Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe na Ndị Na-anọgidesi Ike n’Oge Mbụ na n’Oge A

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe na Ndị Na-anọgidesi Ike n’Oge Mbụ na n’Oge A

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe na Ndị Na-anọgidesi Ike n’Oge Mbụ na n’Oge A

N’akụkụ ndịda Poland, na nso ókè ya na Slovakia na Czech Republic, e nwere otu obere obodo a na-akpọ Wisła. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị nụtụbeghị banyere Wisła, o nwere akụkọ ihe mere eme nke yiri ka ọ̀ ga-amasị ezi Ndị Kraịst. Ọ bụ akụkọ ihe mere eme nke e ji iguzosi ike n’ezi ihe na ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova mara. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

WISŁA dị n’ebe mara mma nke bụ́ ugwu ugwu, bụ́ ebe e nwere ugwu ndị na-adọrọ mmasị. Ọwa mmiri na iyi abụọ ndị na-asọsi ike na-asọbanye n’Osimiri Vistula, bụ́ nke gbagọọrọ gafee ugwu na ndagwurugwu ndị dị n’ime ọhịa. Ndị bi n’ebe ahụ bụ́ ndị nwere omume enyi, na ihu igwe pụrụ iche e nwere n’ógbè ahụ mere ka a mara Wisła dị ka ebe a na-anara ọgwụ, ebe ezumike n’oge okpomọkụ na n’oge oyi.

O yiri ka ndị mbụ biri n’ebe ahụ bụ́ ndị a kpọrọ aha a hà malitere ibi ebe ahụ n’afọ ndị 1590. E wuru ebe ịkwọ osisi, n’oge na-adịghịkwa anya, ndị na-azụ atụrụ na ehi na ndị ọrụ ubi bịara bijupụta n’ugwu ndị ahụ osisi na-adịghị. Ma ndị a dị umeala n’obi bịara nwee oké mgbanwe okpukpe. Ndozigharị okpukpe nke Martin Luther wetara metụtara ndị bi n’ógbè ahụ nke ukwuu, okpukpe Lutheran ghọkwara “okpukpe mba ahụ n’afọ 1545,” dị ka onye na-eme nchọpụta bụ́ Andrzej Otczyk si kọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Agha Iri Afọ Atọ ahụ na Ndozigharị Mmegide sochiri ya gbanwere ọnọdụ ahụ n’ụzọ dị ukwuu. “N’afọ 1654, a napụrụ ndị Protestant ụlọ okpukpe ha nile, machibido ihe omume okpukpe ha iwu, kwakọrọkwa Bible na akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ,” ka Otczyk gara n’ihu ikwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ebe ahụ nọgidere bụrụ ndị Lutheran.

Mkpụrụ Ndị Mbụ nke Eziokwu Bible

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndozigharị okpukpe ka mkpa na-abịa n’ihu. Na 1928, mmadụ abụọ na-anụ ọkụ n’obi bụ́ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, kụrụ mkpụrụ ndị mbụ nke eziokwu Bible. N’afọ sochiri ya, Jan Gomola ji ígwè phonograph bịa Wisła, bụ́ nke o ji kpọọ okwu ihu ọha ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị e kwunyere na teepu. Mgbe ahụ, ọ gafere na ndagwurugwu dị nso n’ebe ahụ bụ́ ebe ọ chọtara onye gere ntị nke ọma—Andrzej Raszka, bụ́ onye dị mkpụmkpụ ma gbaa agbaa nke bi n’elu ugwu bụ́ onye nwere obi na-anabata ihe. Raszka wepụtara Bible ya ozugbo iji chọpụta ma ihe ndị e kwuru n’ígwè phonograph ahụ hà bụ eziokwu. Mgbe ahụ, o tiri mkpu, sị: “Nwanna m, n’ikpeazụ, achọtawo m eziokwu ahụ! Anọwo m na-achọ azịza kemgbe m nọ n’olulu ndị agha n’Agha Ụwa Mbụ!”

Raszka ji ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu kpọrọ Gomola gakwuru ndị enyi ya bụ́ Jerzy na Andrzej Pilch, bụ́ ndị ji oké mmasị nabata ozi Alaeze ahụ. Andrzej Tyrna, bụ́ onye mụtara eziokwu Bible na France, nyeere ndị ikom a aka ime ka ihe ọmụma ha nwere n’ozi Chineke mikwuo emie. N’oge na-adịghị anya, e mere ha baptizim. Iji nyere ìgwè nta nke Ndị Mmụta Bible nọ na Wisła aka, ụmụnna si n’obodo ndị dị nso na-aga eleta ha n’etiti afọ ndị 1930. Ihe ndị si na ya pụta na-atụ n’anya.

Ọtụtụ ndị ọhụrụ nwere mmasị nubatara. Ezinụlọ ndị na-ekpe okpukpe Lutheran nwere àgwà nke ịgụ Bible n’ụlọ ha. Ya mere, ozugbo ha hụrụ arụmụka Akwụkwọ Nsọ ndị doro anya na-emegide ozizi ọkụ ala mmụọ na Atọ n’Ime Otu, ọtụtụ pụrụ ịhụ ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ụgha. Ọtụtụ ezinụlọ kpebiri ikewapụ onwe ha n’ozizi ụgha okpukpe. N’ihi ya, ọgbakọ dị na Wisła mụbara, ka ọ na-erulekwa afọ 1939, ha ruru ihe dị ka mmadụ 140. Otú ọ dị, n’ụzọ na-atụ n’anya, e mebeghị ihe ka ọtụtụ ná ndị toro eto nọ n’ọgbakọ ahụ baptizim. “Nke a apụtaghị na ndị nkwusa a a na-emebeghị baptizim apụghị iguzosi ike n’akụkụ Jehova,” ka Helena, otu n’ime ndị mbụ ahụ ghọrọ Ndịàmà na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’ule okwukwe nke ha zutere n’oge na-adịghị anya, ha gosipụtara iguzosi ike n’ezi ihe ha.”

Gịnị banyere ụmụaka? Ha hụrụ na ndị mụrụ ha achọtawo eziokwu ahụ. Franciszek Branc na-akọ, sị: “Mgbe papa m ghọtara na ya achọtawo eziokwu ahụ, ọ malitere ịkụnye ya n’ime mụ na nwanne m nwoke. Adị m afọ asatọ, nwanne m nwoke dịkwa afọ iri. Papa m na-ajụ anyị ajụjụ ndị dị mfe, ndị dị ka: ‘Ònye bụ Chineke, gịnịkwa bụ aha ya? Gịnị ka ị maara banyere Jizọs Kraịst?’ Anyị na-edepụta azịza anyị edepụta ma jiri amaokwu Bible kwado ha.” Onyeàmà ọzọ na-ekwu, sị: “N’ihi na ndị mụrụ m ji ọchịchọ obi ha nakwere ozi Alaeze ahụ ma hapụ Chọọchị Lutheran na 1940, enwetara m mmegide, e tiekwa m ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ana m ekele ndị mụrụ m maka ịkụnye ụkpụrụ Bible n’ime m. Nke ahụ nyeere m nnọọ aka ịgabiga oge ndị ahụ siri ike.”

E Lee Okwukwe Ha Ule

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, ndị Nazi ewegharakwa ebe ahụ, ha kpebisiri ike ikpochapụ Ndịàmà Jehova. Na mbụ, a gbara ndị toro eto ume—karịsịa ndị nna—ka ha bịanye aka n’akwụkwọ nke na-egosi na ha bụ ndị Germany iji nweta ihe ùgwù ụfọdụ. Ndịàmà ahụ jụrụ ịkwado ndị Nazi. Ọtụtụ ụmụnna na ndị nwere mmasị bụ́ ndị toruworo ogo ịga agha chere ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ihu: Ha pụrụ isonyere ndị agha, ma ọ bụ ha pụrụ ịnọgidesi ike ná nnọpụiche ha ma bụrụ ndị e nyere ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ. “Mmadụ ịjụ ije ozi agha na-apụta na a ga-eziga ya n’ogige ịta ahụhụ, nke na-abụkarị n’Auschwitz,” ka Andrzej Szalbot, bụ́ onye ndị Gestapo jidere na 1943, na-akọwa. “E mebeghị m baptizim n’oge ahụ, ma amaara m mmesi obi ike ahụ Jizọs nyere na Matiu 10:28, 29. Amaara m na ọ bụrụ na mụ anwụọ n’ihi okwukwe m nwere na Jehova, ọ ga-akpọliteli m n’ọnwụ.”

