Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpachara Anya Maka “Olu Ndị Bịara Abịa”

Kpachara Anya Maka “Olu Ndị Bịara Abịa”

 Kpachara Anya Maka “Olu Ndị Bịara Abịa”

“Ha agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị kama ha ga-esi n’ebe ọ nọ gbalaga, n’ihi na ha amaghị olu ndị bịara abịa.”—JỌN 10:5.

1, 2. (a) Olee otú Meri si meghachi omume mgbe Jizọs kpọrọ ya aha, oleekwa ihe Jizọs kwuru tupu mgbe ahụ nke ihe omume a na-egosipụta? (b) Gịnị na-enyekwara anyị aka ịnọ Jizọs nso?

JIZỌS ahụ e si n’ọnwụ kpọlite ahụ nwanyị guzo n’akụkụ ili ya nke tọgbọ chakoo. Ọ maara ya nke ọma. Ọ bụ Meri Magdalin. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ tupu mgbe ahụ, ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ. Kemgbe ahụ, ọ nọwo na-eso ya na ndịozi ya, na-ahụ maka mkpa ha kwa ụbọchị. (Luk 8:1-3) Otú ọ dị, n’ụbọchị a, Meri na-akwa ákwá, n’ịbụ onye na-eru újú n’ihi na ọ hụrụ ka Jizọs nwụrụ, ugbu a kwa, a hụzighịdị ozu ya! Ya mere, Jizọs ajụọ ya, sị: “Nwanyị, n’ihi gịnị ka i ji na-akwa ákwá? Ònye ka ị na-achọ?” N’iche na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, ya azaa, sị: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na i bupụwo ya, gwa m ebe ị dọbara ya, m ga-eburukwa ya pụọ.” Mgbe ahụ Jizọs asị: “Meri!” Ozugbo ahụ, ọ matara ụzọ o sibu agwa ya okwu. “Onye Ozizi!” ka o ji ọṅụ tie ná mkpu. Meri amakụọkwa ya.—Jọn 20:11-18.

2 Ihe ndekọ a na-egosi n’ụzọ na-emetụ n’ahụ́ ihe Jizọs kwuru tupu mgbe ahụ. N’iji onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ na iji ụmụazụ ya tụnyere atụrụ, ọ na-ekwu na onye ọzụzụ atụrụ na-akpọ ụmụ atụrụ ya aha, ha makwaara olu ya. (Jọn 10:3, 4, 14, 27, 28) N’ezie, dị ka atụrụ na-amata onye na-azụ ya, n’ụzọ dị otú ahụ Meri matara Onye Ọzụzụ Atụrụ ya, bụ́ Kraịst. Nke a bụkwa eziokwu banyere ụmụazụ Jizọs taa. (Jọn 10:16) Dị nnọọ ka ntị na-aghọta ihe  nke atụrụ si enyere ya aka ịnọ onye na-azụ ya nso, otú ahụ ka nghọta ime mmụọ anyị si enyere anyị aka ịgbasochi nzọụkwụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, anya.—Jọn 13:15; 1 Jọn 2:6; 5:20.

3. Olee ụfọdụ ajụjụ ndị ihe atụ Jizọs nke ogige atụrụ na-akpalite?

3 Otú ọ dị, dị ka ihe atụ ahụ si gosi, ikike atụrụ nwere ịmata olu mmadụ na-enyere ya aka ịmata ọ bụghị nanị ndị enyi ya kamakwa ndị iro ya. Nke ahụ dị oké mkpa n’ihi na anyị nwere ndị mmegide na-aghọ aghụghọ. Ole ndị ka ha bụ? Olee otú ha si eme ihe? Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị? Iji chọpụta, ka anyị hụ ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ihe atụ ya banyere ogige atụrụ.

