Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Ikpe

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Ikpe

 Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Ikpe

OLEE otú Jehova si emeghachi omume mgbe ndị ya gbakụtara ya azụ ma malite ife chi ụgha? Gịnị ma ọ bụrụ na ha ana-enupụrụ ya isi mgbe mgbe ma na-akpọku ya maka enyemaka nanị mgbe ha nọ ná nsogbu? Jehova ọ̀ na-emere ha ụzọ mgbapụ ọbụna n’oge dị otú ahụ? Akwụkwọ Ndị Ikpe na-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ dị oké mkpa. N’ịbụ nke onye amụma bụ́ Samuel dechara n’ihe dị ka n’afọ 1100 T.O.A., ọ na-akọ ihe mere n’ihe dị ka narị afọ atọ na iri atọ—malite n’ọnwụ Jọshụa ruo mgbe e chiri eze mbụ nke Izrel eze.

Dị ka akụkụ nke okwu, ma ọ bụ ozi, dị ike nke Chineke, akwụkwọ Ndị Ikpe baara anyị uru nke ukwuu. (Ndị Hibru 4:12) Akụkọ ndị na-akpali akpali e dere na ya na-eme ka anyị ghọta ụdị onye Chineke bụ. Ihe ndị anyị na-amụta na ha na-ewusi okwukwe anyị ike ma na-enyere anyị aka ijidesi aka ike ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa. (1 Timoti 6:12, 19; 2 Pita 3:13) Ụzọ ndị Jehova si zọpụta ndị ya na-eme ka a hụperetụ otú Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-esi zọpụta anyị n’ụzọ ka ukwuu n’ọdịnihu.

N’IHI GỊNỊ KA E JI NWEE MKPA MAKA NDỊ IKPE?

(Ndị Ikpe 1:1–3:6)

Mgbe e merisịrị ndị eze nke ala Kenan n’okpuru idu ndú Jọshụa, ebo dị iche iche nke Izrel agaa n’ebe ndị ha ketara ma weghara ala ahụ. Otú ọ dị, ndị Izrel anapụchaghị ndị bi n’ala ahụ ala ha. Nke a aghọọrọ ndị Izrel ọnyà.

Ọgbọ bilitere mgbe ụbọchị Jọshụa gasịrị ‘amaghị Jehova, ha amaghịkwa omume nke O meere Izrel.’ (Ndị Ikpe 2:10) Ọzọkwa, ndị ahụ esoro ndị Kenan lụrịta di na nwunye, na-efekwa chi ha. N’ihi ya, Jehova enyefee ndị Izrel n’aka ndị iro ha. Otú ọ dị, mgbe mmegbu bịara sie ike, ụmụ Izrel akpọkuo ezi Chineke ahụ maka enyemaka. Ọ bụ n’ọnọdụ okpukpe, ọha na eze na ọchịchị dị otú a ka e nwere ihe ndekọ nke ndị ikpe Jehova mere ka ha bilie ịzọpụta ndị ya site n’aka ndị iro ha.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:2, 4—N’ihi gịnị ka e ji họrọ Juda ịbụ ebo mbụ ga-eketa ala e nyere ya? Ọ bụ ebo Ruben, bụ́ ọkpara Jekọb, ka ihe ùgwù a kwesịrị ịgara. Ma n’amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, o kwuru na Ruben agaghị akarị ụmụnne ya n’ihi na ọ tụfuwo ọnọdụ diọkpara ya. A ga-agbasa Simiọn na Livaị, bụ́ ndị ji oké iwe mee ihe, n’Izrel. (Jenesis 49:3-5, 7) N’ihi ya, onye o ruru n’aka bụ Juda, nwa Jekọb nke anọ. Simiọn, bụ́ onye sooro Juda rịgoo, nwetara obere ala ndị dịgasị n’ebe dị iche iche n’ókèala buru ibu nke Juda. *Joshua 19:9.

1:6, 7—N’ihi gịnị ka e ji ebipụ isi aka na isi ụkwụ nke ndị eze e meriri n’agha? O doro anya na onye e bipụrụ isi aka na isi ụkwụ ya apụghị ịlụ agha. Olee otú onye agha nke na-enweghị isi aka pụrụ isi jide mma agha ma ọ bụ ube? Onye e gbubiri isi ụkwụ apụghịkwa ịkwụsi ike n’ala.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

2:10-12. Anyị aghaghị inwe usoro ọmụmụ Bible chiri anya ka anyị wee ‘ghara ichezọ mmeso ọma Jehova.’ (Abụ Ọma 103:2) Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịkụnye eziokwu nke  Okwu Chineke n’obi ụmụ ha.—Deuterọnọmi 6:6-9.

2:14, 21, 22. Jehova nwere ihe mere ọ na-eji ekwe ka ihe ọjọọ dakwasị ndị ya na-enupụ isi—iji nye ha ahụhụ, iji nụchaa ha na iji kpalie ha ịlaghachikwute ya.

JEHOVA EMEE KA NDỊ IKPE BILIE

(Ndị Ikpe 3:7–16:31)

Akụkọ na-akpali akpali nke iji ndị ikpe eme ihe amalite mgbe Ọtniel mere ka ọchịchị nke otu eze Mesopotemia nọworo na-achị Izrel ruo afọ asatọ kwụsị. N’iji obi ike eme ihe, Onyeikpe Ihọd egbuo Eglọn bụ́ eze ndị Moab nke buru oké ibu. Shamga nwere obi ike ejiri osisi e ji achụ ehi tigbuo narị ndị Filistia isii nanị ya. Site n’agbamume Debọra, bụ́ onye jere ozi dị ka onye amụma nwanyị, nakwa site ná nkwado Jehova, Berak na iri puku ndị agha ya na-ejighị oké ngwá agha emerie ndị agha dị ike nke Sisera. Jehova emee ka Gidiọn bilie ma mee ka ya na narị ndị agha atọ ya merie ndị Midian.

Site n’aka Jefta, Jehova anapụta Izrel n’aka ndị Amọn. Tola, Jeya, Ibzan, Ilọn, na Abdọn socha ná ndị ikom 12 kpere Izrel ikpe. Oge Ndị Ikpe akwụsị n’aka Samsin, bụ́ onye lụsoro ndị Filistia ọgụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

4:8—Gịnị mere Berak ji sie ọnwụ na onye amụma nwanyị bụ́ Debọra ga-eso ya gaa n’ọgbọ agha? Ihe àmà na-egosi na Berak chere na ya erughị eru ịga lụso ndị agha Sisera agha nanị ya. Onye amụma nwanyị ahụ ịnọ n’akụkụ ya ga-emesi ya na ndị ikom ya obi ike na Chineke na-eduzi ha, ọ ga-emekwa ka ha nwee obi ike. Mgbe ahụ, ọnwụ Berak siri na Debọra ga-eso ya gaa abụghị ihe àmà nke adịghị ike, kama nke okwukwe siri ike.

5:20—Olee otú kpakpando si lụọrọ Berak agha site n’eluigwe? Bible ekwughị ma nke a ọ̀ gụnyere enyemaka ndị mmụọ ozi, nkume igwe ndị si n’elu na-ada, bụ́ ndị ndị amamihe Sisera kọwara dị ka ihe àmà nke ọdachi, ma ọ bụ eleghị anya, ihe ndị na-agụrụ Sisera kpakpando kwuru ga-eme, bụ́ ndị na-emechaghị mee. Otú ọ dị, obi abụọ adịghị ya na Chineke nyeere Berak aka n’ụzọ ụfọdụ.

7:1-3; 8:10—Gịnị mere Jehova ji kwuo na ndị agha Gidiọn, bụ́ ndị dị puku iri atọ na abụọ, karịrị akarị maka ndị iro ha dị otu narị na iri puku atọ na ise? Nke a bụ n’ihi na ọ bụ Jehova na-enye Gidiọn na ndị ikom ya  mmeri. Chineke achọghị ka ha chee na ha meriri ndị Midian n’ike aka ha.

11:30, 31—Mgbe Jefta na-ekwe nkwa ya, ò bu iji mmadụ chụọ àjà n’obi? Echiche dị otú ahụ agatụghị abata Jefta n’uche n’ihi na Iwu ahụ kwuru, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye na-eme ka nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị gabiga n’ime ọkụ.” (Deuterọnọmi 18:10) Otú ọ dị, Jefta bu mmadụ n’obi, ọ bụghị anụmanụ. O yighị ka ndị Izrel hà na-edebe anụmanụ ndị a pụrụ iji chụọ àjà n’ụlọ. Iji anụmanụ chụọ àjà agaraghịkwa abụ àjà pụrụ iche. Jefta maara na onye ga-esi n’ụlọ ya pụta izute ya pụrụ ịbụ ada ya. A ga-esure onye ahụ “ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ” n’echiche bụ́ na a ga-arara onye ahụ kpamkpam nye ijere Jehova ozi n’ebe nsọ ahụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

3:10. Inwe ihe ịga nke ọma ná nchụso ihe ime mmụọ na-adabere na mmụọ Jehova, ọ bụghị n’amamihe mmadụ.—Abụ Ọma 127:1.

3:21. Ihọd ji mma agha ya mee ihe nke ọma nakwa n’obi ike. Anyị aghaghị ịdị nkà n’iji “mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke” eme ihe. Nke a pụtara na anyị aghaghị iji obi ike jiri Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe n’ozi anyị.—Ndị Efesọs 6:17; 2 Timoti 2:15.

6:11-15; 8:1-3, 22, 23. Obi umeala Gidiọn na-akụziri anyị ihe atọ dị mkpa: (1) Mgbe e nyere anyị ihe ùgwù ije ozi, anyị kwesịrị ịdị na-eche banyere ịbụ ọrụ ya na ya so kama ịdị na-eche banyere ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ ihe ùgwù ọ ga-eweta. (2) Mgbe anyị na ndị okwu na ụka na-emekọ ihe, igosipụta obi umeala bụ ihe amamihe dị na ya ime. (3) Obi umeala na-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị na-achọ ọkwá.

6:17-22, 36-40. Anyị onwe anyị aghaghịkwa ịkpachara anya, ma ghara ‘ikwere okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ.’ Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ‘ịnwale okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke.’ (1 Jọn 4:1) Iji jide n’aka na ndụmọdụ ọ na-achọ inye dabesiiri ike n’Okwu Chineke, okenye ọhụrụ ga-abụ onye maara ihe ịkpọtụrụ okenye ka ya nwee ahụmahụ.

6:25-27. Gidiọn ji akọ mee ihe iji ghara ịkpasu ndị na-emegide ya iwe n’ụzọ na-enweghị isi. Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị aghaghị ịkpachara anya iji ghara ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ụzọ na-enweghị isi site n’otú anyị si ekwu okwu.

7:6. A bịa n’ijere Jehova ozi, anyị kwesịrị ịdị ka narị ndị agha atọ Gidiọn—ịnọ na nche ma mụrụ anya.

 9:8-15. Lee ihe nzuzu ọ bụ iji mpako eme ihe na ịchọ ọkwá ma ọ bụ ikike!

11:35-37. Obi abụọ adịghị ya na ezi ihe nlereanya nke Jefta nyeere ada ya aka ịzụlite okwukwe na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ndị nne na nna taa pụrụ isetịpụrụ ụmụ ha ihe nlereanya dị otú ahụ.

11:40. Ịja onye nwere mmụọ afọ ofufo n’ozi Jehova mma na-agba onye ahụ ume.

13:8. N’ịkụziri ụmụ ha ihe, ndị nne na nna kwesịrị ikpegara Jehova ekpere maka nduzi ma gbasoo ntụziaka ya.—2 Timoti 3:16.

14:16, 17; 16:16. Ịrụgide mmadụ site n’ibe ákwá na oké ekwurekwu pụrụ imebi mmekọrịta.—Ilu 19:13; 21:19.

MMEHIE NDỊ ỌZỌ E MERE N’IZREL

(Ndị Ikpe 17:1–21:25)

Akụkụ ikpeazụ nke akwụkwọ Ndị Ikpe nwere akụkọ abụọ pụtara ìhè. Nke mbụ bụ banyere otu nwoke aha ya bụ Maịka, bụ́ onye guzobere arụsị n’ụlọ ya ma were onye Livaị n’ọrụ dị ka onye nchụàjà ya. Mgbe ha bibisịrị obodo Leish, ma ọ bụ Leshem, ndị Dan ewuo obodo nke aka ha ma kpọọ ya Dan. N’iji arụsị Maịka na onye nchụàjà ya eme ihe, ha eguzobe ụdị ofufe ọzọ na Dan. Ihe àmà na-egosi na e meriri Leish tupu Jọshụa anwụọ.—Joshua 19:47.

Ihe omume nke abụọ ewere ọnọdụ nwa oge ka Jọshụa nwụsịrị. Ndina n’ike nke ụfọdụ ndị ikom obodo Gibia nke ebo Benjamin mere n’ìgwè eduga n’ikpochapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebo Benjamin nile—nanị narị ndị ikom isii afọdụ. Otú ọ dị, atụmatụ dị irè e wepụtara emee ka o kwe ha omume inweta nwunye, ọnụ ọgụgụ ha amụbaakwa ruo ihe fọrọ nke nta ka o ruo iri puku ndị dike isii ka ọ na-erule n’oge ọchịchị Devid.—1 Ihe E Mere 7:6-11.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

17:6; 21:25—Ya bụrụ na “onye ọ bụla na-eme ihe ziri ezi n’anya ya,” nke a ò mere ka e nwee ọgba aghara? Ọ bụchaghị otú ahụ, n’ihi na Jehova mere ọtụtụ ndokwa iji duzie ndị ya. O nyere ha Iwu, nyekwa ha ndị nchụàjà izi ha ụzọ ya. Site n’Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ, nnukwu onye nchụàjà pụrụ ịjụ Chineke ase n’okwu ndị dị mkpa. (Ọpụpụ 28:30) Obodo ọ bụla nwekwara ndị okenye ruru eru inye ndụmọdụ ndị bụ́ ịgba. Ya bụrụ na onye Izrel ejiri ndokwa ndị a mee ihe, ọ ga-enwe ezi ihe na-achịkwa akọ na uche ya. Ya ime “ihe ziri ezi n’anya ya” n’ụzọ dị otú a ga-arụpụta ezi ihe. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ eleghara Iwu ahụ anya ma mere mkpebi nke ya n’ihe ndị metụtara àgwà na ofufe, ihe ọjọọ ga-esi na ya pụta.

20:17-48—Gịnị mere Jehova ji kwere ka ebo Benjamin merie ebo ndị ọzọ ugboro abụọ, ọ bụ ezie na ebo Benjamin kwesịrị ịnata ntaramahụhụ? Site n’ikwe ka ebo ndị kwesịrị ntụkwasị obi buru ụzọ nwee oké mfu, Jehova lere mkpebisi ike ha ikpochapụ ihe ọjọọ n’Izrel ule.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

19:14, 15. Njikere ndị Gibia na-adịghị ile ọbịa bụ mmehie. A na-agba Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agbaso omume nke ile ọbịa.’—Ndị Rom 12:13.

Nnapụta Dị n’Ihu

N’oge na-adịghị nnọọ anya, Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst Jizọs ga-ebibi ajọ ụwa a ma zọpụta ndị ziri ezi na ndị zuru okè. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44) ‘Ndị iro Jehova nile ga-ala n’iyi, ndị hụrụ Ya n’anya ga-adịkwa ka anyanwụ mgbe ọ na-apụta n’ike ya.’ (Ndị Ikpe 5:31) Ka anyị soro ná ndị hụrụ Jehova n’anya site n’itinye ihe ndị anyị mụtara n’akwụkwọ Ndị Ikpe n’ọrụ.

Eziokwu bụ́ isi e gosiri ugboro ugboro n’ihe ndekọ banyere Ndị Ikpe bụ nke a: Irubere Jehova isi na-eweta ngọzi bara ụba, inupụrụ ya isi na-akpata oké ọdachi. (Deuterọnọmi 11:26-28) Lee ka o si dị anyị oké mkpa ịghọ “ndị si n’obi ha na-erube isi” n’uche Chineke nke o kpughewooro anyị!—Ndị Rom 6:17; 1 Jọn 2:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 E kenyeghị ndị Livaị ala n’Ala Nkwa ahụ e wezụga obodo 48 dịgasị n’ebe dị iche iche n’Izrel.

[[Map dị na peeji 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

“Jehova wee mee ka ndị ikpe bilie, ha wee zọpụta ha n’aka ndị na-apụnara ha ihe.”—Ndị Ikpe 2:16

NDỊ IKPE

1. Ọtniel

2. Ihọd

3. Shamga

4. Berak

5. Gidiọn

6. Tola

7. Jeya

8. Jefta

9. Ibzan

10. Ilọn

11. Abdọn

12. Samsin

DAN

MANASE

NAFTALAỊ

ASHA

ZEBULỌN

ỊSAKA

MANASE

GAD

IFREM

DAN

BENJAMIN

RUBEN

JUDA

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee ihe ị mụtara site n’ọnwụ Berak siri na Debọra ga-eso ya aga n’ọgbọ agha?