Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Bụrụ na A Manye Gị Ịrụ Ọrụ’

‘Ọ Bụrụ na A Manye Gị Ịrụ Ọrụ’

 ‘Ọ Bụrụ na A Manye Gị Ịrụ Ọrụ’

“LEE anya! Hapụ ihe ị na-eme ozugbo bịa butere m ihe a.” Olee ihe i chere onye Juu ji ọrụ n’aka na narị afọ mbụ gaara eme ma a sị na onye agha Rom gwara ya okwu ndị ahụ? N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs kwuru ihe o kwesịrị ime, na-asị: “Ọ bụrụkwa na onye ikike dị n’aka amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” (Matiu 5:41) Olee otú ndị na-ege Jizọs ntị ga-esi ghọta ndụmọdụ ahụ? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi ghọta ya taa?

Iji nweta azịza nye ajụjụ ndị a, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe banyere ọrụ mmanye n’oge ochie. Ndị bi n’Izrel n’oge Jizọs maara omume ahụ nke ọma.

Ọrụ Mmanye

Ihe àmà e nwetara na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-egosi na ọrụ mmanye (ma ọ bụ, ọrụ akwụ ụgwọ) adịlarị n’ebe ahụ na narị afọ nke 18 T.O.A. Ihe odide ndị ọchịchị e si n’obodo Siria oge ochie bụ́ Alalakh nweta na-ezo aka n’ìgwè ndị ọrụ akwụ ụgwọ bụ́ ndị gọọmenti manyere ịrụrụ ndị mmadụ ọrụ. N’obodo Ugarit, nke dị n’ụsọ oké osimiri na Siria, ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị naara ala ná ngo na-arụ ọrụ ndị yiri nke ahụ, ọ gwụla ma eze ọ̀ gụpụrụ ha.

N’ezie, mgbe mgbe, e mere ka ndị e meriri n’agha ma ọ bụ ndị nọ n’okpuru ọchịchị ala ọzọ rụọ ọrụ mmanye. Ndị Ijipt na-ekenye ọrụ na-amanye ndị Izrel ịgbara ha ohu site n’ịkpụ brik. Ka e mesịrị, ndị Izrel mere ka ndị Kenan bi n’Ala Nkwa ahụ rụọ ọrụ dị ka ndị ohu, Devid na Solomọn mekwara ihe ndị dị otú ahụ.—Ọpụpụ 1:13, 14; 2 Samuel 12:31; 1 Ndị Eze 9:20, 21.

Mgbe ndị Izrel rịọrọ ka e nye ha eze, Samuel kọwaara ha ihe ga-abụ òkè eze ahụ. Ọ ga-eji ụfọdụ n’ime ndị ọ na-achị mere ndị isi ụgbọala na ndị ịnyịnya, were ụfọdụ mere ndị na-akọ na ndị na-ewe ihe ubi, ndị na-arụpụta ngwá agha na ihe ndị ọzọ. (1 Samuel 8:4-17) Otú o sina dị, mgbe a na-ewu ụlọ nsọ Jehova, n’agbanyeghị na e ji ndị ala ọzọ rụọ ọrụ mmanye dị ka ndị ohu, “ọ dịghị ohu Solomọn mere site n’ụmụ Izrel: kama ndị ahụ bụ ndị ikom agha, na ndị ohu ya, na ndị isi ya, na ndị ọchịagha ya, na ndị isi ụgbọala ya na ndị ịnyịnya ya.”—1 Ndị Eze 9:22.

Banyere ndị Izrel e nyere ọrụ iwu ihe owuwu, 1 Ndị Eze 5:13, 14 na-ekwu, sị: “Eze, bụ́ Solomọn, wee wepụta usuu ndị na-efe ofufe n’Izrel nile; usuu ahụ ndị na-efe ofufe bụ [puku ndị ikom iri atọ]. O zigara ha na Lebanọn, [puku ndị ikom iri] n’ọnwa ná mgbanwe: otu ọnwa ka ha nọrọ na Lebanọn, ọnwa abụọ n’ụlọ.” Otu ọkà mmụta na-ekwu, sị: “O doro nnọọ anya na ndị Izrel na ndị eze Juda ji ndị ọrụ akwụ ụgwọ wuo ihe owuwu ha, rụọkwa ọrụ n’ala ndị eze nwe, iji wee ghara imefu ego.”

Ibu arọ ahụ hiri nne n’oge ọchịchị Solomọn. O siri nnọọ ike nke na mgbe Rehoboam yiri egwu ịtụkwasị ihe n’ibu ahụ, Izrel nile  nupụrụ isi ma tụọ ndị o kenyere ịmanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ nkume. (1 Ndị Eze 12:12-18) Ma, a kwụsịghị ndokwa ahụ. Esa, bụ́ nwa nwa Rehoboam, kpọrọ ndị Juda òkù iwu obodo Geba na Mizpa, ‘ọ dịghịkwa onye ọ gụpụrụ.’—1 Ndị Eze 15:22.

N’okpuru Ọchịchị Ndị Rom

Ozizi Elu Ugwu ahụ gosiri na ndị Juu nke narị afọ mbụ maara na e nwere ike ‘ịmanye ha ịrụ ọrụ.’ E ji okwu ahụ sụgharịa okwu Grik bụ́ ag·ga·reuʹo, bụ́ nke e jibu eme ihe n’ihe metụtara ọrụ ndị obu ozi Peasia. E nyere ha ikike ịkpụrụ ndị mmadụ, ịnyịnya, na iwere ụgbọ mmiri, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ n’ike iji mee ka ozi ha na-ejere ọha gaa ngwa ngwa.

N’oge Jizọs, ndị Rom, bụ́ ndị maliterela ime ihe yiri nke ahụ, bichiri ala Izrel. N’ógbè ha ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, e wezụga ịna ndị bi ebe ahụ ụtụ isi nkịtị, a pụrụ ịmanye ha ịrụ ọrụ site n’oge ruo n’oge ma ọ bụ mgbe ụfọdụ. Ndị mmadụ agatụghị enwe mmasị n’ọrụ ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, a na-ejichikarị anụmanụ, ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya, na ụgbọ ịnyịnya n’ụzọ iwu na-akwadoghị iji buo ibu gọọmenti. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Michael Rostovtzeff si kwuo, ndị ọchịchị “nwara ịchịkwa na ịhazi [ndokwa ahụ], ma o nweghị isi, n’ihi na ọ bụrụhaala na omume ahụ dị, ọ ga-akpatarịrị ihe ọjọọ. Ndị isi, bụ́ ndị ji ezi obi gbalịa ịkwụsị ọchịchị aka ike na mmegbu e ji mara ndokwa ahụ, nyere ọtụtụ iwu . . . Ma ndokwa ahụ nọgidere na-akpata mmegbu.”

“E nwere ebe a kapịrị ọnụ a pụrụ ịmanye onye ọ bụla ibu ibu onye agha ruo,” ka otu onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru, ‘a pụkwara ịmanye onye ọ bụla ịrụ ọrụ ọ bụla ndị ahụ bichiri ebe ahụ chọrọ ka ọ rụọ.’ Nke ahụ bụ ihe mere Saịmọn nke Saịrini, bụ́ onye ndị agha Rom “manyere” ibu osisi ịta ahụhụ Jizọs.—Matiu 27:32.

Ihe odide ndị rabaị zokwara aka ná ndokwa a ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị na ya. Dị ka ihe atụ, a manyere otu rabaị ibuga akụkụ ụfọdụ nke osisi myrtle n’obí eze. A pụrụ ịkpọrọ onye mmadụ goro ọrụ ma nye ya ọrụ ọzọ ma onye ahụ goro ya ọrụ akwụọkwa ya ụgwọ.  A pụrụ ijichi anụmanụ ndị e ji ebu ibu ma ọ bụ oké ehi. Ọ bụrụ na e weghachi ha eweghachi, o yighị ka hà ka ga-adị mma iji ha arụ ọrụ ọzọ. Ị pụrụ ịhụ ihe mere e ji ele ijichi ihe onwunwe anya dị ka iwerecha ya ewerecha. N’ihi ya, otu ilu ndị Juu kwetara, sị: “Angareia dị ka ọnwụ.” Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru, sị: “A pụrụ ime ka obodo daa ogbenye site n’ijichi oké ehi ha ji akọ ubi maka angareia kama iji anụmanụ ndị e ji ebu ibu eme ihe.”

Ị pụrụ iji uche ghọta otú ndị mmadụ si kpọọ ozi ndị dị otú ahụ asị, karịsịa ebe ọ bụ na a na-eji mkparị na ikpe na-ezighị ezi amanye ndị mmadụ ije ha. N’ihi otú ha si kpọọ ndị Jentaịl na-achị ha asị, mweda n’ala nke ịbụ ndị a manyere ịrụ ọrụ ahụhụ kpasuru ndị Juu iwe. Ọ dịghị iwu na-agwa anyị kpọmkwem ebe a pụrụ ịmanye nwa amaala ibu ibu ruo. O yiri ka ọtụtụ ndị agaghị adị njikere iji otu nzọụkwụ gafee ebe iwu kwadoro ka ha ruo.

