Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Na-abaghị Uru?

Ndụ—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Na-abaghị Uru?

 Ndụ—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Na-abaghị Uru?

“Ebe ọ bụ na e mere ụmụ mmadụ n’onyinyo Chineke, mgbe ahụ, igbu mmadụ bụ imebi ihe kasị oké ọnụ ahịa na nke kasị dị nsọ n’ụwa.”—The Plain Man’s Guide to Ethics, nke William Barclay dere.

‘IHE kasị oké ọnụ ahịa n’ụwa.’ Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele ndụ anya? Site n’otú ndị mmadụ si akpa àgwà, o doro anya na ọtụtụ mmadụ ekwenyeghịrị onye edemede ahụ. Ndị na-eme ihe ike bụ́ ndị chụsoro ọdịmma onwe ha nanị n’echebaraghị ọdịmma ụmụ mmadụ ibe ha echiche ejirila obi ịta mmiri napụ ọtụtụ nde mmadụ ndụ ha.—Eklisiastis 8:9.

Ihe Na-abaghị Uru na Ihe A Pụrụ Ịtụfu Atụfu

Agha Ụwa Mbụ bụ nnọọ ihe atụ nke a. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ A.J.P Taylor na-ekwu na ugboro ugboro n’oge agha ahụ dị egwu, “e ji ndị mmadụ chụọ àjà na-enweghị isi.” Iji nweta ùgwù na otuto, ndị ọchịagha jiri ndị agha mee ihe ka à ga-asị na ha abatụghị uru ma bụrụ ndị a pụrụ nnọọ igbu mgbe a chọrọ. E gburu ihe karịrị ọkara nde mmadụ n’agha a lụrụ na Verdun dị na France. “Ọ dịghị ndị ọ ga-abara uru [ọ dịghị ndị ga-emeri na ya],” ka Taylor na-ede, “ọ bụ nanị igbu ndị mmadụ na inweta otuto.”—The First World War.

Ejighị ndụ kpọrọ ihe dị otú ahụ ka jupụtara n’ụwa. Ọkà mmụta bụ́ Kevin Bales kwuru na n’oge na-adịbeghị anya, “mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ emeela ka e nwee ọtụtụ nde ndị ogbenye na ndị dị mfe nrigbu na-achọ ọrụ.” Ha na-eji ndụ ha nile agbalị ịkpata ihe ha ga-eri n’okpuru ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba

 nke na-eme ka ndụ yie “ihe na-abaghị uru.” Ndị na-erigbu ha, ka Bales na-ekwu, na-emeso ha ihe dị ka ndị ohu—“dị nnọọ ka ngwá ọrụ ndị a pụrụ ịtụfu mgbe e jisịrị ha kpaa ego.”—Disposable People.

“Ịchọ Ijide Ifufe”

E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ọtụtụ nde mmadụ ji eche na ha abaghị uru nakwa na ha enweghị olileanya—na ọ dịghị nnọọ onye na-eche ma hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. E wepụ agha na ikpe na-ezighị ezi, e nwere ọdachi ndị dị ka ụkọ mmiri ozuzo, ụnwụ, ọrịa, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eti ihe nile a kpọrọ mmadụ ihe otiti, si otú ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-eche ma ndụ ò nwedịrị isi.—Eklisiastis 1:8, 14.

N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-ebi ndụ nke oké ụkọ na nhụsianya. Ma mgbe mgbe ọbụna ndị na-adịghị ebi ndụ nhụsianya dị otú ahụ ekwenyerela Eze Solomọn nke Izrel oge ochie, bụ́ onye jụrụ, sị: “Gịnị ka mmadụ nwere ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na n’ime nchegbu nke obi ya, nke ya onwe ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ?” Mgbe ha chebasịịrị nke a echiche, ụfọdụ na-aghọta na ọtụtụ n’ime ihe ndị ha mere ghọrọ “ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 2:22, 26.

“Ọ̀ bụ otú a ka ndụ dị?” ka ọtụtụ ndị na-ajụ ka ha na-eleghachi anya azụ ná ndụ ha biri. Ee, mmadụ ole bichara ndụ ha ma bụrụ ndị ‘ndụ ha juru afọ’ n’ezie dị ka nna ochie ahụ bụ́ Ebreham? (Jenesis 25:8) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-enwe mmetụta na-adịghị ebi ebi nke ịbụ ndị na-abaghị uru. Ma, ndụ ekwesịghị nnọọ ịbụ ihe na-abaghị uru. Chineke na-ele ndụ mmadụ ọ bụla anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma chọọ ka onye ọ bụla n’ime anyị bie ndụ na-enye nnọọ obi ụtọ ma na-eju afọ. Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu n’okwu a.