Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgidenụ Na-enweta Ike N’ime Onyenwe Anyị”

“Nọgidenụ Na-enweta Ike N’ime Onyenwe Anyị”

 “Nọgidenụ Na-enweta Ike N’ime Onyenwe Anyị”

“Nọgidenụ na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya.”—Ndị Efesọs 6:10.

1. (a) Agha dị aṅaa dị ịrịba ama weere ọnọdụ ihe dị ka afọ 3,000 gara aga? (b) N’ihi gịnị ka Devid ji nwee mmeri?

IHE dị ka afọ 3,000 gara aga, ndị agha abụọ sitere n’òtù ndị agha na-emegiderịta ibe ha chere onwe ha ihu n’ọgbọ agha. Nke nta n’ime ha bụ nwa okoro na-azụ atụrụ aha ya bụ Devid. Onye guzo ya n’ihu bụ Golaịat, nwoke nwere ike pụrụ iche ma gbaa dimkpa. Uwe agha ya dị ihe dị ka kilogram 57 n’arọ, o jikwa nnukwu ube na agadaga mma agha. Devid eyighị uwe agha ọ bụla, nanị ngwá agha o jikwa bụ èbè. Dike ndị Filistia ahụ bụ́ Golaịat weere ya dị ka mkparị na onye Izrel bịara ịma ya aka bụ nnọọ obere nwa. (1 Samuel 17:42-44) N’uche ndị Izrel na ndị Filistia na-ekiri ihe na-emenụ, ọ ghaghị iyiwo ka è ji n’aka ihe ga-esi n’agha ahụ pụta. Ma ọ bụghị ndị dị ike na-emeri n’agha mgbe nile. (Eklisiastis 9:11) Devid nwere mmeri n’ihi na ọ lụrụ ọgụ ahụ n’ike Jehova. “Jehova nwe agha nke a,” ka o kwuru. Ihe ndekọ Bible ahụ na-ekwu na “Devid wee were èbè, werekwa nkume, ka onye Filistia n’ike.”—1 Samuel 17:47, 50.

2. Ọgụ dị aṅaa ka Ndị Kraịst na-alụ?

2 Ndị Kraịst adịghị alụ agha nkịtị. Ọ bụ ezie na ha na mmadụ nile na-adị n’udo, ha na-alụ agha ime mmụọ megide ndị iro siri nnọọ ike. (Ndị Rom 12:18) N’isiakwụkwọ ikpeazụ nke akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl kọwara ọgụ nke Onye Kraịst ọ bụla na-alụ. O dere, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.”—Ndị Efesọs 6:12.

3. Dị ka Ndị Efesọs 6:10 si gosi, gịnị ka ọ dị anyị mkpa inwe iji jide n’aka na anyị ga-enwe mmeri?

3 “Ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” ahụ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị na-achọ ibibi mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ebe ọ bụ na ha ka anyị nnọọ ike, anyị na-achọta onwe anyị n’ọnọdụ yiri nke Devid, anyị apụghịkwa inwe ihe ịga nke ọma ọ gwụla ma ànyị dabeere na Chineke maka ume. N’ezie, Pọl na-agba anyị ume ‘ịnọgide na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya.’ (Ndị Efesọs 6:10) Mgbe o nyesịrị ndụmọdụ ahụ, onyeozi ahụ kọwara ndokwa ime mmụọ na àgwà Ndị Kraịst bụ́ ndị na-enyere anyị aka inwe mmeri.—Ndị Efesọs 6:11-17.

4. Olee isi ihe abụọ anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 4 Ugbu a, ka anyị tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ike nke onye iro anyị na ụzọ ndị o si eme ihe. Mgbe ahụ, anyị ga-atụlezi ụzọ anyị na-aghaghị isi mee ihe iji chebe onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị agbasoo ntụziaka Jehova, anyị pụrụ inwe obi ike na ndị iro anyị agaghị emeri anyị.