‘Onye Na-adịghị Esite n’Ọnụ Ụzọ Abanye’

4. Dị ka e kwuru n’ihe atụ nke onye ọzụzụ atụrụ ahụ, ònye ka atụrụ ndị ahụ sooro, oleekwa onye ha na-esoghị?

4 Jizọs na-ekwu, sị: “Onye na-esite n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye na-azụ atụrụ. Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere onye a ụzọ, atụrụ na-ege ntị n’olu ya, ọ na-akpọkwa atụrụ nke ya n’aha, na-edurukwa ha apụ. Mgbe ọ kpọpụtaworo ndị nile bụ́ nke ya, ọ na-aga ha n’ihu, atụrụ ahụ na-esokwa ya, n’ihi na ha maara olu ya. Ha agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị kama ha ga-esi n’ebe ọ nọ gbalaga, n’ihi na ha amaghị olu ndị bịara abịa.” (Jọn 10:2-5) Rịba ama na Jizọs jiri okwu ahụ bụ́ “olu” mee ihe ugboro atọ. O kwuru ugboro abụọ banyere olu onye ọzụzụ atụrụ, ma na nke atọ, o zoro aka ‘n’olu ndị bịara abịa.’ Ụdị onye bịara abịa dị aṅaa ka Jizọs na-ezo aka na ya?

5. Gịnị mere na anyị adịghị ele ụdị onye bịara abịa a kpọtụrụ aha na Jọn isi 10 ọbịa?

5 Jizọs adịghị ekwu banyere ụdị onye bịara abịa anyị ga-achọ ile ọbịa—okwu nke pụtara “ịhụ ndị bịara abịa n’anya” n’asụsụ mbụ nke Bible. (Ndị Hibru 13:2) N’ihe atụ Jizọs, onye ahụ bịara abịa abụghị ọbịa a kpọrọ òkù. Ọ ‘dịghị esite n’ọnụ ụzọ abanye n’ogige atụrụ kama ọ na-arịgo ebe ọzọ.’ Ọ bụ “onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe.” (Jọn 10:1) Ònye bụ onye mbụ a kpọtụrụ aha n’Okwu Chineke bụ́ onye ghọrọ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe? Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Anyị na-achọta ihe àmà nke ahụ n’akwụkwọ Jenesis.

Mgbe A Nụrụ Olu Onye Bịara Abịa nke Mbụ Ya

6, 7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Setan onye bịara abịa na onye ohi n’ụzọ ziri ezi?

6 Jenesis 3:1-5 na-akọwa otú e si nụ olu onye bịara abịa n’ụwa na nke mbụ ya. Ihe ndekọ ahụ na-akọ na Setan bịakwutere nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, site n’ọnụ agwọ, gwakwa ya okwu n’ụzọ na-eduhie eduhie. N’ezie, n’ihe ndekọ a, a kpọghị Setan n’ụzọ nkịtị “onye bịara abịa.” Otú o sina dị, omume ya gosiri na n’ọtụtụ ụzọ o yiri onye ahụ bịara abịa nke a kọwara n’ihe atụ Jizọs nke e dekọrọ na Jọn isi 10. Tụlee myirịta ụfọdụ e nwere.

7 Jizọs na-ekwu na onye ahụ bịara abịa na-ejekwuru atụrụ ọ na-achọ iburu n’ogige atụrụ ahụ n’ụzọ aghụghọ. N’otu aka ahụ, Setan gakwuuru onye ahụ ọ chọrọ iduhie n’ụzọ aghụghọ, na-eji agwọ eme ihe. Ụzọ aghụghọ a o si ejekwuru mmadụ na-ekpughe ihe Setan bụ n’ezie—onye mwaba na-aghọ aghụghọ. Ọzọkwa, onye ahụ bịara abịa n’ogige atụrụ na-achọ izunara onye nwe atụrụ atụrụ ya. N’eziokwu, ọ dị njọ karịa onye ohi, n’ihi na ebumnobi ya bụkwa ‘igbu na ibibi ihe.’ (Jọn 10:10) N’otu aka ahụ, Setan bụ onye ohi. N’iduhie Iv, o weghaara nrubeisi ya n’ebe Chineke nọ. Ọzọkwa, Setan wetakwaara ụmụ mmadụ ọnwụ. N’ihi ya, ọ bụ ogbu mmadụ.

8. Olee otú Setan si gbagọọ okwu na ebumnobi Jehova?

8 Emeghị ihe n’eziokwu Setan pụtara ìhè n’ụzọ o si gbagọọ okwu na ebumnobi Jehova. ‘Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla?’ ka ọ jụrụ Iv. Setan mere ka à ga-asị na o juru ya anya, dị ka ọ̀ na-asị: ‘Olee otú Chineke ga-esi bụrụ onye na-enweghị ezi uche otú ahụ?’ Ọ gbakwụnyere, sị: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu.” Rịba ama ihe o kwuru: “Chineke maara.” Setan kwuru dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Amaara m ihe Chineke ma. Amaara m ihe o bu n’obi,  ihe o bu n’obi dịkwa njọ.’ (Jenesis 2:16, 17; 3:1, 5) N’ụzọ dị mwute, Iv na Adam agbakụtaghị olu onye a bịara abịa azụ. Kama nke ahụ, ha gere ya ntị ma wetara onwe ha na ụmụ ha ahụhụ.—Ndị Rom 5:12, 14.

9. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na a ga-anụ olu ndị bịara abịa taa?

9 Setan na-eji ụzọ ndị yiri nke ahụ eduhie ndị Chineke taa. (Mkpughe 12:9) Ọ bụ “nna nke ụgha,” ndị dịkwa ka ya, bụ́ ndị na-agbalị iduhie ndị ohu Chineke, bụ ụmụ ya. (Jọn 8:44) Ka anyị hụ ụzọ ụfọdụ e si anụ olu ndị a bịara abịa taa.

Otú E Si Anụ Olu Ndị Bịara Abịa Taa

10. Olee otu ụzọ e si na-anụ olu ndị bịara abịa?

10 Echiche ndị na-eduhie eduhie. Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Unu abụla ndị e ji ozizi ọhụrụ dị iche iche bufuo.” (Ndị Hibru 13:9) Ụdị ozizi ndị dị aṅaa? Ebe ọ bụ na ha pụrụ ‘ibufu anyị,’ o doro anya na Pọl na-ezo aka n’ozizi ndị pụrụ ime ka anyị daa mbà n’ụzọ ime mmụọ. Olee ndị na-ezi ozizi ọhụrụ ndị dị otú ahụ? Pọl gwara otu ìgwè ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst, sị: “Ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie ma na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:30) N’ezie, taa, dị ka ọ dị n’oge Pọl, ụfọdụ ndị nọbu n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-agbalịzi iduhie atụrụ ndị ahụ site n’ikwu “ihe gbagọrọ agbagọ”—ihe ndị na-abụchaghị eziokwu na ụgha chara acha. Dị ka Pita onyeozi si kwuo ya, ha na-eji “okwu nrafu”—okwu ndị yiri eziokwu ma ha bụ n’ezie okwu ndị na-abaghị uru—eme ihe.—2 Pita 2:3.

11. Olee otú okwu ndị a na-achọta na 2 Pita 2:1, 3 si ekpughe ụzọ ndị si n’ezi ofufe dapụ si eme ihe na ebumnobi ha?

11 Pita kpughekwuru ụzọ ndị si n’ezi ofufe dapụ si eme ihe site n’ikwu na ha “ga-eji ụzọ nzuzo webata ịrọ òtù nke na-ebibi ihe.” (2 Pita 2:1, 3) Dị nnọọ ka onye ohi ahụ dị n’ihe atụ Jizọs nke ogige atụrụ ahụ “na-adịghị esite n’ọnụ ụzọ abanye n’ogige atụrụ kama na-arịgo ebe ọzọ,” otú ahụ ka ndị si n’ezi ofufe dapụ si eji ụzọ aghụghọ abịakwute anyị. (Ndị Galeshia 2:4; Jud 4) Gịnị bụ ebumnobi ha? Pita na-agbakwụnye, sị: ‘Ha ga-erigbu unu.’ N’ezie, n’agbanyeghị ihe ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ pụrụ ikwu, ebumnobi ndị mwaba ahụ n’ezie bụ ‘izu ohi, gbuokwa ma bibie ihe.’ (Jọn 10:10) Kpachara anya maka ndị bịara abịa dị otú ahụ!

12. (a) Olee otú mkpakọrịta anyị pụrụ isi kpughepụ anyị nye olu ndị bịara abịa? (b) Olee myirịta dị n’etiti ụzọ aghụghọ Setan na nke ndị bịara abịa taa?

