Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụlọikwuu nke Ndị Ziri ezi Ga-ama Akwụkwọ Dị Ka Ihe A Kụrụ Akụ”

“Ụlọikwuu nke Ndị Ziri ezi Ga-ama Akwụkwọ Dị Ka Ihe A Kụrụ Akụ”

 “Ụlọikwuu nke Ndị Ziri ezi Ga-ama Akwụkwọ Dị Ka Ihe A Kụrụ Akụ”

MGBE oké ifufe nke Ha-Magedọn tiwapụrụ ma weta ajọ usoro ihe nke Setan ná njedebe, ‘a ga-eme ka ụlọ nke ndị na-emebi iwu tọgbọrọ n’efu.’ Gịnị banyere “ụlọikwuu nke ndị ziri ezi”? N’ụwa ọhụrụ Chineke, ọ “ga-ama akwụkwọ dị ka ihe a kụrụ akụ.”—Ilu 14:11.

Otú ọ dị, ndị zuru okè na ndị na-emebi iwu aghaghị ịnọkọ ruo mgbe ‘a ga-ebipụ ndị na-emebi iwu n’ụwa, e fopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.’ (Ilu 2:21, 22) Ndị ziri ezi hà pụrụ ịma akwụkwọ dị ka ihe a kụrụ akụ n’okpuru ọnọdụ ndị a? Amaokwu 1 ruo nke 11 n’isi nke 14 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-egosi na site n’ikwe ka amamihe na-eduzi okwu na omume anyị, anyị pụrụ inwetụ ọganihu na nkwụsi ike ọbụna ugbu a.

Mgbe Amamihe Wuru Ụlọ

N’ikwu banyere mmetụta nwunye na-enwe n’ọdịmma ezinụlọ ya, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-ekwu, sị: “Nwanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya: ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya.” (Ilu 14:1) Olee otú nwanyị nwere amamihe si ewu ụlọ ya? Nwanyị maara ihe na-akwanyere ndokwa Chineke maka ịbụisi ùgwù. (1 Ndị Kọrint 11:3) Mmụọ nnwere onwe nke jupụtara n’ụwa Setan adịghị emetụta ya. (Ndị Efesọs 2:2) Ọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya ma na-ekwu okwu ọma banyere ya, na-eme ka ndị ọzọ na-akwanyekwuru di ya ùgwù. Nwanyị maara ihe na-ekere òkè pụtara ìhè n’ọzụzụ ime mmụọ na nke nkịtị nke ụmụ ya. Ọ na-arụsi ọrụ ike maka abamuru nke ezinụlọ ya, na-eme ka ebe obibi bụrụ ebe na-enye obi ụtọ na nke dị ntụsara ahụ́ maka ezinụlọ ya. Ọ na-egosipụta amamihe n’otú o si eji ihe ha nwere eme ihe, ọ dịghịkwa emefusị ihe. Nwanyị maara ihe n’ezie na-atụnye ụtụ n’ọganihu na nkwụsi ike nke ezinụlọ ya.

Nwanyị gbagọrọ agbagọ n’uche adịghị akwanyere ndokwa Chineke maka ịbụisi ùgwù. Ọ dịghị ara ya ahụ́ ikwu okwu ọjọọ banyere di ya. N’ịbụ onye na-adịghị eji akọ eme ihe, ọ na-emefusị ego a tara ahụhụ kpata. Ọ na-alakwa oge n’iyi. N’ihi ya, ụlọ ya na-eru unyí, ụmụ ya na-atakwa ahụhụ n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ee, nwanyị gbagọrọ agbagọ n’uche na-akwada ụlọ ya.

Otú ọ dị, gịnị na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ bụ onye maara ihe ka ọ bụ onye gbagọrọ agbagọ n’uche? Ilu 14:2 na-ekwu, sị: “Onye na-eje ije n’izi ezi ya na-atụ egwu Jehova: ma onye na-esihie n’ụzọ ya nile na-eleda Ya anya.” Onye ziri ezi na-atụ egwu ezi Chineke ahụ, ‘mmalite amamihe ka egwu Jehova bụkwa.’ (Abụ Ọma 111:10) Onye maara ihe n’ezie maara na ọ bụ ọrụ ya ‘ịtụ egwu Chineke na idebe ihe  nile O nyere n’iwu.’ (Eklisiastis 12:13) N’aka nke ọzọ, onye gbagọrọ agbagọ n’uche na-agbaso ụzọ nke na-ekwekọghị n’ụkpụrụ izi ezi nke Chineke. Ọ na-esihie ụzọ. Onye dị otú ahụ na-elelị Chineke, na-asị n’obi ya: “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.”—Abụ Ọma 14:1.

Mgbe Amamihe Na-eduzi Egbugbere Ọnụ

Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere okwu nke onye na-atụ egwu Jehova na nke onye na-elelị Ya? “N’ọnụ onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya ka ome mpako dị,” ka eze ahụ na-ekwu, “ma egbugbere ọnụ nke ndị maara ihe ga-edebe ha.” (Ilu 14:3) N’ịbụ onye na-enweghị amamihe sitere n’elu, onye gbagọrọ agbagọ n’uche adịghị eme udo, o nweghịkwa ezi uche. Amamihe nke na-eduzi nzọụkwụ ya bụ nke ụwa, nke anụ ahụ́, nke ndị mmụọ ọjọọ. Ọ na-ekwu okwu na-akpata esemokwu ma na-egosi mpako. Mpako dị n’ọnụ ya na-akpatakwuru ya na ndị ọzọ nsogbu.—Jems 3:13-18.

Egbugbere ọnụ nke onye maara ihe na-edebe ya, na-atụnye ụtụ n’afọ ojuju na obi ụtọ ya. N’ụzọ dị aṅaa? Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Onye maara ihe adịghị ekwu okwu n’echeghị ya eche ma ọ bụ na-ekwu okwu mkparị. Obi ya na-atụgharị uche iji zaghachi. (Ilu 15:28) Okwu ya ọ na-eche eche ekwu bụ ihe na-agwọ mmadụ—ọ na-agba mkpụrụ obi dara mbà ume ma na-ewetara onye e wedara n’ala ume ọhụrụ. Kama ịkpasu ndị ọzọ iwe, egbugbere ọnụ ya na-akwalite udo na ahụ́ iru ala.

Mgbe Amamihe Na-eduzi Ihe Omume Mmadụ

Solomọn tụziri ilu na-akpali mmasị nke yiri ka ọ̀ na-ekwu banyere mkpa ọ dị mmadụ ibu ụzọ tụlee uru na ọghọm dị n’ime ihe ụfọdụ. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ a na-azụ ehi na-adị ọcha: ma ihe omume hiri nne na-esite n’ike ehi.”Ilu 14:4.

N’ịkọwa ihe ilu a pụtara, otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ụlọ anụ ihe na-adịghị na-egosi na e nweghị ehi a ga-enye nri, n’ihi ya kwa, mmadụ na-enwere onwe ya pụọ ná nsogbu nke ịzacha ụlọ anụ na ilekọta ụmụ anụmanụ, mmefu na-ebelatakwa. Ma ‘uru’ a na-apụ n’anya n’amaokwu nke 4b: ihe ọ pụtara bụ na, ma é jighị ehi mee ihe, ihe a ga-enweta n’ubi agaghị ehi nne.” Onye ọrụ ubi aghaghị iji amamihe mee nhọrọ.

Ọ̀ bụ na e kwesịghị itinyekwa ụkpụrụ dị n’ilu a n’ọrụ mgbe anyị na-atụle ịgbanwe ọrụ anyị, ịhọrọ ibi n’ụdị ụlọ ụfọdụ, ịzụ ụgbọala, ịzụ anụ ụlọ na ihe ndị yiri ha? Onye maara ihe ga-atụle uru na ọghọm ma kpebie ma ihe omume ahụ ọ̀ ga-eru mgbalị na mmefu e mere maka ya n’ezie.

Mgbe Onye Àmà Bụ Onye Maara Ihe

“Onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi adịghị ekwu okwu ụgha,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “ma onye àmà okwu ụgha na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume.” (Ilu 14:5) Ụgha nke onye àmà okwu ụgha pụrụ nnọọ imebi ihe dị ukwuu. A tụgburu Nebọt onye Jezril n’ihi na ndị ikom abụọ jọgburu onwe ha gbara àmà ụgha megide ya. (1 Ndị Eze 21:7-13) Ọ̀ bụ na ndị àmà okwu ụgha agbaghị àmà ụgha megide Jizọs, na-eduga n’ọnwụ ya?  (Matiu 26:59-61) Ndị àmà okwu ụgha gbakwara àmà ụgha megide Stivin—onye na-eso ụzọ Jizọs mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya.—Ọrụ 6:10, 11.

Ọ pụrụ ịbụ na a gaghị ekpughe onye okwu ụgha ruo oge ụfọdụ, ma tụlee ihe ga-abụ ọdịnihu ya. Jehova kpọrọ “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” asị, ka Bible na-ekwu. (Ilu 6:16-19) Òkè onye dị otú ahụ ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ na sọlfọ na-enwu—ọnwụ nke abụọ—ya na ndị ajọ omume dị ka ndị na-egbu ọchụ, ndị na-akwa iko, na ndị na-ekpere arụsị.—Mkpughe 21:8.

Onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi adịghị aṅụ iyi ụgha mgbe ọ na-agba akaebe. Ụgha adịghị emebi akaebe ya. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na iwu ji ya inye ndị pụrụ imerụ ndị Jehova ahụ́ n’ụzọ ọ bụla ihe ọmụma zuru ezu. Ndị nna ochie bụ́ Ebreham na Aịzik enyeghị ndị na-adịghị efe Jehova ihe ọmụma ụfọdụ. (Jenesis 12:10-19; 20:1-18; 26:1-10) Rehab nke Jeriko duhiere ndị ikom eze. (Joshua 2:1-7) Jizọs Kraịst n’onwe ya zeere inye ihe ọmụma zuru ezu mgbe ọ matara na ime otú ahụ ga-akpata ihe ize ndụ na-enweghị isi. (Jọn 7:1-10) O kwuru, sị: “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ.” N’ihi gịnị? “Ka ha wee ghara . . . [ịtụgharị] wee dọwaa unu.”—Matiu 7:6.

Mgbe ‘Ihe Ọmụma Na-adị Mfe’

Ọ̀ bụ mmadụ nile nwere amamihe? Ilu 14:6 na-ekwu, sị: “Onye na-akwa emo achọwo amamihe, ma ọ hụghị ha: ma ihe ọmụma dịịrị onye nghọta mfe.” Onye na-akwa emo, ma ọ bụ onye na-achị ọchị pụrụ ịchọ amamihe, ma ọ dịghị achọta ezi amamihe. Ebe ọ bụ na onye na-akwa emo na-eji mpako achị ihe ndị metụtara Chineke ọchị, ọ dịghị enweta ihe bụ́ isi dị mkpa maka amamihe—ezi ihe ọmụma nke ezi Chineke ahụ. Nganga na mpako ya na-egbochi ya ịmụ banyere Chineke na inweta amamihe. (Ilu 11:2) Gịnị medịrị o ji enye onwe ya nsogbu ịchọ amamihe? Ilu ahụ agwaghị anyị, ma ikekwe ọ pụrụ ịdị na-eme otú ahụ iji mee ka ndị ọzọ chee na ọ ma ihe.

“Ihe ọmụma dịịrị onye nghọta mfe.” A na-akọwa nghọta dị ka “iji uche aghọta ihe,” “ikike nke ịmata ihe jikọrọ akụkụ dị iche iche nke otu ihe.” Ọ bụ ikike nke ijikọta akụkụ dị iche iche nke okwu ma ghọta okwu ahụ n’ozuzu ya, ọ bụghị nanị akụkụ ya dịgasị iche. Ilu a na-ekwu na ihe ọmụma na-adịrị onye nwere ikike a mfe nnweta.

N’akụkụ a, tụlee ahụmahụ gị n’inweta ihe ọmụma nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ị malitere ịmụ Bible, o yikarịrị ka ozizi ndị bụ́ isi banyere Chineke, nkwa ya, na Ọkpara ya hà so n’eziokwu ndị mbụ ị mụtara. Ruo oge ụfọdụ, ihe ọmụma ndị ahụ nọgidere bụrụ ihe ndị na-enweghị ihe jikọrọ ha. Ma ka ị na-aga n’ihu n’ọmụmụ ihe gị, ihe ọmụma ndị ahụ na-enweghị ihe jikọrọ ha malitere inwe njikọ, ị pụkwara ịhụ n’ụzọ doro anya otú ihe ọmụma ahụ dịgasị iche iche si metụta nzube bụ́ isi nke Jehova maka ụmụ mmadụ na ụwa. Eziokwu sitere na Bible ghọrọ ihe ezi uche dị na ya na nke nwere njikọ. Ịmụta na icheta ihe ọmụma ndị  ọhụrụ ghọziri ihe dị mfe karị n’ihi na ị pụrụ ịhụ ihe jikọrọ ha na nzube Jehova.

Eze ahụ maara ihe dọrọ aka ná ntị banyere ebe a na-agaghị ahụ ihe ọmụma. “[Si n’ihu onye nzuzu pụọ],” ka ọ na-ekwu, “ị gaghị amatakwa egbugbere ọnụ ihe ọmụma n’ahụ́ ya.” (Ilu 14:7) Onye nzuzu enweghị ezi ihe ọmụma. Ọ dịghị ekwu okwu nwere ihe ọmụma. Ndụmọdụ a na-enye anyị bụ isi n’ihu onye dị otú ahụ pụọ, ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ịghara ịkpa ya nso. “Enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

“Amamihe onye nwere ezi uche bụ ịghọta ụzọ ya,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “ma uche gbagọrọ agbagọ nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.” (Ilu 14:8) Onye maara ihe na-atụle ihe ndị ọ na-eme. Ọ na-atụle nhọrọ dịgasị iche iche e nwere ma gụkọọ ihe pụrụ isi na nke ọ bụla pụta. Ọ na-eji amamihe ahọrọ ụzọ nke ọ ga-eso. Gịnị banyere onye nzuzu? Ọ na-ahọrọ ụzọ nzuzu, na-eche na ya maara ihe ya na-eme nakwa na ya na-eme nhọrọ kasị mma. Nzuzu ya na-eduhie ya.

Mgbe Amamihe Na-eduzi Mmekọrịta

Onye amamihe na-eduzi na ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta dị n’udo. “Ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha, ikpe ọmụma na-akwa ha emo,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma n’etiti ndị ziri ezi ka ihe na-atọ Chineke ụtọ dị.” (Ilu 14:9) Obi amamikpe ma ọ bụ mwute bụ ihe ọchị nye onye gbagọrọ agbagọ n’uche. O mebiwo mmekọrịta nke ya na ndị ya na ha nọ n’ụlọ nakwa nke ya na ndị ọzọ n’ihi na ọ dị “mpako ruo n’ókè nke na ọ pụghị imeziwanye ihe” ma chọọ udo. (The New English Bible) Onye ziri ezi dị njikere ileghara emezighị emezi nke ndị ọzọ anya. Ọ dị njikere ịrịọ mgbaghara na imeziwanye ihe mgbe o mehiere ndị ọzọ. N’ihi na ọ na-achụso udo, ya na ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta na-enye obi ụtọ na nke kwụsiri ike.—Ndị Hibru 12:14.

Solomọn zoziri aka n’ihe na-egbochi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ na-ekwu, sị: “Obi maara ilu nke aka ya; ọ bụkwa n’ọṅụ ya ka onye nke na-abụghị nke ya na-adịghị agwakọta onwe ya.” (Ilu 14:10) Ànyị pụrụ mgbe nile ikwupụta mmetụta anyị ndị kasị mie emie—ma ọ bụ mwute ma ọ bụ ọṅụ—nye ndị ọzọ ma ọ bụ kọọrọ ha kpọmkwem mmetụta ndị anyị na-enwe? Mmadụ ọ̀ pụkwara mgbe nile ịghọta n’ụzọ zuru ezu mmetụta onye ọzọ na-enwe? Azịza nke ajụjụ abụọ ahụ bụ ee e.

Dị ka ihe atụ, tụlee echiche nke igbu onwe onye. Onye na-enwekarị ya apụghị ịgwa onye òtù ezinụlọ ma ọ bụ enyi ya mmetụta ndị ahụ n’ụzọ doro anya. Ndị ọzọ apụghịkwa mgbe nile ịghọta mgbaàmà nke mmetụta ndị dị otú ahụ nke ndị ha na ha na-akpakọ na-enwe. Ọ dịghị anyị mkpa ịma onwe anyị ikpe mgbe anyị na-achọpụtaghị mgbaàmà ndị a ma ghara ime ihe ụfọdụ pụrụ inye aka. Ilu a na-akụzikwara anyị na ọ bụ ezie na ọ bụ ihe nkasi obi ịgakwuru enyi nwere ọmịiko maka nkwado n’ụzọ mmetụta uche, a kpaara nkasi obi ụmụ mmadụ pụrụ inye ókè. Anyị pụrụ ịdabere nanị n’ebe Jehova nọ mgbe a bịara n’ịtachi obi n’ihe isi ike ụfọdụ.

“Ihe Dị Iche Iche Dị Oké Ọnụ Ahịa na Akụ̀ Dị n’Ụlọ Ya”

“Ụlọ nke ndị na-emebi iwu, a ga-eme ka ọ tọgbọrọ n’efu,” ka eze Izrel ahụ na-ekwu, “ma ụlọikwuu nke ndị ziri ezi ga-ama akwụkwọ dị ka ihe a kụrụ akụ.” (Ilu 14:11) Ihe pụrụ ịdị na-agara onye na-emebi iwu nke ọma n’usoro ihe a, ọ pụkwara ibi n’ụlọ e wuru nke ọma, ma olee uru nke ahụ ga-abara ya mgbe ya onwe ya na-adịghịzi? (Abụ Ọma 37:10) N’aka nke ọzọ, ebe obibi nke onye ziri ezi pụrụ ịbụ nnọọ nke a na-achọghị mma pụrụ iche. Ma “ihe dị iche iche dị oké ọnụ ahịa na akụ̀ dị n’ụlọ ya,” ka Abụ Ọma 112:3 na-ekwu. Gịnị ka ha bụ?

Mgbe amamihe na-achịkwa okwu anyị na ihe ndị anyị na-eme, anyị na-enwe “akụ̀ na nsọpụrụ” bụ́ ndị ha na amamihe na-agakọ. (Ilu 8:18) Ha gụnyere iso Chineke na mmadụ ibe anyị enwe mmekọrịta dị n’udo, mmetụta nke ezi ahụ́ ike na obi ụtọ, na nkwụsi ike ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ee, “ụlọikwuu nke ndị ziri ezi” pụrụ ịma akwụkwọ dị ka ihe a kụrụ akụ ọbụna ugbu a.

[Foto dị na peeji nke 27]

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya

[Foto dị na peeji nke 28]

“Ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ”