Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ Ahịa” taa

Ịchọ “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ Ahịa” taa

 Ịchọ “Nkume Pel Dị Oké Ọnụ Ahịa” taa

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà.”—MATIU 24:14.

1, 2. (a) Gịnị ka ndị Juu nke oge Jizọs chere banyere Alaeze Chineke? (b) Gịnị ka Jizọs mere iji mee ka a ghọta Alaeze ahụ nke ọma, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?

ALAEZE CHINEKE bụ isiokwu na-ewu ewu n’etiti ndị Juu mgbe Jizọs bịara n’ụwa. (Matiu 3:1, 2; 4:23-25; Jọn 1:49) Otú ọ dị, na mbụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha aghọtachaghị otú ọchịchị ya ga-agbasaru na ike ọ ga-enwe; ha aghọtaghịkwa na ọ ga-abụ ọchịchị eluigwe. (Jọn 3:1-5) Ọbụna ụfọdụ ndị ghọrọ ụmụazụ Jizọs aghọtachaghị ihe Alaeze Chineke bụ ma ọ bụ ihe ha ga-emerịrị iji nweta ngọzi nke ịghọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa.—Matiu 20:20-22; Luk 19:11; Ọrụ 1:6.

2 Ka oge na-aga, Jizọs ji ndidi kụziere ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe, gụnyere ilu banyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ, na-eme ka ha ghọta ịdị mkpa nke itinyesi mgbalị ike ná nchụso nke Alaeze eluigwe. (Matiu 6:33; 13:45, 46; Luk 13:23, 24) Ọ ga-abụrịrị na nke a metụrụ ha n’obi nke ukwuu n’ihi na n’oge na-adịghị anya ha ji obi ike kpọsaa ozi Alaeze ahụ ruo n’akụkụ ndị dị anya nke ụwa n’adaghị mbà, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gbakwara akaebe ya.—Ọrụ 1:8; Ndị Kọlọsi 1:23.

3. N’ikwu maka oge anyị, gịnị ka Jizọs kwuru banyere Alaeze ahụ?

3 Oleekwanụ maka taa? A na-enye ọtụtụ nde mmadụ ohere inweta ngọzi nke paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze ahụ. N’oké amụma ya banyere “ngwụsị nke usoro ihe a,” Jizọs kwuru kpọmkwem, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu  ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:3, 14; Mak 13:10) Ọ kọwakwara na a ga-arụ nnukwu ọrụ a n’agbanyeghị ihe mgbochi na ihe ịma aka ndị siri ike, ọbụna mkpagbu. Otú o sina dị, o mesiri ha obi ike, sị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Matiu 24:9-13) Ihe a nile na-achọ ụdị ịchụ onwe onye n’àjà na nraranye onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs gosipụtara. È nwere ndị na-egosipụta okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ taa n’ịchụso Alaeze ahụ?

Ọṅụ nke Ịchọta Eziokwu Ahụ

4. Olee mmetụta eziokwu Alaeze ahụ na-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ taa?

4 Onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe ọ chọtara ihe ọ ghọtara ịbụ “nkume pel dị oké ọnụ ahịa.” Ọṅụ ahụ kpaliri ya ime ihe nile o nwere ike ime iji nweta nkume pel ahụ. (Ndị Hibru 12:1) N’otu aka ahụ, eziokwu banyere Chineke na Alaeze ya na-adọta ma na-akpali ndị mmadụ taa. Nke a na-eme ka anyị cheta okwu Nwanna A. H . Macmillan, bụ́ onye dere banyere ọchịchọ ọ chọrọ Chineke na nzube Ya maka ihe a kpọrọ mmadụ n’akwụkwọ bụ́ Faith on the March. O kwuru, sị: “Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ ka na-achọta ihe m chọtarala. Ha bụkwa ndị dị ka mụ na gị n’ihi na ha si ná mba nile, agbụrụ nile ma nọrọ n’ọnọdụ nile ná ndụ, ha bụkwa ndị nọ n’afọ ndụ nile. Ọ dịghị onye eziokwu ahụ sọ nsọ. Ọ na-adọta ụdị mmadụ nile.”