Mgba Megide Ìgwè Ndị Mmụọ Ọjọọ

5. Olee otú ojiji e ji okwu ahụ bụ́ “ịgba mgba” mee ihe ná Ndị Efesọs 6:12 si enyere anyị aka ịghọta ụzọ Setan si eme ihe?

5 Pọl na-akọwa na anyị “nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” Mmụọ ọjọọ bụ́ isi adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 12:24-26) Bible na-akọwa ọgụ anyị dị ka “mgba,” ma ọ bụ ọgụ aka. Mgbe a na-agba mgba na Gris oge ochie, onye mgba ọ bụla na-agbalị ime ka onye ya na ya na-agba mgba zọhie ụkwụ iji wee tụọ ya n’ala. N’otu aka ahụ, Ekwensu na-achọ ime ka anyị zọhie ụkwụ n’ụzọ ime mmụọ. Olee otú ọ pụrụ isi mee ka anyị mee nke a?

6. Jiri Akwụkwọ Nsọ gosi otú Ekwensu pụrụ isi jiri ụzọ dị iche iche mee ihe iji mebie okwukwe anyị.

6 Ekwensu pụrụ ime ihe dị ka agwọ, ọdụm na-agbọ ụja, ma ọ bụ ọbụna dị ka mmụọ ozi nke ìhè. (2 Ndị Kọrint 11:3, 14; 1 Pita 5:8) Ọ pụrụ iji ụmụ mmadụ mee ihe iji kpagbuo ma ọ bụ kụda anyị mmụọ. (Mkpughe 2:10) Ebe ọ bụ na ụwa dum na-atọgbọ n’aka Setan, ọ pụrụ iji ọchịchọ na ihe ndọrọ ụwa eme ihe iji mata anyị n’ọnyà. (2 Timoti 2:26; 1 Jọn 2:16; 5:19) Ọ pụrụ iji echiche ụwa ma ọ bụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ duhie anyị, dị nnọọ ka o si duhie Iv.—1 Timoti 2:14.

7. Gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ na-apụghị ime, oleekwa ihe enyemaka anyị nwere?

7 Ọ bụ ezie na ngwá agha na ike Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya pụrụ iyi ka hà karịrị anyị ike, o nwere ihe ndị ha na-apụghị ime. Ndị mmụọ ọjọọ a apụghị ịmanye anyị ime ihe ọjọọ nke na-ewute Nna anyị nke eluigwe. Anyị nweere onwe anyị ime nhọrọ, anyị nwekwara ike ịchịkwa echiche na omume anyị. Ọzọkwa, anyị adịghị alụ ọgụ ahụ nanị anyị. Ihe bụ́ eziokwu n’oge Ịlaịsha bụkwa eziokwu n’oge anyị: “Ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” (2 Ndị Eze 6:16) Bible na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru Chineke ma guzogide Ekwensu, ọ ga-agbapụ n’ebe anyị nọ.—Jems 4:7.

Ịma Atụmatụ Setan

8, 9. Ule ndị dị aṅaa ka Setan wetaara Job iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe ya, ihe ize ndụ ndị dịkwa aṅaa ka anyị na-eche ihu taa n’ụzọ ime mmụọ?

8 Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ Setan n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe ụzọ ndị bụ́ isi o si eme ihe. (2 Ndị Kọrint 2:11) Ekwensu ji ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba, ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya, mmegide ezinụlọ, nhụjuanya, na nkatọ na-enweghị ihe ndabere sitere  n’aka ndị enyi ụgha mee ihe megide onye ezi omume ahụ bụ́ Job. Job nwere nkụda mmụọ ma chee na Chineke agbahapụwo ya. (Job 10:1, 2) Ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị abụ Setan kpọmkwem ga-akpata nsogbu ndị a taa, ihe isi ike ndị dị otú ahụ na-emetụta ọtụtụ Ndị Kraịst, Ekwensu pụkwara iji ha mee ihe.

9 Ihe ndị dị ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ amụbawo n’oge ọgwụgwụ a. Anyị bi n’ụwa ebe nchụso ihe onwunwe na-akpagbu ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Usoro mgbasa ozi nọgidere na-egosipụta mmekọahụ rụrụ arụ dị ka ụzọ e si enweta obi ụtọ kama ịbụ ihe na-akpata obi mgbawa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ aghọwokwa “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) Ụzọ iche echiche dị otú a pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ anyị n’ihe ize ndụ ọ gwụla ma ànyị ‘lụsiri ọgụ ike maka okwukwe ahụ.’—Jud 3.

10-12. (a) Gịnị bụ otu ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere n’ilu ya nke ọgha mkpụrụ? (b) Nye ihe atụ nke otú a pụrụ isi kpagbuo ihe ime mmụọ.

10 Otu n’ime aghụghọ ndị Setan ji eme ihe bụ́ nke na-enwekarị ihe ịga nke ọma bụ ime ka anyị mikpuo onwe anyị n’ụwa a na ná nchụso ihe onwunwe ya. N’ilu ya nke ọgha mkpụrụ, Jizọs dọrọ aka ná ntị na n’ọnọdụ ụfọdụ “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba na-akpagbu okwu ahụ [okwu nke Alaeze ahụ].” (Matiu 13:18, 22) Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ịkpagbu’ pụtara ‘ịnyagbu kpamkpam.’

11 A pụrụ ịhụ ọgbụ n’ọhịa ụfọdụ dị n’ebe okpomọkụ. Ọ na-eji nwayọọ nwayọọ eto ka ọ na-atụhị n’osisi ọ nọ na ya. Nke nta nke nta, ọgbụ ahụ na-eji mkpọrọgwụ nke na-esiwanye ike akpagbu osisi ọ tụhịrị. Mkpọrọgwụ nke ọgbụ ahụ, bụ́ nke na-adị ọtụtụ, na-emesị mịkọrọ nri nile dị n’úkwù osisi ahụ, akwụkwọ ya na-ekpuchikwa osisi ahụ ka ọ ghara inweta ìhè. N’ikpeazụ, osisi ahụ ọ tụhịrị na-anwụ.

12 N’ụzọ yiri nke ahụ, nchegbu nke usoro ihe a na ọchịchọ maka akụ̀ na ụba na ndụ ntụsara ahụ́ pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-ewekọrọ oge na ume anyị. Ebe a dọrọwooro uche anyị gaa n’ihe nke ụwa, ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe ileghara ọmụmụ Bible onwe onye anya ma mee ya omume anyị ịhapụ nzukọ Ndị Kraịst, si otú ahụ na-ahapụ nri ime mmụọ. Ihe mgbaru ọsọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na-anọchizi nchụso ime mmụọ, n’ikpeazụkwa, anyị pụrụ ịghọrọ Setan anụ oriri n’ụzọ dị mfe.

Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzosi Ike

13, 14. Gịnị dị mkpa ka anyị mee mgbe Setan na-emegide anyị?

13 Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume “iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11) N’ezie, anyị apụghị ibibi Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka Chineke nyere ọrụ ime otú ahụ. (Mkpughe 20:1, 2) Otú ọ dị, ruo mgbe a ga-ewepụ Setan, anyị aghaghị “iguzosi ike” ka ọ ghara imeri anyị ná mwakpo ya.

14 Pita onyeozi mesikwara ya ike mkpa ọ dị iguzogide Setan. “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche,” ka Pita dere. “Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị  dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa. Ma guzogidenụ ya, sienụ ike n’okwukwe, ebe unu maara na a na-esite n’ịta ahụhụ emezu otu ihe ahụ n’òtù ụmụnna unu nile nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:8, 9) N’ezie, nkwado nke ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị dị anyị oké mkpa iji guzosie ike megide mwakpo Ekwensu na-awakpo anyị dị ka ọdụm na-agbọ ụja.

15, 16. Nye ihe atụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi otú nkwado nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ isi nyere anyị aka iguzosi ike.