12 Mkpakọrịta ndị na-emerụ ahụ́. A pụrụ ịnụ olu ndị bịara abịa site n’ọnụ ndị anyị na ha na-akpakọrịta. Mkpakọrịta ndị na-emerụ ahụ́ na-etinyekarị ndị ntorobịa n’ihe ize ndụ. (1 Ndị Kọrint 15:33) Cheta na Setan họọrọ Iv—onye nke a tọrọ na nke ka bụrụ onye na-enweghị ahụmahụ n’ime mmadụ abụọ mbụ ahụ. O mere ka o  kweta na Jehova na-egbochi nnwere onwe ya n’ụzọ na-enweghị isi, ma nke ahụ abụtụghị eziokwu. Jehova hụrụ ụmụ mmadụ o kere eke n’anya ma na-elekọta ha anya. (Aịsaịa 48:17) N’ụzọ yiri nke ahụ, taa, ndị bịara abịa na-agbalị ime ka unu bụ́ ndị ntorobịa kwere na ndị nne na nna unu bụ́ Ndị Kraịst na-egbochi nnwere onwe unu n’ụzọ na-enweghị isi. Olee otú ndị bịara abịa dị otú a pụrụ isi metụta unu? Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst na-ekweta, sị: “Ruo oge ụfọdụ, ụmụ klas m mere ka okwukwe m gharazie isi ike ruo n’ókè ụfọdụ. Ha nọgidere na-ekwu na okpukpe m adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́ ma bụrụ nke na-achọ ihe ezi uche na-adịghị na ya n’aka ndị mmadụ.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nne na nna unu hụrụ unu n’anya. Ya mere, mgbe ụmụ akwụkwọ ibe unu na-agbalị ime ka unu kwụsị ịtụkwasị ndị nne na nna unu obi, unu ekwela ka e duhie unu dị ka e duhiere Iv.

13. Ụzọ dị aṅaa amamihe dị na ya ka Devid gbasoro, oleekwa otu ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie ya?

13 Banyere mkpakọrịta na-emerụ ahụ́, ọbụ abụ bụ́ Devid na-ekwu, sị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa.” (Abụ Ọma 26:4) Ọzọkwa, ị̀ hụrụ àgwà ahụ e ji amata ndị bịara abịa? Ha na-ezochi ihe ha bụ—dị nnọọ ka Setan zochiri ihe ọ bụ site n’iji agwọ mee ihe. Taa, ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ na-ezochi ihe ha bụ na ihe ha bu n’obi n’ezie site n’iji Intanet eme ihe. N’ebe ndị a na-ekwurịta okwu n’Intanet, ndị toro eto bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ pụrụ ikwu na ha bụ ndị ntorobịa iji mata unu n’ọnyà ha. Ndị na-eto eto, bikonụ kpacharanụ anya ka a ghara imerụ unu ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.—Abụ Ọma 119:101; Ilu 22:3.

14. Olee otú usoro mgbasa ozi si agbasa olu ndị bịara abịa mgbe ụfọdụ?

14 Ebubo ụgha. Ọ bụ ezie na ụfọdụ akụkọ a na-agbasa banyere Ndịàmà Jehova dị mma, mgbe ụfọdụ, usoro mgbasa ozi na-ekwe ka e jiri ya mee ihe iji gbasaa olu ndị bịara abịa ndị na-egosi ajọ mbunobi. Dị ka ihe atụ, n’otu mba, otu akụkọ kwuru n’ụzọ na-abụghị eziokwu na Ndịàmà kwadoro ọchịchị Hitler n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ná mba ọzọ, e boro Ndịàmà ebubo na ha na-emebisị ụlọ chọọchị. N’ọtụtụ mba, usoro mgbasa ozi na-ebo Ndịàmà ebubo na ha na-ajụ inye ụmụ ha ọgwụgwọ nakwa na ha na-akpachara anya agbachi nkịtị ná mmehie ndị dị oké njọ nke ndị kwere ekwe ibe ha mere. (Matiu 10:22) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị maara ndị anyị bụ na-aghọta na ihe ndị dị otú ahụ bụ ebubo ụgha.

15. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwere ihe nile a na-agbasa n’usoro mgbasa ozi?

15 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a gbasaa ebubo ụgha site n’olu ndị bịara abịa? Ọ ga-adị mma anyị iburu ndụmọdụ dị n’Ilu 14:15 n’uche: “Onye na-enweghị uche na-ekwere  okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwere ihe nile a na-agbasa n’usoro mgbasa ozi dị ka eziokwu. Ọ bụ ezie na anyị adịghị nnọọ ele ihe ọmụma nile nke ụwa anya dị ka ihe na-abụghị eziokwu, anyị na-aghọta na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

“Nwaleenụ Okwu Ndị Sitere ná Mkpali nke Mmụọ”

16. (a) Olee otú àgwà atụrụ nkịtị si egosi ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs a na-achọta na Jọn 10:4? (b) Gịnị ka Bible na-agba anyị ume ime?

16 Otú ọ dị, olee otú anyị ga-esi mata nnọọ ma onye anyị na-emeso ihe ọ̀ bụ enyi ka ọ̀ bụ onye iro? Jizọs na-ekwu na ụmụ atụrụ na-eso onye na-azụ ha “n’ihi na ha maara olu ya.” (Jọn 10:4) Ọ bụghị ọdịdị nke onye ọzụzụ atụrụ nkịtị na-akpali atụrụ iso ya; ọ bụ olu ya. Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible na-akọ na otu onye ọbịa kwuru na ụmụ atụrụ na-amata onye na-azụ ha site n’uwe ya, ọ bụghị olu ya. Otu onye ọzụzụ atụrụ zara na ọ bụ olu ya ka ha maara. Iji nwapụta nke a, ya na onye ahụ bịara abịa gbanwerịtara uwe. N’iyi uwe onye ọzụzụ atụrụ ahụ, onye ahụ bịara abịa kpọrọ ụmụ atụrụ ahụ, ma ha abịaghị. Ha amaghị olu ya. Ma mgbe onye ọzụzụ atụrụ ahụ kpọrọ ha, ọ bụ ezie na ọ gbanwere uwe, ụmụ atụrụ ahụ bịara ozugbo. N’ihi ya, mmadụ pụrụ ịdị ka onye ọzụzụ atụrụ, ma nye atụrụ, nke ahụ adịghị egosi na ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ n’ezie. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ụmụ atụrụ ahụ na-anwale olu onye na-akpọ ha, jiri ya tụnyere olu onye na-azụ ha. Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị na-eme otu ihe ahụ—“nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke.” (1 Jọn 4:1; 2 Timoti 1:13) Gịnị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ?

17. (a) Olee otú anyị si amata olu Jehova? (b) Ihe ọmụma banyere Jehova na-enyere anyị aka ime gịnị?

17 N’ụzọ kwere nghọta, ka anyị na-amụtakwu olu ma ọ bụ ozi Jehova, otú ahụ ka anyị ga na-enwe ike ịmata olu ndị bịara abịa ngwa ngwa karị. Bible na-ekwu otú anyị si enweta ihe ọmụma dị otú ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:21) “Okwu” ahụ si n’azụ anyị sitere n’Okwu Chineke. Mgbe ọ bụla anyị na-agụ Okwu Chineke, anyị na-anụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, olu nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu anyị, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 23:1) N’ihi ya, ka anyị na-amụkwu Bible, otú ahụ ka anyị na-amatakwu olu Chineke. Ihe ọmụma chiri anya dị otú ahụ, n’aka nke ya, na-enyere anyị aka ịmata olu ndị bịara abịa ozugbo.—Ndị Galeshia 1:8.

18. (a) Gịnị ka ịmata olu Jehova na-agụnye? (b) Dị ka Matiu 17:5 si kwuo, n’ihi gịnị ka anyị ji kwesị irube isi n’olu Jizọs?

18 Gịnị ka ịmata olu Jehova na-agụnyekwu? E wezụga ịnụ ya, ọ na-agụnye irube isi na ya. Rịba kwa ama Aịsaịa 30:21. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Nke a bụ ụzọ.” Ee, site n’ọmụmụ Bible, anyị na-anụ nduzi Jehova. Ọ na-enyezi iwu, sị: “Jeenụ ije n’ime ya.” Jehova na-achọ ka anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-anụ. N’ihi ya, site n’itinye ihe anyị mụtara n’ọrụ, anyị na-egosi na ọ bụghị nanị na anyị nụrụ olu Jehova kamakwa na anyị rubere isi na ya. (Deuterọnọmi 28:1) Irube isi n’olu Jehova pụtakwara irube isi n’olu Jizọs, n’ihi na Jehova n’onwe ya gwara anyị ka anyị mee otú ahụ. (Matiu 17:5) Gịnị ka Jizọs, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, na-agwa anyị ka anyị na-eme? Ọ na-akụziri anyị ime ndị na-eso ụzọ na ịtụkwasị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” obi. (Matiu 24:45; 28: 18-20) Irube isi n’olu ya ga-apụtara anyị ndụ agwụghị agwụ.—Ọrụ 3:23.

