahụ ụzọ, ígwè ọrụ na-agagharị agagharị nke na-achịkwa onwe ya, kọmputa na-emepụtaghachi onwe ya—ihe e kere eke nke dị ebube na nke dị mgbagwoju anya n’ọtụtụ ụzọ.” Chineke nke kere “ahụ́ mmadụ” rụrụ ọrụ ebube n’ezie, bụ́ nke nọgidere na-atụ anyị n’anya. E nwekwara ụdị ọrụ ebube ndị ọzọ ị hụrụla, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị ghọtaghị na ha bụ ọrụ ebube.

Akwụkwọ Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ọrụ Ebube?

Ọ dịghị akwụkwọ a na-ekesaru otú e si ekesa Bible. Ị̀ na-ahụ ya dị ka ọrụ ebube? Ànyị nwere ike iwere ya dị ka ihe “ike karịrị nke mmadụ” mere ka ọ dịrị? N’eziokwu, Bible bụ akwụkwọ ụmụ mmadụ dere, ma ha kwuru na ha dere echiche Chineke, ọ bụghị nke ha. (2 Samuel 23:1, 2; 2 Pita 1:20, 21) Cheedị banyere ya. Ha dị mmadụ 40, bie ndụ n’agbata otu puku afọ na narị isii. Ha si ná nzụlite dịgasị iche dị ka ndị ọzụzụ atụrụ, ndị agha, ndị ọkụ azụ̀, ndị ọrụ bekee, ndị dọkịta, ndị nchụàjà na ndị eze. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ziri otu ozi olileanya ahụ, nke bụ́ eziokwu ma zie ezie.

Site n’iji nlezianya mụọ Bible, Ndịàmà Jehova nakweere ya, “ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke,” dị ka Pọl onyeozi dere. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ruo ọtụtụ afọ, akwụkwọ ha akọwaala otú a pụrụ isi mee ka ihe ndị ahụ a sịrị na ha na-emegiderịta onwe ha na Bible kwekọọ n’ozi ya n’ozuzu ya. Nkwekọ a nke akụkụ dị iche iche nke Bible bụ ihe àmà na-egosi na ọ bụ Chineke chepụtara ya. *

Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ a nwarala ibibi dị ka a nwarala ibibi Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka dị, ma ọ̀ dịghịkwa ihe ọzọ, akụkụ ya ụfọdụ dị n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ. Ma otú e si chekwaa ya n’ụzọ nkịtị dị ka akwụkwọ ma otú e si chekwaa ihe dị n’ime ya na-egosi na o sitere n’aka Chineke. Bible bụ ọrụ ebube n’ezie!

Ọrụ Ebube nke “Dị Ndụ Ma Na-akpa Ike”

A dịghịzi ahụ ụdị ọrụ ebube ndị a rụrụ n’oge ndị gara aga—ọgwụgwọ na mbilite n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube. Ma anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na n’ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ, a ga-arụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ ọzọ, na nke ugbu a, n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Ha ga-eweta nnwere onwe na-adịgide adịgide, ha ga-akarịkwa ihe anyị pụrụ ịghọta ugbu a.

 Ọrụ ebube bụ́ Bible ka pụrụ ọbụna ịrụ ihe ndị yiri ọrụ ebube taa site n’ịkpali ndị mmadụ imeziwanye àgwà ha. (Lee otu ihe atụ n’igbe bụ́ “Ike nke Okwu Chineke,” na peeji nke 8.) Ndị Hibru 4:12 na-ekwu, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” Ee, Bible enyela aka gbanwee ndụ nke ihe karịrị nde mmadụ isii bi gburugburu ụwa, mee ka ndụ ha nwee nzube ma nye ha olileanya dị ebube maka ọdịnihu.

Gịnị ma i kwe ka Bible rụọ ọrụ ebube ná ndụ gị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a a sịrị na ha na-emegiderịta onwe ha iji hụ otú a pụrụ isi mee ka ha kwekọọ, a tụlere ọtụtụ n’ime ha n’isiokwu bụ́ “Bible Ọ̀ Na-emegide Onwe Ya” n’Ụlọ Nche, July 15, 1992.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ọ̀ NWỤỌLA ANWỤỌ KA Ọ̀ KA DỊ NDỤ?

Dị ka Jọn 19:33, 34 si kwuo, Jizọs anwụọla mgbe “otu onye n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ, ozugbo ahụkwa ọbara na mmiri gbapụtara.” Otú ọ dị, Matiu 27:49, 50 na-egosi na Jizọs ka dị ndụ mgbe nke a mere. Gịnị mere e ji nwee ọdịiche dị otú ahụ?

Iwu Mozis machibidoro ịhapụ onye omekome n’elu osisi e ji kwụgbuo ya ruo ụtụtụ echi ya. (Deuterọnọmi 21:22, 23) N’ihi ya, n’oge Jizọs, ya bụrụ na onye omekome a kwụgburu n’elu osisi ka dị ndụ ruo mgbede, a na-akụjikarị ya ụkwụ, si otú ahụ mee ka ọ nwụọ ngwa ngwa. Ọ gaghịzi enwe ike ịgbatị onwe ya iji wee kuru ume nke ọma. Na ndị agha kụjiri ụkwụ nke ndị omekome abụọ ahụ a kpọgbukọtara ha na Jizọs ma ghara ịkụji nke Jizọs na-egosi na ha chere na ọ nwụọla. O nwere ike ịbụ na onye agha ahụ mara ya ube n’akụkụ nanị iji jide n’aka na ọ nwụruola ala na iji mee ka ọ ghara imesị teta, bụ́ nke pụrụ ime ka a kpọsaa n’ụzọ na-ezighị ezi na o bilitere n’ọnwụ.