15 Mgbe ọdụm nọ ha nso n’ala na-enweghị oké ọhịa n’Africa gbọrọ ụja, ụmụ ele pụrụ imeghachi omume site n’itikapụ ọsọ ruo mgbe ha si n’ebe ahụ dị ize ndụ pụọ. Otú ọ dị, enyí bụ ihe atụ nke inyerịta nkwado. Akwụkwọ bụ́ Elephants—Gentle Giants of Africa and Asia na-akọwa, sị: “Ụzọ ìgwè enyí si echebe onwe ha bụ iji onwe ha gbaa ogige, ndị nke toro eto n’ime ha na-eche ihe ize ndụ ahụ ihu ebe ndị obere n’ime ha na-anọ ná nchebe n’ime ogige ahụ.” N’ịhụ ngosipụta dị otú ahụ nke ike na nkwado, ọdụm adịghị awakpokarị ọbụna ụmụ enyí.

16 N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya yiri anyị egwu, ọ dị anyị mkpa iso ụmụnna anyị bụ́ ndị kwusiri ike n’okwukwe nọkọta ọnụ. Pọl kwetara na ụfọdụ Ndị Kraịst ibe ya ghọọrọ ya ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’ mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom. (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘ihe enyemaka na-eme ka a dị ike’ pụtara nanị otu ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Dị ka Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere si kwuo, “ụdị ngwaa nke okwu ahụ na-apụta ọgwụ e ji eme ka ahụ́ mgbakasị dajụọ.” Dị ka ọgwụ nke na-eme ka ahụ́ mgbakasị dajụọ, nkwado nke ndị tozuru okè na-efe Jehova pụrụ ibelata ihe mgbu nke oké nchegbu ma ọ bụ ahụhụ kpatara.

17. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke?

17 Agbamume sitere n’aka Ndị Kraịst ibe anyị taa pụrụ iwusi mkpebi anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi ike. Karịsịa, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye dị njikere inye aka n’ụzọ ime mmụọ. (Jems 5:13-15) Ihe ndị na-enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi na-agụnye ịmụchi Bible anya na ịga nzukọ Ndị Kraịst, mgbakọ ukwu na ndị nke nta. Mmekọrịta chiri anya nke anyị na Chineke na-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. N’ezie, ma ànyị na-eri ihe, ma ànyị na-aṅụ ihe, ma ànyị na-eme ihe ọ bụla ọzọ, anyị kwesịrị ịchọ ime ihe nile iji wetara Chineke otuto. (1 Ndị Kọrint 10:31) Dị ka o kwesịrị, iji ekpere adabere n’ebe Jehova nọ dị oké mkpa iji nọgide na-eme ihe na-amasị ya.—Abụ Ọma 37:5.

18. N’ihi gịnị ka anyị na-ejighị kwesị ịda mbà ọbụna ma a sị na ọnọdụ ndị siri ike na-amịkọrọ ike anyị?

18 Mgbe ụfọdụ, Setan na-awakpo anyị mgbe anyị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ọdụm na-awakpo anụmanụ na-adịghị ike. Nsogbu ezinụlọ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, ma ọ bụ nsogbu ahụ́ ike pụrụ ịmịkọrọ ike anyị n’ụzọ ime mmụọ. Ma ka ike ghara ịgwụ anyị n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, n’ihi na Pọl sịrị: “Mgbe m  na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:10; Ndị Galeshia 6:9; 2 Ndị Tesalonaịka 3:13) Gịnị ka o bu n’uche? Ihe o bu n’uche bụ na ike Chineke pụrụ imeju adịghị ike anyị dị ka mmadụ, ma ọ bụrụhaala na anyị echigharịkwuru Jehova maka ike. Mmeri Devid meriri Golaịat na-egosi na Chineke pụrụ iwusi ndị ya ike nakwa na ọ na-ewusi ha ike. Ndịàmà Jehova nke oge a pụrụ ịgba akaebe na Chineke ewusiwo ha ike n’oge oké ihe isi ike.—Daniel 10:19.