“Ha Ga-esi n’Ebe Ọ Nọ Gbalaga”

19. Gịnị kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị nye olu ndị bịara abịa?

19 Oleezi otú anyị kwesịrị isi meghachi omume nye olu ndị bịara abịa? Ọ bụ dị ka atụrụ si eme. Jizọs na-ekwu, sị: “Ha agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị kama ha ga-esi n’ebe ọ nọ gbalaga.” (Jọn 10:5) Mmeghachi omume anyị gụnyere ihe abụọ. Nke mbụ, anyị “agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị.” Ee, anyị ga-ajụ onye bịara abịa kpamkpam. N’ezie, n’asụsụ Grik e ji dee Bible, okwu ahụ bụ́ “ma ọlị” na-asụgharị ụzọ kasị sie ike e si egosi na a jụrụ ihe n’asụsụ ahụ. (Matiu 24:35; Ndị Hibru 13:5) Nke abụọ, anyị “ga-esi n’ebe ọ nọ gbalaga,” ma ọ bụ gbakụta ya azụ. Nke ahụ bụ nanị ụzọ ziri ezi isi meghachi omume nye ndị ozizi ha na-ekwekọghị n’olu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ.

20. Olee otú anyị ga-esi meghachi omume mgbe anyị chere ihe ndị a ihu (a) ndị nduhie si n’ezi ofufe dapụ, (b) mkpakọrịta na-emerụ ahụ́, (ch) akụkọ usoro mgbasa ozi bụ́ ndị na-egosi ajọ mbunobi?

20 Ya mere, mgbe anyị zutere ndị na-akpọsa echiche ndị si n’ezi ofufe dapụ, anyị ga-achọ ime ihe Okwu Chineke na-ekwu: “Ka unu na-elegide ha anya bụ́ ndị na-akpata nkewa na ọnọdụ ndị na-akpata ịsụ ngọngọ bụ́ nke megidere ozizi unu mụtaworo, na-ezerekwanụ ha.” (Ndị Rom 16:17; Taịtọs 3:10) N’otu aka ahụ, ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eche ihe ize ndụ nke mkpakọrịta na-emerụ ahụ́ ihu ga-etinye n’ọrụ ndụmọdụ Pọl nyere Timoti na-eto eto, bụ́: “Gbanahụ ọchịchọ nke oge ntorobịa.” Mgbe e bokwara anyị ebubo ụgha n’usoro mgbasa ozi, anyị ga-echeta ndụmọdụ ọzọ Pọl nyere Timoti: “A ga-eme ka ha [ndị na-ege ntị n’olu ndị bịara abịa] chigharịa gaa n’akụkọ ụgha. Ma, gị onwe gị, nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile.” (2 Timoti 2:22; 4:3-5) N’agbanyeghị otú olu ndị bịara abịa pụrụ isi yie ihe na-atọ ụtọ, anyị na-agbanahụ ihe nile ga-ekpu okwukwe anyị ihu.—Abụ Ọma 26:5; Ilu 7:5, 21; Mkpughe 18:2, 4.

21. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa na-echere ndị jụrụ olu ndị bịara abịa?

21 Site n’ịjụ olu ndị bịara abịa, Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-emeghachi omume n’okwu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ a na-achọta na Luk 12:32. N’ebe ahụ Jizọs na-agwa ha, sị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na Nna unu akwadowo inye unu alaeze.” N’otú aka ahụ, “atụrụ ọzọ” ahụ na-enwe ọchịchọ siri ike ịnụ okwu Jizọs, bụ́: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziworo, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Jọn 10:16; Matiu 25:34) Lee ụgwọ ọrụ na-ekpo obi ọkụ na-echere anyị ma ọ bụrụ na anyị ajụ “olu ndị bịara abịa”!

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú Setan si daba ná nkọwa nke onye ahụ bịara abịa a kpọtụrụ aha n’ihe atụ Jizọs banyere ogige atụrụ?

• Olee otú e si anụ olu ndị bịara abịa taa?

• Olee otú anyị pụrụ isi mata olu ndị bịara abịa?

• Gịnị kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị nye olu ndị bịara abịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Meri matara Kraịst

[Foto dị na peeji nke 16]

Onye bịara abịa adịghị ejekwuru atụrụ ihu na ihu

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú anyị si emeghachi omume nye olu ndị bịara abịa?