Ihe e dere na Matiu 27:49, 50 kọrọ otú ọzọ ihe a si mee. Ọ na-ekwu, sị: “Nwoke ọzọ buuru ube mapuo ya akụkụ, ọbara na mmiri wee gbapụta. Jizọs tiri mkpu ọzọ n’oké olu, wee kubie ume.” Otú ọ dị, ahịrịokwu ahụ e dere n’aka akwụkwọ dị iche adịghị n’ihe odide oge ochie nile nke Bible. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ọ bụ ihe odide e si n’Oziọma Jọn weta ma gbakwụnye n’ihe odide Matiu ka e mesịrị, kama na e tinyere ya n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. N’ihi ya, n’ọtụtụ nsụgharị, e denyere ahịrịokwu ahụ n’ime akara ngebichi, kọwaa ya n’ihe odide ala ala peeji, ma ọ bụ wepụ ahịrịokwu ahụ kpamkpam.

Ihe odide ochie nke Westcott na Hort chịkọtara, bụ́ nke e si na ya sụgharịa New World Translation, tinyere ahịrịokwu a n’akara ngebichi gbara mkpị. Ihe odide ahụ kwuru na “o yikarịrị nnọọ ka ọ̀ bụ ndị odeakwụkwọ tinyere” ahịrịokwu ahụ.

Mgbe ahụ, e nwere ihe àmà dị ukwuu na-egosi na Jọn 19:33, 34 bụ eziokwu, nakwa na Jizọs anwụọla mgbe onye agha Rom ahụ mara ya ube.

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

IKE NKE OKWU CHINEKE

Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma na onye nne na nna ya na-ebikọtaghịzi ọnụ, Detlef malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụbiga mmanya ókè na ige egwu rock na-ada oké ụda. * Ọ ghọrọ onye agboro, omume ime ihe ike ya mesịkwara mee ka ndị uwe ojii kpara ya aka.

Na 1992, ndị agboro 60 na ihe dị ka ndị egwu rock 35 lụrụ ọgụ dị egwu n’otu ụlọ nri dị ná mgbago ebe ọwụwa anyanwụ Germany. A kụrụ Thomas, bụ́ otu n’ime ndị egwu rock ahụ, ihe nke ukwuu nke na ọ nwụrụ n’ihi ahụ́ e merụrụ ya. A tụrụ ọtụtụ n’ime ndị isi ha, gụnyere Detlef, mkpọrọ mgbe e kpesịrị ha ikpe nke ọtụtụ ndị nta akụkọ kọrọ banyere ya.

Obere oge ka a tọhapụsịrị Detlef n’ụlọ mkpọrọ, Ndịàmà Jehova nyere ya otu akwụkwọ nta. Isiokwu akwụkwọ nta ahụ bụ “N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu?” Detlef ghọtara ozugbo na eziokwu dị n’ihe akwụkwọ nta ahụ kwuru, ọ malitekwara iso Ndịàmà na-amụ Bible. Nke a gbanwere nnọọ ndụ ya. Kemgbe 1996, ọ bụwo Onyeàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi.

Siegfried, bụ́bu onye egwu rock, bụ ezigbo enyi Thomas, bụ́ nwa okorobịa ahụ e gburu egbu; o mesịkwara ghọọ Onyeàmà ma na-eje ozi ugbu a dị ka okenye ọgbakọ. Mgbe Siegfried gara n’ọgbakọ Detlef ikwu okwu ihu ọha dabeere na Bible (ọ dabara na nne Thomas na-agakwa nzukọ n’ebe ahụ mgbe ụfọdụ), Detlef kpọrọ Siegfried òkù ịbịa n’ụlọ ya rie nri ehihie. Ihe dị ka afọ iri gara aga, ịkpọasị dị n’etiti ha gaara esi ike nchịkwa. Taa, ịhụnanya ụmụnna ha pụtara ìhè.

Detlef na Siegfried na-atụ anya ịnabataghachi Thomas ná ndụ n’ime ụwa paradaịs. Detlef na-ekwu, sị: “Nanị iche banyere ya na-agba m anya mmiri. Ihe ndị m mere wutere m.” Ọchịchọ ha abụọ nwere bụ inyere Thomas aka mgbe ahụ, dị ka ha na-enyere ndị ọzọ aka taa, ịmata Jehova na ịṅụrị ọṅụ n’olileanya Bible na-enye.

Ee, nke ahụ bụ ike nke Okwu Chineke!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 25 A gbanweela aha ndị ahụ.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ahụ́ mmadụ bụ ihe e kere eke nke dị ịtụnanya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Anatomy Improved and Illustrated, London, 1723, Bernardino Genga