19. Nye ihe atụ iji gosi otú Jehova pụrụ isi wusie ndị ohu ya ike.

19 Banyere nkwado nke Chineke nyeworo ha, otu di na nwunye dere, sị: “N’ime afọ ndị gafeworonụ, anyị ejeworo Jehova ozi dị ka di na nwunye, anyị enwewokwa ọtụtụ ngọzi ma mata ọtụtụ ndị bụ́ ndị ezigbo mmadụ. Jehova azụwokwa ma wusie anyị ike inwe ihe ịga nke ọma n’ịtachi obi n’ihe isi ike dị iche iche. Dị ka Job, anyị aghọtaghị mgbe nile ihe mere ihe dị iche iche ji mee otú ha si mee, ma anyị maara na Jehova nọ ya mgbe nile inyere anyị aka.”

20. Ihe àmà ndị dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Jehova na-akwado ndị ya mgbe nile?

20 Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ ịkwado na iwusi ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ike. (Aịsaịa 59:1) Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Jehova na-akwagide ndị nile na-ada ada, Ọ na-ekulikwa ndị nile na-ehuda n’ala.” (Abụ Ọma 145:14) N’ezie, Nna anyị nke eluigwe “na-eburu anyị ibu” kwa ụbọchị ma na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie.— Abụ Ọma 68:19.

“Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere na Chineke” Dị Anyị Mkpa

21. Olee otú Pọl si mesie ike mkpa ekike agha ime mmụọ dị?

21 Anyị atụlewo ụfọdụ n’ime ụzọ ndị Setan si eme ihe ma hụ mkpa ọ dị iguzosi ike mgbe ọ na-awakpo anyị. Ugbu a, anyị aghaghị ịtụle ihe ọzọ dị oké mkpa ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ichebe okwukwe anyị. Ugboro abụọ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl onyeozi kpọtụrụ aha ihe dị oké mkpa n’iguzosi ike megide ajọ nzupụta dị iche iche nke Setan na n’inwe ihe ịga nke ọma na mgba anyị na-agbaso ìgwè ndị mmụọ ọjọọ. Pọl dere, sị: “Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu . . . Chịrịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke, ka unu wee nwee ike iguzogide n’ajọ ụbọchị ahụ nakwa, mgbe unu mezuchaworo ihe nile, iguzosi ike.”—Ndị Efesọs 6:11, 13.

22, 23. (a) Gịnị ka ekike agha ime mmụọ anyị na-agụnye? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

22 Ee, ọ dị anyị mkpa iyikwasị “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke.” Mgbe Pọl degaara ndị Efesọs akwụkwọ ozi ya, onye agha  Rom, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ na-eyi uwe agha zuru ezu mgbe ụfọdụ, nọ na-eche ya nche. Otú ọ dị, ọ bụ ike mmụọ nsọ kpaliri onyeozi ahụ ikwu banyere ihe agha ime mmụọ bụ́ ndị dị ohu Jehova ọ bụla oké mkpa.

23 Ekike agha a sitere na Chineke na-agụnye àgwà Ndị Kraịst na-aghaghị inwe nakwa ndokwa ime mmụọ ndị Jehova na-eme. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-enyocha akụkụ nke ọ bụla nke ekike agha ime mmụọ. Nke a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị dịruru njikere maka agha ime mmụọ anyị. N’otu oge ahụ, anyị ga-ahụ otú ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jizọs Kraịst si enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide Setan bụ́ Ekwensu.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ọgụ dị aṅaa ka Ndị Kraịst nile nwere?

• Kọwaa ụfọdụ n’ime ụzọ ndị Setan si eme ihe.

• Olee otú nkwado nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ isi wusie anyị ike?

• N’ike ònye ka anyị na-aghaghị ịdabere, n’ihi gịnịkwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ndị Kraịst ‘nwere mgba megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ’

[Foto dị na peeji nke 12]

Nchegbu nke usoro ihe a pụrụ ịkpagbu okwu nke Alaeze ahụ

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị Kraịst ibe anyị pụrụ ịbụ ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’

[Foto dị na peeji nke 14]

Ị̀ na-ekpeku Chineke ekpere maka ike?