Ma, nke a bụ ndokwa Jizọs zoro aka na ya mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na onye ikike dị n’aka amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” (Matiu 5:41) Mgbe ha nụrụ nke ahụ, ụfọdụ aghaghị ichewo na ọ bụ onye na-adịghị echebara mmadụ echiche. Gịnị ka o bu nnọọ n’uche?

Ihe Ndị Kraịst Kwesịrị Ime

N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ihe Jizọs nọ na-agwa ndị na-ege ya ntị bụ na ọ bụrụ na onye nwere ikike amanye ha ịrụ ọrụ na-adịghị njọ, ha kwesịrị iji obi ha rụọ ya n’ebughị iwe n’obi. N’ụzọ dị otú ahụ, ha ga na-akwụghachi “Siza ihe nke Siza” ma ghara ileghara ibu ọrụ nke ịkwụghachi “Chineke ihe nke Chineke” anya.—Mak 12:17. *

Ọzọkwa, Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu, n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke; Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala. Ya mere, onye na-emegide ikike ahụ eguzogidewo ndokwa nke Chineke. . . . Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, na-atụ egwu: n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ na-ebu mma agha.”—Ndị Rom 13:1-4.

Jizọs na Pọl si otú ahụ kweta na eze ma ọ bụ gọọmenti nwere ikike inye ndị nupụụrụ iwu ya isi ntaramahụhụ. Ụdị ntaramahụhụ dị aṅaa? Onye Gris bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Epictetus, nke dịrị ndụ na narị afọ mbụ na nke abụọ O.A., na-enye otu azịza, na-asị: “Ọ bụrụ na a rịọ gị ihe ị na-atụghị anya ya, onye agha ewerekwa nwa ịnyịnya ibu gị, hapụrụ ya ya. Eguzogidela ya, atamula ntamu, ka a ghara iti gị ihe ma ka narakwa gị ịnyịnya ibu gị.”

Ma mgbe ụfọdụ, ma n’oge ochie ma n’oge a, Ndị Kraịst echewo na ha apụghị ime ihe gọọmenti gwara ha mee ma ka nwee akọ  na uche dị ọcha. Mgbe ụfọdụ, nke a arụpụtawo ihe ndị dị nnọọ njọ. A mawo Ndị Kraịst ụfọdụ ikpe ọnwụ. Ndị ọzọ anọwo ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ịjụ itinye aka n’ihe ha lere anya dị ka ihe ga-emebi nnọpụiche ha. (Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16; 18:36) N’oge ndị ọzọ, Ndị Kraịst echewo na ha pụrụ ime ihe a sịrị ha mee. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst ụfọdụ chere na ọ gaghị emegide akọ na uche ha ịrụ ọrụ ndị metụtara ijere ọha ozi n’okpuru ọchịchị ndị nkịtị. Nke ahụ pụrụ ịgụnye inyere ndị agadi ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ aka, ịrụ ọrụ dị ka ndị mgbanyụ ọkụ, ikpocha ụsọ mmiri, ịrụ ọrụ n’ogige ntụrụndụ, n’ọhịa, ma ọ bụ n’ọ́bá akwụkwọ, na ihe ndị ọzọ.

Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ọnọdụ dị ná mba dị iche iche na-adịgasị iche. Ya mere, iji kpebie ma ọ̀ ga-eme ihe a sịrị ya mee ka ọ̀ ga-ajụ ime ya, Onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ịgbaso akọ na uche ya e ji Bible zụọ.

Ịga Maịl nke Abụọ

Ụkpụrụ ahụ Jizọs kụziri, nke bụ́ ime ihe kwesịrị ekwesị a rịọrọ anyị ka anyị mee abụghị nanị n’ihe banyere ihe ndị gọọmenti chọrọ anyị n’aka ka ọ bara uru, kamakwa ná mmekọrịta anyị na ndị mmadụ kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na onye nwere ikike gwara gị ka i mee ihe ị na-agaraghị achọ ime ma ya abụrụ na ihe ahụ emegideghị iwu Chineke. Gịnị ka ị ga-eme? Ị pụrụ iche na a na-amanye gị iji oge na ike gị eme ihe gabiga ókè, n’ihi ya kwa, ị pụrụ imeghachi omume n’iwe. Ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịbụ ibu iro. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na i mee ya ma o sighị gị n’obi, ọ pụrụ ịbụ na obi agaghị adị gị mma. Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Mee ihe Jizọs tụrụ aro ka e mee—gaa maịl nke abụọ. Emela nanị ihe a sịrị gị mee kama meedị ihe karịrị ya. Jiri obi gị nile mee ya. Ọ bụrụ na i jiri àgwà dị otú ahụ mee ya, ị gaghịzi ele ya anya na a na-emegbu gị emegbu, kama nke ahụ, ọ ka ga-abụ na ị na-eme ihe ị chọrọ ime.

“Ọtụtụ mmadụ na-eji ndụ ha nile eme nanị ihe ndị a manyere ha amanye ime,” ka otu onye na-ede akwụkwọ na-ekwu. “Ndụ na-esiri ha ike, ike na-agwụkwa ha mgbe nile. Ndị ọzọ na-eme ihe karịrị ihe a chọrọ ha n’aka ma na-esi n’obi ha enyere ndị ọzọ aka.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọtụtụ ọnọdụ na-achọ ka anyị gaa otu maịl ná mmanye—ma ọ bụ gaa maịl abụọ. Ọ bụrụ na mmadụ agaa otu maịl, ọ pụrụ ịchọ ịzọwa ihe ruuru ya. Ọ bụrụ na ọ gaa maịl abụọ, ọ pụrụ inwe afọ ojuju dị nnọọ ukwuu. Olee ụdị onye ị bụ? Ma eleghị anya, ị ga-enwe nnọọ obi ụtọ ma bụrụ onye na-arụpụta ihe karị ma ọ bụrụ na i lee ihe ndị ị na-eme anya, ọ bụghị nanị dị ka ihe ndị ị na-aghaghị ime, kama dị ka ihe ndị ị chọrọ ime.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere ikike? O doro anya na gị iji ikike gị amanye ndị mmadụ ime ihe ị gwara ha mee nke ha na-achọghị ime adịghị egosi ịhụnanya, ọ bụghịkwa omume kwesịrị Onye Kraịst. Jizọs kwuru, sị: “Ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ha bụ ndị nwe ha, ndị ukwu na-achịkwa ha n’aka ike.” Ma nke ahụ abụghị àgwà Ndị Kraịst. (Matiu 20:25, 26) Ọ bụ ezie na iji aka ike amanye ndị mmadụ ime ihe pụrụ ịrụpụta ihe, lee ka ndị nile o metụtara ga-esi nwee ezi mmekọrịta n’etiti onwe ha karị ma ọ bụrụ na e jiri nkwanye ùgwù na mgbasapụ ihu mee ihe ọ bụla ziri ezi e ji obiọma rịọ ka e mee! N’ezie, ịdị njikere ịga maịl abụọ kama ịga nanị otu pụrụ ime ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ gị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Maka ntụle zuru ezu nke ihe ọ pụtara bụ́ ‘ịkwụghachi Siza ihe nke Siza, ma kwụghachi Chineke ihe nke Chineke,’ lee Ụlọ Nche nke May 1, 1996, peeji nke 15-20.

[Igbe dị na peeji nke 25]

OTÚ E SI JIRI IKIKE ỊMANYE MMADỤ ỊRỤ ỌRỤ MEE IHE N’ỤZỌ NA-EZIGHỊ EZI N’OGE OCHIE

Iwu ndị e nyere iji belata iji ikike ịmanye mmadụ ịrụ ọrụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-egosi na mgbe mgbe, e ji ya mee ka ndị mmadụ rụọ ọrụ ndị ha na-ekwesịghị ịrụ. N’afọ 118 T.O.A., Ptolemy Euergetes nke Abụọ nke Ijipt nyere iwu na ndị ọrụ ya “agaghị amanye onye ọ bụla bi n’obodo ahụ ịrụrụ ha ọrụ, ma ọ bụ rịọ ha (aggareuein) ehi ha iji rụọ ọrụ nke aka ha.” Tụkwasị na nke ahụ: “Ọ dịghị onye ga-arịọ . . . ụgbọ mmiri maka ọrụ nke aka ya n’ọnọdụ ọ bụla.” N’ihe e dere n’Ụlọ Nsọ Ebe Mgbaba Ukwu nke dị n’Ijipt n’afọ 49 O.A., onye nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị Rom bụ́ Vergilius Capito kwetara na ndị agha rịọrọ ihe ndị iwu na-akwadoghị, o kwukwara na “ọ dịghị onye ga-anara ma ọ bụ rịọ . . . ihe ọ bụla, ọ gwụla ma m nyere ya akwụkwọ ikike.”

[Foto dị na peeji nke 24]

A manyere Saịmọn nke Saịrini ibu ihe

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọtụtụ Ndịàmà anọwo oge ụfọdụ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi iguzosi ike maka ụkpụrụ Ndị Kraịst ha