Ná mmalite nke afọ 1942, ndị Nazi jidere ụmụnna 17 si Wisła. N’ime ọnwa atọ, mmadụ 15 n’ime ha nwụrụ n’Auschwitz. Olee mmetụta nke a nwere n’ahụ́ Ndịàmà fọdụrụ na Wisła? Kama ime ka ha gbahapụ okwukwe ha, nke a gbara ha ume ịnọgidesi ike n’akụkụ Jehova n’emebighị okwukwe ha! N’ime ọnwa isii ọzọ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ na Wisła mụbara okpukpu abụọ. N’oge na-adịghị anya, e jidekwuru ndị ọzọ. Ná ngụkọta, ndị agha obi tara mmiri nke Hitler jidere ụmụnna, ndị nwere mmasị na ụmụntakịrị 83. E zigara mmadụ 53 n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ (karịsịa n’Auschwitz) ma ọ bụ n’ogige ọrụ mmanye n’ebe ndị a na-egwupụta ihe n’ime ala na n’ebe ndị a na-agbari okwute na Poland, Germany, na Bohemia.

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe na Ndị Na-anọgidesi Ike

N’Auschwitz, ndị Nazi gbalịrị iji atụmanya nke inweta nnwere onwe ozugbo rata Ndịàmà ahụ. Otu onye nche SS gwara otu nwanna nwoke, sị: “A sị nnọọ na ị ga-abịanye aka n’akwụkwọ na-ekwu na i sokwaghị ná Ndị Mmụta Bible, anyị ga-atọhapụ gị, ị pụkwara ịlawa.” E kwere ya nkwa ahụ ọtụtụ ugboro, ma nwanna ahụ emebighị nrubeisi ya nye Jehova. N’ihi ya, e tiri ya ihe, mee ya akaje, ya arụọkwa ọrụ mmanye, ma n’Auschwitz ma na Mittelbau-Dora, nke dị na Germany. Nwa oge tupu a tọhapụ ya, nwanna nwoke a fọrọ nke nta ka ọ nwụọ mgbe a tụrụ bọmbụ n’ogige e tinyere ya.

Paweł Szalbot, bụ́ Onyeàmà nke nwụrụ na nso nso a, chetara n’otu oge, sị: “N’oge ha na-agba m ajụjụ ọnụ, ndị Gestapo na-ajụ m ugboro ugboro ihe mere m ji jụ isonyere ndị agha Germany na ito Hitler.” Mgbe ọ kọwasịrị ihe ndabere sitere na Bible maka nnọpụiche ya dị ka Onye Kraịst, e zigara ya ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ngwá agha. “O doro anya na akọ na uche m agaghị ekwe m ịnakwere ụdị ọrụ a, n’ihi ya, ha zigara m ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ihe n’ime ala.” N’agbanyeghị nke a, ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi.

Ndị a na-atụghị mkpọrọ—ụmụ nwanyị na ụmụntakịrị—zigaara ndị nọ n’Auschwitz nri. “N’oge okpomọkụ, anyị na-atụtụ mkpụrụ osisi berry n’ọhịa ma were ha gbanwere ọka wit,” ka otu nwanna nwoke nke bụ́ onye ntorobịa mgbe ahụ na-ekwu. “Ụmụnna nwanyị na-eme achịcha ma banye ha n’abụba. Mgbe ahụ anyị na-ewegara ha ndị kwere ekwe ibe anyị a tụrụ mkpọrọ obere obere.”

Ná ngụkọta, e zigara Ndịàmà 53 toro eto bụ́ ndị si Wisła n’ogige ịta ahụhụ na ịrụ ọrụ mmanye. Mmadụ 38 n’ime ha nwụrụ.

Ọgbọ Ọhụrụ Etopụta

Omume mmegbu nke ndị Nazi metụtakwara ụmụ Ndịàmà Jehova. E zigara ụfọdụ na ndị nne ha n’ogige ịta ahụhụ nwa oge ndị dị na Bohemia. A kpọpụrụ ndị ọzọ site n’ebe ndị mụrụ ha nọ ma ziga ha n’ogige ụmụaka dị na Lodz bụ́ nke nwere aha ọjọọ.

“Na mgbe mbụ e bugara ndị mmadụ Lodz,” ka atọ n’ime ha na-echeta, “ndị Germany kpọọrọ anyị mmadụ iri, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ ise na itoolu. Anyị gbarịtara onwe anyị ume site n’ikpe ekpere na ikwurịta isiokwu ndị dabeere na Bible. Ọ dịghị mfe ịtachi obi.” N’afọ 1945, ụmụntakịrị nile ahụ laghachiri n’ụlọ ha. Ha dị ndụ kama ha tara ahụ́ ma nwee uche mkpasasị. Ma, ọ dịghị ihe mebiliri iguzosi ike n’ezi ihe ha.

Gịnị Meziri?

Ka Agha Ụwa nke Abụọ na-eru ná njedebe, Ndịàmà nọ na Wisła ka siri ike n’okwukwe, dịkwa njikere iji ịnụ ọkụ n’obi na mkpebi siri ike maliteghachi ọrụ nkwusa ha. Ìgwè ụmụnna dị iche iche gakwuuru ndị bi n’ebe ji kilomita 40 dị anya site na Wisła, na-eme nkwusa ma na-ekesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. “N’oge na-adịghị anya, e nwere ọgbakọ atọ na-arụsi ọrụ ike n’obodo anyị,” ka Jan Krzok na-ekwu. Otú ọ dị, nnwere onwe okpukpe adịteghị aka.

Ọchịchị ndị Kọmunist, bụ́ nke nọchiri ndị Nazi, machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Poland n’afọ 1950. Ya mere, ụmụnna ndị nọ n’ógbè ahụ aghaghị iji akọ na-eme ihe n’ozi ha. Mgbe ụfọdụ, ha na-eleta ndị mmadụ n’ụlọ ha dị ka à ga-asị na ha chọrọ ịzụ anụ ụlọ ma ọ bụ mkpụrụ akụ́kụ́. Nzukọ Ndị Kraịst na-abụkarị n’abalị n’ìgwè nta dị iche iche. Otú o sina dị, ndị nche jideliri ọtụtụ ndị na-efe Jehova, na-ebo ha ebubo na ha na-arụrụ ndị uwe ojii nzuzo nke mba ọzọ ọrụ—ebubo na-enwetụghị ihe ndabere ọ bụla. Ụfọdụ ndị ọfịsa ji okwu mkparị yie Paweł Pilch egwu, na-asị: “Hitler akwụsịlighị unu, ma anyị ga-akwụsị unu.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, nọọ n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ ise. Mgbe ụfọdụ Ndịàmà na-eto eto jụrụ ịbịanye aka n’akwụkwọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị socialist, a chụrụ ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ọrụ ha.

Jehova Nọgidere Na-anọnyere Ha

Ọchịchị gbanwere n’afọ 1989, Ndịàmà Jehova ghọkwara òtù iwu kwadoro na Poland. Ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-efe Jehova na Wisła maliteghachiri ọrụ ha ngwa ngwa, dị ka ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile na-egosi. Ihe dị ka 100 ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị obodo a abanyewo n’ozi ọsụ ụzọ. Ka a sịkwa ihe mere e ji kpọọ obodo a Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Ndị Ọsụ Ụzọ.

Bible na-ekwu banyere nkwado Chineke nyere ndị ohu ya n’oge gara, sị: “A sị na ọ bụghị Jehova Nke dịịrị anyị, mgbe mmadụ biliri imegide anyị: mgbe ahụ ha ga-eloworị anyị ná ndụ.” (Abụ Ọma 124:2, 3) N’oge anyị, n’agbanyeghị enweghị mmasị na omume rụrụ arụ nke ọha mmadụ bi n’ụwa, ndị na-efe Jehova na Wisła na-agbalịsi ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, a na-akwụghachikwa ha ụgwọ n’ụba. Ọgbọ Ndịàmà sochirinụ n’ógbè ahụ pụrụ ịgba akaebe nye ịbụ eziokwu nke okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?”—Ndị Rom 8:31.

[Foto dị na peeji nke 26]

E zigara Emilia Krzok na ụmụ ya bụ́ Helena, Emilia, na Jan n’ogige ịta ahụhụ nwa oge dị na Bohemia

[Foto dị na peeji nke 26]

Mgbe ọ jụrụ ije ozi agha, e zigara Paweł Szalbot ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ihe n’ime ala

[Foto dị na peeji nke 27]

Mgbe e zigara ụmụnna n’Auschwitz, ha nwụọkwa, ọrụ ahụ akwụsịghị ịmụba na Wisła

[Foto dị na peeji nke 28]

A kpọgara Paweł Pilch na Jan Polok n’ogige ndị ntorobịa dị na Lodz

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Mkpụrụ osisi berry na okooko osisi: © R.M. Kosinscy/www.kosinscy.pl