Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Rite Uru Site n’Ịgbaso Ụkpụrụ Ime Mmụọ

Rite Uru Site n’Ịgbaso Ụkpụrụ Ime Mmụọ

 Rite Uru Site n’Ịgbaso Ụkpụrụ Ime Mmụọ

“Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.”—Eklisiastis 5:10.

ỊRỤBIGA ọrụ ókè pụrụ ịkpata nrụgide, nrụgide pụkwara ịkpata nsogbu ahụ́ ike, mgbe ụfọdụ na-eduga n’ọnwụ. N’ọtụtụ ala, ịgba alụkwaghịm na-etisasị ezinụlọ. Mgbe mgbe, ọ bụ nchegbu gabigara ókè maka ihe onwunwe na-akpata nsogbu ndị dị otú ahụ. Kama ịnụ ụtọ ihe o nwere, onye mikpuworo onwe ya n’inweta ihe onwunwe pụrụ ịdị na-achọ inwetakwu ihe mgbe nile, n’agbanyeghị otú ọ ga-emetatụru ahụ́ ike ya. Otu akwụkwọ enyemaka onwe onye na-ekwu, sị: “Ịnwa ịdị ka ibe bụ ihe ọtụtụ ndị ná mba anyị na-eji egburu oge, ọbụna ma ọ bụrụ na ndị ibe bụ ndị na-arụbiga ọrụ ókè, ndị ọ fọrọ nke nta ka ha nwee nkụchi obi mgbe ha dị afọ iri anọ na atọ.”

Ọchịchọ inwetakwu ihe pụrụ ịghọ ihe a na-adịghị emeju emeju, na-anapụ mmadụ ọṅụ ọ bụla nke onye ahụ pụrụ inwewo. Otu ihe dị nnọọ ike—mkpọsa ngwá ahịa—na-eji adịghị ike anyị dị ka ụmụ mmadụ n’akụkụ a eme ihe! Mkpọsa ngwá ahịa telivishọn na redio na-agbakarị gị ume ịzụ ihe ndị ọ pụrụ ịbụ na ha  adịghị gị mkpa na ndị ọ pụrụ ọbụna ịbụ na aka gị agaghị eru. Ihe a nile pụrụ ịkpata mmerụ ahụ́ dị ukwuu.

Imeju ọchịchọ onwe onye n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ inwe mmetụta a na-apụghị ịchọpụta n’ụzọ dị mfe ma bụrụ nke ga-emebiri anyị ihe, ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’omume. Dị ka ihe atụ, Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Ndụ nke anụ ahụ́ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) N’ụzọ dị iche, oké ndọlị, nchegbu, na nrụgide nke ịkpakọba akụ̀ na ụba pụrụ ibibi ahụ́ ike na obi ụtọ anyị. Nchụso nke ihe onwunwe ịchịkwa ndụ anyị na-enwe mmetụta dị njọ ná mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ. Mgbe ndụ mmadụ n’ezinụlọ nakwa n’ọha na eze mebikwara, ọ na-emetụtakwa ndụ onye ahụ n’ozuzu.

Ụkpụrụ Ime Mmụọ Ka Elu

“Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ ọtụtụ narị afọ gara aga. (Ndị Rom 12:2) Ụwa na-ahụ ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya n’anya. (Jọn 15:19) Ọchịchọ ya bụ ịkpali ikike ịhụ ihe, ibitụ ihe aka, ịnụ ísìsì, na ịnụ ihe gị—ee, ịnakwere ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ihe ọ na-emesi ike bụ “ọchịchọ nke anya,” ka gị na ndị ọzọ wee na-achụso uru ihe onwunwe.—1 Jọn 2:15-17.

Ma e nwere ihe ndị karịrị ego, ịbụ onye a ma ama, na akụ̀ na ụba. Ọtụtụ narị afọ gara aga, Eze Solomọn kpakọbara ihe onwunwe nile a pụrụ ịchọta n’ụwa. O wuru ụlọ dị iche iche ma nwee ogige, ubi mkpụrụ osisi, ndị ohu, anụ ụlọ, ndị nwoke na ndị nwanyị na-abụ abụ, nakwa ọlaọcha na ọlaedo n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu. Solomọn mụbara ihe onwunwe ya karịa nnọọ ndị nile buru ya ụzọ. N’ezie, ọ nọ n’ikpo akụ̀. Solomọn fọrọ nke nta ka o nwee ihe nile mmadụ pụrụ ịchọ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe o lere ihe ndị ọ rụzuru anya, o kwuru, sị: “Ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 2:1-11.

Site n’amamihe ka elu nke o nwere ihe ùgwù inweta, Solomọn maara na a na-enweta afọ ojuju ka ukwuu site n’ịchụso ụkpụrụ ime mmụọ. O dere, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

Akụ̀ dị oké ọnụ ahịa a pụrụ ịchọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaọcha na ọlaedo. (Ilu 16:16) Dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, e nwere eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ị ga-achọta n’ime ya. Ị̀ ga-achọ ma gwupụta ha? (Ilu 2:1-6) Onye Okike anyị, bụ́ Isi Iyi nke ezi ụkpụrụ, na-agba gị ume ime otú ahụ, ọ ga-enyekwara gị aka. N’ụzọ dị aṅaa?

Jehova na-enye anyị akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya. (Abụ Ọma 1:1-3; Aịsaịa 48:17, 18; Matiu 24: 45-47; 1 Ndị Kọrint 2:10) Inyocha akụ̀ ndị a a na-adịghị ahụkebe bụ́ ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa na-enye gị ohere iji amamihe họrọ ụzọ ndụ kasị mma na nke kasị akwụghachi ụgwọ. Nke ahụ agaghịkwa esi ike omume n’ihi na Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, maara ihe dị anyị mkpa iji nwee obi ụtọ n’ezie.

Bible Na-agba Ume Inwe Ụkpụrụ Ndị Kasị Elu

Ezi ndụmọdụ, ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị, a na-achọta n’ime Bible dị irè ma bụrụ nke na-enweghị oyiri. Ụkpụrụ omume ọ na-agba ume ka e nwee enweghị atụ. Ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe nile. Ngabiga nke oge emebeghị ka ọ kwụsị ịdị irè. Ihe atụ nke ezi ndụmọdụ ndị dị na Bible bụ ịrụsi ọrụ ike, ime ihe n’eziokwu, iji ego eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya na izere ịdị umengwụ.—Ilu 6:6-8; 20:23; 31:16.

N’ikwekọ na nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’elu ala, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-awabanyekwa ma na-ezu ohi. Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awabanye ma na-ezu ohi.”—Matiu 6:19, 20.

Ndụmọdụ ahụ bịara n’ezi oge dị irè taa dịkwa ka ọ dị afọ 2,000 gara aga. Kama ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’ọchịchọ nke akụ̀ na ụba, anyị pụrụ irite uru ugbu a site n’ịchụso ụzọ ndụ ka elu. Ihe bụ́ isi bụ ịkpakọba akụ̀ ime mmụọ, bụ́ nke na-eduga ná ndụ nke ezi obi ụtọ na afọ ojuju. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Ọ bụ site n’ịgụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, na site n’itinye ihe ọ na-akụzi n’ọrụ.

Ụkpụrụ Ime Mmụọ Na-eweta Ụgwọ Ọrụ

Mgbe e tinyere ya n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ụkpụrụ ime mmụọ na-abara anyị uru n’ụzọ anụ ahụ́, mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ. Dị nnọọ ka ihe nchebe ozone dị n’elu mbara ụwa si echebe anyị pụọ n’ụzarị anyanwụ, ezi ụkpụrụ omume na-echebe anyị site n’ikpughe mmetụta ndị dị ize ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:9, 10.

Ịhụ akụ̀ na ụba n’anya na-araba ndị mmadụ n’ịchọ akụ̀, ọkwá na ike. Ọtụtụ mgbe, a na-eji ụzọ aghụghọ na emeghị ihe n’eziokwu eme ihe iji ruo ihe mgbaru ọsọ ndị a. Nchụso nke ihe onwunwe pụrụ izunara mmadụ oge, ume na ikike. Ọ pụrụ ọbụna ịnapụ mmadụ ụra abalị. (Eklisiastis 5:12) N’ezie, ọchịchọ inwetakwu ihe na-akpagbu ọganihu ime mmụọ. N’ụzọ doro anya, nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ, bụ́ Jizọs Kraịst, gosiri anyị ụzọ ka mma: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ọ maara na akụ̀ ime mmụọ na-eweta nkwụghachi ụgwọ na-adịgide adịgide, nakwa na ọ dị nnọọ mkpa karịa uru ihe onwunwe na-adịghị adịte aka.—Luk 12:13-31.

 Ọ̀ Dị Irè n’Ezie?

“Ndị mụrụ m gbalịsiri ike ime ka m kweta na ịgbaso ụkpụrụ ime mmụọ adịghị irè,” ka Greg na-echeta. “Ma, enwetara m nnọọ udo nke uche site n’ịchụso ihe ime mmụọ n’ihi na adịghị m adọgbu onwe m n’ịma ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe.”

Ụkpụrụ ime mmụọ na-emekwa ka mmadụ na ndị ọzọ nwee mmekọrịta ka mma. A na-adọta ezi ndị enyi n’ebe ị nọ n’ihi ihe ị bụ, ọ bụghị n’ihi ihe i nwere. Bible na-atụ aro, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.” (Ilu 13:20) Ọzọkwa, ezinụlọ na-aga nke ọma na-adabere n’amamihe na ịhụnanya, ọ bụghị n’ihe onwunwe.—Ndị Efesọs 5:22–6:4.

Anyị ebughị ụkpụrụ pụta ụwa. Anyị aghaghị ịmụta ya site n’aka ndị ọgbọ anyị ma ọ bụ site n’ebe ka elu. Ọ bụ ya mere mmụta dabeere na Bible pụrụ iji gbanwee kpam kpam ụzọ anyị si ele ihe onwunwe anya. “E nyeere m aka ịtụleghachi ụkpụrụ ndị m na-agbaso, amụtakwara m inwe afọ ojuju n’ihe ndị dị mkpa n’ezie,” ka Don, bụ́ onye na-arụbu ọrụ n’ụlọ akụ̀ na-ekwu.

Chụsoo Akụ̀ Ime Mmụọ Ndị Na-adịgide Adịgide

Ụkpụrụ ime mmụọ na-adọrọ uche gaa ná nkwụghachi ụgwọ na-adịru ogologo oge, ọ bụghị n’imeju agụụ na-adịru nwa oge. Pọl dere, sị: “Ihe ndị a na-ahụ anya [ihe onwunwe] na-adịru nwa oge, ma ihe ndị a na-adịghị ahụ anya [ihe ime mmụọ] na-adịru ebighị ebi.” (2 Ndị Kọrint 4:18) Ọ bụ eziokwu na nchụso nke ihe onwunwe pụrụ imeju ọchịchọ ndị na-adịru nwa oge, ma anyaukwu agaghị ewetara mmadụ uru na-adịgide adịgide. Ụkpụrụ ime mmụọ na-adịru ebighị ebi.—Ilu 11:4; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

Bible katọrọ ịhụ ihe onwunwe n’anya nke  juru ebe nile n’oge a. Ọ na-akụziri anyị ụzọ isi chịkwaa ọchịchọ onwe onye nanị site n’ilegide anya otu ebe, na-elekwasị ya n’ihe ka mkpa, akụ̀ ime mmụọ. (Ndị Filipaị 1:10) Ọ na-ekpughe ihe anyaukwu bụ n’ezie—ife onwe onye. Ka anyị na-etinye ihe anyị na-amụta n’Okwu Chineke n’ọrụ, anyị na-enweta obi ụtọ ka ukwuu. Echiche anyị na-esite n’ịnara anara gaa n’inye enye. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ iji ụkpụrụ ime mmụọ dochie anya imeju ọchịchọ onwe onye!

N’eziokwu, ego pụrụ ịbụ ihe nchebe ruo n’ókè ụfọdụ. (Eklisiastis 7:12) Ma Bible na-ekwu n’ezie, sị: “Ego gị pụrụ ịgwụ n’otu ntabi anya, dị ka à ga-asị na o puru nku ma fepụ dị ka ugo.” (Ilu 23:5, Today’s English Version) Ndị mmadụ achụwo ọtụtụ ihe n’àjà n’ihi ịhụ ihe onwunwe n’anya—ahụ́ ike, ezinụlọ, ọbụna ezi akọ na uche—si otú ahụ nweta ọtụtụ ọdachi. N’aka nke ọzọ, inwe ọnọdụ ime mmụọ na-egbo mkpa anyị ndị kasị mkpa—mkpa maka ịhụnanya, mkpa maka nzube, na mkpa nke ife Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova. Ọ na-egosikwa anyị ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi n’izu okè mmadụ na paradaịs elu ala—olileanya nke Chineke kwere anyị ná nkwa.

N’isi nso, a ga-emezu olileanya nke ihe a kpọrọ mmadụ maka ọganihu n’ụzọ zuru ezu n’ụwa ọhụrụ nke Chineke. (Abụ Ọma 145:16) N’oge ahụ, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa” dum. (Aịsaịa 11:9) Ụkpụrụ ime mmụọ ga-ejupụta ebe nile. Ịhụ ihe onwunwe n’anya na ihe ndị ọ na-akpata ga-apụ n’anya kpam kpam. (2 Pita 3:13) Mgbe ahụ, ihe ndị na-eme ka ndụ dịkwuo nnọọ ụtọ obibi—ahụ́ ike zuru okè, ọrụ na-eju afọ, ezi ntụrụndụ, mmekọrịta ezinụlọ na-ekpo ọkụ na ọbụbụenyi na-adịgide adịgide nke Chineke na ụmụ mmadụ—ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ezi obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Jiri Ego Gị Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya!

Ghọta ihe ndị dị gị mkpa. Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Nye anyị nri anyị maka taa dị ka ihe a chọrọ taa si dị.” (Luk 11:3) Ekwela ka ọchịchọ gị taa ghọọrọ gị mkpa echi. Cheta na ndụ gị adabereghị n’ihe i nwere.—Luk 12:16-21.

Mee atụmatụ mkpata na mmefu. Azụla ihe ị na-emeghị atụmatụ ya. Bible na-ekwu, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” (Ilu 21:5) Jizọs dụrụ ndị na-ege ya ntị ọdụ ibu ụzọ gụkọọ ihe ọ ga-ewe tupu ha emewe ihe ọ bụla e ji ego eme.—Luk 14:28-30.

Zere ịbanye n’ụgwọ na-enweghị isi. Ebe o kwere mee, chekwaa ego ị ga-eji zụọ ihe kama ịzụ ihe n’aka. Ilu si otú a kwuo ya: “Ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.” (Ilu 22:7) Site n’inwe njide onwe onye na ibi ndụ dị ka ihe ị na-akpata hà, ị pụrụ ọbụna inwe ihe ịga nke ọma n’ime atụmatụ ịzụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ.

Zere imefusị ihe. Mee ka ihe i nwere dịteere gị aka site n’ilekọta ya nke ọma, si otú ahụ na-ezere imefusị ihe. Jizọs gosiri ịdị mkpa nke ịghara imefusị ihe n’ihe ndị o ji mee ihe.—Jọn 6:10-13.

Bute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Onye maara ihe ‘ga-azụpụtara onwe ya oge’ iji chụsoo ihe mgbaru ọsọ ndị ka mkpa.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ịmụta Ihe Site n’Ahụmahụ—Ọ Dị Ụzọ Ka Mma

Ahụmahụ onwe onye—ma nke ọma ma nke ọjọọ—pụrụ ịkụziri anyị ihe ndị bara uru. Ma ọ̀ bụ eziokwu na ahụmahụ onwe onye bụ onye nkụzi kasị mma, dị ka a na-ekwukarị? Ee e, e nwere ebe ka elu e si enweta nduzi. Ọbụ abụ ahụ matara ya mgbe o kpere ekpere, sị: ‘Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.’—Abụ Ọma 119:105.

N’ihi gịnị ka ịmụta ihe site ná ntụziaka Chineke ji ka mma karịa ịmụta ihe site n’ahụmahụ onwe onye? Otu ihe bụ na ịmụta ihe site nanị n’ahụmahụ onwe onye—ọtụtụ nnwale—pụrụ iweta ma mfu ma ihe mgbu. Ọ dịghịkwa mkpa. “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu!” ka Chineke gwara ụmụ Izrel oge ochie. “Udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:18.

Otu ihe mere Okwu Chineke ji bụrụ ebe kasịnụ e si enweta ntụziaka bụ na o nwere ihe ndekọ kasị ochie na nke kasị zie ezie nke ahụmahụ ụmụ mmadụ. O yiri ka ị̀ ga-aghọta na ịmụta ihe site n’ihe ịga nke ọma na ọdịda nke ndị ọzọ n’enweghị ihe mgbu dị mma karịa ihie ụzọ dị ka ha hiere. (1 Ndị Kọrint 10:6-11) Nke ka mkpa bụ na n’ime Bible, Chineke na-enye anyị iwu na ụkpụrụ nduzi ndị bụ́ ịgba a pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu. ‘Iwu Jehova zuru okè, ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.’ (Abụ Ọma 19:7) N’ezie, ịmụta ihe site n’amamihe nke Onye Okike anyị na-ahụ n’anya bụ ụzọ kasị mma.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ụwa chọrọ ka ị nakwere ụzọ ndụ ya nke ịhụ ihe onwunwe n’anya

[Foto dị na peeji nke 5]

Akụ̀ dị oké ọnụ ahịa a na-achọta na Bible dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaọcha na ọlaedo