5. Olee ezi ihe ndị a rụzuru bụ́ ndị a na-ahụ n’akụkọ afọ ije ozi 2004?

5 A na-ahụ ịbụ eziokwu nke okwu ndị ahụ kwa afọ ka ozi ọma Alaeze Chineke na-akpali ọtụtụ narị puku ndị nwere obi eziokwu ịrara ndụ ha nye Jehova na ime uche ya. Afọ ije ozi 2004, bụ́ nke malitere na September 2003 ma kwụsị n’August 2004, adịghị iche. N’ime ọnwa 12 ndị ahụ, mmadụ narị puku abụọ, iri puku isii na abụọ, narị anọ na iri na isii gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova n’ihu ọha site na baptizim ime mmiri. Nke a weere ọnọdụ na narị ala abụọ na iri atọ na ise, bụ́ ebe Ndịàmà Jehova na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị nde isii, iri puku asatọ na ise, narị atọ na iri asatọ na asaa kwa izu iji nyere ndị nọ n’ọnọdụ nile ná ndụ, ndị sikwa ná mba, ebo na asụsụ nile aka ịnabata eziokwu ahụ na-enye ndụ sitere n’Okwu Chineke.—Mkpughe 7:9.

6. Gịnị mere e ji nọgide na-enwe mmụba n’afọ ndị gaferelanụ?

6 Gịnị mere ihe a nile ji kwe omume? Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ Jehova na-adọtara onwe ya ndị a nwere ezi ọchịchọ obi. (Jọn 6:65; Ọrụ 13:48) Otú ọ dị, e kwesịghị ileghara mmụọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị na mgbalị siri ike nke ndị tinyerela onwe ha n’ịchụso Alaeze ahụ anya. Mgbe ọ dị afọ 79, Nwanna Macmillan dere, sị: “Malite mgbe mbụ m nụrụ banyere nkwa ndị ahụ e kwere ihe a kpọrọ mmadụ na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ, olileanya m nwere n’ihe ozi Bible ahụ kpugherela ebelatabeghị. Ozugbo ahụ, ekpebiri m ịchọpụtakwu ihe Bible na-akụzi ka m wee nwee ike inyere ndị ọzọ dị ka m aka bụ́ ndị na-achọ ihe ọmụma banyere Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, nakwa banyere nzube ọma ya dị iche iche maka ihe a kpọrọ mmadụ.”

7. Olee ahụmahụ na-egosi ọṅụ na mgbalị nke ndị na-achọ eziokwu Bible?

7 A na-ahụkwa ọchịchọ siri ike dị otú ahụ  n’ebe ndị ohu Jehova nọ taa. Were Daniela bụ́ onye Vienna, Austria, dị ka ihe atụ. O kwuru, sị: “Site na mgbe m dị obere, mụ na Chineke abụrụla nnọọ ezigbo enyi. Achọrọ m nnọọ ịmata aha ya n’ihi na, nye m, ‘Chineke’ akọwatụghị ụdị onye ọ bụ. Ma ọ bụ mgbe m dị afọ 17 ka Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị. Ha kọwara ihe nile m chọrọ ịma banyere Chineke. Emechaala m chọta eziokwu ahụ, obi tọkwara m ụtọ nke ukwuu! Ọṅụ juru m nnọọ obi nke na m bidoro ikwusara onye ọ bụla oziọma.” Ịnụ ọkụ n’obi ya mesịrị mee ka ụmụ klas ya kwawa ya emo. Daniela gara n’ihu ikwu, sị: “Otú ọ dị, nye m, ọ dị ka ịhụ ka amụma Bible na-emezu, n’ihi na Jizọs kwuru na a ga-akpọ ụmụazụ ya asị, kpagbuokwa ha n’ihi aha ya. Obi dị m nnọọ ụtọ, ọ tụkwara m n’anya.” N’oge na-adịghị anya, Daniela raara ndụ ya nye Jehova, e mee ya baptizim, ya ebidokwa ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ozi ala ọzọ. Mgbe ọ lụsịrị di, Daniela na di ya bụ́ Helmut malitere ikwusara ndị Africa, China, Philippines na ndị India bi na Vienna ozi ọma. Daniela na Helmut na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ozi ala ọzọ na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Africa.

Ha Adịghị Ada Mbà

8. Olee otu ụzọ na-eweta ụgwọ ọrụ ọtụtụ sirila gosipụta ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ na iguzosi ike n’ihe ha nye Alaeze ya?

8 N’ezie, ozi ala ọzọ bụ otu n’ime ụzọ ndị ndị Jehova taa si egosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na iguzosi ike n’ihe ha nye Alaeze ya. Dị ka onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs, ndị na-abanye n’ozi a dị njikere ịga ebe ndị dị anya n’ihi Alaeze ahụ. N’ezie, ndị ozi ala ọzọ adịghị eme njem iji chọta ozi ọma Alaeze ahụ; ha na-ewegara ya ndị bi n’ebe ndị kasị dị anya nke ụwa, na-ezi ndị mmadụ ihe ma na-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. (Matiu 28:19, 20) N’ọtụtụ ala, ha aghaghị ịtachi obi n’oké ihe isi ike. Ma ntachi obi ha na-eweta nnukwu ụgwọ ọrụ.

9, 10. Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-akpali akpali ka ndị ozi ala ọzọ nọ n’ebe ndị dị ka Central African Republic na-enwe?

9 Were Central African Republic dị ka ihe atụ, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst n’afọ gara aga bụ puku mmadụ iri na isii, otu narị na iri asatọ na anọ, bụ́ nke ji okpukpu asaa karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọ n’ala ahụ. Ebe ọ bụ na ọkụ eletrik adịghị n’ọtụtụ akụkụ nke ala ahụ, ndị mmadụ na-anọkarị n’èzí arụ ọrụ ụbọchị ha n’okpuru osisi. Ya mere, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na ndị ozi ala ọzọ ahụ ga na-anọkwa ebe ndị dị otú ahụ arụ ọrụ ha—na-eduzi ọmụmụ Bible n’okpuru osisi. Ọ bụghị nanị na a na-ahụ ụzọ nke ọma karị n’èzí nakwa na ọ na-aka ajụ oyi  n’ahụ́, kamakwa, e nwere uru ọzọ. Ndị ebe ahụ nwere nnọọ mmasị na Bible, a na-ekwukarịkwa banyere okpukpe dị nnọọ ka a na-ekwukarị banyere egwuregwu ma ọ bụ ọnọdụ ihu igwe n’ebe ndị ọzọ. Mgbe mgbe, ndị na-agafe agafe na-ahụ ihe na-emenụ ma sonye n’ọmụmụ ihe ahụ.

10 Ya mere, mgbe otu onye ozi ala ọzọ nọ na-eduzi ọmụmụ Bible n’èzí, otu nwa okorobịa nke bi n’ofe nke ọzọ nke okporo ámá ahụ bịara ma kwuo na ebe ọ bụ na ọ dịbeghị onye bịara na nke ya, na ọ ga-amasị ya ka onye ozi ala ọzọ ahụ bịa na nke ya ma duziekwara ya ọmụmụ Bible. N’ezie, onye ozi ala ọzọ ahụ ji obi ụtọ kweta, nwa okorobịa ahụ na-enwekwa ọganihu ngwa ngwa. Ná mba ahụ, ndị uwe ojii na-akwụsịkarị Ndịàmà n’ụzọ, ọ bụghị iji kpọọ ha òkù n’ụlọikpe ma ọ bụ iji rie ha nhá, kama iji jụọ ha ma hà nwere magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ndị kasị ọhụrụ, ma ọ bụ iji kelee ha maka isiokwu kasị masị ha.

11. N’agbanyeghị ule, olee mmetụta ndị nọterela aka n’ozi ala ọzọ na-enwe banyere ozi ha?

11 Ọtụtụ n’ime ndị banyeworo n’ozi ala ọzọ afọ 40 ma ọ bụ 50 gara aga ka ji ikwesị ntụkwasị obi eje ozi n’ubi. Lee ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi na nnọgidesi ike n’ihe nke ahụ bụụrụ anyị nile! N’ime afọ 42 gara aga, otu di na nwunye ejekọọla ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ ná mba atọ dị iche iche. Nke nwoke na-ekwu, sị: “Anyị enweela ọtụtụ ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, anyị nagidere ọrịa ịba ruo afọ 35. Ma anyị akwatụghị ụta maka mkpebi anyị ịbụ ndị ozi ala ọzọ.” Nwunye ya na-agbakwunye, sị: “Ọ dịbeghị mgbe anyị na-enweghị ọtụtụ ihe anyị ga-enwe ekele maka ha. Ozi ubi na-enye nnọọ ọṅụ, ọ na-adịkwa mfe ịmalite ọmụmụ Bible. Mgbe ị hụrụ ka ndị ị na-amụrụ ihe na-abịa nzukọ ma na-amata onwe ha, ọ na-adị nnọọ ka nnọkọ ntụrụndụ ezinụlọ.”

Ha ‘Na-agụ Ihe Nile Dị Ka Mfu’

12. Olee otú mmadụ si egosi na ya na-ele nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?

12 Mgbe onye ahịa ahụ hụrụ nkume pel dị oké ọnụ ahịa, “ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ ree ihe nile o nwere wee zụọ ya.” (Matiu 13:46) Njikere a ọ dị ịhapụ ihe ndị a pụrụ iwere dị ka ihe ndị dị oké ọnụ ahịa bụ ihe e ji ama ndị na-ele nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Dị ka onye ga-eso Kraịst nweta ebube Alaeze, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m agụkwa ihe nile n’ezie dị ka mfu n’ihi abamuru na-enweghị atụ nke ihe  ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe nile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka ihe mkpofu dị ukwuu, ka m wee nweta Kraịst.”—Ndị Filipaị 3:8.

13. Olee otú otu onye Czech Republic si gosi ịhụnanya o nwere maka Alaeze ahụ?

13 N’otu ụzọ ahụ, ọtụtụ ndị taa dị njikere ime mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha iji nweta ngọzi Alaeze ahụ. Dị ka ihe atụ, n’October 2003, onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ dị na Czech Republic bụ́ onye dị afọ 60 hụrụ akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ọ gụchara ya, ọ kpọtụụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ya ozugbo ka ha duziere ya ọmụmụ Bible. O nwere ezi ọganihu ime mmụọ, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ malitere ịga nzukọ nile. Oleekwanụ maka atụmatụ ya ịzọ ọkwá onyeisi obodo ma mesịa zọọ ọkwá onye omeiwu? Ọ họọrọ nchụso dị iche—ịgba ọsọ nke ndụ dị ka onye nkwusa Alaeze. O kwuru, sị, “Enyefere m ụmụ akwụkwọ m ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.” O gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site n’ịbụ onye e mikpuru ná mmiri ná mgbakọ ukwu e nwere na July 2004.

14. (a) Gịnị ka ozi ọma Alaeze ahụ kpalirila ọtụtụ nde mmadụ ime? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa na-akpali iche echiche ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya?

14 Ọtụtụ nde ndị ọzọ n’ụwa nile emeghachila omume n’ụzọ yiri nke ahụ n’ebe ozi Alaeze ahụ dị. Ha esila n’ụwa ajọ omume pụta, yipụ ụdị mmadụ ochie ha, hapụ ndị enyi mbụ ha na nchụso nke ihe nke ụwa. (Jọn 15:19; Ndị Efesọs 4:22-24; Jems 4:4; 1 Jọn 2:15-17) Olee ihe mere ha ji mee ihe a nile? Ọ bụ n’ihi na ha ji ngọzi Alaeze Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla usoro ihe a pụrụ inye. Ọ̀ bụ otu mmetụta ahụ ka ị na-enwe banyere ozi Alaeze ahụ? Ọ̀ na-akpali gị ime mgbanwe ndị dị mkpa iji mee ka ndụ gị, ihe ndị i ji akpọrọ ihe na ihe mgbaru ọsọ gị kwekọọ n’ihe ndị Jehova na-achọ? Ime otú ahụ ga-arụpụtara gị ngọzi dị ukwuu, ugbu a na n’ọdịnihu.

Owuwe Ihe Ubi Na-abịa ná Njedebe

15. Gịnị ka e buru n’amụma na ndị Chineke ga-eme n’oge ikpeazụ a?

15 Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị.” Ndị nyerela onwe ha n’afọ ofufo na-agụnye “igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa” na “usuu bara ụba” nke “ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ.” (Abụ Ọma 68:11; 110:3) Gịnị sirila n’ịdị uchu na ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị Jehova—ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị, ndị na-eto eto na ndị agadi—pụta n’oge ikpeazụ ndị a?

16. Nye ihe atụ nke otú ndị ohu Chineke si agbalị inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Alaeze ahụ.

16 Otu onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile n’India, nọ na-eche otú e nwere ike isi nyere ihe karịrị nde ndị ogbi abụọ bi ná mba ahụ aka ịmụta banyere Alaeze ahụ. (Aịsaịa 35:5) O kpebiri ịbanye n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Bangalore ịmụ asụsụ ndị ogbi. N’ebe ahụ, ọ gwara ọtụtụ ndị ogbi maka olileanya Alaeze ahụ, e guzobekwara ọtụtụ ìgwè ọmụmụ Bible. N’ime izu ole na ole, ihe karịrị mmadụ iri na abụọ malitere  ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka e mesịrị, n’otu oriri agbamakwụkwọ, onye ọsụ ụzọ ahụ zutere nwa okorobịa bụ́ onye ogbi nke si Calcutta, bụ́ onye jụrụ ọtụtụ ajụjụ ma gosi ezi mmasị n’ịmatakwu banyere Jehova. Otú ọ dị, e nwere otu nsogbu. Nwa okorobịa ahụ na-alaghachi Calcutta, bụ́ nke dị ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii iji banye n’ụlọ akwụkwọ kọleji, ọ dịghịkwa Ndịàmà maara asụ asụsụ ogbi n’ebe ahụ. Nwa okorobịa ahụ mere mgbalị dị ukwuu iji mee ka papa ya kweta itinye ya n’ụlọ akwụkwọ dị na Bangalore kama ya ịga nke dị na Calcutta ka o wee nwee ike ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya. O nwere ezi ọganihu ime mmụọ, ka ihe dị ka otu afọ gasịkwara, ọ raara ndụ ya nye Jehova. Ya onwe ya kwa duziiri ọtụtụ ndị ogbi ọmụmụ Bible, gụnyere enyi ya nke ya na ya kpawara kemgbe ha dị obere. Alaka ụlọ ọrụ dị n’India na-ahazi ugbu a ka ndị ọsụ ụzọ mụọ asụsụ ndị ogbi iji nye aka n’akụkụ ahụ.

17. Kọọ ihe ị hụtara dị ka ihe na-agba ume karịsịa banyere akụkọ afọ ije ozi 2004 nke dị na peeji nke 19 ruo nke 22.

17 Na peeji nke 19 ruo nke 22 nke magazin a, ị ga-ahụ akụkọ ozi ubi Ndịàmà Jehova n’ụwa nile maka afọ ije ozi 2004. Were obere oge tụlee ya ma jiri anya gị hụrụ ihe na-egosi na ndị Jehova n’ụwa nile na-elekwasị nnọọ anya n’ịchọ ‘nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa’ taa.

“Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”

18. Olee ihe Jizọs na-ekwughị n’ilu ya banyere onye ahịa ahụ, n’ihi gịnịkwa?

18 N’ịlaghachi n’ilu Jizọs banyere onye ahịa ahụ, anyị na-ahụ na Jizọs ekwughị ihe ọ bụla banyere otú onye ahịa ahụ ga-esi na-elekọta onwe ya mgbe o resịrị ihe nile o nwere. N’ụzọ kwere nghọta, ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú onye ahịa ahụ ga-esi nweta ihe ọ ga-eri, uwe ọ ga-eyi na ụlọ ọ ga-ebi na ya ebe ọ bụ na o nweghịzi ihe fọdụụrụ ya? Olee uru nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa ga-abara ya?’ Ezi uche dị n’ajụjụ ndị ahụ ma e lee ha anya n’ụzọ nkịtị. Ma, ọ̀ bụ na Jizọs agbaghị ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile”? (Matiu 6:31-33) Isi ihe dị n’ilu ahụ bụ na ọ dị mkpa mmadụ iji obi ya nile rara onwe ya nye Chineke ma na-anụ ọkụ n’obi maka Alaeze ahụ. Ọ̀ dị ihe anyị ga-amụta na nke a?

19. Olee isi ihe anyị pụrụ ịmụta n’ilu Jizọs banyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa?

19 Ma ànyị ka nụrụ ozi ọma ahụ dị ebube na nso nso a ma ànyị achụsoola Alaeze ahụ ma na-agwa ndị ọzọ banyere ngọzi ndị ọ ga-eweta ruo ọtụtụ iri afọ, anyị ga-anọgiderịrị na-enwe mmasị n’Alaeze ahụ ma na-etinye uche anyị na ya. Oge ndị a siri ike, ma anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na ihe anyị na-achụso bụ ihe dị adị na ihe na-enweghị atụ—dị ka nkume pel ahụ onye ahịa ahụ chọtara. Ihe ndị na-eme n’ụwa na amụma Bible ndị mezurulanụ na-enye ihe àmà doro anya na anyị na-ebi ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Dị ka onye ahịa ahụ, ka anyị jiri obi anyị nile na-anụ ọkụ n’obi maka Alaeze Chineke ma na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma ahụ.—Abụ Ọma 9:1, 2.

Ị̀ Na-echeta?

• N’afọ ndị gaferelanụ, olee ihe tụnyerela ụtụ ná mmụba nke ndị na-efe ezi ofufe?

• Olee mmụọ a na-ahụ n’etiti ndị na-eje ozi ala ọzọ?

• Olee mgbanwe ndị ndị mmadụ merela n’ihi ozi ọma Alaeze ahụ?

• Olee ihe bara uru anyị pụrụ ịmụta n’ilu Jizọs banyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

 [Chaatị dị na peeji nke 19-22]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2004 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

 (Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto dị na peeji nke 14]

“Eziokwu ahụ . . . na-adọta ụdị mmadụ nile.”—A. H. Macmillan

[Foto dị na peeji nke 15]

Daniela na Helmut kwusara ozi ọma n’ebe e nwere ndị na-asụ asụ asụsụ mba ọzọ na Vienna

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Dị ka onye ahịa ahụ, a na-agọzi ndị ozi ala ọzọ n’ụzọ dị ukwuu taa

[Foto dị na peeji nke 17]

“Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo”